Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iju Mmiri Oge Noa Ò Zuru Ụwa Ọnụ n’Ezie?

Iju Mmiri Oge Noa Ò Zuru Ụwa Ọnụ n’Ezie?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Iju Mmiri Oge Noa Ò Zuru Ụwa Ọnụ n’Ezie?

Ọ bụ n’ihe karịrị puku afọ anọ gara aga ka e nwere Iju mmiri oge Noa. Ya mere, o nweghị onye nọ ndụ taa n’ụwa hụrụ mgbe o mere nke ga-akọrọ anyị akụkọ ya. Ma, e nwere ebe e dere ihe ahụ merenụ, bụ́ ebe kwuru na iju mmiri ahụ tochiri ugwu kacha ogologo n’ugwu niile e nwere n’oge ahụ.

Akwụkwọ ahụ nke kọrọ akụkọ ihe mere eme kwuru, sị: “Mmiri nke iju mmiri ahụ zogidere n’elu ụwa ruo ụbọchị iri anọ . . . Mmiri ahụ wee kpuchie ụwa nke na o tochiri ugwu niile dị elu bụ́ ndị dị n’okpuru eluigwe dum. Mmiri ahụ ji kubit iri na ise [ihe dị ka mita isii na ọkara] kpuchie ha, o wee tochie ugwu niile.”—Jenesis 7:17-20.

Ụfọdụ nwere ike ichewe na akụkọ a nke kwuru na mmiri kpuchiri ụwa dum bụ akụkọ ifo ma ọ bụkwanụ akụkọ a kọrọ karịa otú o si mee. Ọ bụghị ma ọlị! N’ezie, a ka nwere ebe ụfọdụ mmiri kpuchiri n’ụwa. Oké osimiri niile dị n’ụwa kpuchiri ihe dị ka ụzọ asaa n’ime ụzọ iri nke mbara ala. Ya mere, nke bụ́ eziokwu bụ na mmiri iju mmiri ahụ ka dị n’ụwa. Ọ bụrụ na mmiri kpụkọrọ akpụkọ agbazee, oké osimiri dị iche iche ga-eto kpuchie obodo ndị dị ka New York na Tokyo.

Ndị ọkà mmụta ndị na-enyocha mbara ala ebe ugwu ọdịda anyanwụ United States kwuru na mmiri etochiela ebe ahụ n’oge gboo ihe ruru ugboro otu narị. Ha kwuru na mmiri nke tochiri ebe ahụ n’otu mgbe ruru narị mita isii n’ịdị elu. Otú o si kworo na-aga n’ike n’ike yiri ụgbọala nke na-agba otu narị kilomita na ise kwa awa. Ndị ọkà mmụta sayensị ndị ọzọ emeela nchọpụta yiri nke ahụ wee kwuo na ọ ga-abụ na ọ dị mgbe e nwere iju mmiri zuru ụwa ọnụ.

Ma, ndị kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke anaghị enwe obi abụọ ma ọ̀ dị mgbe e nwere iju mmiri zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ ihe mere eme. Jizọs gwara Chineke, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Pọl onyeozi dere na ọ bụ uche Chineke “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Olee otú Pọl ga-esi kụziere ndị na-eso ụzọ Jizọs eziokwu banyere Chineke ma ọ bụrụ na ihe dị n’Okwu Chineke bụ akụkọ ifo?

Ọ bụghị naanị na Jizọs kweere na ọ dị mgbe e nwere Iju Mmiri, kamakwa, o kweere na o zuru ụwa ọnụ. N’amụma dị oké mkpa o buru banyere ọnụnụ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a, o ji ihe ndị na-eme n’oge a tụnyere ihe ndị mere n’oge Noa. (Matiu 24:37-39) Pita onyeozi dekwara banyere iju mmiri oge Noa, sị: “E jikwa ihe ndị ahụ bibie ụwa nke oge ahụ mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.”—2 Pita 3:6.

Ọ bụrụ na akụkọ Noa na iju mmiri ahụ nke zuru ụwa ọnụ bụ akụkọ ifo, ịdọ aka ná ntị Pita na Jizọs dọrọ ndị dị ndụ n’oge ikpeazụ a enweghị isi. Kama ịbụrụ onye na-amụ Baịbụl okwu ịdọ aka ná ntị, ọ ga-etinye ya ná mgbagwoju anya, meekwa ka ọ ghara ime ihe ga-eme ka ọ lanahụ mkpagbu karịrị Iju Mmiri oge Noa.—2 Pita 3:1-7.

Mgbe Chineke na-ekwu banyere ebere ọ na-emere ndị ya, bụ́ nke na-agaghị agwụ agwụ, ọ sịrị: “Dị nnọọ ka m ṅụrụ iyi na mmiri Noa agaghị ekpuchi ụwa ọzọ, otú ahụ ka m ṅụrụ iyi na agaghị m eweso gị iwe, agaghịkwa m abara gị mba.” Otú ahụ Iju Mmiri oge Noa si kpuchie ụwa, ọ bụ otú ahụ ka obiọma Chineke ga-adịkwasị ndị tụkwasịrị ya obi.—Aịzaya 54:9.