Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọṅụ M Nwere n’Ime Uche Chineke Kemgbe Ndụ M

Ọṅụ M Nwere n’Ime Uche Chineke Kemgbe Ndụ M

Ọṅụ M Nwere n’Ime Uche Chineke Kemgbe Ndụ M

Dị ka Bill Yaremchuk si kọọ

Na March 1947, anọ m na-aga Singapore bụ́ ebe e kenyere m ka m gaa kwusaa ozi ọma. M ka gụchara akwụkwọ naanị izu ole na ole na klas nke asatọ nke ụlọ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bụ́ Watchtower Bible School of Gilead, nke dị na South Lansing, New York, U.S.A., n’oge ahụ.

Ọ BỤ mụ na Dave Farmer, onye Canada ibe m nke gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead na klas nke asaa, ga-arụkọ ọrụ n’ebe ahụ. Anyị nọ na San Francisco, California, banye ụgbọ mmiri a na-akpọ Marine Adder, nke e jibu alụ agha.

Ebe mbụ ụgbọ mmiri ahụ kwụsịrị n’Eshia bụ Hong Kong. Ihe anyị hụrụ n’ebe ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Anyị hụrụ otú Agha Ụwa nke Abụọ si kpaa ndị mmadụ aka ọjọọ n’ebe niile ahụ—ndị mmadụ tọgbọ n’akụkụ ụzọ, na-achọ ịnwụ n’agụụ. Ọ dịghị anya, anyị banyeghachiri n’ụgbọ wee gawa Manila, bụ́ isi obodo Philippines.

Anyị hụkwara ike agha ahụ kpara n’ebe ahụ. Ákwà ụgbọ mmiri nke ụgbọ mmiri ndị ụgbọelu United States na ndị òtù ha tụrụ bọmbụ juru ebe niile n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, ụnwụ dịkwa ebe niile. Anyị hụrụ Ndịàmà Jehova ole na ole n’ebe ahụ, bụ́ ndị kpọọrọ anyị gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ha nwere obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ha.

Ebe ọzọ ụgbọ mmiri anyị kwụsịrị bụ Batavia, (nke bụ́ Jakarta ugbu a) n’Indonesia. Ndị obodo ahụ na ibe ha na-alụ agha, ebe ha na-alụ agha adịghị anya n’ebe anyị kwụsịrị, n’ihi ya, e kweghị ka anyị pụta n’ụgbọ mmiri ahụ. Mgbe anyị gawaziri Singapore, m malitere iche ihe anyị ga-ahụ n’ebe ahụ. Ọ̀ bụzi otú a ka mba ndị dị n’Eshia dị, bụ́ ndị anyị na-agụ akụkọ ọma banyere ha n’akwụkwọ?

N’ime abalị ole na ole, akwụsịrị m inwe obi abụọ. Ihe ndị na-aga ime ga-eme ka o doo mụ na Dave anya na Chineke kwadoro ozi anyị na-aga ije.

Otú E Si Hapụ Anyị Ka Anyị Nọrọ

Mgbe ihe dị ka otu ọnwa anyị hapụrụ San Francisco gachara, ụgbọ mmiri anyị kwụsịrị na St. John’s Island, bụ́ ebe ụgbọ mmiri na-akwụsịtụ ruo mgbe e nyere ya ikike ịbata Singapore. Ndị na-ahụ maka ndị na-abata n’obodo ahụ batara n’ụgbọ mmiri ahụ ka ha hụ ndị ụgbọ ahụ bu, ha suru stampụ e dere “E nyela Gị Ikike Ịbata” n’akwụkwọ ikike ngafe anyị. N’ụtụtụ echi ya, ụgbọ mmiri anyị kwụsịrị n’ọdụ ụgbọ mmiri ha. Mgbe otu onye na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ lechara akwụkwọ anyị anya, ọ gwara anyị ka anyị pụtawa.

