Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Banyere Otú Anyị Ga-esi Na-emeso Ndị Ọzọ Ihe

Banyere Otú Anyị Ga-esi Na-emeso Ndị Ọzọ Ihe

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Otú Anyị Ga-esi Na-emeso Ndị Ọzọ Ihe

Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee obiọma?

Ị̀ na-emeso ndị mmadụ ihe n’obiọma n’agbanyeghị na ha anaghị emeso gị ihe n’obiọma? Ọ bụrụ na anyị chọrọ iṅomi Jizọs, anyị aghaghị iji obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe ọbụna ndị kpọrọ anyị asị. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee uru ọ baara unu? N’ihi na ọbụna ndị mmehie bụ ndị hụrụ ha n’anya ka ha na-ahụ n’anya. . . . Kama nke ahụ, na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, . . . unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kasị Elu, n’ihi na o nwere obiọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ.”—Luk 6:32-36; 10:25-37.

Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agbaghara ndị ọzọ?

Mgbe anyị mere mmehie, anyị na-achọ ka Chineke gbaghara anyị. Jizọs kụziiri anyị na ọ dị mma ka anyị na-arịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị. (Matiu 6:12) Ma, Jizọs kwukwara na Chineke ga-agbaghara anyị naanị ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.”—Matiu 6:14, 15.

Olee otú ezinụlọ nwere ike isi nwee obi ụtọ?

Ọ bụ ezie na Jizọs alụghị nwunye, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka ya banyere otú anyị ga-esi nwee obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. O setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya anyị ga-eṅomi site n’ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere. Tụlee ụzọ ihe atọ a:

1. Di aghaghị ịhụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ ahụ́ nke ya. Jizọs setịpụụrụ ndị bụ́ di ihe nlereanya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya.” Olee otú ha ga-ahụru ibe ha n’anya? Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya.” (Jọn 13:34) Baịbụl chetaara ndị bụ́ di iwu a, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya. N’ụzọ dị otú a, ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya, dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya.”—Ndị Efesọs 5:25, 28, 29.

2. Di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị ịkpa n’èzí. Nwoke lụrụ nwunye ma ọ bụ nwaanyị lụrụ di na onye ọzọ inwe mmekọahụ bụ mmehie n’anya Chineke, ọ na-aghasakwa ezinụlọ. Jizọs sịrị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na . . . ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya. . . . Ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Matiu 19:4-9.

3. Ụmụaka aghaghị ido onwe ha n’okpuru ndị mụrụ ha. Ọ bụ ezie na Jizọs bụ nwata zuru okè, nne na nna ya abụrụ ndị na-ezughị okè, o rubeere ha isi. Baịbụl kọrọ banyere Jizọs mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, sị: “O wee soro ha [ya bụ, nne na nna ya] gbadaa ma bịaruo Nazaret, ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.”—Luk 2:51; Ndị Efesọs 6:1-3.

Gịnị mere anyị ga-eji tinye iwu ndị a n’ọrụ?

Jizọs kwuru banyere ihe ndị ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, si: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.” (Jọn 13:17) Ọ bụrụ na anyị bụ ezi Ndị Kraịst, anyị aghaghị ime ihe Jizọs gwara anyị banyere otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe. Ọ sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere ezinụlọ, gụọ isi nke iri na anọ nke akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ihe atụ Jizọs mere banyere nwa mmefu na-akụziri anyị na obiọma na mgbaghara mmehie dị mkpa.—Luk 15:11-32

[Foto dị na peeji nke 17]

Di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị ịkpa n’èzí