Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’Asụsụ Igbo

E Wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’Asụsụ Igbo

Ọganihu Pụrụ Iche Ndị Chineke Nwere!

E Wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’Asụsụ Igbo

NDỊ Chineke nwere ọganihu pụrụ iche n’October 5, 2007: E wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Igbo.

Ugbu a, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ esonyewo na Baịbụl ndị na-atụ egwu Chineke n’ala Igbo na-agụ kemgbe. Gịnị mere o ji dị mkpa ka a sụgharịa Baịbụl ọzọ? Olee ndị bipụtara ya? Oleekwa ihe ndị mere ị ga-eji tụkwasị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ obi?

Gịnị Mere E Ji Nwee Ọtụtụ Nsụgharị Baịbụl?

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e bipụtawo ọtụtụ nsụgharị Baịbụl ndị ọhụrụ. Nsụgharị ọhụrụ ụfọdụ emewo ka e nwee ike ịgụ Okwu Chineke nke mbụ ya n’asụsụ ụfọdụ. Otú ọ dị, a na-asụgharịkwa Baịbụl ndị ọhụrụ n’asụsụ ndị e nwere nsụgharị Baịbụl ndị gbanyeworo mgbọrọgwụ. N’ihi gịnị? Akwụkwọ bụ́ So Many Versions? (Gịnị Mere E Ji Nwee Ọtụtụ Nsụgharị?), nke Sakae Kubo na Walter Specht dere, kwuru, sị: “O nweghị nsụgharị Baịbụl a ga-ewere na ọ bụ ya bụ nsụgharị ikpeazụ. A ghaghị ịnọgide na-eme nsụgharị n’ihi ihe a na-amụtakwu banyere Baịbụl, nakwa n’ihi na asụsụ na-agbanwe agbanwe.”

N’ime otu narị afọ gara aga, a ghọtakwuola asụsụ Hibru, Arameik, na Grik nke ọma, bụ́ asụsụ ndị e ji dee Baịbụl n’oge e dere ya. A hụkwuola ihe odide Baịbụl ndị mere ochie na ndị ziri ezi karịa ndị nke ndị sụgharịrị Baịbụl n’oge gboo ji sụgharịa Baịbụl. Ya mere, e nwere ike ịsụgharị Baịbụl n’ụzọ ziri ezi taa karịa otú e metụrụla.

Akwụkwọ bụ́ The Atlantic Monthly kwuru banyere ịchụ nta ego, sị: “E ji ibipụta Baịbụl akpa ezigbo ego.” Mgbe ụfọdụ, ihe na-adị ndị mmadụ mkpa bụ ibipụta Baịbụl ga-akacha gaa ahịa karịa ibipụta nke ziri ezi. Ndị bipụtara otu Baịbụl n’oge na-adịbeghị anya wepụrụ ebe ụfọdụ ha chere “na-agwụ ike ọgụgụ.” Ndị bipụtara Baịbụl ọzọ gbanwere okwu ọ bụla ha chere na ọ gaghị adị ndị na-agụ ya n’oge a mma. Dị ka ihe atụ, ha gbalịrị ime ka obi dị ndị na-ekwu na ndị inyom na ndị ikom hà nhata mma site n’ịkpọ Chineke “Nna bụ́ Nne.”

Izochi Aha Chineke

Ma eleghị anya, ihe kacha njọ a na-eme bụ ihe a na-eme aha Chineke, bụ́ Jehova. (Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-asụgharị ya “Yahweh.”) Na Baịbụl e dere n’oge ochie, e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ nke a na-asụgharị YHWH ma ọ bụ JHVH dee aha Chineke. Naanị ná mpaghara ahụ a na-akpọ Agba Ochie, aha a nke ọ bụ naanị Chineke na-aza, pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro puku asaa. (Ọpụpụ 3:15; Abụ Ọma 83:18) Ya mere, o doro anya na ọ bụ nzube Onye Okike anyị ka ndị na-efe ya mara aha ahụ ma na-akpọ ya!

