Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwela Ka Ọchịchọ I Nwere Ịmata Ihe Ghọ Gị Ahịa

Ekwela Ka Ọchịchọ I Nwere Ịmata Ihe Ghọ Gị Ahịa

Ekwela Ka Ọchịchọ I Nwere Ịmata Ihe Ghọ Gị Ahịa

“Ụmụ mmadụ e kere eke na-ajụkarị ajụjụ. Anyị na-amalite ịjụ ajụjụ site n’oge a mụrụ anyị . . . E nwedịrị ike ikwu na ihe e ji mara ụmụ mmadụ kemgbe ụwa bụ ịjụ ajụjụ na ịza ajụjụ ndị ha jụrụ.”—Octavio Paz, onye Mexico na-ede uri.

GỊNỊ na-eme ka onye na-esi nri sie ụdị nri ọ na-esitụbeghị? Gịnị na-eme ka onye na-eme nchọpụta gaa ebe ndị dị anya ọ na-agatụbeghị? Gịnị mere nwatakịrị ji ajụ ọtụtụ ajụjụ? Ihe na-akpatakarị ya bụ na mmadụ nwere ọchịchọ ịmata ihe.

Olee maka gị onwe gị? Ọ̀ na-amasị gị ka ị mata ihe ọhụrụ ma ọ bụ ka ị mata azịza ajụjụ ndị na-akpali mmasị? Dị ka ihe atụ, Olee otú ndụ si malite? Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa? Chineke ọ̀ dị adị? Malite mgbe anyị bụ ụmụaka, ọchịchọ anyị nwere ịmata ihe na-eme ka ọtụtụ n’ime anyị na-ajụ ụdị ajụjụ ndị ahụ, na-emekwa ka anyị chọọ ịmata ihe mere ihe ji eme. Mgbe ihe dọtara mmasị anyị, anyị na-agbalị ịmata ihe niile banyere ya. N’ihi ya, ọchịchọ ịmata ihe nwere ike ime ka mmadụ mata ọtụtụ ihe magburu onwe ha. Ma, o nwekwara ike iduba mmadụ ná nsogbu nakwa n’ọdachi.

Kpachara Anya, Enwefela Ọchịchọ ahụ Ókè

Ọtụtụ ndị anụtụla ilu bụ́: Ọ bụ ka a hụtachaa mere mgbọ ji tụọ nwa enwe n’isi. N’ezie, mmadụ nwere ike ịdaba ná nsogbu ma o sorochaa ọchịchọ o nwere ịmata ihe. Dị ka ihe atụ, ọchịchọ ịmata ihe nwere ike ime ka nwata bitụ aka n’ekwu dị ọkụ, ya adaa ya. N’aka nke ọzọ, ọchịchọ ịmata ihe nwere ike ime ka anyị matakwuo ihe, mataruo ya n’isi. Ma, ọ̀ ga-adị mma ka anyị chọọ ịmata ihe ọ bụla dọtara mmasị anyị?

N’ezie, e nwere ihe ọ na-adịghị mma ka anyị mata n’ihi na ọ ga-emerụ anyị ahụ́. Mmadụ ịchọ ịmata banyere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, anwansi, ma ọ bụ ihe òtù nzuzo ma ọ bụ òtù ọjọọ na-akụzi, nwere ike imerụ ya ahụ́. N’ụdị ihe ndị a na ndị yiri ha, anyị kwesịrị iṅomi otu ọbụ abụ bụ́ onye Hibru, onye kpere ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.”—Abụ Ọma 119:37.

E nwekwara ihe ndị na-agaghị emerụ anyị ahụ́ ma anyị mata ha, ma, ọ dịghị mkpa ịmata ha, o nweghịkwa uru ha ga-abara anyị. Dị ka ihe atụ, olee uru ọ ga-abara anyị ịmatacha ihe niile banyere ndị na-eme fim ma ọ bụ ndị a ma ama, ma ọ bụ ịmatacha ndị so n’òtù asọmpi egwuregwu na otú ha si asọ mpi ha, ma ọ bụ ịmatacha ihe niile banyere ihe ndị a rụpụtara ọhụrụ ma ọ bụ ụgbọala kacha ọhụrụ a rụpụtara? Ọ dịghị uru ịmatacha ihe ndị a ga-abara ọtụtụ ndị.

