Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-egosi Obi Ekele?

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-egosi Obi Ekele?

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-egosi Obi Ekele?

“Ezigbo Raquel,

I meela nke ukwuu maka otú i si agba m ume. Omume ọma gị na okwu ọma gị enyerela m aka nke ukwuu, ọ bụ ezie na ị maghị.”—Jennifer.

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe i nwetara akwụkwọ ozi ị na-atụghị anya ya nke mmadụ detaara gị iji kelee gị maka ihe i meere ya? Ọ bụrụ na ọ dịla mgbe i nwetara ya, o doro anya na o mere gị obi ụtọ. A sị ka e kwuwe, ọ dịghị onye obi na-anaghị adị ụtọ ma e kelee ya maka ihe o mere.—Matiu 25:19-23.

Ekele na-eme ka onye nyere onyinye na onye e nyere onyinye dịkwuo ná mma. Ihe ọzọ bụ na onye na-egosi obi ekele na-eme ihe Jizọs Kraịst mere, bụ́ onye gosiri obi ekele maka ihe dị mma ndị ọzọ mere.—Mak 14:3-9; Luk 21:1-4.

Ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị anaghịzi ekele ndị meere ha ihe ọma, ma ọ̀ bụ iji ọnụ kelee ha ma ọ̀ bụ ide ya n’akwụkwọ ozi. Baịbụl dọrọ aka ná ntị na “n’oge ikpeazụ” ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-enweghị ekele.” (2 Timoti 3:1, 2) Ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya, enweghị ekele nke juru ebe niile taa nwere ike ime ka anyị ghara inwe ekele.

Olee ihe ndị mụrụ ụmụ ga-eme iji kụziere ụmụ ha ka ha na-enwe obi ekele? Ònye ka anyị kwesịrị igosi obi ekele? Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enwe obi ekele, n’agbanyeghị na ndị anyị na ha nọ enweghị obi ekele?

N’Ime Ezinụlọ

Ndị mụrụ ụmụ na-arụsi ọrụ ike iji gbooro ụmụ ha mkpa ha. Ma, mgbe ụfọdụ, ndị mụrụ ụmụ nwere ike na-eche na ụmụ ha enweghị obi ekele maka mbọ ha na-agba. Gịnị ka ha nwere ike ime ka ụmụ ha wee nwewe obi ekele? Ụzọ ihe atọ dị mkpa.

(1) Ezi Ihe Nlereanya. Ụzọ kacha mma isi na-akụziri ụmụaka ihe bụ isetịpụrụ ha ezi ihe nlereanya. Lee ihe Baịbụl kwuru banyere otu nne nke na-arụsi ọrụ ike n’oge ochie n’Izrel: “Ụmụ ya na-ekwu okwu ọma banyere ya.” Olee ebe ụmụ ya si mụta igosi ya obi ekele? Ihe ọzọ e kwuru n’amaokwu ahụ ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya. Ọ sịrị: “Di ya na-ajakwa ya mma.” (Ilu 31:28, nsụgharị New Century Version) Di na nwunye ndị na-egosi ibe ha obi ekele na-akụziri ụmụ ha na ekele na-eme ka obi dị onye e kelere ụtọ, na-eme ka e nwee obi ụtọ n’ezinụlọ, na-egosikwa na mmadụ tozuru okè.

Otu nna aha ya bụ Stephen kwuru, sị, “M na-agbalị isetịpụrụ ụmụ m ezi ihe nlereanya site n’ikele nwunye m ma o sichaa nri.” Gịnị ka nke a rụpụtara? Stephen sịrị, “Ụmụ m abụọ chọpụtara nke a, o nyewokwara ha aka igosikwu obi ekele.” Ọ bụrụ na ị bụ di ma ọ bụ nwunye, ị̀ na-ekele nwunye gị ma ọ bụ di gị mgbe niile ọ rụrụ ụmụ obere ọrụ a na-ewe na ha abụghị oké ọrụ? Ị̀ na-ekele ụmụ gị, ọbụna mgbe ha mere ihe ha kwesịrị ime?

(2) Ọzụzụ. Inwe obi ekele dị ka okooko osisi. A na-ebu ụzọ lekọta ya tupu ya amịpụta okooko mara mma. Olee otú ndị mụrụ ụmụ ga-esi nyere ụmụ ha aka igosi obi ekele? Eze Sọlọmọn onye amamihe ihe kwuru otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mgbe o dere, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu.”—Ilu 15:28.

