Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdachi nke Dakwasịrị Solomon Islands

Ọdachi nke Dakwasịrị Solomon Islands

Ọdachi nke Dakwasịrị Solomon Islands

Na Monday, April 2, 2007, nnukwu ala ọma jijiji mere n’ebe dị iche iche na Solomon Islands, bụ́ agwaetiti a na-enwekarị okpomọkụ na ya nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Australia. N’ime nkeji ole na ole, nnukwu ebili mmiri a sịrị na o ruru mita iri n’ịdị elu nubatara n’agwaetiti ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ obodo ahụ, gbuo mmadụ iri ise na abụọ, bibiekwa ụlọ puku mmadụ isii.

Otu n’ime ebe ndị ọ kacha kpaa aka ọjọọ bụ Gizo, bụ́ otu obodo dị n’akụkụ oké osimiri nke puku mmadụ asaa bi, nke dị n’Agwaetiti Ghizo, bụ́ ebe dị naanị kilomita iri anọ na ise site n’ebe ala ọma jijiji ahụ malitere. Otu ntakịrị ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị na Gizo nọ na-akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ha ga-echeta ná mgbede ahụ dị ka a na-eme kwa afọ. (1 Ndị Kọrịnt 11:23–26) Chi ụbọchị ahụ bọrọ nke ọma. Anyanwụ wara nke ọma, oké osimiri dị n’ebe ahụ dịkwa jụụ. Ma, mgbe o ji nkeji iri atọ na itoolu gafee elekere asaa n’ụtụtụ ahụ, ala ọma jijiji ahụ malitere.

Ala Ọma Jijiji!

Ron Parkinson, bụ́ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, na nwunye ya, bụ́ Dorothy, nọ na-esi nri ụtụtụ mgbe ala ọma jijiji ahụ malitere. Ron sịrị: “Ụlọ anyị nọ na-aṅagharị dị ka osisi akị Bekee, ma, ọ daghị. Mkpọtụ nọ na-eme ebe niile. Kọbọd, oche, efere, piano, na ngwongwo ndị ọzọ dị n’ụlọ anyị kụrichara n’ala. Anyị jisiri ike gbapụ n’èzí. Dorothy zọnyere ụkwụ nkịtị n’enyo kụwasịrị akụwa wee meruo ahụ́.”

Tony na Christine Shaw, bụ́ ndị bi nso, gbapụtakwara n’èzí. Di na nwunye a si n’ala ha gaa ná mba a ikwusa ozi ọma. Christine sịrị: “Ala mara jijiji nke ukwuu nke na adara m n’ala, enweghịkwa m ike ibilite. Ụlọ ndị mmadụ dịcha n’elu oké osimiri. Ọ bụ nnukwu ebili mmiri bupụrụ ụlọ ndị ahụ. Ndị mmadụ ji ụgbọ epeepe na-achọgharị ndị ka dị ndụ n’etiti ngwongwo niile dị n’elu oké osimiri. E mechaa, nnukwu ala ọma jijiji ọzọ mere—ọzọ emeekwa. Ala ọma jijiji nọgidere na-eme ruo abalị ise. Ọ bụghị ihe e ji ọnụ akọ!”

Ala Ọma Jijiji Mekwara n’Oké Osimiri

Patson Baea nọ n’ụlọ ya dị n’agwaetiti Sepo Hite, nke dị ihe dị ka kilomita isii site na Gizo, mgbe ala ọma jijiji ahụ mere. Olee ihe mere Patson na ezinụlọ ya n’oge ọdachi a?

Lee ihe Patson chetara banyere ọdachi ahụ: “M ji ọsọ gbakwuru nwunye m, bụ́ Naomi, na ụmụ anọ anyị n’ikpere mmiri. Ala ọma jijiji ahụ kwaturu ha n’ala, ma, ọ dịghị ihe mere ha. Ahụ́ nọ na-ama ụmụ anyị jijiji, ụfọdụ n’ime ha nọkwa na-ebe ákwá. Mụ na Naomi kasiri ha obi ozugbo.

“Achọpụtara m na otú oké osimiri si na-enugharị adịghị mma. O doro anya na ala ọma jijiji chọrọ ime n’oké osimiri. O yiri ka mmiri ọ̀ ga-ekpuchi obere agwaetiti ahụ anyị bi. Mama m, bụ́ Evalyn, onye bi n’otu obere àgwàetiti nke dị nso, nọkwa n’ihe ize ndụ. Agwara m ndị ezinụlọ m ozugbo ka ha banye n’ụgbọ epeepe anyị nwere njin, anyị wee gawa ịzọpụta ya.

