Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Gịnị mere mmanụ na-esi ísì ụtọ nke Meri tere Jizọs ji dị oké ọnụ?
Ụbọchị ole na ole tupu Jizọs anwụọ, Meri, nwanne Lazarọs, “ji mkpọ̀ alabasta mmanụ nke na-esi ísì ụtọ bịa. Ọ bụ ezigbo mmanụ nad nke dị oké ọnụ.” Ọ wụrụ Jizọs mmanụ dị na ya. (Mak 14:3-5; Matiu 26:6, 7; Jọn 12:3-5) Oziọma Mak na Oziọma Jọn sịrị na ọnụ ego mmanụ a bụ narị dinarịọs atọ, ihe dị ka ego onye ọrụ ga-arụta n’otu afọ.
Olee ebe e si nweta mmanụ a dị oké ọnụ? Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ n’obere osisi (Nardostachys jatamansi) na-esi ísì ọma nke dị n’Ugwu Himalaya ka e si enweta mmanụ nad ma ọ bụ mmanụ spaịknad nke e kwuru okwu ya na Baịbụl. Ọtụtụ mgbe, a na-agwa mmanụ nad dị oké ọnụ ihe ọzọ ma ọ bụ ọbụna mepụta nke adịgboroja ya. Otú ọ dị, ma Mak ma Jọn kpọrọ ya “ezigbo mmanụ nad.” Ebe ọ bụ na mmanụ a na-esi ísì ụtọ dị oké ọnụ, ọ ga-abụ na o si n’ebe dị anya bụ́ India.
Gịnị mere akwụkwọ Mak ji kwuo na Meri “mepere mkpọ̀ alabasta ahụ”? A na-akpụ ọnụ mkpọ̀ alabasta ka ọ dị warara ka e wee nwee ike imechi ya nke ọma ka ísì ọma ya ghara ikupụ. Alan Millard kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Discoveries From the Time of Jesus, sị: “Ọ dị mfe ịhụ otú nwaanyị ahụ obi dị ụtọ si kụwaa [ọnụ mkpọ̀ mmanụ ahụ], o jighị nwayọọ meghee ya, ísì mmanụ ahụ wee kupụ otu mgbe.” Nke a na-eme ka anyị ghọta ihe mere ‘ísì mmanụ ahụ nke na-esi ísì ụtọ ji jupụta ụlọ ahụ.’ (Jọn 12:3) N’ezie, ọ bụ nnọọ onyinye dị oké ọnụ ahịa, ma, o kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị? Nwaanyị a ji onyinye a gosi na ya nwere ekele maka mkpọlite Jizọs kpọlitere nwanne ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Lazarọs, n’ọnwụ n’oge na-adịbeghị anya.—Jọn 11:32-45.
Ọ̀ bụ naanị otu Jeriko ka e nwere ka ọ̀ dị abụọ?
Matiu, Mak, na Luk dechara banyere otú Jizọs si gwọọ ndị mmadụ n’ebe dị nso na Jeriko. (Matiu 20:29-34; Mak 10:46-52; Luk 18:35-43) Ma Matiu ma Mak kwuru na Jizọs rụrụ ọrụ ebube a mgbe o si Jeriko “na-apụ.” Ma, Luk kwuru na Jizọs rụrụ ọrụ ebube a mgbe “ọ na-eru Jeriko nso.”
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ̀ bụ naanị otu obodo ka a na-akpọ Jeriko, ka ọ̀ dị abụọ? Akwụkwọ bụ́ Bible Then & Now zara, sị: “Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e wuola Jeriko ọhụrụ n’ebe dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita abụọ site n’ebe ndịda Jeriko ochie. Herọd Onye Ukwu wuru obí ọ na-anọ n’oge oyi n’ebe ahụ.” Akwụkwọ bụ́ Archaeology and Bible History kwadoro nke a mgbe o kwuru, sị: “Jeriko dị abụọ n’oge Jizọs nọ n’ụwa. . . . Isi na Jeriko nke ochie bụ́ nke ndị Juu gaa na nke ndị Rom erughị kilomita abụọ.”
Ya mere, ọ ga-abụ na Jizọs rụrụ ọrụ ebube ahụ mgbe o si na Jeriko nke ndị Juu na-apụ wee na-aga na nke ndị Rom, ma ọ̀ bụkwanụ ya abụrụ mgbe o si na Jeriko nke ndị Rom na-aga na nke ndị Juu. O doro anya na ịmara ihe ndị mere n’oge e dere akwụkwọ ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe yiri ka hà na-emegide ibe ha.
[Foto dị na peeji nke 31]
Mkpọ̀ alabasta mmanụ na-esi ísì ụtọ
Ebe E Si Nweta Foto]
© Réunion des Musées Nationaux/Art Resource, NY