Otú ọ dị, egwu na-enweghị isi ndị Juu na-atụ n’ọtụtụ narị afọ gara aga mere ka ha kwụsị ịkpọ aha Chineke. Ka oge na-aga, Ndị Kraịst malitekwara inwe ụdị echiche ahụ. (Tụlee Ọrụ 20:29, 30; 1 Timoti 4:1.) Ndị na-asụgharị Baịbụl wee malite iji utu aha bụ́ “Onyenwe anyị” na-edochi aha Chineke. Taa, aha Chineke adịghị ma ọlị n’ọtụtụ Baịbụl. Ụfọdụ Baịbụl Bekee a sụgharịrị n’oge a wepụrụ okwu bụ́ “aha” na Jọn 17:6, bụ́ ebe Jizọs kwuru, sị: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè.” Lee otú nsụgharị bụ́ Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik si sụgharịa amaokwu a: “Emeela m ka ndị ahụ . . . mara onye ị bụ.”

Gịnị mere e ji kpọọ aha Chineke asị otú a? Chee echiche banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ bụ́ Practical Papers for the Bible Translator. (Nke 43, nọmba nke 4, 1992) Ọ bụ United Bible Societies, nke na-ahụ maka ịsụgharị Baịbụl n’ọtụtụ ebe n’ụwa, bipụtara ya. Otu isiokwu e dere na ya sịrị: “Ebe o doro anya na YHWH bụ aha Chineke, ụzọ kacha mma isi sụgharịa ya bụ iji mkpụrụ akwụkwọ nke asụsụ a na-asụgharị dee ya.” Ma, isiokwu ahụ dọrọ aka ná ntị, sị: “Otú ọ dị, e nwere ihe ụfọdụ a na-aghaghị iburu n’uche.”

‘Ihe ndị ahụ a na-aghaghị iburu n’uche’ hà rijuru afọ? Dị ka akwụkwọ a kwuru, ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na anyị edee aha ahụ bụ́ Yahweh, [ndị na-abụghị Ndị Kraịst] nwere ike ịghọta ihe dị iche . . . , ha nwere ike iche na ‘Yahweh’ bụ Chi ndị ala ọzọ, ma ọ bụ Chi ọhụrụ a na-amaghị ama, nke dị iche na Chineke ha ma.” Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na Jehova bụ́ Chineke dị iche na chi dị iche iche ndị na-abụghị Ndị Kraịst na-efe!—Aịzaya 43:10-12; 44:8, 9.

Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-ekwu na mgbe ha ji utu aha ahụ bụ́ “Onyenwe anyị” dochie aha Chineke na naanị ihe ha mere bụ ịgbaso ihe ndị ọzọ na-eme. Ma, Jizọs katọrọ ịgbaso ihe ndị ọzọ na-eme nke na-anaghị ewetara Chineke nsọpụrụ. (Matiu 15:6) E wezụga nke ahụ, iji utu aha na-edochi ezigbo aha adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ. Jizọs Kraịst nwere ọtụtụ utu aha, dị ka “Okwu Chineke” na “Eze nke ndị eze.” (Mkpughe 19:11-16) È kwesịrị iji otu n’ime utu aha ndị a dochie aha ya bụ́ Jizọs?

Isiokwu ọzọ dị n’akwụkwọ ahụ a kpọrọ aha na mbụ kwuru, sị: “E kwesịghị ide ‘Jehova.’” N’ihi gịnị? “Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ọ bụ ‘Yahweh’ bụ ụzọ kacha mma isi ede aha ahụ dabere n’otú e si akpọ ya na mbụ.” Ka o sina dị, a na-asụgharịkwa aha dị iche iche a maara nke ọma bụ́ ndị dị na Baịbụl dị ka Jeremaya, Aịzaya, na Jizọs n’ụzọ na-eyighị otú e si akpọ ha na mbụ n’asụsụ Hibru (Yir·meyahʹ, Yeshaʽ·yaʹhu, na Yehoh·shuʹaʽ). Ebe ọ bụ na “Jehova” bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi sụgharịa aha Chineke—bụrụkwa nke ọtụtụ ndị maara—ikwu na e kwesịghị ide ya erijughị afọ. N’ezie, ọ ga-abụ n’ihi mmasị a na-enweghị n’aha Chineke na asị a kpọrọ ya mere na a naghị ede ya ná nsụgharị Baịbụl dị iche iche, ọ bụghị n’ihi ihe ndị ọkà mmụta chọpụtara.

