Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tel Arad Na-agba Àmà n’Ekwughị Okwu

Tel Arad Na-agba Àmà n’Ekwughị Okwu

Tel Arad Na-agba Àmà n’Ekwughị Okwu

Obodo a na-amakwaghị ebe ọ dị. Ụlọ nsọ a na-amaghị ihe ọ bụla banyere ya. Ọtụtụ ihe odide ndị mgbe ochie. Akụkọ ndị a nwere ike ịdị ka ihe e mere na fim. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ruo ọtụtụ narị afọ, ihe a niile na ihe ndị ọzọ dị n’ime ala, n’ọzara, bụ́ ebe ájá kpuchiri ha na Tel Arad, Israel, ruo mgbe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie malitere igwu ala n’ebe ahụ.

TAA, ọtụtụ ndị na-eje n’obodo Arad nke oge a na-ewere ya na ọ bụ otu n’ime obodo ndị Israel. Ma, obodo a dị n’ala ịkpa Judia, n’ebe ọdịda anyanwụ nke Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Puku mmadụ iri abụọ na puku asaa bi na ya. Otú ọ dị, ebe obodo Erad oge ochie nke dị n’Izrel dịbu bụ n’ebe dị ihe dị ka kilomita asatọ n’ebe ọdịda anyanwụ ebe ahụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie ji nlezianya kpopụchaa ájá wee hụ ọtụtụ ihe e wuru n’oge ochie na ọtụtụ ihe odide.

A hụrụ ihe odide ndị ahụ ná mpekere ihe dị iche iche e ji ụrọ kpụọ bụ́ ndị e ji mere ihe e ji ede ihe. Ọ bụ otú ahụ ka e si ede ihe n’oge ochie. E kwuru na ihe e ji ụrọ kpụọ e ji mere ihe e ji ede ihe bụ́ ndị e gwupụtara na Tel Arad karịrị ụdị ya e gwupụtatụrụla n’Israel. Ma, olee uru ihe ndị a e gwupụtara bara?

Ihe ndị ahụ e gwupụtara na Tel Arad bụ ihe Baịbụl kọrọ akụkọ ha, ndị mere malite n’oge Ndị Ikpe Izrel ruo n’oge ndị Babịlọn bibiri Juda na 607 T.O.A. Ya mere, ihe ndị a a hụrụ na-egosi na Baịbụl ziri ezi. Ha na-egosikwa anyị ihe ndị na-eme ka anyị mara otú ndị biri n’Izrel oge ochie si lee aha Chineke anya.

Ihe A Kọrọ Banyere Erad n’Ime Baịbụl

N’eziokwu, o nweghị ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru banyere Erad. Ma, o nwere mgbe obodo a dị mkpa bụ ebe ndị ahịa si agafe. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na akụkọ e dere ede na ihe ndị mgbe ochie a chọpụtara na-egosi na e meriela obodo ochie a ugboro ugboro, bibiekwa ya ma wughachi ya ma n’oge ọma ma n’oge ọjọọ. Owuwu e wughachiri ya ọtụtụ ugboro mere ka o nwee nnukwu tell, ma ọ bụ mkputamkpu ala.

Oge mbụ Baịbụl kwuru banyere Erad bụ mgbe ọ na-akọ ihe ndị ikpeazụ mere mgbe njem ụmụ Izrel jere afọ iri anọ n’ala ịkpa gwụwara. N’oge na-adịghị anya nwanne Mozis, bụ́ Erọn, nwụrụ, ndị nke Chineke rutere nso n’ebe ndịda ókè Ala Nkwa ahụ. O doro anya na eze Erad bụ́ onye Kenan chere na ọ ga-adịrị ya mfe imeri ndị a na-agagharị n’ala ịkpa. O wee buso ha agha. Site n’enyemaka Jehova bụ́ Chineke, ndị Izrel busogwaara ha agha wee merie ha kpamkpam, bibie obodo ha, ọ bụ ezie na o doro anya na o nwere ndị na-anwụghị n’ime ha.—Ọnụ Ọgụgụ 21:1-3.

Ndị Kenan ahụ wughachiri obodo ha ahụ dị oké mkpa n’egbughị oge; mgbe Jọshụa ruru ebe ahụ ka afọ ole na ole gachara, ọ malitere ibuso ndị Kenan agha site n’ebe ugwu, jiri nke nta nke nta na-ebibi ha malite ‘n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa Negeb.’ Otu n’ime ndị iro chere ya ihu bụ “eze Erad.” (Jọshụa 10:40; 12:14) Mgbe e mechara, ụmụ Hobab, onye Kenaịt, ndị ọ ga-abụ na ha sonyeere ụmụ Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa, biri n’akụkụ Negeb a.—Ndị Ikpe 1:16.