N’echi ya, anyị gaghachiri n’ebe ụgbọ mmiri ahụ dọ ka anyị sị ndị ibe anyị na-aga ikwusa ozi ọma n’ebe ọzọ gaa nke ọma. Ha na-aga India na Ceylon (nke bụ́ Sri Lanka ugbu a). Mgbe onye na-anya ụgbọ mmiri ahụ hụrụ anyị, ọ gbadatara n’ebe ahụ ụgbọ mmiri ahụ dọ wee bịakwute anyị. Iwe ji, ya wee baara anyị mba na anyị ekwesịghị isi n’ụgbọ ahụ gbadata. Onyeisi ndị na-ahụ maka ndị na-abata n’obodo ahụ, bụ́ Maazị Haxworth, ebularị ụzọ nye ya iwu ka ọ ghara ikwe ka anyị pụta n’ụgbọ ahụ ma anyị rute n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Anyị amaghị na e nyere iwu ahụ, onye hapụrụ anyị ka anyị rịtuo n’ụgbọ ahụ amaghịkwa.

Mgbe a kpọgara anyị n’ihu Maazị Haxworth, ọ baara anyị mba wee sị na e nyere iwu ka anyị ghara ịbata Singapore. Ebe anyị na-amaghị na e nyere anyị iwu ka anyị ghara ịbata, anyị gosiri ya akwụkwọ ikike ngafe anyị nke e suru stampụ e dere “E nyela Gị Ikike Ịbata.” O ji iwe nara anyị akwụkwọ ikike ngafe anyị ma kagbuo ihe ahụ e dere na ya. Ma, ụgbọ mmiri ahụ akwọpụla! Maazi Haxworth jichiri akwụkwọ ikike ngafe anyị ruo otu afọ zuru ezu, mechaa suo ya stampụ e dere “E nyela Gị Ikike Ịbata” ma weghachiri anyị ya.

Ozi Anyị Miri Mkpụrụ na Singapore

Mgbe anyị rutere n’April 1947, otu nwoke aha ya bụ Joshua bụ naanị Onyeàmà nọ na Singapore. O kwusara ozi ọma oge niile ruo mgbe ọ nwụrụ tupu afọ 1975. N’oge na-adịghị anya, ụfọdụ ndị nọ na-amụta eziokwu dị na Baịbụl malitere izisara ya ndị ọzọ. A malitere ịza ekpere anyị nọ na-ekpe ka anyị nweta ndị ga-eso anyị n’ọrụ owuwe ihe ubi anyị na-arụ.—Matiu 9:37, 38.

Na 1949, mgbe Maazi Haxworth gara ezumike nke ọ nọrọ ogologo oge n’England, e zitere mmadụ isii ọzọ na Singapore, bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead, na klas nke iri na otu. N’ime oge a, Dave, onye mụ na ya kwusarala ozi ọma ọtụtụ afọ, hapụrụ Singapore n’ihi ọrịa. Ọ gawara Australia, bụ́ ebe o ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo mgbe ọ nwụrụ na 1973. Otu n’ime mmadụ isii ahụ e zitere bụ Aileen Franks, bụ́ onye m lụrụ na 1956.

N’ime ọtụtụ afọ gaferenụ, anyị kụziiri ọtụtụ ndị Baịbụl, ha aghọọ Ndịàmà, ha na ụmụ ha. Ọbụna taa, ụfọdụ n’ime ha na-ekwusa ozi ọma oge niile ná mba dị iche iche. Otu akụkọ na-eme obi ụtọ bụ akụkọ metụtara Lester na Joanie Haynes, di na nwunye bi na Singapore bụ́ ndị America. Afọ 1949 agafeela mgbe anyị malitere ịkụziri ha Baịbụl. Di na nwunye ahụ nabatara eziokwu dị na Baịbụl ngwa ngwa, e wee mee ha baptizim mgbe ha laghachiri United States. Mgbe e mechara, ozi ọma Lester na Joanie zisara mịrị mkpụrụ. Ha nyeere ọtụtụ ndị aka, tinyere ụmụ ha atọ, ịghọ Ndịàmà.

Joanie detaara anyị akwụkwọ ozi, sị: “M na-echeta afọ ahụ na Singapore, n’ezie, ọ gbanwere ndụ anyị. A sị na ọ bụghị na ị ‘kpọbatara’ anyị, ikekwe, anyị ka gaara na-agagharị ebe niile n’ụwa. Obi dị m ụtọ na ọ bụ gị kụziiri Les eziokwu dị na Baịbụl, n’ihi na site ná mmalite, ị kụziiri ya nke ọma ka ọ hụ Jehova na Ndị Kraịst ibe anyị n’anya. Ọ ka na-eme otú ahụ.”

