Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ò Ji Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Ata Ndị Mmadụ Ahụhụ?

Chineke Ò Ji Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Ata Ndị Mmadụ Ahụhụ?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Chineke Ò Ji Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Ata Ndị Mmadụ Ahụhụ?

Chineke anaghị eji ọdachi ndị na-emere onwe ha ata ndị mmadụ ahụhụ. O metụbeghị ya, o nweghịkwa mgbe ọ ga-eme ya. N’ihi gịnị? N’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya,” dị ka Baịbụl kwuru na 1 Jọn 4:8.

Ọ bụ ịhụnanya na-akpali Chineke ime ihe niile ọ na-eme. Ịhụnanya anaghị eme ndị aka ha dị ọcha ihe ọjọọ, n’ihi na Baịbụl kwuru na “ịhụnanya adịghị eme onye agbata obi mmadụ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 13:10) Baịbụl kwuru na Job 34:12, sị: “N’eziokwu, Chineke adịghị eme ihe ọjọọ.”

N’eziokwu, Baịbụl buru amụma na a ga-enwe ọdachi ndị dị ka “oké ala ọma jijiji” n’oge anyị a. (Luk 21:11) Ma, ọ bụghị Jehova na-akpata ọdachi ndị ha na-eweta otú ahụ ọ na-abụghị onye na-ekwu otú ihu igwe ga-adị na-akpata ajọ ifufe ndị ọ na-ekwu na a ga-enwe. Ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha, gịnị na-akpata ya?

Baịbụl kwuru na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ,” ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ọ bụ ogbu mmadụ malite mgbe o nupụrụ isi n’oge ụmụ mmadụ malitere ịdị ndụ ruo n’oge anyị a. (Jọn 8:44) Setan weere ndụ ụmụ mmadụ dị ka ihe na-abaghị uru na ihe na-enweghị isi. Ọ bụ oké ọchịchọ mere o ji eme ihe niile ọ na-eme, ka a sịkwa ihe mere o ji mee ka ịchọ ọdịmma onwe onye naanị jupụta n’ụwa. Ihe e ji mara ụwa oge anyị a bụ ndị mmadụ irigbu ibe ha nke na ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-ebi n’ebe ndị dị ize ndụ, n’ebe ọdachi ndị na-emere onwe ha na nke ndị mmadụ na-akpata na-eme. (Ndị Efesọs 2:2; 1 Jọn 2:16) Ya mere, ọ bụ ụmụ mmadụ ndị anyaukwu na-akpata ụfọdụ ọdachi ndị na-adakwasị ndị mmadụ. (Ekliziastis 8:9) Olee otú o si bụrụ otú ahụ?

Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụmụ mmadụ so na-akpata ọtụtụ ọdachi ndị na-emenụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ọdachi ndị dakwasịrị ndị bi n’obodo New Orleans, U.S.A., mgbe oké ifufe mere ka mmiri tochie obodo ahụ, ma ọ bụ mgbe apịtị na-asọ asọ kwatusịrị ụlọ ndị dị n’akụkụ ugwu dị n’ikpere osimiri na Venezuela. N’ebe ndị ahụ nakwa n’ebe ndị ọzọ, ihe ndị na-emere onwe ha, dị ka ikuku na mmiri ozuzo, kpatara ọdachi n’ihi na ụmụ mmadụ amaghị ihe ndị na-eme n’ógbè ha, ha rụrụ ihe ndị ha na-ekwesịghị ịrụ, ghara ime ezi atụmatụ, ghara ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị, tinyere ihe ndị ọchịchị na-emehie.

Lebagodị anya n’ọdachi mere n’oge ochie. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, otu ụlọ elu dara na mberede wee gbuo mmadụ iri na asatọ. (Luk 13:4) Ma ọ́ bụghị ihe ụmụ mmadụ mehiere kpatara ya, ya abụrụ “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya,” ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ha abụọ kpatara ya. Ma otu ihe e ji n’aka bụ na ọ bụghị Chineke kpatara ya.—Ekliziastis 9:11.

Ò nwetụla ọdachi ndị Chineke wetara? Ee. Ma, ha adịghị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ ndị ụmụ mmadụ na-akpata n’ihi na ọdachi ndị ahụ egbughị ndị mmadụ aghara aghara, o nwekwara ihe mere o ji weta ha, ọ na-esikwa ike tupu ha emee. Ihe atụ abụọ e nwere bụ Iju Mmiri nke mere n’ụwa dum n’oge nna ochie bụ́ Noa nakwa mbibi e bibiri Sọdọm na Gọmọra n’oge Lọt. (Jenesis 6:7-9, 13; 18:20-32; 19:24) Amamikpe abụọ ahụ ndị si n’aka Chineke bibiri ndị ajọ omume na-enweghị nchegharị, ma, o gbughị ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya Chineke.

N’eziokwu, ọ masịrị Jehova bụ́ Chineke ime ka ahụhụ niile kwụsị na idozi nsogbu niile ọdachi ndị na-emere onwe ha kpatara, o nwekwara ike ọ ga-eji mee ya. Abụ Ọma 72:12 buru amụma banyere Jizọs Kraịst bụ́ Eze nke Chineke họpụtara, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka.”