Ịkasi Ndị Ọrịa Ha Na-anaghị Ala Ala Obi
Ịkasi Ndị Ọrịa Ha Na-anaghị Ala Ala Obi
“Mgbe mbụ m nụrụ na ọrịa mama m agaghị ala ala, o nyeghị m ọnụ okwu. O wutere m nke ukwuu, o siiri m ike ikweta na mama m m hụrụ n’anya na-aga ịnwụ.”—Grace, Canada.
MGBE e lere mmadụ ahụ́ wee chọpụta na ọrịa na-arịa ya agaghị ala ala, ọ na-ewute ma ndị ezinụlọ ya ma ndị enyi ya nke ukwuu, ha anaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme. Ụfọdụ nwere ike na-eche ma hà kwesịrị ịgwa onye ahụ ihe niile a chọpụtara na-arịa ya. Ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ma hà ga-edili ịhụ onye ha hụrụ n’anya ka ọ na-ata ahụhụ ma ghara inwe ike ime ihe ọ bụla n’onwe ya n’ihi ọrịa. Ihe na-echegbu ọtụtụ ndị bụ na ha amaghị ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ ihe ha ga-eme mgbe onye ahụ na-aga ịnwụ.
Olee ihe i kwesịrị ịmara banyere ihe ị ga-eme mgbe ị nụrụ ozi ọjọọ ahụ? Olee otú ị ga-esi bụrụ “ezi enyi” ma kasie ndị ọzọ obi, kwadookwa ha n’oge nsogbu a?—Ilu 17:17.
Otú Ọ Na-adị n’Ahụ́
Mgbe onye mmadụ hụrụ n’anya dara ọrịa, ọ na-akpasakarị onye ahụ uche. Ọbụna ndị dọkịta na-enwekarị nchegbu, ha anaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme iji nyere ndị ọrịa ha na-anaghị ala ala aka, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-anwụkarị n’ihu ha.
O nwekwara ike isiri gị ike ijiteli onwe gị mgbe ị hụrụ ka onye ị hụrụ n’anya na-ata ahụhụ. Hosa, bụ́ onye bi na Brazil nke nwanne ya nwaanyị rịara ọrịa na-anaghị ala ala, kwuru, sị, “Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya ịhụ onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu ka ahụ́ na-egbu ya mgbu mgbe niile.” Mgbe nwoke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Mozis hụrụ ka e tiri nwanne ya nwaanyị ekpenta, o tikuru Chineke, sị: Ọnụ Ọgụgụ 12:12, 13.
“Biko, Chineke! Biko, gwọọ ya!”—Ọrịa ndị anyị hụrụ n’anya na-arịa na-eme ka obi koro anyị n’elu n’ihi na e kere anyị n’onyinyo Chineke anyị nke nwere obi ọmịiko, bụ́ Jehova. (Jenesis 1:27; Aịzaya 63:9) Olee otú obi na-adị Jehova ma ndị mmadụ na-ata ahụhụ? Tụlee ihe Jizọs mere. Ọ kpara àgwà dị ka Nna ya n’ụzọ zuru okè. (Jọn 14:9) Mgbe Jizọs hụrụ ndị na-arịa ọrịa, “o nwere ọmịiko” n’ahụ́ ha. (Matiu 20:29-34; Mak 1:40, 41) Dị ka a kọwara n’isiokwu bu nke a ụzọ na magazin a, mgbe enyi Jizọs bụ́ Lazarọs nwụrụ, Jizọs hụrụ otú ọnwụ ya si wute ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya, o wee metụ ya n’ahụ́ nke ukwuu nke na “anya mmiri gbara” ya. (Jọn 11:32-35) N’ezie, Baịbụl kwuru na ọnwụ bụ onye iro ma kwe nkwa na, n’oge na-adịghị anya, ọrịa na ọnwụ agaghị adị ọzọ.—1 Ndị Kọrịnt 15:26; Mkpughe 21:3, 4.