Ndị mụrụ ụmụ, ùnu nwere ike ịzụ ụmụ unu ka ha na-eche echiche ghọta mbọ onye nyere ha onyinye ọ bụla gbara wee nye ha onyinye ahụ? Iche echiche otú a ga-eme ka mmadụ na-enwekwu obi ekele otú ahụ ala dị mma na-eme ka okooko osisi na-eto nke ọma. Maria, bụ́ onye zụliterela ụmụ atọ, sịrị: “Ọ na-ewe oge mmadụ ịnọdụ ala kọwaara ụmụ ya ihe mmadụ inye ha onyinye pụtara, ya bụ, na onye ahụ na-eche banyere onye ahụ o nyere onyinye, chọọkwa igosi na ọ hụrụ ya n’anya. Ma, m chere na oge o were m alaghị n’iyi.” Mkparịta ụka dị otú ahụ na-enyere ụmụaka aka ịmara ihe ha kwesịrị ikwu mgbe ha na-ekele onye meere ha ihe na ihe mere ha ji kwesị ikwu ya.

Ndị nne na nna maara ihe na-enyere ụmụ ha aka ka ha ghara iche na ha kwesịrị inweta ihe niile dị mma a na-enye ha. * Ịdọ aka ná ntị dị n’Ilu 29:21, nke na-ekwu banyere ndị na-eje ozi, metụtakwara ụmụaka. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ na-azụtọ onye na-ejere ya ozi malite n’oge ọ bụ nwata, mgbe o mere okenye, ọ ga-aghọ onye na-enweghị ekele.”

Olee otú a ga-esi nyere ụmụaka aka igosi obi ekele? Linda, bụ́ nne ji ụmụ atọ, sịrị, “Mụ na di m na-agba ụmụ anyị ume ka ha soro anyị na-ede akwụkwọ ozi ndị anyị ji ekele ndị meere anyị ihe site n’ịgwa ụmụ anyị ka ha see ihe a ga-etinye n’akwụkwọ ozi ahụ ma ọ bụ ka ha dee aha ha na ya.” Ọ bụ eziokwu na ihe ha na-ese anaghị ama oké mma, aka akwụkwọ ha nwekwara ike isi ike ngụta, ma ihe ha na-amụta na nke a buru ibu.

(3) Ndidi. Anyị niile bu ịchọ ọdịmma onwe onye naanị pụta ụwa, nke a nwere ike ime ka anyị ghara ịdị na-egosicha obi ekele. (Jenesis 8:21; Matiu 15:19) N’agbanyeghị nke a, Baịbụl na-agba ndị ohu Chineke ume, sị: “Unu kwesịrị ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ, unu kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị.”—Ndị Efesọs 4:23, 24.

Otú ọ dị, ndị nne na nna ọrụ ịzụ ụmụ doro anya maara na inyere ụmụaka aka ka ha ‘yiri mmadụ ọhụrụ ahụ’ adịghị mfe. Stephen, bụ́ onye e kwuru banyere ya na mbụ, sịrị, “O yiri ka ịkụziri ụmụ anyị ka ha na-ekele ndị mmadụ ma ha nye ha ihe n’echetaghịrị ha ya echeta were ogologo oge.” Ma ike agwụghị Stephen na nwunye ya. Stephen kwukwara, sị: “Ndidi anyị nwere mere ka ụmụ anyị mụta ya. Obi dị anyị ụtọ ugbu a na ha na-ekele ndị ọzọ ma ha meere ha ihe.”

Olee Maka Ndị Enyi na Ndị Agbata Obi?

Mgbe ụfọdụ, anyị na-echefu ikele ndị meere anyị ihe, ọ bụ ezie na anyị nwere obi ekele. Ọ̀ dị oké mkpa ka anyị na-egosi obi ekele mgbe mmadụ meere anyị ihe ọma, kama naanị inwe obi ekele? Iji zaa ajụjụ a, tụlee ihe mere n’etiti Jizọs na ndị ekpenta.

Mgbe Jizọs na-aga Jeruselem, ọ hụrụ ndị ekpenta iri. Baịbụl kwuru, sị: “Ha wee tie mkpu, sị: ‘Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!’ Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha: ‘Gaanụ gosi ndị nchụàjà onwe unu.’ Ma ka ha nọ na-apụ, e mere ka ha dị ọcha. Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọrọ ya, ọ laghachiri, jiri oké olu na-enye Chineke otuto. O wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala n’ụkwụ Jizọs, na-ekele ya; ọ bụ onye Sameria.”—Luk 17:11-16.

