Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Ma Onye Nna Gị nke Bi n’Eluigwe Bụ?

Ị̀ Ma Onye Nna Gị nke Bi n’Eluigwe Bụ?

Ị̀ Ma Onye Nna Gị nke Bi n’Eluigwe Bụ?

Ị̀ MA nna gị nke ọma? O nwere otú ajụjụ a ga-ada gị ná ntị ma ọ bụrụ na i tolitere n’ezinụlọ hụrụ onwe ha n’anya. I nwere ike ịza, ‘Eenụ, ama m ya nke ọma!’ N’eziokwu, ọtụtụ ndị ma ihe na-adị nna ha mma na ihe na-anaghị adị ya mma, marakwa ihe ọ ga-eme ma ihe ụfọdụ mee, nakwa otú o si elekọta ezinụlọ ya.

Ma, ọ ga-abụ na o nweela oge ụfọdụ nna gị mere ihe ọ na-enweghị mgbe ị tụrụ anya na ọ ga-eme. Dị ka ihe atụ, ihe nwata nwere ike ịma bụ na nna ya dị nwayọọ, ruo mgbe otu ihe mere. Ya ahụzie ka nna ya na-akpa ike iji hụ na o nweghị ihe mere ezinụlọ ya.

Olee maka Onye kere anyị? A gwara anyị banyere ya, sị: “Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ.” (Ọrụ 17:28) Ọ bụ Chineke kere anyị; ọ bụ ya mere o ji bụrụ Nna nke ndị niile dị ndụ. (Aịzaya 64:8) Ọ dị mma ma ọ bụrụ otú ahụ ka i si ele Chineke anya, n’ihi na ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị isi na-ele ya anya. Ma, a ka nwere ọtụtụ ihe ga-atọ anyị ụtọ ma baara anyị uru anyị ga-amata ma chọpụta banyere ya.

Ọ bụ otú ị maruru nna mụrụ gị na-ekpebi otú i si ele ya anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ebe Chineke nọ, ọ bụrụ na ị mara ya nke ọma, gị na ya ga-adị ná mma karị. Chineke ga-enyere gị aka idi ọnwụnwa na nsogbu ndị na-abịara gị ná ndụ ma ọ bụrụ na ị mara ya nke ọma ma mụta ime uche ya.

Olee ụdị onye Chineke bụ? Olee otú àgwà ya kwesịrị isi metụta otú i si ele ya anya? Ò nwere ihe ịmara onye Chineke bụ ga-achọ n’aka gị? Ị ga-ahụ azịza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

Ọ bụ otú ị maruru ndị ọzọ na-ekpebi otú i si ele ha anya