Ọ bụghị ihe iju anya na i nwere ike ịchọ ịta mmadụ ụta mgbe ị nụrụ na onye ị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa na-agaghị ala ala. Ma, Dọkịta Marta Ortiz, bụ́ onye dere banyere otú a ga-esi na-elekọta ndị ọrịa ha na-anaghị ala ala, nyere ndụmọdụ, sị: “Atala ndị ọzọ ụta. Atala ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ma ọ bụ onwe gị ụta n’ihi ọrịa na-arịa onye ahụ. Naanị ihe nke ahụ ga-akpata bụ esemokwu, ọ ga-emekwa ka a ghara ilekwasị anya n’ihe kacha mkpa, ya bụ, mkpa onye ahụ ọrịa ya na-anaghị ala ala.” Olee ihe ndị i nwere ike ime iji nyere onye ị hụrụ n’anya aka idi ọrịa ya na ọnwụ chere ya ihu?
Lekwasị Anya n’Onye ahụ, Ọ Bụghị n’Ọrịa Ya
Ihe mbụ ị ga-eme bụ ileghara ihe ọrịa ahụ na-eme onye ahụ anya ma lekwasị anya n’onye ahụ. Olee otú i nwere ike isi mee nke a? Sarah, bụ́ nọọsụ, sịrị: “M na-ewepụta oge kirie foto onye ahụ na-arịa ọrịa sere mgbe ahụ́ dị ya. M na-ege ya ntị nke ọma mgbe ọ na-akọrọ m ihe ndị ọ mere n’oge gara aga. Nke a na-enyere m aka icheta otú onye ahụ si bie ndụ na ihe
ndị mere ná ndụ ya, ọ bụghị ọrịa ọ na-arịa ugbu a.”Anne-Catherine, onye bụkwa nọọsụ, kwuru otú o si ewepụ uche ya n’ọrịa na-arịa onye ahụ. Ọ sịrị: “M na-elegide onye ahụ anya ná mkpụrụ anya, obi m na-adị n’ihe m ga-eme ka ọrịa ya belata.” Akwụkwọ bụ́ The Needs of the Dying—A Guide for Bringing Hope, Comfort, and Love to Life’s Final Chapter kwuru, sị: “Ahụ́ anaghị eru mmadụ ala ịnọ na-ahụ onye ọ hụrụ n’anya nke ọrịa ma ọ bụ ihe mberede mere ka o nwee nkwarụ. Ihe kacha mma a ga-eme mgbe ọ dị otú ahụ bụ ilegide onye ahụ anya ná mkpụrụ anya ya wee cheta onye ọ bụ.”
N’eziokwu, nke a chọrọ njide onwe onye na mkpebi siri ike. Georges, bụ́ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, onye na-aga mgbe niile na-eleta ndị ọrịa ha na-anaghị ala ala, kwuru, sị, “Ịhụnanya anyị nwere n’ebe onye anyị na-arịa ọrịa nọ aghaghị isi ike karịa ọrịa ahụ.” Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’onye ahụ kama ilekwasị anya n’ọrịa ahụ, ọ ga-abara gị uru, baakwara onye ị hụrụ n’anya. Yvonne, bụ́ onye lekọtara ụmụaka ndị rịara ọrịa kansa, kwuru, sị, “Ịghọta na i nwere ike inyere ndị na-arịa ọrịa aka ka ahụ́ ruo ha ala ga-enyere gị aka idi ihe ọrịa ahụ na-eme ha n’ahụ́.”
