Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Chineke Ji Nwee Mmasị n’Ebe Noa Nọ—Ihe Mere O Ji Gbasa Anyị

Ihe Mere Chineke Ji Nwee Mmasị n’Ebe Noa Nọ—Ihe Mere O Ji Gbasa Anyị

Ihe Mere Chineke Ji Nwee Mmasị n’Ebe Noa Nọ—Ihe Mere O Ji Gbasa Anyị

ỌTỤTỤ n’ime anyị na-echeta mgbe anyị nụrụ ozi dị mkpa. Anyị na-echeta ihe niile merenụ—ọ bụghị naanị ebe anyị nọ nụ ozi ahụ na ihe anyị na-eme mgbe ahụ, kamakwa, ihe anyị mere mgbe anyị nụrụ ya. O doro anya na Noa echefughị ụbọchị Jehova Chineke, bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa, ziri ya ozi. Ò nwere ozi ka nke ahụ mkpa? Jehova kwuru na ya ekpebiela ibibi “anụ ahụ́ niile.” Ọ gwara Noa ka o wuo nnukwu ụgbọ nke ọ ga-eji chebe ya na ezinụlọ ya na ụdị anụmanụ ọ bụla.—Jenesis 6:9-21.

Olee ihe Noa mere? Ọ̀ ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ nụrụ ozi ahụ, ka ò mere mkpesa? Olee otú o si kọọrọ nwunye ya na ndị ezinụlọ ya ndị nke ọzọ banyere ozi ahụ? Baịbụl agwaghị anyị. Lee ihe Baịbụl gwara anyị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.”—Jenesis 6:22.

Nke a dị nnọọ mkpa, n’ihi na ọ na-eme ka anyị mara otu n’ime ihe mere Chineke ji nwee mmasị n’ebe Noa nọ; ọ masịrị Noa ime ihe Chineke gwara ya ka o mee. (Jenesis 6:8) Oleekwa ihe ọzọ mere Chineke ji nwee mmasị n’ebe Noa nọ? Azịza ya dị mkpa n’ihi na anyị aghaghị ime ka Noa ma ọ bụrụ na a ga-azọpụta anyị mgbe Chineke ga-ekpochapụ ndị ajọ omume ọzọ n’ụwa. Ma, ka anyị buru ụzọ tụlee otú ihe dịịrị Noa tupu e nwee Iju Mmiri ahụ.

Ndị Mmụọ Ọjọọ Bịara n’Ụwa

Noa dịrị ndụ mgbe ọ na-adịbeghị anya e kere mmadụ. Ọ bụ n’ihe dị ka otu puku afọ e kechara mmadụ mbụ ka a mụrụ ya. Ndị biri ndụ n’oge ahụ abụghị ndị na-enweghị ọgụgụ isi bi n’ọgba, ndị ajị juru ahụ́ na-eji okpiri n’aka agagharị, dị ka ọtụtụ ndị na-eche. Ngwá ọrụ e ji ígwè na ọla kọpa kpụọ dị n’oge ahụ, ọ ga-abụkwa na Noa ji ha wuo ụgbọ ahụ. E nwekwara ngwá egwú n’oge ahụ. Ndị mmadụ na-alụ di na nwunye, na-amụ ụmụ, na-arụ ọrụ ubi, na-azụkwa ụmụ anụmanụ. Ha na-azụ azụ, na-ere ere. N’ụzọ niile a, otú ihe dị n’oge ahụ ka ọ dịkwa ugbu a.—Jenesis 4:20-22; Luk 17:26-28.

Ma, e nwekwara ọdịiche n’otú ihe dị n’oge ahụ nakwa n’otú ọ dị ugbu a. Otu n’ime ihe dị iche bụ na ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ n’oge ahụ karịa ka a na-adị ugbu a. Ndị mmadụ na-adịkarị ndụ karịa narị afọ asatọ. Noa dịrị ndụ ruo narị afọ itoolu na iri ise; Adam dịruru narị afọ itoolu na iri atọ; Metusela bụ́ nna nna Noa adịruo narị afọ itoolu na iri isii na itoolu. *Jenesis 5:5, 27; 9:29.