“Mgbe anyị na-agatebeghị aka, nnukwu ebili mmiri si n’okpuru ụgbọ epeepe anyị kwofere. Oké osimiri ahụ malie, ya amada. Mgbe anyị garuru n’ebe mama m bi, egwu ji ya, ọ maghịkwa ihe ọ ga-eme eme. Ụjọ ekweghịkwa ya bata na mmiri. Naomi na Jeremy, bụ́ nwa anyị nwoke dị afọ iri na ise, mabara na mmiri ahụ na-ekwo ekwo wee nyere ya aka ka o gwuru mmiri bata n’ụgbọ epeepe anyị. Mgbe ahụ, anyị nyesiri ụgbọ anyị ọkụ ike, wee banye n’etiti oké osimiri.

“N’oge ahụ, mmiri dị n’oké osimiri tara nke ukwuu nke na a na-ahụzi ihe ndị dị n’ala oké osimiri anya na gburugburu agwaetiti ndị ahụ. Ma, na mberede, nnukwu ebili mmiri nubatara n’ike, mmiri wee kpuchie agwaetiti abụọ ahụ. O bibisịrị ụlọ anyị rụrụ n’ihu oké osimiri maka ndị ọbịa nke na a gaghị arụtali ya ọzọ. Mmiri ahụ nubakwara n’ụlọ obibi anyị, mebisịa ọtụtụ ngwongwo anyị. Mgbe oké osimiri ahụ dajụrụ, anyị wepụtara Baịbụl anyị na akwụkwọ abụ anyị wee gawa Gizo.”

Ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n’ikpere mmiri, ọtụtụ ihe lakwara n’iyi n’ebe ahụ. Ebe ọdachi ahụ kacha kpaa aka ọjọọ bụ ebe ọdịda anyanwụ nke Agwaetiti Ghizo. Ọ dịkarịa ala, ebili mmiri a sịrị na ọ dị ihe dị ka mita ise n’ịdị elu bibiri obodo nta iri na atọ, bibie ha kpamkpam!

N’abalị ahụ, mmadụ iri abụọ na abụọ zukọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị na Gizo iji cheta Ọnwụ Jizọs. Ọ bụ ihe obi ụtọ na o nweghị onye ọ bụla n’ime ha ọdachi ahụ merụrụ ahụ́ nke ukwuu. Ron, onye e kwuru banyere ya na mbụ, sịrị: “Ọkụ eletrik adịghị, ihe ọkụ anyị kụwachakwara akụwa. N’ihi ya, Nwanna Shaw ji ọkụ tọọchị kwuo okwu si na Baịbụl. Ọ bụ ezie na anyị nọ n’ọchịchịrị, anyị ji olu anyị dum bụkuo Jehova abụ ekele.”

Ikesa Ihe Enyemaka

Mgbe ndị nọ na Honiara, bụ́ isi obodo ahụ, nụrụ banyere ọdachi ahụ, alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova mere mgbalị ngwa ngwa ịhụ na e bugaara ndị ahụ ihe enyemaka. Ha kpọrọ telefon wee mata na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o nweghị ihe mere Ndịàmà niile bi n’ebe ndị ahụ. E dupụrụ ndị aka siri ike ka ha gaa chọọ otu nwaanyị naanị ya bụ Onyeàmà n’Agwaetiti Choiseul. E mechara chọta ya, o nweghịkwa ihe mere ya. E zigakwara ego na Gizo iji zụọ ihe ndị a ga-ebugara ndị ahụ ọdachi dakwasịrị.

Ndị si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova so ụgbọelu mbụ gara n’ebe ahụ wee rute Gizo na Thursday. Craig Tucker, onye so na Kọmitii Na-elekọta Alaka ahụ, sịrị: “Anyị bu ọtụtụ igbe a kwajuru ihe enyemaka. Obi tọrọ anyị ụtọ na igbe anyị niile rutere n’enweghị ihe mere ha, ọ bụ ezie na ndị ọzọ so ụgbọelu ahụ nwere ibu ha ndị a na-ebuteghị n’ihi na ụgbọelu ahụ agaghị ebutecha ha niile. Ihe enyemaka ndị anyị butere so na ndị nke mbụ rutere n’ebe ahụ ọdachi mere. Mgbe abalị abụọ gachara, e ji ụgbọ mmiri bute ihe enyemaka ndị ọzọ.”

Ka nke ahụ na-eme, Tony Shaw na Patson Baea, na Ndịàmà ndị ọzọ si Gizo, ji ụgbọ epeepe gaa njem awa abụọ iji nyere Ndịàmà naanị ha bi n’agwaetiti Ranongga aka. Ala ọma jijiji ahụ nulitere agwaetiti a elu, nke dị kilomita iri atọ na abụọ n’ogologo na kilomita asatọ n’obosara, ya ejirizie mita abụọ dị elu karịa oké osimiri ahụ! Ọ ga-abụ na mmiri ahụ nke pụrụ na mberede n’ebe o kwesịrị ịdị mere ka ala ọma jijiji mee n’oké osimiri wee kpaa agwaetiti ndị gbara ya gburugburu aka ọjọọ.

