Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nwata Nwaanyị Izrel” nke Oge A

“Nwata Nwaanyị Izrel” nke Oge A

“Nwata Nwaanyị Izrel” nke Oge A

MGBE ọ fọrọ izu abụọ tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs eruo, onye ọ bụla n’ezinụlọ Sales, bụ́ ndị bi na Praia Grande, Brazil, dere aha ndị ọ ga-akpọ òkù n’akwụkwọ. E nyere Abigayl, bụ́ onye dị afọ isii, otu akwụkwọ ịkpọ òkù wee jụọ ya onye ọ ga-enye ya.

Ọ zara sị, “M ga-enye ya otu nwoke na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe ọ bụla ọ hụrụ m?

Ndị mụrụ ya jụrụ ya, sị, “Ònye ka ọ bụ?”

Ọ zara, sị, “Nwoke ahụ na-anọ n’ígwè ndị ngwọrọ.”

Mgbe ụbọchị anọ gafere, Abigayl gosiri ndị mụrụ ya nwoke ahụ. Nwoke ahụ aha ya bụ Walter bi nso n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe karịrị afọ iri na ise gara aga, nwoke ahụ nwere ihe mberede okporo ụzọ mgbe ọ dị afọ iri abụọ na asatọ, ahụ́ ya wee kpọnwụọ malite n’úkwù gbadaa. Ebe ọ bụ aka ji akụ̀, o nwere mmadụ abụọ na-eche ya nche. Mgbe ndị mụrụ Abigayl natara ikike ka Abigayl gwa Walter okwu, ha gwara nwoke ahụ na nwa ha nwaanyị chọrọ inye ya akwụkwọ ịkpọ òkù.

Mgbe Abigayl gwachara nwoke ahụ okwu, ọ sịrị ya: “Ndị ọzọ na-abịa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị nwetara ọtụtụ akwụkwọ ịkpọ òkù, ma, ọ bụ naanị otu ka e nyere m. Ya mere, ọ bụ naanị gị ka m na-akpọ òkù. Ọ bụrụ na ị bịaghị, ihe ọ pụtara bụ na o nweghị onye bịara n’aha m. Ma, ọ bụrụ na ị bịa, obi ga-atọ m ezigbo ụtọ, obi ga-atọkwa Jehova ụtọ karị.”

N’ụbọchị ahụ a ga-echeta Ọnwụ Jizọs, Abigayl na Ndịàmà ndị ọzọ nọ na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ọcha iji kwadebe maka Ncheta ahụ a ga-enwe n’anyasị. N’ehihie ahụ, Walter nọ n’ụgbọala na-agafe, mgbe ọ hụrụ Abigayl, ọ gwara onye na-akwọrọ ya ụgbọala ka ọ kwụsị. O meghere windo ya, wee jụọ Abigayl ihe ọ na-eme. Ọ gwara ya na ha na-edebe ụlọ nzukọ ha ọcha ka ọ dị mma mgbe ọ ga-abịa.

Ná mgbede ahụ, ahụ́ erughị Abigayl ala. Okwu malitere, ya anọrọ na-elegharị anya ka ọ hụ ma Walter ọ̀ bịala. Na mberede, ya na ndị na-eche ya nche bịara. Ọnụ ọchị ekweghị Abigayl fụnwuo ọkụ. Mgbe ihe omume ahụ gachara, Walter kwuru na ya nọ na-aga obodo ọzọ ma mechaa gbanwee obi ya wee bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ka obi dị Abigayl mma. O kwukwara, sị: “Ihe m nụrụ bụ ụdị okwu ahụ́ m chọrọ.” Ọ rịọrọ ka e nye ya Baịbụl, a malitekwara ịkụziri ya Baịbụl, ọ malitekwara ịga ọmụmụ ihe.

N’ime oge a, nwanne Walter sịrị na ya chọrọ ịhụ Abigayl, bụ́ onye nwanne ya na-ekwu okwu ya mgbe niile. Mgbe ọ hụrụ Abigayl, obi tọrọ ya ụtọ ịhụ na Abigayl bụ ezigbo nwata. Ọ sịrị: “Ahụla m ihe mere obi ji dị nwanne m ụtọ nke ukwuu.”

Walter ka na-amụ ihe, na-agakwa ọmụmụ ihe. Ọ na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, na-agwakwa ndị ọzọ ihe ọ na-amụta. N’ezie, nwata a bụ́ Abigayl na-echetara anyị nwata nwaanyị Izrel bụ́ onye nyeere Neaman aka ịmata ezi Chineke, bụ́ Jehova.—2 Ndị Eze 5:2-14.