Ihe ọzọ dị iche bụ ihe e kwuru na Jenesis 6:1, 2, nke sịrị: “O wee ruo na mgbe ndị mmadụ malitere ịmụba n’elu ala, a mụọkwara ha ụmụ ndị inyom, mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke malitere ịhụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma; ha wee na-alụrụ ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ.” “Ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke” ndị a bụ ndị mmụọ ozi si n’eluigwe, ndị nwoghara ghọọ ndị ikom wee biri n’ụwa. Ọ bụghị Chineke gwara ha ka ha bịa; ha abịaghịkwa inyere ụmụ mmadụ aka. Kama nke ahụ, “ha hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” n’eluigwe ka ha na ụmụ nwaanyị mara mma n’ụwa wee na-enwe mmekọahụ. Ha ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ.—Jud 6.

Ndị mmụọ ọjọọ a rụrụ arụ bụ́ ndị nnupụisi, ndị ike ha na ọgụgụ isi ha karịrị nke mmadụ, duhiere ụmụ mmadụ. Ọ ga-abụ na ha nọ na-atụrụ ụmụ mmadụ ihe ha ga-eme, na-emegbukwa ha. Ha anaghị akpa ike ha ná nzuzo otú ahụ onye omekome nke na-akpa arụ si akpa ya ná nzuzo ka a ghara ịmara onye ọ bụ. Kama, ha na-enupụrụ Chineke isi n’ihu ọha n’enweghị ihere ọ bụla.

Ndị mmụọ ozi ahụ bụ́ ụmụ Chineke na ụmụ nwaanyị nwere mmekọahụ, ha wee mụta ụmụ ndị toro wee nwee ike na-enweghị atụ. E ji okwu Hibru bụ́ “Nefilim” mara ha. A gwara anyị, sị: “Ndị Nefilim nọ n’ụwa n’oge ahụ, nakwa mgbe ọ gasịrị, mgbe ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke na ụmụ ndị inyom nke mmadụ nọ na-enwe mmekọahụ, ha wee mụọrọ ha ụmụ ndị ikom, ha bụ ndị dike, ndị biri n’oge gboo, ndị ikom a ma ama.” (Jenesis 6:4) A na-atụ ndị Nefilim oké ụjọ. “Nefilim” pụtara “Ndị Ntigbu,” ndị na-etigbu ndị ọzọ. Ha bụ ndị ogbu mmadụ, ndị ọ ga-abụ ihe ike niile ha mere ka e ji kọọ akụkọ ifo n’oge ochie.

Otú nke a Si Wute Ndị Ezi Omume

Ihe Baịbụl kọrọ banyere ọgbọ ahụ na-egosi na arụrụala zuru ebe niile n’oge ahụ, dịteekwa aka. Ọ sịrị: “Ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ. . . . Ụwa wee jupụta n’ime ihe ike. . . . Anụ ahụ́ niile ebibiwo ụzọ ha n’elu ụwa.”—Jenesis 6:5, 11, 12.

Ọ bụ n’ụdị ụwa a ka Noa dịrị ndụ. Ma, Noa adịghị ka ndị ibe ya. Ọ “bụ onye ezi omume,” o “so ezi Chineke jee ije.” (Jenesis 6:9) Ọ dịghị mfe onye ezi omume ibi n’etiti ndị ajọ omume. O doro anya na ihe ndị mmadụ na-ekwu na ihe ha na-eme wutere Noa nke ukwuu. Ikekwe, otú ahụ obi dị Lọt, bụ́ onye ezi omume nke dịrị ndụ tupu Iju Mmiri ahụ, ka ọ dị ya. Lọt, onye biri n’etiti ndị Sọdọm rụrụ arụ, “nwere oké mwute n’ihi mmikpu nke ndị na-eleda iwu anya mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ,” a na-emekpakwa “mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ́ kwa ụbọchị n’ihi ihe ọ na-ahụ na ihe ọ na-anụ, n’ihi mmebi iwu ha.” (2 Pita 2:7, 8) Ọ ga-abụrịrị otú ahụ ka obi dị Noa.