Dị Njikere Ige Ntị
Ndị mmadụ anaghị enwecha mmasị ileta onye na-aga ịnwụ anwụ n’agbanyeghị na ha hụrụ ya n’anya nke ukwuu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha amaghị ihe ha ga-ekwu ekwu. Otú ọ dị, Anne-Catherine, bụ́ onye ọ na-adịbeghị anya o lekọtara otu enyi ya nke rịara ọrịa na-anaghị ala ala, kwuru na ọ dịghị njọ ịgbachi nkịtị mgbe ụfọdụ. Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka anyị ji akasi ha obi, anyị jikwa omume anyị eme otú ahụ. Iburu oche nọdụ ala, ịbịa ha nso na ijide ha aka, ibe ákwá mgbe ha gwara anyị otú obi dị ha—ha niile na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya”
O nwere ike ịbụ na onye ị hụrụ n’anya chọrọ ikwu otú ọ dị ya n’obi n’ezoghị ọnụ. Ma, mgbe mgbe, onye na-arịa ọrịa maara na ndị na-elekọta ya na-echegbu onwe ha, n’ihi ya, ha na-ahapụ ikwu ihe ndị dị mkpa gbasara onwe ha. Ndị enyi na ndị ezinụlọ onye na-arịa ọrịa nwekwara ike ghara ikwu ihe ndị dị onye ọrịa ahụ mkpa, ọbụna na-ezochiri ya ihe ndị dị mkpa banyere ọrịa ahụ na-arịa ya. Gịnị ka ịgba nkịtị a na-arụpụta? Otu dọkịta nke na-agwọ ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala kwuru na mgbalị a na-eme iji zochiere ha eziokwu “na-eme ka e gbuo oge a gaara eji nyere onye ọrịa ahụ aka ịghọta ọrịa na-arịa ya na idi ihe bịaara ya.” Ya mere, ọ bụrụ na onye ahụ na-arịa ọrịa chọrọ ikwu banyere ọrịa ya na ọnwụ chere ya ihu, e kwesịrị ịhapụ ya ka o kwuo otú ọ dị ya n’obi.
Mgbe ọnwụ chere ndị ohu Chineke ihu n’oge ochie, ha na-agwa Jehova bụ́ Chineke nchegbu ndị ha na-enwe. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Hezekaya, bụ́ onye dị afọ iri atọ na itoolu, nụrụ na ya ga-anwụ, o kwupụtara otú obi si daa ya mbà. (Aịzaya 38:9-12, 18-20) N’otu aka ahụ, e kwesịrị ịhapụ ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala ka ha kwuo otú o si na-ewute ha na ha agaghị adịte ndụ aka. Ikekwe, ọ na-ewute ha na ihe ndị ha chọrọ ime ná ndụ, dị ka ime njem, inwe ezinụlọ nke ha, ịhụ ka ụmụ ụmụ ha tolitere, itinyekwu oge n’ife Chineke, agaghị enwekwa isi. O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụ ha na ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha ga-agbara ha ọsọ maka na ha amaghị ihe ha ga-eme eme. (Job 19:16-18) Ụjọ ịta ahụhụ, ịtụ ụjọ na ahụ́ ha agakwaghị arụ ọrụ nke ọma, ma ọ bụ ụjọ ịnwụ n’enweghị onye na-abịa ha nso nwere ike ịdị na-echegbu ha.
Anne-Catherine sịrị: “Ọ dị mkpa ka ị hapụ onye gị na-arịa ọrịa ka o kwuo ihe dị ya n’obi, n’anapụghị ya okwu n’ọnụ ma ọ bụ mawa ya ikpe ma ọ bụ gwawa ya na o kwesịghị ịtụ ụjọ. Ọ bụ ụzọ kacha mma ị ga-esi mara otú obi dị
ya, ghọtakwa ihe ọ chọrọ, ihe na-echegbu ya na ihe ọ na-atụ anya ya.”Ghọta Ihe Ndị Kacha Ha Mkpa
Ọnọdụ onye gị na-arịa ọrịa, bụ́ nke nwere ike ịka njọ mgbe ọgwụ na-akpa ya ike n’ahụ́, nwere ike inye gị nsogbu nke ukwuu nke na i nwere ike ichefu otu n’ime ihe kacha onye ọrịa ahụ mkpa. Mkpa ahụ bụ onye ọrịa inwe ike imere onwe ya mkpebi.
N’ebe ụfọdụ, ndị ezinụlọ onye na-arịa ọrịa nwere ike ịnwa ichebe ya site n’izochiri ya ihe bụ́ eziokwu banyere ọrịa ya, ọbụna ruo n’ókè nke imere ya mkpebi banyere ụdị ọgwụ a ga na-enye ya. N’ebe ndị ọzọ, e nwere ike inwe ụdị nsogbu ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu nwoke bụ́ nọọsụ, nke aha ya bụ Jerry, kwuru, sị, “Mgbe ụfọdụ, ndị bịara ileta onye na-arịa ọrịa na-eguzo n’akụkụ ebe o dina na-ekwu ihe masịrị ha banyere onye ahụ, dị ka à ga-asị na ọ nọghị n’ebe ahụ.” Nke ọ bụla n’ime omume abụọ a na-eme ka ahụ́ ghara iru onye ọrịa ala.