Ihe Nlereanya Magburu Onwe Ya

N’ezie, ọchịchọ ịmata ihe nwere mgbe ọ na-aba uru. Dị ka ihe atụ, tụlee banyere Alexander von Humboldt, bụ́ onye Germany nke dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, onye bụ́ ọkà mmụta ihe ndị si n’okike na onye na-eme nchọpụta. Ọ bụ aha ya ka a gụrụ mmiri bụ́ Humboldt Current nke dị nso n’Ụsọ Oké Osimiri ebe ọdịda anyanwụ South America.

Humboldt kwuru otu mgbe ná ndụ ya, sị: “Kemgbe m dị obere, ọ na-agụsi m agụụ ike ịga ebe dị iche iche dị anya, bụ́ ebe ndị Yurop na-anaghị agakarị.” Ọ sịrị na ọchịchọ ahụ karịrị akarị mgbe ọ “na-enwekwaghị ike ijide onwe ya n’ihi otú o si na-agụsi ya agụụ ike n’obi.” Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na itoolu, ọ gara Central America na South America, bụ́ njem were ya afọ ise. O dere ihe niile ọ chọpụtara na njem ahụ. Akwụkwọ o dere banyere njem ahụ dị iri atọ.

Ihe niile Humboldt hụrụ dọọrọ mmasị ya—otú oké osimiri dị, ma ọ̀ na-ekpo ọkụ, ma ọ̀ jụrụ oyi, azụ̀ ndị dị n’ime ya, ahịhịa ndị ọ hụrụ n’ụzọ. Ọ rịrị ugwu, gaa n’osimiri na oké osimiri dị iche iche. Ihe ndị Humboldt chọpụtara na-enye aka n’ihe dị iche iche a na-amụ na sayensị taa. Ihe mere o ji mụta ihe niile ahụ bụ ọchịchọ o nwere ịmata ihe na mmasị dị ukwuu o nwere n’oge ndụ ya dum ịmụta ihe. Onye America na-ede edemede, bụ́ Ralph Waldo Emerson, kwuru, sị, “Humboldt so n’otu n’ime ndị e ji ama atụ . . . ndị na-apụta mgbe mgbe, igosi anyị otú uche mmadụ si dị ebube, na otú o si akpa ike na-enweghị atụ.”

Ihe Anyị Kwesịrị Ịmụ

O doro anya na ọtụtụ n’ime anyị anọghị n’ọnọdụ ga-eme ka anyị ghọọ ndị na-eme nchọpụta n’ụwa ma ọ bụ ndị ga-achọpụta ihe ọhụrụ nke ga-enye aka ná mmụta sayensị. Ma, e nwere ihe ọmụmụ anyị nwere ike itinye uche anyị na ya, bụ́ nke uru anyị ga-erite na ya ga-akarị ihe ọ bụla ọzọ anyị nwere ike ịmụ. Jizọs Kraịst kwuru banyere ihe ọmụmụ a mgbe ọ na-ekpeku Nna ya nke eluigwe ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ịmara banyere ezi Chineke, onye aha ya bụ́ Jehova, na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-abara onye nwere ọchịchọ ịmata ihe uru n’ọtụtụ ụzọ karịa ịmụta banyere ihe ọ bụla ọzọ. Cheta ajụjụ ndị a jụrụ banyere ndụ ná mmalite isiokwu a. Lee ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa yiri ha: Gịnị mere ahụhụ ji ju ebe niile n’ụwa? Ndị mmadụ hà ga-emebi ụwa, bibiekwa ya? Gịnị ka Chineke ga-eme iji hụ na ụdị ihe ahụ agaghị eme ụmụ mmadụ? Ihe ịmata azịza ajụjụ ndị a ga-emere anyị abụghị naanị ịmata ihe anyị na-amaghị. Jizọs kwuru na ọ bụ “iji nweta ndụ ebighị ebi.” Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na nke a bụ eziokwu?

Baịbụl bụ Okwu Chineke nke si n’ike mmụọ nsọ. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere banyere ya, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”—2 Timoti 3:16, 17.

Chegodị nke ahụ n’echiche. Onyeozi ahụ sịrị na Baịbụl ga-eme ka anyị mara ihe niile ga-akwadebe anyị ma ọ bụ nyere anyị aka ime ihe niile dị mma. O nwere ike inyere anyị aka ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya. Anyị makwaara na ihe ọmụma Chineke na amamihe ya karịrị nke onye ọ bụla ọzọ. Aịzaya onye amụma si n’ike mmụọ nsọ dee ihe a Chineke kwuru, sị: “‘Echiche unu abụghị echiche m, ụzọ m abụghịkwa ụzọ unu,’ ka Jehova kwuru. ‘N’ihi na dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu, otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.’”—Aịzaya 55:8, 9.