Akụkọ ọjọọ ndị juru ebe niile na omume rụrụ arụ nke ndị gbara gị gburugburu na-eme hà na-ewute gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta otú obi dị Noa. Chegodị echiche otú o si siere ya ike idi ajọ omume niile a na-eme n’ụwa ruo narị afọ isii, bụ́ afọ ole ọ dị mgbe e nwere Iju Mmiri ahụ. Ọ ghaghị ịbụ na ọ gụsiri ya agụụ ike ka ajọ omume kwụsị!—Jenesis 7:6.

Egwu Emeghị Ka Noa Ghara Ịdị Iche

Noa “bụ onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ.” (Jenesis 6:9) Ị ga-ahụ na Baịbụl sịrị na ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ, ọ bụghị n’anya ha. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Noa enweghị ntụpọ n’anya Chineke. Ma, n’anya ndị biri tupu Iju Mmiri ahụ, ọ maghị nke a na-akọ. Anyị ji n’aka na o tinyeghị aka n’ihe ọtụtụ ndị nọ na-eme, o soghịkwa ha na-enwe ntụrụndụ rụrụ arụ ndị a na-enwe n’oge ahụ. Chegodị echiche otú ndị mmadụ si na-ele ya anya mgbe ọ malitere iwu ụgbọ ahụ! Ọ ga-abụ na ha nọ na-achị ya ọchị, na-akwakwa ya emo. Ha weere ya na ọ maghị ihe ọ na-eme.

Noa kwenyesikwara ike na Chineke, o mekwara ka ndị ọzọ mara ihe o kweere. Baịbụl kwuru na ọ bụ “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) O doro anya na Noa maara na a ga-emegide ya. Nna nna nna ya bụ́ Inọk bụ onye ezi omume nke buru amụma na Chineke ga-eme ndị ajọ omume ihe o kpere n’ikpe. O doro anya na nke a mere ka a kpagbuo Inọk, ọ bụ ezie na Chineke ekweghị ka ndị na-emegide ya gbuo ya. (Jenesis 5:18, 21-24; Ndị Hibru 11:5; 12:1; Jud 14, 15) Ihe dị Noa mkpa bụ obi ike na inwe okwukwe na Jehova nwere ikike ichebe ya ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ na ndị Nefilim nakwa ọtụtụ ụmụ mmadụ ndị na-enweghị mmasị n’ebe ọ nọ na ndị na-emegide ya ghara imeri ya.

Kemgbe ụwa, ndị na-adịghị efe Chineke na-akpagbu ndị na-efe ya. A kpọrọ ọbụna Jizọs Kraịst asị, kpọọkwa ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 10:22; Jọn 15:18) Egwu emeghị ka Noa ghara ife Chineke, ọ bụ ezie na ọ dịghị ndị mmadụ mma. Ọ ghọtara na Chineke inwe mmasị n’ebe ọ nọ dị mkpa nke ukwuu karịa ụmụ mmadụ ndị na-emegide Chineke inwe mmasị n’ebe ọ nọ. N’ezie, Chineke nwere mmasị n’ebe Noa nọ.

Noa Ṅara Ntị

Dị ka anyị hụworo, Noa ji obi ike kwusaara ndị ọzọ ozi ọma. Olee ihe ha mere mgbe ọ na-ezi ha ozi ọma? Baịbụl sịrị na tupu e nwee Iju Mmiri ahụ na ndị mmadụ nọ “na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.” Ha aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị e nyere ha.—Matiu 24:38, 39.

Jizọs kwuru na otu ihe ahụ ga-eme n’oge anyị a. Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, Ndịàmà Jehova anọwo na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị na Jehova ga-eme ihe iji mezuo nkwa ya nke bụ́ ime ka e nwee ụwa ọhụrụ nke ezi omume. Ọ bụ ezie na ọtụtụ nde mmadụ aṅaala ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ, ọtụtụ ijeri mmadụ bi n’ụwa anaghị aṅa ntị na ya. “Dị ka ha si chọọ,” ha na-eleghara ma Iju Mmiri ahụ ma ihe ndị ọ na-akụziri anyị anya.—2 Pita 3:5, 13.

