Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“M Ga-akwanye Ọkụ n’Èzí Jiri Ya Gụọ Ya n’Abalị A”

“M Ga-akwanye Ọkụ n’Èzí Jiri Ya Gụọ Ya n’Abalị A”

Akwụkwọ Ozi Si Australia

“M Ga-akwanye Ọkụ n’Èzí Jiri Ya Gụọ Ya n’Abalị A”

N’AUSTRALIA, e nwere ebe dịpụrụ adịpụ bụ́ ọzara, oké anwụ na-acha na ya, e nwekwara ọtụtụ ebe ndị mmadụ na-ebighị na ya. Ma, n’ime ndị niile bi ná mba ahụ, otu onye n’ime otu narị mmadụ, ya bụ, ihe dị ka otu narị puku mmadụ na puku iri asatọ, bi n’ebe ahụ dịpụrụ adịpụ.

Ndị mụrụ m, bụ́ Ndịàmà Jehova, na-akpọ m aga ozi ọma n’ebe ahụ mgbe m dị obere. Otú ebe ahụ si buo ibu na otú okwute juru na ya si maa mma masịrị m nke ukwuu. Enwekwara m mmasị n’otú ndị bi n’ebe ahụ si gbasie ike na otú obi si ruo ha ala. Ugbu a m nwere ezinụlọ nke m, achọrọ m ka nwunye m na ụmụ anyị abụọ, otu dị afọ iri, nke ọzọ adịrị afọ iri na abụọ, gaa n’ebe ahụ.

Ịkwadebe Maka Njem Ahụ

Anyị bu ụzọ gbakọọ ihe ọ ga-efu anyị. Olee ebe anyị ga-enwe ike ịgaru n’ebe ahụ? Abalị ole ka anyị ga-anọ? Otu di na nwunye na ụmụ nwaanyị abụọ na-ekwusa ozi ọma oge niile bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ anyị kwuru na ha ga-eso anyị gaa. Anyị kwekọrịtara mgbe anyị ga-aga, ya bụ, n’oge ụmụ akwụkwọ ga-emechi akwụkwọ n’etiti afọ. Anyị degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Sydney, Australia, akwụkwọ ozi ka ha gwa anyị ebe anyị ga-aga ozi ọma n’ebe ahụ. Ha gwara anyị ka anyị gaa n’otu obodo dịpụrụ adịpụ nke dị nso na Goondiwindi, bụ́ otu ime obodo nke dị narị kilomita anọ site n’ebe ọwụwa anyanwụ Brisbane, bụ́ ebe anyị bi.

Anyị nụrụ na e nwere otu obere ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Goondiwindi. Nke a ga-enyekwuru anyị aka. Ndị nwoke na ndị nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst anyị ga-ahụ n’ebe ahụ ga-eme ka njem anyị tọgbuo onwe ya. Anyị zigaara ọgbakọ ahụ ozi na anyị na-abịa. Ozi ha ji obi ụtọ zighachiri anyị mere ka anyị mara na ha na-eche anyị eche.

Obere oge tupu anyị agawa, anyị niile zukọrọ iji kwurịta otú anyị ga-esi zie ndị bi n’ebe ahụ dịpụrụ adịpụ ozi ọma Alaeze Chineke. Nke ka nke bụ na anyị chọrọ ịkwanyere ndị nwe ala ebe ahụ bụ́ ndị anyị ga-ahụ ùgwù. Dị ka ihe atụ, ebo ụfọdụ n’ime ha weere na ala ha bụ ụlọ ha. Ya mere, ịga ebe ahụ n’agwaghị ha agwa bụ ịkparị ha akparị.

Anyị Gawara Ebe ahụ Dịpụrụ Adịpụ

N’ikpeazụ, ụbọchị anyị ga-aga ruru. Ezinụlọ anyị na ezinụlọ nke ọzọ bu ụgbọala abụọ ndị mmadụ na ngwongwo juru gawa. Anyị gafechara n’ebe a kọrọ ubi wee ruo n’ebe yiri ọzara nke nwere osisi ụfọdụ. Oge a bụ oge oyi, ma, anwụ na-acha, eluigwe gbachapụkwara agbachapụ. Mgbe awa ole na ole gachara, anyị rutere Goondiwindi, wee rahụ n’ụlọ anyị kwụrụ ụgwọ ya, n’ogige a na-edebe ụlọ a na-akpụgharị akpụgharị.

Mgbe chi bọrọ n’echi ya bụ́ Sunday, ihu igwe dị nnọọ mma ikwusa ozi ọma n’ihi na anwụ na-acha. Anyanwụ na-achasi ike n’ebe a n’oge ọkọchị! Ebe mbụ anyị kwụsịtụrụ bụ otu obodo ndị nwe ala bi, nke dị kilomita iri atọ site n’ebe anyị rahụrụ. A gwara anyị ka anyị gakwuru Jenny, bụ́ agadi nwaanyị isi chara awọ, bụ́ onye ndú obodo ahụ. O gere ntị nke ọma n’ozi ọma anyị ziri ya, o jikwa obi ụtọ nara akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. * E mechaa, ọ gwara anyị ka anyị banye n’obodo ha gaa zie ndị bi n’ebe ahụ ozi ọma.