Ị̀ ga-achọ ịmara banyere ụzọ Chineke na echiche ya bụ́ nke na-enweghị atụ? Ọchịchọ i nwere ịmata ihe ọ̀ na-akpali gị ịchọpụta ihe Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru banyere ụzọ Chineke na echiche ya? Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịmụta ihe Chineke ga-eme iji kwụsị ahụhụ niile na ihe ọma niile ọ ga-emere ndị na-erube isi? Baịbụl na-akpọ gị òkù a, sị: ‘Detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma; obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke gbabara n’ime ya.’—Abụ Ọma 34:8.

Eziokwu nke Okwu Chineke bụ́ nke na-akpa ike nwere ike imetụta obi onye nwere ezi obi otú ahụ ìhè si emetụta onye na-anaghị ahụbu ụzọ nke malitere ịhụ ụzọ. O metụrụ Pọl onyeozi n’ahụ́ ikwu, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!” (Ndị Rom 11:33) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mgbe anyị ga-aghọtacha ihe ọmụma na amamihe Chineke. Anyị nwere olileanya magburu onwe ya nke ịnọgide na-amụta ihe ọhụrụ mgbe niile n’enweghị ike ọgwụgwụ.

Ekwela Ka Ọchịchọ ahụ Jụọ Oyi!

N’eziokwu, ọtụtụ n’ime anyị agaghị aghọ ndị a ma ama na-eme nchọpụta ma ọ bụ ndị na-emepụta ihe ọhụrụ. Ikekwe, oge ndụ anyị ugbu a agaghị ezuru anyị ịghọtacha ihe niile anyị chọrọ ịghọta. N’agbanyeghị nke ahụ, ekwela ka ọchịchọ i nwere ịmata ihe jụọ oyi. Mee ka ọchịchọ a i nwere ịmụta ihe, bụ́ nke Chineke ji ịhụnanya tinye n’ime anyị, dịgide.

Jiri onyinye magburu onwe ya nke Chineke nyere gị mụta ihe ndị ga-abara gị uru, ghọtakwa Okwu Chineke e si n’ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Baịbụl. Ọ bụrụ na i mee nke a, ị ga-enwe obi ụtọ na ọṅụ, nweekwa olileanya ịnọgide na-enwe ha ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “[Chineke emewo] ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya. O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha, ka ụmụ mmadụ wee ghara ịchọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.”—Ekliziastis 3:11.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ị̀ Maara na . . .

• Ọtụtụ narị afọ tupu Columbus na Magellan egosi otú ụwa dị, Baịbụl ekwuolarị na ụwa adịghị larịị, kama na ọ dị gburugburu?—Aịzaya 40:22.

• Ọtụtụ afọ tupu ndị na-aga na mbara igwe enwee ike ịmata na ọ dịghị ihe ụwa nọkwasịrị na ya, Baịbụl ekwuolarị na ọ dịghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya?—Job 26:7.

• Ya dịkarịa ala, puku afọ abụọ na narị afọ ise tupu William Harvey, bụ́ dọkịta Bekee, achọpụta otú ọbara si aga n’ahụ́ mmadụ, Baịbụl ekwuolarị na ọ bụ n’obi mmadụ ka isi iyi nke ndụ si apụta?—Ilu 4:23.

• N’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, Baịbụl ji okwu dị mfe nghọta kọwaa otú mmiri si ezo, na otú o si alaghachi n’igwe ma zoghachi, bụ́ nke na-eme ka ndụ na-aga n’ihu n’ụwa?—Ekliziastis 1:7.

Ọ́ dịghị ịtụnanya na ọ dịla anya Baịbụl bu ụzọ kwuo banyere ihe ndị a ndị ọkà mmụta sayensị na-akụzi tupu ndị mmadụ amara banyere ha ma ọ bụ chọpụta ha? N’ezie, ihe ọmụma na-enweghị atụ nke na-enye ndụ dị na Baịbụl, ọ dịkwa mkpa ka ị chọpụta ya.

[Foto dị na peeji nke 19]

Alexander von Humboldt