Tony kwuru, sị, “Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ nwere ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ anyị. Ọ dịghị ihe mere ha, ahụ́ sikwara ha ike. Ha bi n’èzí n’ihi na ụjọ ji ha na ala ọma jijiji ka nwekwara ike ime. Ụgbọ mmiri anyị bụ nke mbụ butere ihe enyemaka. Tupu anyị alaa, anyị na ha ji obi anyị niile kpekuo Jehova ekpere wee kelee ya.”

Patson kwuru, sị: “Ka ọtụtụ ụbọchị gachara, anyị gaghachiri Ranongga iji wegakwuoro ha ihe enyemaka na iji chọọ otu ezinụlọ Ndịàmà ndị bi n’otu agwaetiti dị n’ime ime. Anyị mechara chọta Matthew Itu na ezinụlọ ya ka ha nọ n’ime ime ọhịa. Ha bere ákwá n’ihi obi ụtọ ha nwere na anyị echefughị ha! Ala ọma jijiji ahụ bibiri ụlọ ha nakwa ọtụtụ ụlọ ndị dị n’obodo ha. Ma, ihe kacha ha mkpa bụ ka e wetara ha Baịbụl n’otu n’otu n’ihi na nke ha furu mgbe ọdachi ahụ mere.”

Ndị Mmadụ Ajaa Ndịàmà Mma

Ndị ọzọ hụrụ ịhụnanya ahụ Ndị Kraịst gosiri ibe ha. Craig Tucker kwuru, sị, “Otu onye nta akụkọ katọrọ otú e si kesaa ihe enyemaka, ma, ọ tụrụ ya n’anya, masịkwa ya mgbe ọ nụrụ na Ndịàmà Jehova bugaara ndị ibe ha nri, ihe ha ga-eji kpuchie ngwongwo ha, tinyere ihe ndị ọzọ dị ha mkpa, n’ime ụbọchị ole na ole ala ọma jijiji ahụ mere.” Patson kwuru, sị, “Ndị bi na Ranongga kwuru okwu ọma banyere otú anyị si kesaa ihe enyemaka ngwa ngwa, ha mekwara mkpesa na ndị chọọchị ha enyereghị ha aka.” Otu nwaanyị kwuru, sị, “Ndị ọgbakọ unu gbataara unu ọsọ enyemaka n’egbughị oge!”

Ndịàmà nyekwaara ndị agbata obi ha aka. Christine Shaw kọrọ, sị, “Mgbe anyị gara n’ụlọ ọgwụ e wuru na Gizo iji gwọọ ndị merụrụ ahụ́ n’ọdachi ahụ, anyị hụrụ otu di na nwunye anyị ziri ozi ọma n’oge na-adịbeghị anya. Ha abụọ merụrụ ahụ́, ọdachi ahụ gbawakwara ha obi nke ukwuu. Mmiri bunaara nwaanyị ahụ nwa nwa ya mgbe ala ọma jijiji mere n’oké osimiri. Anyị lara n’ụlọ ozugbo gaa wetara ha nri na ákwà. Ha nwere obi ekele nke ukwuu.”

N’ezie, ihe dị ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha dakwasịrị mkpa abụghị naanị ihe oriri na ákwà. Ihe kacha ha mkpa bụ nkasi obi nke naanị Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, na-enye. Ron kwuru, sị, “Ụfọdụ ndị ụkọchukwu nọ na-asị na Chineke ji ọdachi ahụ taa ndị mmadụ ahụhụ n’ihi mmehie ha. Ma, anyị ji Baịbụl gosi ha na ihe ọjọọ esighị n’aka Chineke. Ọtụtụ ndị kelere anyị maka iji Okwu Chineke kasie ha obi.”—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4; Jems 1:13. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 Gụọ isiokwu bụ́ “‘Why?’—Answering the Hardest of Questions,” na Teta! (Bekee) nke November 2006, peeji nke 3 ruo nke 9. E kesara ọtụtụ narị Teta! a na Gizo mgbe ọdachi a mechara.

[Ihe Osise/Map dị na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Choiseul

Ghizo

Gizo

Ranongga

HONIARA

AUSTRALIA

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe ndị ezinụlọ Baea nọ n’ụgbọ epeepe ha nwere njin

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọ bụ naanị Ụlọ Nzukọ Alaeze a bụ ụlọ na-ebibighị na Lale, n’Agwaetiti Ranongga

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihe ndị ala ọma jijiji ahụ mere n’oké osimiri mebiri na Gizo