Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka

Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka

Ọ̀ DỊTỤLA onye ị maara rịasiri ọrịa ike?— Ọ̀ dị gị ka gị nyere ya aka?—Ya bụrụkwanụ na onye ahụ bụ onye obodo ọzọ ma ọ bụ onye okpukpe ọzọ? Ọ̀ ka ga-amasị gị inyere ya aka ka ọ gbakee?—Ọ masịrị otu nwata nwaanyị ime otú ahụ. Nwata a biri n’ala Izrel n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ atọ gara aga. Ka anyị kọọ ihe mere mgbe ahụ.

Ndị Izrel oge ochie, bụ́ obodo nwata ahụ, na ndị Siria, bụ́ mba dị ya nso, na-alụkarị agha. (1 Ndị Eze 22:1) Otu ụbọchị, ndị Siria batara n’Izrel dọrọ nwata nwaanyị ahụ n’agha. Ha kpọgara ya Siria, bụ́ ebe ọ ghọrọ odibo nwunye Neaman, bụ́ ọchịagha ndị Siria. Neaman na-arịa ọrịa ọjọọ bụ́ ekpenta. Ọrịa a na-eribisị ebe ụfọdụ n’ahụ́ mmadụ.

Nwata nwaanyị a nke na-ejere nwunye Neaman ozi gwara ya otú e nwere ike isi gwọọ di ya. Ọ sịrị: ‘A sị nnọọ na Neaman nọ na Sameria, Ịlaịsha onye amụma Jehova gaara agwọ ya ekpenta ya.’ Ihe nwata nwaanyị a kwuru banyere Ịlaịsha mere ka Neaman kweta na onye amụma ahụ nwere ike ịgwọta ya. Ya mere, Ben-hedad, bụ́ eze Siria, nyere Neaman na ụfọdụ ndị na-ejere ya ozi ikike ka ha gaa ebe ruru otu narị kilomita na iri ise ịga chọọ Ịlaịsha.

Ha bu ụzọ gakwuru Jehoram, bụ́ eze Izrel. Ha gosiri ya akwụkwọ ozi Eze Ben-hedad detaara ya nke o ji gwa ya ka o nyere Neaman aka. Ma, Jehoram enweghị okwukwe n’ebe Jehova ma ọ bụ Ịlaịsha onye amụma nọ. Jehoram chere na Ben-hedad na-achọ ya okwu. Mgbe Ịlaịsha nụrụ nke a, ọ gwara Eze Jehoram, sị: “Biko, ka ọ bịakwute m.” Ịlaịsha chọrọ igosi na Chineke nwere ike ọ ga-eji gwọọ Neaman ọrịa na-arịa ya.—2 Ndị Eze 5:1-8.

Mgbe Neaman ji ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya dị iche iche rute n’ụlọ Ịlaịsha, Ịlaịsha ziri onye ozi ya ka o zie ya, sị: ‘Gaa mikpuo onwe gị ugboro asaa n’Osimiri Jọdan, ahụ́ ga-adị gị mma.’ Neaman were iwe. Ọ tụrụ anya na Ịlaịsha ga-apụta fegharịa aka n’ahụ́ ya ka ekpenta na-arịa ya laa. Kama nke ahụ, ọ bụ naanị onye ozi ya ka ọ hụrụ! Neaman wee tụgharịa jiri oké iwe lawa.—2 Ndị Eze 5:9-12.

Gịnị ka ị gaara eme ma à sị na ị bụ otu n’ime ndị na-ejere Neaman ozi?— Ndị na-ejere ya ozi jụrụ ya, sị: ‘A sị na ọ bụ ihe siri ike ka Ịlaịsha gwara gị mee, ọ̀ bụ na ị gaghị eme ya? Mee ntakịrị ihe a—naanị mikpuo onwe gị na mmiri wee dị ọcha.’ Neaman gere ha ntị. ‘O wee gbadaa, malite imikpu onwe ya ugboro asaa na Jọdan, anụ ahụ́ ya wee lọghachi dị ka anụ ahụ́ nwata.’

Neaman gaghachikwuuru Ịlaịsha wee sị ya: “Lee, amatawo m ugbu a na e nweghị Chineke n’ebe ọ bụla n’ụwa ma e wezụga n’Izrel.” O kwere Ịlaịsha nkwa na ọ gakwaghị “esure àjà nsure ọkụ ma ọ bụ chụọrọ chi ọzọ àjà ma e wezụga Jehova.”—2 Ndị Eze 5:13-17.

Ọ̀ ga-amasị gị inyere onye ọzọ aka ịmụta banyere Jehova na ihe ndị ọ ga-eme, dị ka nwata nwaanyị ahụ mere?— Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, otu nwoke nke na-arịa ọrịa ekpenta nwere okwukwe n’ebe ọ nọ wee sị: ‘Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ inyere m aka, ị ga-eme ya.’ Ị̀ maara ihe Jizọs gwara ya?— “Achọrọ m.” Jizọs gwọrọ ya otú ahụ Jehova gwọrọ Neaman.—Matiu 8:2, 3.

Ị̀ maara maka ụwa ọhụrụ nke Jehova ga-eweta? Ahụ́ ga-esi ndị niile ga-ebi n’ime ya ike, ha ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.— (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) N’eziokwu, ọ ga-adị mma ka ị kọọrọ ndị ọzọ ihe ọma ndị a!

Ajụjụ:

○ Olee otú otu nwata nwaanyị ndị obodo Neaman dọọrọ n’agha si nyere Neaman aka?

○ Gịnị mere na Neaman enweghị mmasị ná mmalite ime ihe Ịlaịsha kwuru, ma, gịnị mere o ji gbanwee obi ya?

○ Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ime ụdị ihe nwata nwaanyị ahụ mere?

○ Gịnị ka Jizọs mere, gịnịkwa mere ndụ ga-eji amagbu onwe ya n’ụwa ọhụrụ nke Chineke?