Ihe Ndị Mgbe Ochie A Hụrụ

Ihe ndị mgbe ochie a hụrụ na Tel Arad na-akwado akụkọ ụfọdụ ọzọ a kọrọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ọtụtụ mgbidi. E kwuru na ọ ga-abụ n’oge ọchịchị Eze Sọlọmọn, bụ́ onye a ma na o wuru ọtụtụ ihe owuwu, ka e wuru ụfọdụ n’ime ha. (1 Ndị Eze 9:15-19) Otu n’ime mgbidi ahụ nwere ihe àmà na-egosi na a gbara ya ọkụ, e kwukwara na ọ bụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị itoolu gara aga ka e wuru ya. Ọ ga-abụ na a gbara ya ọkụ a n’oge eze Ijipt bụ́ Shaịshak busoro obodo ahụ agha, naanị afọ ise mgbe Sọlọmọn nwụrụ. Na Karnak, nke dị n’ebe ndịda Ijipt, e nwere ihe a tụrụ ná mgbidi nke e ji echeta agha ahụ, Erad sokwa n’ọtụtụ obodo ndị e meriri.—2 Ihe E Mere 12:1-4.

Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị nke ukwuu na e dere aha Hibru ndị e dere na Baịbụl, ndị dị ka Pash-họ, Meremọt na aha ụmụ Kora, n’ọtụtụ n’ime ihe dị ka narị ihe e ji ụrọ kpụọ abụọ e gwupụtara. Ihe ọzọ ka mkpa mere ha ji adọrọ mmasị bụ na e dere aha Chineke n’ụfọdụ n’ime ha. Ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ bụ́ יהוה (YHWH), nke a na-akpọkarị Tetragramatọn, bụ aha naanị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile na-aza. Mgbe e mechara, nkwenkwe ụgha mere ka ọtụtụ ndị kwere na ịkpọ aha Chineke ma ọ bụ ide ya ede bụ arụ. Ma, ihe ndị a hụrụ na Tel Arad, na ọtụtụ ihe àmà ndị ọzọ, na-egosi na n’oge ochie ndị mmadụ na-akpọ aha Chineke n’ọtụtụ ihe ha na-eme ná ndụ ha, ma n’ikele ekele ma n’ịgọzi ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, otu ihe e dere ede sịrị: “Nye onyenwe m bụ́ Elyashib. Ka Yahweh [ya bụ, Jehova] lebara ọnọdụ gị anya. . . . Ọ nọ n’ụlọ nsọ Yahweh.”

Ma, oleekwanụ banyere ụlọ nsọ a na-amaghị ihe ọ bụla banyere ya nke e kwuru okwu ya ná mmalite? E nweela ọtụtụ ihe e kwuru banyere ụlọ nsọ a hụrụ na Tel Arad nke nwere ebe ịchụàjà, bụ́ nke e wuru n’oge alaeze Juda na-achị. Ọ bụ ezie na ụlọ nsọ a aharughị ka ụlọ nsọ Sọlọmọn wuru na Jeruselem, o yiri ya n’ọtụtụ ụzọ. Gịnị mere e ji wuo ụlọ nsọ ahụ dị n’Erad, oleekwa mgbe e wuru ya? Gịnị ka e ji ya mee? Naanị ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nwere ike ikwu bụ ihe ha chere.

Jehova kwuru hoo haa na ụlọ nsọ nke dị na Jeruselem bụ naanị ebe ọ nabatara ka a nọrọ na-achụrụ ya àjà ma na-eme ememme ndị a na-eme kwa afọ. (Diuterọnọmi 12:5; 2 Ihe E Mere 7:12) Ya mere, owuwu e wuru ụlọ nsọ ahụ dị n’Erad na ihe niile e ji ya mee bụ inupụrụ Iwu Chineke isi, ikekwe, ọ ga-abụ n’oge ha hapụrụ ofufe dị ọcha wee lekwasị anya n’ebe ịchụàjà na omenala ndị ọzọ. (Ezikiel 6:13) Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ n’oge Hezekaya ma ọ bụ n’oge Josaya ka e bibiri ebe a a na-anọ efe ofufe ụgha mgbe ha mere ka e nwee mgbanwe dị ukwuu n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga ma ọ bụ puku afọ asaa na narị afọ isii gara aga.—2 Ihe E Mere 31:1; 34:3-5, 33.

O doro anya na ihe ndị fọdụrụ n’Erad nwere ihe ndị dị mkpa ha na-akụziri anyị. E gwupụtala arịa dị iche iche ndị ájá kpuchiri kemgbe ọtụtụ narị afọ bụ́ ndị na-egosi na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu, ndị na-egosikwa otú ofufe ụgha rụrụ arụ si malite ma daa, na-egosikwa otú e si na-akpọ aha Jehova ma na-akwanyere ya ùgwù mgbe niile n’oge ahụ.

[Map/Foto dị na peeji nke 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

JERUSELEM

Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ

Erad

Tel Arad

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ihe a tụrụ ná mgbidi dị na Karnak, Egypt

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ihe e dere n’ebe a sịrị: “Ka Yahweh [ya bụ, Jehova] lebara ọnọdụ gị anya”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto © Israel Museum, Jerusalem; a natara Israel Antiquities Authority ike see ya

[Foto dị na peeji nke 25]

Otu akụkụ nke ụlọ nsọ dị na Tel Arad

[Foto dị na peeji nke 25]

Akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe e wusiri ike na Tel Arad

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 25]

Todd Bolen/Bible Places.com