Ma, Noa ṅara ntị. O kweere ihe Jehova bụ́ Chineke gwara ya. Isi ahụ o rubere mere ka a zọpụta ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe Chineke dọsịrị Noa aka ná ntị banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya, ọ bụ okwukwe ka o ji gosi egwu Chineke ma rụọ ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya.”—Ndị Hibru 11:7.

Ihe Nlereanya Anyị Kwesịrị Iṅomi

Ụgbọ ahụ Noa wuru buru oké ibu, ọ dị ogologo karịa ọgbọ egwuregwu bọl, ọ hakwa ka ụlọ elu dị okpukpu ise. O ji mita iri atọ kara otu ụgbọ kacha ukwuu e ji osisi wuo, nke aha ya bụ Wyoming. Ọ bụ ezie na ụgbọ Noa abụghị ụgbọ mmiri, e wuru ya ka o see n’elu mmiri, bụ́ nke chọrọ ezigbo nkà. E jikwa korota techie ya ime na azụ. Ọ ga-abụ na iwucha ya were ihe karịrị afọ iri ise.—Jenesis 6:14-16.

Ọ bụghị naanị nke ahụ. A gwakwara Noa ka ọ chịkọta nri ga-ezuru ya na ndị ezinụlọ ya na ụmụ anụmanụ ruo otu afọ. Tupu e nwee Iju Mmiri ahụ, ọ ga-achịkọta ụmụ anụmanụ ma chịba ha n’ụgbọ ahụ. “Noa wee mee ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.” Ọ ga-abụrịrị na ahụ́ ruru ya ala mgbe o mechara ihe niile, Jehova wee mechie ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ.—Jenesis 6:19-21; 7:5, 16.

Mgbe ahụ, Iju Mmiri ahụ malitere. Mmiri zoro ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. Ha niile nọrọ otu afọ zuru ezu n’ụgbọ ahụ ruo mgbe mmiri ahụ tara. (Jenesis 7:11, 12; 8:13-16) Ndị ajọ omume niile nwụrụ. Ọ bụ naanị Noa na ezinụlọ ya dị ndụ banye n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha.

Baịbụl kwuru na Iju Mmiri ahụ e nwere n’ụwa dum n’oge Noa “ghọọrọ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ.” Olee otú o si bụrụ otú ahụ? Anyị na-agụ, sị: “Eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Ma, a ga-enwekwa ndị ga-afọdụ ndụ, dị ka e nwere n’oge Noa. Ka obi sie gị ike na “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.”—2 Pita 2:5, 6, 9; 3:7.

Noa sọpụụrụ Chineke, bụrụkwa onye ezi omume n’etiti ndị ajọ omume ya na ha dịkọrọ ndụ. O rubeere Chineke isi ruo n’isi. Egwu emeghị ka ọ ghara ime ihe ziri ezi, ọ bụ ezie na ọ ma na nke a ga-eme ka ndị na-achọghị ife Chineke kpọ ya asị. Ọ bụrụ na anyị eṅomie Noa n’ihe ndị a, Chineke ga-enwekwa mmasị n’ebe anyị nọ, anyị ga-enwekwa olileanya na a ga-azọpụta anyị ka anyị wee dịrị ndụ n’ụwa ọhụrụ a ga-enwe n’oge na-adịghị anya.—Abụ Ọma 37:9, 10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Gụọ isiokwu bụ́ “Hà Dịruru Afọ Ole ahụ n’Eziokwu?” na Teta! nke July-September 2007, peeji nke 24.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Ọ ga-abụ ihe ike niile ndị Nefilim mere ka e ji kọọ akụkọ ifo n’oge ochie

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọ bụrụ na anyị eṅomie okwukwe Noa, Chineke ga-enwe mmasị n’ebe anyị nọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Alinari/Art Resource, NY