Ezinụlọ Anyị Jere Ozi na Singapore

Na 1962, ihe anyị na-atụghị anya ya gbanwere otú ọrụ anyị si na-aga. Dọkịta na-agwọ ezinụlọ anyị gwara Aileen na ọ dị ime. Anyị chọrọ ịnọgide na-ekwusa ozi ọma oge niile ná mba a, ma, olee otú anyị ga-esi mee nke a ma na-azụkwa nwa? Nathan H. Knorr, bụ́ onye na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’ụwa dum n’oge ahụ, detaara anyị akwụkwọ ozi wee gbaa mụ ume ka m chọta ọrụ ego, ka anyị wee nwee ike ịnọgide na Singapore. Nke a adịghịrị anyị mfe.

Ọtụtụ ndị mbịarambịa bụ ndị isi n’ụlọ ọrụ dị iche iche si mba ọzọ. Ọrụ achụmnta ego edoghị m anya ebe ọ bụ na m banyere ozi ikwusa ozi ọma oge niile ozugbo m gụchara akwụkwọ iri afọ abụọ na atọ gara aga tupu oge a. Ya mere, m kwụrụ ụlọ ọrụ dị na London nke na-enyere ndị mmadụ aka ịchọta ọrụ ụgwọ ka ha deere m akwụkwọ na-akọwa ihe m ga-arụli dabere n’ozi m jerela ná mba ọzọ, ha wee zigara ọtụtụ ụlọ ọrụ si mba dị iche iche nọ na Singapore akwụkwọ ahụ.

Ozi m nọgidere na-anata bụ, “O wutere anyị na anyị enweghị ọrụ anyị ga-enye onye nwere asambodo i nwere.” Ha weere m na m karịrị ụdị onye ha chọrọ! Ọnwa ole na ole gafere, nwunye m wee mụọ nwa anyị nwaanyị bụ́ Judy. Nwanna Knorr bịara ileta Singapore mgbe ahụ, o wee gaa ịhụ Judy na mama ya n’ụlọ ọgwụ. Ọ gbara anyị ume, sị, “Unu nwere ike ịnọ n’ụlọ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile ná mba a ruo mgbe Bill nwetara ọrụ.”

Mgbe ọnwa ole na ole gafere, m nwetara ọrụ irere otu ụlọ ọrụ ụgbọelu ahịa bụ́ nke ụgbọelu ha na-aga mba dị iche iche. Ụgwọ ha na-akwụ m dị ntakịrị. Mgbe afọ abụọ gafere, otu ụlọ ọrụ ụgbọelu America were m n’ọrụ wee kwụwa m ihe ụlọ ọrụ mbụ ahụ na-akwụ m okpukpu abụọ. Ka oge na-aga, m ghọrọ onye a ma ama n’ọrụ inyere ndị na-eme njem aka, m wee na-enwekwu ohere maka ezinụlọ m na ozi m.

Anyị butere ozi Jehova ụzọ ná ndụ anyị. Nke a mere ka m nwee ike ije ọtụtụ ozi dị mkpa n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Aileen malitere ikwusa ozi ọma oge niile ọzọ. N’ime oge a, ọrụ ikwusa Alaeze Chineke nọ na-aga n’ihu na Singapore. N’ihe dị ka afọ 1965, anyị zụrụ otu ụlọ elu anyị ji mere Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe na-ekwo ekwo n’obodo ahụ. Ọgbakọ anọ na-amụ ihe n’ebe ahụ.

A Machibidoro Ọrụ Anyị Iwu!

Mgbe oge na-aga, mmegide bịawara. Na January 14, 1972, anyị gawara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, dị ka anyị na-eme. Ma, e ji agbụ ígwè na ugodi kpọchie ọnụ ụzọ ámá ya. Akwụkwọ a nyapawara n’ebe ahụ kwuru na a kagbuola Ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị na Singapore. A machibidola anyị iwu! *

Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ e mechiri emeghị ka anyị kwụsị ife Jehova, ma, ajụjụ dị m n’obi bụ, ‘Gịnị ka Chineke chọrọ ka ezinụlọ m mee?’ M nọ na-eche na ọ bụrụ na a gbaara anyị ụgbọ nwa mkpi, anyị agakwaghị enwe ike ịbịaghachi leta ndị enyi anyị na Singapore. Ya mere, m jụrụ onyeisi ụlọ ọrụ anyị ma m̀ nwere ike ịga rụwa ọrụ na Kuala Lumpur, Malaysia. Nke a ga-eme ka ezinụlọ anyị nwee ike ịdị na-abịa Singapore mgbe ọ bụla anyị chọrọ. O juru m anya na o nyere m ọrụ ịbụ onyeisi ụlọ ọrụ anyị dị na Kuala Lumpur, bụ́ nke ga-eme ka ụgwọ a na-akwụ m na ihe ndị ọzọ a na-enye m hie nne okpukpu abụọ.