Olileanya bụ ihe ọzọ dị onye ọrịa oké mkpa. Ná mba ụfọdụ bụ́ ebe a na-eleta ndị ọrịa anya nke ọma, ime ka ha nwee olileanya so n’ihe dị mkpa a na-elebara anya mgbe a na-agwọ ha. Michelle, bụ́ onye lekọtara mama ya ugboro atọ ọrịa kansa rịara ya, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mama m achọọ ile ma à ga-agwọ ya n’ebe ọzọ ma ọ bụ ka ọ hụ dọkịta ọzọ, m na-enyere ya aka chọta ebe ọ ga-abụ. Aghọtala m na ekwesịghị m iche na a ga-agwọta ya ozugbo kama na m kwesịrị ịdị na-ekwu okwu ndị ga na-agba ya ume.”
Ọ̀ bụrụkwanụ na olileanya adịghị na a ga-agwọta ya? Cheta na ọ dị onye na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala mkpa ka a gwa ya na ọ gaghị agbake n’ọrịa ya. Georges, bụ́ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke e kwuru banyere ya na mbụ, sịrị: “Ọ dị nnọọ mkpa ka a ghara izochiri onye ahụ na ọ na-aga ịnwụ. Nke a ga-eme ka onye ahụ na-arịa ọrịa hazie ihe ndị dị mkpa ma jikere maka ọnwụ ya.” Njikere a ga-eme ka onye ahụ na-arịa ọrịa mechapụ ihe ndị ọ chọrọ ime, meekwa ka ọ ghara ichegbu onwe ya na ya ga-aghọrọ ndị ọzọ ibu arọ.
N’eziokwu, ikwurịta ihe ndị a adịghị mfe. Ma, ọ na-eme ka mmadụ nwee ohere ikwu ihe dị n’ala ala obi ya. Onye ahụ na-aga ịnwụ nwere ike ịchọ idozi okwu ya na mmadụ sere, ikwu ihe ndị na-ewute ya, ma ọ bụ ịrịọ mgbaghara. Mkparịta ụka a nwere ike ime ka gị na onye ahụ dịrị ná mma karịa otú unu dị na mbụ.
Ịkasi Onye ahụ Obi Ụbọchị Ole na Ole Tupu Ya Anwụọ
Olee otú i nwere ike isi kasie onye na-aga ịnwụ anwụ obi? Dọkịta Ortiz, onye e kwuru banyere ya na mbụ, sịrị: “Hapụ onye ahụ na-arịa ọrịa ka o kwuo ihe ikpeazụ ọ chọrọ ka e meere ya. Gee ya ntị nke ọma. Ọ bụrụ na o kwere omume, meere ya ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe omume imere ya ihe niile ọ chọrọ, gwa ya eziokwu.”
O nwere ike ịdị onye ahụ na-aga ịnwụ anwụ mkpa n’oge ọ na-aga ịnwụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka ya na ndị dị ya oké mkpa ná ndụ na-akparịta. Georges kwuru, sị, “Nyere onye ahụ na-aga ịnwụ anwụ aka ka ya na ha kwurịta okwu, ọ bụrụgodị na ha kwurịtara okwu obere oge maka na onye ahụ na-arịa ọrịa enwekwaghị ume.” Ọ bụrụgodị naanị na telefon ka ha kwurịtara okwu, ọ ga-eme ka ha gbarịta onwe ha ume ma kpekọọ ekpere ọnụ. Christina, nwaanyị Canada, bụ́ onye mmadụ atọ ọ hụrụ n’anya nwụrụ, nke a nwụpụ, nke ọzọ anwụọ, kwuru, sị, “Mgbe ọnwụ ha ruwere nso, ihe nyeere ha aka bụ ekpere Ndị Kraịst ibe ha kpeere ha.”
