Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Timoti—Dị Njikere, Nweekwa Mmasị Ije Ozi

Timoti—Dị Njikere, Nweekwa Mmasị Ije Ozi

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Timoti—Dị Njikere, Nweekwa Mmasị Ije Ozi

“Ì JIKERELA?” Ò nwetụla onye jụrụ gị ajụjụ a?— Onye jụrụ gị ajụjụ a chọrọ ịmara ma ị kwadebewo. Dị ka ihe atụ, ọ ga-abụ na onye ahụ chọrọ ịma ma ‘Ì burula akwụkwọ i ji aga ụlọ akwụkwọ? Ị̀ gụọla akwụkwọ gị?’ Dị ka anyị ga-ahụ, Timoti dị njikere.

Timoti nwekwara mmasị. Ị̀ ma ihe nke a pụtara?— Mgbe a kpọrọ Timoti òkù ka o jeere Chineke ozi, o mere ụdị omume onye ọzọ bụ́ ohu Chineke mere, onye sịrị: “Lee m! Ziga m.” (Aịzaya 6:8) Ndụ Timoti dịrị tọrọ ya ụtọ n’ihi na ọ dị njikere, nweekwa mmasị ije ozi. Ị̀ ga-achọ ịnụ banyere ndụ ya?—

A mụrụ Timoti na Listra, bụ́ ebe dị ọtụtụ narị kilomita site na Jeruselem. Nne nne ya bụ́ Lọịs na nne ya bụ́ Yunis na-amụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ha malitekwara ịkụziri Timoti Okwu Chineke mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ.—2 Timoti 1:5; 3:15.

Ọ dị ka ọ bụ mgbe Timoti na-erubeghị afọ iri abụọ ka Pọl onyeozi na Banabas gara Listra mgbe mbụ ha gara ikwusa ozi ọma n’ebe dị anya. Ọ ga-abụ n’oge a ka nne Timoti na nne nne ya ghọrọ Ndị Kraịst. Ị̀ ga-achọ ịnụ ụdị nsogbu bịaara Pọl na Banabas?— Ndị kpọrọ Ndị Kraịst asị tụrụ Pọl okwute, ya adaa n’ala, ha akpụrụ ya kpụga n’azụ obodo ahụ. Ha chere na ọ nwụọla.

Ndị kweere ihe Pọl nọ na-akụzi gbara ya gburugburu, ya ebilie. N’echi ya, Pọl na Banabas hapụrụ ebe ahụ. Ma n’oge na-adịghị anya, ha gaghachiri Listra. Mgbe ha gaghachiri, Pọl kwuru okwu n’ebe ahụ wee gwa ndị na-eso ụzọ Jizọs, sị: “Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.” (Ọrụ 14:8-22) Ị̀ ma ihe Pọl bu n’obi?— Ihe ọ na-ekwu bụ na ndị ọzọ ga na-akpagbu ndị na-efe Chineke. Pọl mechara degara Timoti akwụkwọ ozi, sị: ‘A ga-akpagbu ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke.’—2 Timoti 3:12; Jọn 15:20.

Mgbe Pọl na Banabas hapụrụ Listra, ha lara n’obodo ha. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, Pọl kpọọrọ Saịlas, ha abụọ wee soro gaghachi n’ebe dị iche iche Pọl gara na mbụ, ka ha wee gbaa ndị ọhụrụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ume. Mgbe ha rutere na Listra, obi tọrọ Timoti ụtọ nke ukwuu ịhụ Pọl ọzọ! Obi tọrọ Timoti ụtọ karị mgbe Pọl gwara ya ka o soro ya na Saịlas. Timoti kwetara. O nwere mmasị, dịkwa njikere ịga.—Ọrụ 15:40–16:5.

Ha atọ gawara. Ha ji ụkwụ gaa ọtụtụ kilomita, e mechaa, ha banyere n’ụgbọ mmiri. Mgbe ha pụtara n’ụgbọ ahụ, ha ji ụkwụ gaa Tesalọnaịka, nke dị na Gris. Ọtụtụ ndị ghọrọ Ndị Kraịst n’ebe ahụ. Ma, ndị ọzọ were iwe, ha wee zukọta ịlụso ha ọgụ. Pọl, Saịlas, na Timoti wee nọrọ n’ihe ize ndụ, ha wee gawa Beria.—Ọrụ 17:1-10.

Pọl nọ na-echegbu onwe ya banyere ndị nọ na Tesalonaịka bụ́ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge na-adịbeghị anya. O wee zighachi Timoti n’ebe ahụ. Ị̀ ma ihe mere o ji ziga ya?— Pọl mechara gwa Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka, sị: ‘Ka o mee ka unu guzosie ike, kasiekwa unu obi ka a ghara inwe onye ga-ada mbà.’ Ị̀ ma ihe mere Pọl ji ziga Timoti n’ebe ahụ dị ize ndụ, ọ bụ ezie na Timoti aghọbeghị dimkpa?— Ọ bụ maka na ndị mmegide ahụ amachaghị onye Timoti bụ, o nwekwara mmasị ịga. Nke ahụ chọrọ obi ike dị ukwuu! Olee ihe si na njem ahụ pụta? Mgbe Timoti laghachikwuuru Pọl, ọ kọọrọ Pọl otú ndị Tesalọnaịka si na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ihi ya, Pọl degaara ha akwụkwọ, sị: ‘A kasiwo anyị obi n’ihe metụtara unu.’—1 Ndị Tesalọnaịka 3:2-7.

Timoti na Pọl jere ozi ruo afọ iri. E mechaa, a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom. Timoti, bụ́ onye ka si n’ụlọ mkpọrọ pụta, gara ka ya na ya nọrọ. Ọ bụ mgbe ahụ Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ ka o degaara ndị Filipaị akwụkwọ ozi. Ọ ga-abụ Timoti deere ya akwụkwọ ozi ahụ. Pọl sịrị: ‘Enwere m olileanya izitere unu Timoti, n’ihi na enweghị m onye ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke ga-ejere unu ozi nke ọma karịa ya.’—Ndị Filipaị 2:19-22; Ndị Hibru 13:23.

Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ o kwuru tọrọ Timoti ụtọ nke ukwuu! Pọl hụrụ Timoti n’anya nke ukwuu n’ihi na Timoti nwere mmasị, dịkwa njikere ije ozi. Anyị nwere olileanya na ị ga-emekwa otú ahụ.

Ajụjụ:

Ebee ka Timoti nọ too, oleekwa ihe mere n’oge mbụ Pọl gara ebe ahụ?

Olee ihe Timoti mere mgbe Pọl gwara ya ka o soro ya na Saịlas gaa njem?

Olee otú Timoti si gosi na ya nwere obi ike, oleekwa ihe mere Pọl ji hụ ya n’anya nke ukwuu?

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọ̀ bụ gịnị mere?