Jizọs ò leghaara ndị nke ọzọ ahụ na-abịaghị kelee ya anya? Akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Jizọs sịrị ya: ‘Ọ́ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ? È nwere onye a hụrụ lọghachitere inye Chineke otuto ma ọ́ bụghị nwoke a bụ onye mba ọzọ?’”—Luk 17:17, 18.

Ndị ekpenta itoolu ndị nke ọzọ abụghị ndị ajọ omume. Tupu a gwọọ ha, ha kwuru ihe gosiri na ha nwere okwukwe n’ebe Jizọs nọ, ha rubekwara isi n’ihe ọ gwara ha, ya bụ, ịga Jeruselem gosi ndị nchụàjà onwe ha. Ọ bụ ezie na o doro anya na ha nwere obi ekele dị ukwuu maka ihe ọma Jizọs meere ha, ha agaghị kelee ya. Ihe ha mere adịghị Jizọs mma. Olee maka anyị? Ọ bụrụ na mmadụ emeere anyị ihe ọma, ànyị na-ekele ya ngwa ngwa, degara ya akwụkwọ ozi iji kelee ya, ma ọ bụrụ onye anyị kwesịrị idegara akwụkwọ ozi?

Baịbụl sịrị na ‘ịhụnanya adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya.’ (1 Ndị Kọrịnt 13:5) Ya mere, mmadụ iji obi ya dum kelee onye meere ya ihe ọma na-egosi na onye ahụ nwere ezigbo àgwà na ịhụnanya. Dị ka anyị na-amụta n’akụkọ ndị ekpenta ahụ, ndị chọrọ ime ihe dị Kraịst mma kwesịrị ịhụ mmadụ niile n’anya, na-egosikwa ha obi ekele, n’agbanyeghị mba ha si, agbụrụ ha, ma ọ bụ okpukpe ha.

Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ụbọchị ikpeazụ m kelere onye agbata obi m, onye mụ na ya na-arụ ọrụ, nwa akwụkwọ ibe m, onye na-arụ n’ụlọ ọgwụ, onye m na-azụ ahịa, ma ọ bụ onye ọzọ nyeere m aka?’ Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na i wepụta otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ dee ugboro ole i kelere ndị mmadụ ma ọ bụ degara ha akwụkwọ ozi maka ihe ha meere gị. Nke a nwere ike inyere gị aka ịmara ebe ị ga-emezikwu n’ikele ndị meere gị ihe.

Onye mbụ anyị kwesịrị ịna-ekele maka ihe niile ọ na-emere anyị bụ Jehova bụ́ Chineke. Ọ bụ ya na-enye “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.” (Jems 1:17) Olee ụbọchị ikpeazụ i ji obi gị dum kelee Chineke maka ihe ndị o meere gị?—1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18.

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-egosi Obi Ekele n’Agbanyeghị na Ndị Ọzọ Anaghị Eme Otú Ahụ?

O nwere ike ịbụ na ndị ọzọ anaghị ekele anyị ma anyị meere ha ihe. Gịnịzi mere anyị kwesịrị iji na-ekele ndị meere anyị ihe, n’agbanyeghị na ndị ọzọ anaghị eme otú ahụ? Tụlee naanị otu ihe mere anyị ji kwesị ịdị na-enwe obi ekele.

Ọ bụrụ na anyị na-emere ndị na-enweghị obi ekele ihe ọma, anyị na-eṅomi Onye Okike anyị na-eme amara, bụ́ Jehova Chineke. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị enweghị obi ekele maka ịhụnanya Jehova, nke a emeghị ka ọ kwụsị imere ha ihe ọma. (Ndị Rom 5:8; 1 Jọn 4:9, 10) Ọ na-eme ka “anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ikele ndị meere anyị ihe, n’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa ebe ndị mmadụ na-enweghị obi ekele, anyị ga-abụ “ụmụ nke Nna [anyị] nọ n’eluigwe.”—Matiu 5:45.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ọtụtụ ndị nne na nna na ụmụ ha amụọla akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site nAka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Isi nke 18 ya bụ: “Ị̀ Na-echeta Ịsị I Meela?”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Wepụta otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ dee ugboro ole i kelere ndị mmadụ maka ihe ha meere gị

[Foto dị na peeji nke 15]

Setịpụrụ ụmụ gị ezi ihe nlereanya n’ikele ndị meere gị ihe

[Foto dị na peeji nke 15]

E nwere ike inyere ọbụna ụmụaka aka igosi obi ekele