Ì kwesịrị ịtụ ụjọ ibe ákwá n’ihu onye ị hụrụ n’anya? Mba. Ọ bụrụ na i bee ákwá, ọ ga-eme ka onye ahụ na-aga ịnwụ anwụ nwee ohere ịkasi gị obi. Akwụkwọ bụ́ The Needs of the Dying kwuru, sị: “Ọ bụ ihe na-agba ume nke ukwuu ma ọ bụrụ na onye na-aga ịnwụ anwụ akasie mmadụ obi, ọ ga-enyekwara ya aka nke ukwuu.” Ọ bụrụ na onye ọrịa akasie ndị ọzọ obi, ọ na-eme ka obi ruo ya ala na ya rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ dị ka ezigbo enyi, ezigbo nna ma ọ bụ ezigbo nne.
O doro anya na ihe ụfọdụ nwere ike ime ka gị Job 14:14, 15; Ọrụ 24:15.
na onye ị hụrụ n’anya ghara ịnọkọ n’oge ọ na-aga ịnwụ. Ma, ọ bụrụ na i nwee ike ịga n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ n’ụlọ enyi gị nke na-aga ịnwụ anwụ ka ị nọnyere ya, gbalịa ka i jide ya n’aka ruo mgbe o kubiri. Oge a ọ na-anwụ nwere ike inye gị ohere ikwu ihe ndị dị gị n’obi ọ na-agaghị enwe mgbe ọzọ ị gaara ekwu ha. Ọ bụrụgodị na onye ahụ anaghịzi ekwuli okwu, ekwela ka nke a mee ka ị ghara ịgwa ya na ị hụrụ ya n’anya nakwa na i nwere olileanya na gị na ya ga-ahụ ọzọ mgbe o bilitere n’ọnwụ.—Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a tupu onye ahụ anwụọ, o nwere ike ị gaghị akwa mmakwaara mgbe e mechara. N’ezie, oge a na-agbawa obi nwere ike ịkasi gị obi mgbe ọ bụla i chetara ya. Ime nke a ga-egosi n’ezie na ị bụ ezi enyi ‘n’oge nsogbu.’—Ilu 17:17.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]
Ilekwasị anya n’onye ahụ kama ilekwasị anya n’ọrịa na-arịa ya, ga-abara gị uru, baakwara onye ị hụrụ n’anya
[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]
Otú Ị Ga-esi Kwanyere Onye Na-arịa Ọrịa Ùgwù
N’ọtụtụ mba, a na-agba mbọ ka a kwanyere ndị ọrịa ha na-anaghị ala ala ùgwù ruuru ha, nke bụ́ ịnwụ n’obi iru ala. Ihe onye ọrịa dere n’akwụkwọ mgbe ọrịa ya na-adịbeghị oké njọ nwere ike ime ka a kwanyere ya ùgwù ruuru ya, meekwa ka a hapụ ya ka ọ nọrọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa nwụọ.
Akwụkwọ e dere mgbe ọrịa na-adịbeghị oké njọ ga-eme ihe ndị a:
• Ọ ga-eme ka gị na ndị ikwu gị na ndị dọkịta ghara inwe nghọtahie
• Ọ ga-eme ka ndị ezinụlọ gị ghara ịbịa kpebiwe ihe a ga-eme
• Ọ ga-eme ka a ghara ịga mefuwe oké ego, chọwa ọgwụ na-akpa ike n’ahụ́ bụ́ nke na-adịghị mkpa
Ihe ndị na-esonụ ga-adịrịrị n’akwụkwọ e dere mgbe ọrịa na-adịbeghị oké njọ:
• Aha onye ị chọrọ ka ọ na-ekpebi otú a ga-esi na-agwọ gị
• Ụdị ọgwụgwọ ị ga-anabata na nke ị na-agaghị anabata mgbe ị na-amakwaghị ihe na-emenụ
• Ọ bụrụ na o kwe omume, aha dọkịta maara ihe ndị ị chọrọ
[Foto dị na peeji nke 26]
Cheta otú onye ahụ si bie ndụ na ihe ndị mere ná ndụ ya, ọ bụghị ọrịa ọ na-arịa ugbu a