Otú ọ dị, nke a abụghị naanị okwu metụtara nkà mmụta. Dị ka ihe atụ, otu onye na-anọchi anya United Bible Societies n’India dere banyere nsogbu ndị dị n’iwepụ aha Chineke na Baịbụl ndị e bipụtarala bụ́ ndị aha ahụ dịbu. Ọ sịrị: “Ndị Hindu achọghị ịma ihe bụ́ utu aha Chineke; ihe ha chọrọ ịma bụ ezigbo aha Chineke, ha na onye nwe aha ahụ agaghịkwa enwe mmekọrịta ọ gwụla ma ha maara aha ya.” N’eziokwu, otú a ka ọ dị ndị niile na-achọ Chineke. Ịmata aha Chineke dị oké mkpa iji ghọta onye ọ bụ, ọ bụghị ịmata ya dị ka ikike efu, kama dị ka onye—onye anyị pụrụ ịmata. (Ọpụpụ 34:6, 7) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Ndị Rom 10:13) Ndị na-efe Chineke aghaghị ịdị na-akpọ aha ya!

Nsụgharị nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

Ya mere, e nwere ọganihu pụrụ iche n’afọ 1950, mgbe mbụ e bipụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Bekee. N’ime afọ iri sochiri ya, e ji nke nta nke nta bipụta nkebi dị iche iche nke ihe ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie, ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’afọ 1961, e bipụtara Baịbụl zuru ezu n’asụsụ Bekee. Ọ dị mma ịmara na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ dere aha nsọ ahụ bụ́ Jehova n’ebe niile ọ pụtara ‘n’Agba Ochie,’ nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku asaa. Ihe magburu onwe ya bụ mweghachi o weghachiri aha Chineke narị ugboro abụọ na iri atọ na asaa ‘n’Agba Ọhụrụ,’ ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Ọ bụghị naanị na iweghachi aha ahụ na-ewetara Chineke nsọpụrụ, kama o nwere ihe ọhụrụ ọ na-eme ka anyị ghọta. Iji maa atụ, lee otú ọtụtụ Baịbụl si sụgharịa Matiu 22:44: “Onyenwe anyị sịrị Onyenwe m.” Olee onye na-agwa ibe ya okwu? Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ sụgharịrị amaokwu a otú a, “Jehova gwara Onyenwe m,” bụ́ nke kwekọrọ n’otú e si dee ya n’Abụ Ọma 110:1. Ya mere, ndị na-agụ ya ga-enwe ike ịmata ọdịiche dị oké mkpa dị n’agbata Jehova Chineke na Ọkpara ya.

Olee Ndị Bipụtara Ya?

Ọ bụ Watch Tower Bible and Tract Society, bụ́ ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke na-anọchite anya Ndịàmà Jehova, na-ebipụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ndịàmà Jehova na-ebipụta ma na-ekesa Baịbụl n’ụwa niile kemgbe ihe karịrị otu narị afọ. Ọ bụ Ndị Kraịst so na Kọmitii Nsụgharị Baịbụl Ụwa Ọhụrụ nyefere Ndịàmà Jehova Baịbụl a. Kama ịchọ ka ha bụrụ ndị a ma ama, ndị so na kọmitii a rịọrọ ka a ghara ime ka a mata ndị ha bụ ọbụna mgbe ha nwụrụla.—Tụlee 1 Ndị Kọrịnt 10:31.

Gịnị mere e ji kpọọ Baịbụl a Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ? Nke a na-egosi nkwenye ha kwenyesiri ike na ụmụ mmadụ nọ “n’ọnụ ụzọ nke ụwa ọhụrụ” ahụ e kwere nkwa ya na 2 Pita 3:13. Dị ka kọmitii ahụ dere, ọ dị mkpa ka nsụgharị dị iche iche nke Baịbụl mee ka “eziokwu dị ọcha nke dị n’Okwu Chineke” pụta ìhè ‘n’oge a e si n’ụwa ochie na-abanye’ n’ụwa ọhụrụ.—Gụọ Okwu Mmalite nke mbipụta nke 1950.