Ụmụaka obodo ahụ ji ọsọ na-aga agwa ndị mmadụ na anyị na-abịa. Ndị niile anyị hụrụ n’ụlọ gere ntị nke ọma n’ozi ọma anyị ziri ha, natakwa anyị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ọ dịghị anya akwụkwọ niile anyị ji agwụ. Oge rukwara ka anyị laghachi n’ebe mepere emepe bụ́ ebe anyị ga-aga ọmụmụ ihe. Ma, tupu anyị alaa, anyị kwuru na anyị ga-abịaghachi hụ ndị anyị na-agabeghị na nke ha.

N’ehihie ahụ, ndị mmadụ ji obi ụtọ na-akparịta ụka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihi ihu ọhụrụ ndị ha hụrụ. Ndịàmà iri abụọ na ise bi n’ebe ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusara puku mmadụ iri na otu, bụ́ ndị bi n’obosara ala karịrị puku kilomita iri atọ, ozi ọma Alaeze. Otu Onyeàmà nke obi jupụtara n’ekele, sịrị: “Unu emeela gbalịa bịa nyere anyị aka.” Mgbe anyị gbasara ọmụmụ ihe, anyị niile gara tụrụ ndụ. Tupu anyị alaba n’abalị ahụ, anyị nyere ụmụ anụmanụ na-akpagharị n’ogige ahụ anyị hiri ihe oriri.

‘M Ga-akwanye Ọkụ n’Èzí n’Abalị A’

N’ime ụbọchị abụọ sochirinụ, anyị bu ụgbọala abụọ anyị gaa n’ebe ndị mmadụ bigasị n’ime ime obodo, n’ókè Queensland na New South Wales. Ọ bụ naanị osisi ole na ole kpọrọ nkụ dị n’obodo ndị ahụ, tinyere ala dị larịị ebe atụrụ na ehi na-ata ahịhịa. Anyị hụrụ ọtụtụ anụ ọhịa kangaruu n’ụzọ ka ntị ha na-eme ụṅara mgbe ha nụrụ mkpọtụ anyị. Anyị hụrụ nnụnụ mara mma ndị yiri enyí nnụnụ ka ha na-agagharị n’ogige ha dị uzuzu uzuzu, n’ebe dịtụ anya n’ebe anyị nọ.

N’ehihie Tuesday, anyị hụrụ ìgwè ehi ka ha ji nwayọọ nwayọọ na-aga n’okporo ụzọ. Ndị a na-akwụ ụgwọ ịchị ụmụ anụmanụ anaghị achị anụ agafe ebe a, karịchaa, n’oge oké ọkọchị. Ọ dịghị anya, anyị hụrụ otu onye na-achị anụ nke nọ n’elu ịnyịnya ya. M kwụsịrị n’akụkụ ụzọ, pụta n’ụgbọala wee kelee ya. Ya ekwe m. Agadi nwoke ahụ kwụsịrị ka mụ na ya kwurịta okwu, nkịta o ji achị ehi nọkwa ya n’akụkụ.

Mgbe mụ na ya kwutụrụ okwu banyere oké ọkọchị e nwere, m ziwere ya ozi ọma. O kwuru, sị, “Kemgbe m bụ nwata, o nwetụbeghị onye gwara m banyere Baịbụl!” Ọ sịrị na ọ bụ ndị ndú okpukpe mere ihe ọjọọ ji ju n’ụwa taa. N’agbanyeghị nke ahụ, o ji Baịbụl kpọrọ ihe. Mgbe anyị na ya kwurịtachara okwu site n’Akwụkwọ Nsọ, m nyere ya akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? * Ya anara m ya tinye n’akpa uwe ya wee sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-agwa m ihe Baịbụl kwuru, m ga-akwanye ọkụ n’èzí jiri ya gụọ ya n’abalị a.”

Anyị Lawara

N’abalị ahụ, anyị kọọrọ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze otú anyị si gaa. Ha kwere nkwa na ha ga-agaghachi na nke ndị nwere mmasị n’ozi ọma anyị ziri ha. Mgbe anyị gbasara ọmụmụ ihe, ọ dịrịghị anyị mfe ịhapụ ha lawa. Anyị na ha amalitela ịdị ná mma nke ukwuu. Ume ha gbara anyị na nke anyị gbara ha wusiri anyị niile ike.—Ndị Rom 1:12.

N’echi ya, anyị lawara. Anyị tụgharịrị uche na njem anyị wee kweta na Jehova gọziri mgbalị anyị nke ukwuu. Njem ahụ mere ka anyị bịarukwuo Jehova nso. Mgbe anyị lọtara, m jụrụ ụmụ m, sị: “Olee ebe unu ga-achọ ịga n’oge ọzọ unu ga-emechi akwụkwọ? Ùnu ga-achọ ịga rịa ugwu?” Ha zara, sị, “Papa, mba, anyị ga-aga ikwusa ozi ọma ọzọ n’ebe dịpụrụ adịpụ.” Nwunye m kwukwara, sị: “Ee, anyị ga-aga ebe ahụ. Ọ bụ ebe kacha mma anyị gatụrụla ezumike!”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ par. 17 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.