Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere e ji nye Judas mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ka o wee rara Jizọs nye?

Mgbe Judas Iskarịọt gakwuuru ndị isi nchụàjà ka ọ mara ego ole ha ga-enye ya ka o wee rara Jizọs nye n’aka ha, ha nyere ya “mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.” (Matiu 26:14, 15) O yiri ka ego ole ahụ ha nyere ya ò gosiri ụdị asị ha kpọrọ Jizọs nakwa otú ha si lelie ya anya.

Ọ ga-abụ na mkpụrụ ego ndị ahụ ha nyere ya bụ shekel ọlaọcha, bụ́ ego ndị Juu ji azụ ahịa n’oge ahụ. Gịnị ka mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ga-azụtali? Iwu Mozis kwuru na ọ bụ ego e ji azụta ohu. E nwekwara ike iji mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ zụta otu ibé ala.—Ọpụpụ 21:32; Matiu 27:6, 7.

Mgbe Zekaraya onye amụma gwara ụmụ Izrel, bụ́ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị, ka ha kwụọ ya ụgwọ maka ọzụzụ ọ na-azụ ha dị ka atụrụ, ha tụrụ ọlaọcha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ wee nye ya “mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.” Ha kpachaara anya nye onye amụma Chineke ahụ ego ole ahụ iji kparịa ya wee gosi ya na ọ dị ka ohu n’anya ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji nye Zekaraya iwu, sị: “Wụsa ya n’ebe a na-edebe akụ̀, ọ bụ ọnụ ahịa dị elu m ruru n’anya ha.” (Zekaraya 11:12, 13) Ihe Zekaraya mere mgbe e nyere ya iwu a na-echetara anyị ihe Judas mere ego ahụ e nyere ya maka ịrara Onye Jehova họpụtara ịbụ onye na-azụ Izrel dị ka atụrụ nye.—Matiu 27:5.

Gịnị ka “akwụkwọ ịgba alụkwaghịm” ahụ Baịbụl kwuru okwu ya bụ?

Iwu Mozis sịrị: “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, . . . ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị di ya n’ihi na ọ chọpụtawo ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwaanyị ahụ nọ, nwoke ahụ ga-edekwara ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ma were ya nye ya n’aka, wee chụpụ ya n’ụlọ ya.” (Diuterọnọmi 24:1) Gịnị mere e ji enye akwụkwọ a? Akwụkwọ Nsọ ekwughị ihe a na-ede n’akwụkwọ ahụ, ma, o doro anya na ọ bụ maka ọdịmma nwaanyị a chụrụ achụ, ọ na-enyekwara ya aka inweta ihe ruuru ya.

N’afọ 1951 ruo 1952, a hụrụ ọtụtụ ihe ndị mgbe ochie n’ọgba ndị dị n’ebe ugwu nke ọwara Mmiri Murabbaat, nke mmiri na-adịkwaghị, nke dị n’ọzara Judia. Otu n’ime ihe e dere ede ndị a hụrụ n’ebe ahụ bụ akwụkwọ ịgba alụkwaghịm e dere n’asụsụ Arameik nke a sị na e dere n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu na iri atọ na isii gara aga. O kwuru ihe mere n’abalị mbụ nke ọnwa Marheshvan, n’afọ nke isii ndị Juu nupụụrụ ọchịchị Rom isi. Josef, nwa Naqsan, onye bi na Masada, gbara Miriam, nwa Jọnatan onye Hanablata, alụkwaghịm. O wee nwere onwe ya ịlụ nwoke Juu ọ bụla dị ya mma. Josef nyeghachiri Miriam ihe niile ndị mụrụ Miriam mefuru n’isi Miriam mgbe ọ na-ala di. Ọ kwụkwara Miriam ụgwọ ihe ya ọ bụla mebiri emebi okpukpu anọ. Josef na ndị akaebe atọ bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ. Ha bụ Elịiza, nwa Malka; Josef, nwa Malka; na Elieza, nwa Hanana.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ọgba ndị dị n’ọwara mmiri Murabbaat

[Foto dị na peeji nke 25]

Akwụkwọ ịgba alụkwaghịm nke a sị na e dere n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu na iri atọ na isii gara aga

[Ebe E Sigasị Nweta Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ọgba: Todd Bolen/Bible Places.com; akwụkwọ ịgba alụkwaghịm: Clara Amit, a natara Israel Antiquities Authority ikike see ya