Nsụgharị Ziri Ezi

E lekwasịrị anya karịchaa n’ịhụ na o ziri ezi. Ndị sụgharịrị mbipụta nke Bekee si kpọmkwem n’asụsụ Hibru, Arameik, na Grik e ji dee ya sụgharịa ya. Ọ bụ ihe odide ndị kacha mma e nwere ka ha ji sụgharịa ya. * A kpachapụrụ nnọọ anya hụ na a sụgharịrị ihe odide oge ochie ndị ahụ otú e si dee ha n’asụsụ ndị e ji dee ha na mbụ ruo n’ókè o kwere mee. Ma, a sụgharịrị ya otú ọ ga-adịrị ndị na-agụ ya n’oge a mfe nghọta.

Ọ bụghị ihe ijuanya na ụfọdụ ndị ọkà mmụta ajawo Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ mma maka otú o si zie ezi ma bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Prọfesọ Benjamin Kedar, bụ́ ọkà mmụta asụsụ Hibru n’Israel, kwuru n’afọ 1989, sị: “Mgbe m na-eme nchọpụta banyere okwu ndị dị na Baịbụl Hibru nakwa otú e si sụgharịa ha, ọtụtụ mgbe m na-enyocha Baịbụl a maara dị ka Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee. M nyochaa ya, m na-achọpụta ugboro ugboro na ihe m chere bụ eziokwu, ya bụ, na a kwụwara aka ọtọ mgbe a na-eme nsụgharị a iji hụ na a ghọtara kpọmkwem ihe Baịbụl na-ekwu ruo n’ókè o kwere mee.”

Iwepụta Ya n’Asụsụ Dị Iche Iche

N’ihi ya, Ndịàmà Jehova emewo ka e nwee Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ndị ọzọ na-abụghị Bekee. Ka ọ dị ugbu a, e bipụtala ya ma n’ozuzu ya ma nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik n’asụsụ iri isii na asatọ. Iji mee ka ọrụ ịsụgharị Baịbụl dị mfe, e wepụtara ụzọ isi na-eme nsụgharị nke na-eme ka e jiri kọmputa na-amụ okwu dị iche iche dị na Baịbụl. E hiwekwara Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-elekọta ọrụ nsụgharị Baịbụl site n’aka Kọmitii Na-ahụ Maka Ide Ihe nke ọ họpụtara. Olee otú e si arụ ọrụ a?

Ihe mbụ a na-eme bụ ịhọpụta Ndị Kraịst nyefere Chineke onwe ha ka ha bụrụ ndị nsụgharị. A chọpụtawo na ọ bụrụ na ndị nsụgharị arụkọọ ọrụ ọnụ, kama ịrụ ya iche iche, ihe ha na-asụgharị na-aka mma, kakwa ụtọ ọgụgụ. (Tụlee Ilu 11:14.) Ọtụtụ mgbe, ndị na-eso eme nsụgharị a na-abụ ndị aka ochie n’ịsụgharị akwụkwọ Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụ, a na-enye ha ezigbo ọzụzụ n’otú e si asụgharị Baịbụl nakwa n’ụzọ pụrụ iche e si eji kọmputa asụgharị ya.