Ma, ihe m nọ na-eche bụ, ‘Ọ̀ bụ uche Chineke ka anyị hapụ ụmụnna anyị pụọ na Singapore?’ Mụ na ezinụlọ m gwara ya Jehova n’ekpere. Anyị kpebiri na ọ bụ Jehova kpọtara anyị n’ebe a. N’ihi ya, m kpebiri na anyị agaghị akwapụ. Ọ tụrụ onyeisi ọrụ anyị n’anya na anaraghị m ọkwá a dị elu.

Ibi n’ebe a machibidoro ọrụ anyị iwu na-eje ozi siri ike nke ukwuu ebe ọ bụ na e nwere ike ijide anyị ma tụọ anyị mkpọrọ mgbe ọ bụla. E nwere ihe ndị merenụ mere anyị ji kwenyesie ike n’ihe Abụ Ọma 34:7 kwuru, nke sịrị: “Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya, ọ na-anapụtakwa ha.”

E Kenyere Anyị Ọrụ n’Ebe Ọzọ

N’ikpeazụ, n’afọ 1993, mgbe anyị jerela ozi afọ iri anọ na isii na Singapore, a gwara anyị ka anyị gaa New Zealand, bụ́ ebe ihe ga-akara anyị mfe. N’ezie, o wutere anyị na anyị ga-ahapụ ndị enyi anyị nọ na Singapore, bụ́ ndị anyị hụrụ n’anya nke ukwuu. Ma, ihe kasiri anyị obi bụ na anyị maara na ihe e ji tọọ ntọala okwukwe ha bụ ihe ọkụ na-apụghị irepịa. Nke a mere ka ha guzosie ike n’agbanyeghị ule ndị na-abịara ha.—1 Ndị Kọrịnt 3:12-14.

Ugbu a mụ na Aileen nọrọla ihe karịrị afọ iri na anọ na New Zealand, ọ bụ ezie na anyị emeela agadi, anyị ka bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ya bụ, ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile. Ụmụnne m abụọ ka dị ndụ. Ha ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi na Canada. Mike dị afọ iri itoolu na anọ, Peter adịrị afọ iri itoolu.

Na 1998, nwa anyị bụ́ Judy, gaghachiri Eshia jee ozi ọtụtụ afọ. N’otu n’ime akwụkwọ ozi o detaara anyị, ọ sịrị: “Kwa ụbọchị, m na-ekele Jehova maka ohere ọma m nwere ije ozi ọma n’ebe a! Unu emeela maka otú unu si jiri ịhụnanya zụọ m na ihe ndị unu meere m na ndị unu ka na-emere m bụ́ nke mere ọnụnọ m ebe a ji nwee isi.” Na 2003, ọ lọghachiri New Zealand iji nyere mụ na Aileen aka. *

Anyị na-ekele Jehova na ọnọdụ anyị kwere ka anyị za òkù Onye nwe owuwe ihe ubi na-akpọ ka ndị ọrụ gakwuo n’ubi ya. Nke a emeela ka anyị nwee ọṅụ na-enweghị atụ. Mgbe ‘ụwa ga-agabiga,’ dị ka Baịbụl kwuru, obi ga-adị anyị ụtọ ịhụ mmezu nke nkwa magburu onwe ya Chineke kwere, sị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 25 Gụọ Ụlọ Nche (Bekee) nke June 1, 1972, peeji nke 341 ruo nke 349.

^ par. 32 Aileen m hụrụ n’anya nwụrụ na January 24, 2008, mgbe ọ fọrọ nke nta ka e bipụta isiokwu a.

[Foto dị na peeji nke 29]

Joshua bụ naanị Onyeàmà nọ na Singapore mgbe anyị rutere na 1947

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na Dave Farmer na Hong Kong, mgbe anyị na-aga Singapore, na 1947

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na Aileen, na 1958

[Foto dị na peeji nke 31]

Anyị na nwa anyị bụ́ Judy

[Ebe E Si Nweta Foto]

Kimroy Photography

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 28]

Kimroy Photography