A na-agwa ha ka ha wepụta Baịbụl (1) ziri ezi, (2) nke a sụgharịrị okwu Hibru na okwu Grik nke ọ bụla otu ihe n’ebe ọ bụla o kwere mee, (3) nke a sụgharịrị kpọmkwem otú e si dee ya n’asụsụ mbụ e ji dee ya, ma bụrụ (4) nke ga-adịrị ndị nkịtị mfe nghọta. Olee otú e si eme nke a? Weregodị Baịbụl a e wepụtara ọhụrụ dị ka ihe atụ. Ndị sụgharịrị ya malitere ọrụ site n’ịhọrọ okwu Igbo ha ga-eji sụgharịa okwu niile bụ́ isi dị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee. A rụrụ kọmputa ha ji mee nsụgharị otú ọ ga na-ebupụta okwu ndị dị na Baịbụl ha na ibe ha yiri nakwa okwu ndị ọzọ ha na ibe ha pụtara otu ihe. Ọ na-ebupụtakwa okwu Grik ma ọ bụ Hibru ndị e ji dee Baịbụl na mbụ, bụ́ ndị e si na ha sụgharịa okwu Bekee ndị ahụ, ka onye nsụgharị wee nwee ike ịmata otú e si sụgharịa okwu Grik ma ọ bụ Hibru ndị ahụ n’ebe ndị ọzọ ha pụtara. Ihe a niile nyeere ha aka nke ukwuu mgbe ha na-ahọrọ okwu Igbo ndị ha na okwu Bekee kwekọrọ. Ozugbo ndị nsụgharị ahụ nwere otu olu n’okwu ndị ahụ, ha malitere ịsụgharị Baịbụl. Mgbe ha na-asụgharị amaokwu nke ọ bụla, kọmputa na-ebupụta okwu Igbo ndị ahụ ha họọrọla.

Otú ọ dị, ime nsụgharị abụghị iji otu okwu edochi okwu ọzọ. A gbalịsiri ike ịhụ na okwu Igbo ndị a họọrọ iji sụgharịa amaokwu nke ọ bụla wepụtara echiche ziri ezi nke dị n’Akwụkwọ Nsọ. A kpachapụrụ anya iji hụ na ụtọ asụsụ e dere na ya na otú e si hazie okwu ndị dị na ya dị ụtọ ọgụgụ. Mgbalị e tinyere iji sụgharịa Baịbụl a pụtara ìhè. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Igbo sụgharịrị Okwu Chineke ka ọ dị mfe ọgụgụ, ka o doo anya ma kwe nghọta, ọ gbasochikwara ihe odide Hibru na Grik anya.

Anyị na-agba gị ume ka i nyochaa Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’onwe gị. I nwere ike inweta ya site n’aka ndị bipụtara magazin a ma ọ bụ nweta ya n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị n’ebe i bi. Mgbe ị na-agụ ya, nwee obi ike na e ji ikwesị ntụkwasị obi sụgharịa ihe Chineke kwuru. O doro anya na ọ gaghị adị anya gị ekweta na mwepụta e wepụtara ya na nso nso a bụ n’eziokwu ọganihu pụrụ iche ndị Chineke nwere!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 The New Testament in the Original Greek, nke Westcott na Hort dere, bụ ihe odide bụ́ isi e ji sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Grik. Biblia Hebraica nke R. Kittel dere bụ ihe odide bụ́ isi e ji sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru.

[Igbe dị na peeji nke 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ihe Ụfọdụ Dị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

A Na-ahụ Ya nke Ọma, Ọ Dịkwa Mfe Ọgụgụ

A Haziri Amaokwu Ya Dị Iche Iche Ka Ha Dịrị na Paragraf na Paragraf: Kama ime ka amaokwu ya nke ọ bụla bụrụ otu paragraf, a haziri ha ka ha dịrị na paragraf na paragraf. Nke a na-enyere onye na-agụ ya aka ịghọta ọkpụrụkpụ ihe ndị dere Baịbụl na-ekwu.

Okwu Ndị Bụ́ Isi Dị n’Elu Peeji: Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha dị na peeji niile, ha na-enye aka ịchọta ihe e dere na Baịbụl ngwa ngwa.

Ihe Ndị E Dere n’Etiti Peeji: N’etiti peeji nke ọ bụla, e nwere ihe ndị e dere ndị ga-eduga gị n’ebe ndị ọzọ e kwuru ihe yiri ya na Baịbụl.

Okwu Ndị Dị na Baịbụl: E nwere ebe a kpọrọ “Ndepụta nke Okwu Ndị Dị na Baịbụl” ná ngwụcha Baịbụl a. E dere okwu ụfọdụ na ya, deekwa ebe ha dị n’ime Baịbụl na okwu ndị na-egosi otú e si dee ha.

Ihe Odide Ntụkwasị: E dere ihe ụfọdụ bụ́ isi dị na Baịbụl na isiokwu ndị ọzọ yiri ha ná nkenke.

[Foto dị na peeji nke 26]

Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