Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Akwụsịkwala Ikwusa Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ”

“Akwụsịkwala Ikwusa Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ”

“Akwụsịkwala Ikwusa Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ”

Dị ka Jacob Neufeld si kọọ

“N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, akwụsịkwala ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Ka m nọ na-atụgharị uche n’okwu ahụ, m gara kilomita ise wee ruo n’obodo nta dị nso. Mgbe m ruru, ụjọ ekweghị m banye n’ụlọ mbụ m hụrụ. Mgbe ụjọ ahụ na-ekweghị m banye, m banyere n’ọhịa wee kpekusie Chineke ekpere ike ka o nye m obi ike m ga-eji kwusaa ozi ọma. M mechara gaa n’ụlọ mbụ ahụ zie ozi ọma.

OLEE ihe kpọgara m n’obodo ahụ dị n’ọzara nke dị na Paraguay, bụ́ ebe m nọ naanị m na-agbalị ka m kwusaa ozi ọma? Ka m bido n’isi. A mụrụ m na November 1923, n’obodo ndị Ukraine bụ́ Kronstalʹ, n’ebe ndị okpukpe Menno bụ́ ndị Germany bi. N’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, ndị okpukpe Menno si Germany kwaga Ukraine, e nyekwara ha ikike ime ihe niile ha chọrọ ime, tinyere ife ofufe otú ha si chọọ (ma ha agaghị ezi ndị ọzọ ozi ọma), ha nweere onwe ha ịchị onwe ha, ha anaghịkwa aga agha.

Mgbe Ọchịchị Kọmunist malitere ịchị, ha kwụsịrị ha ime ihe niile ahụ e nyere ha ikike ime. Tupu afọ 1930, ndị ọchịchị weghaara nnukwu ugbo ndị okpukpe Menno. Ndị ọchịchị kwụrụ ha agụụ ruo mgbe ha kwetara ihe ha kwuru, e mekpọkwara onye na-ekweghị ọnụ. Tupu afọ 1940, ndị KGB (ya bụ, Ndị Uwe Ojii Nzuzo nke Mba Soviet), na-abịakarị n’abalị na-akpụrụ ọtụtụ ndị ikom, ruo mgbe ndị ikom nọ n’ọtụtụ n’ime obodo anyị fọziri ole na ole. Ọ bụ otú ahụ ka ha si kpụrụ papa m n’afọ 1938, mgbe m dị afọ iri na anọ. Ahụghị m ya ọzọ, anụghịkwa m banyere ya. Mgbe afọ abụọ gafere, ha kpụkwaara nwanne m nwoke nke tọrọ m.

N’afọ 1941, ndị agha Hitler weghaara Ukraine. Anyị chere na nke a ga-eme ka ọchịchị Kọmunist gharakwa ịchị anyị. Ma na mberede, ezinụlọ asatọ bụ́ ndị Juu, bụ́ ndị bi n’obodo anyị, funyụrụ anya. Ihe niile a merenụ mere ka m nwee ọtụtụ ajụjụ n’obi m. Gịnị mere ihe ndị a ji na-eme?

Ịkwụwa Aka Ọtọ Chebere M

N’afọ 1943, ndị agha Germany hapụrụ ebe ahụ. Ha kpọọrọ ọtụtụ ezinụlọ bụ́ ndị Germany, tinyere ndị fọrọ n’ezinụlọ anyị, ka anyị wee nyere ha aka n’agha ahụ. Tupu oge a, a manyewo m isonye ná ndị agha pụrụ iche nke ndị Germany nọ na Romania (bụ́ ndị a na-akpọ SS). Obere ihe mere n’oge a metụtara m ndụ m nke ukwuu.

Ọchịagha nke na-elekọta ìgwè ndị agha m so na ya lere m ule iji mara ma m̀ na-akwụwa aka ọtọ. Ọ gwara m ka m chịga uwe agha ya n’ebe a ga-asa ya. O tinyere ego n’otu n’ime akpa uwe ahụ, bụ́ nke m hụrụ. Mgbe m wegaara ya ego ahụ, ọ sịrị na ya etinyeghị ihe ọ bụla n’akpa uwe ya. M gwara ya na ọ bụ n’akpa uwe ya ka m wetara ya. Mgbe obere oge gafere, e mere m osote ya wee nye m ọrụ ide akwụkwọ, ikenye ndị nche ebe ha ga-arụ ọrụ, na ilekọta ego e nyere ìgwè ndị agha m so na ya.

N’otu abalị, ndị agha Russia jidere ndị agha niile so n’ìgwè ndị agha anyị; ma, ha ejideghị m, n’ihi na m nọ n’ụlọ na-arụrụ ọchịagha anyị ọrụ. Ihe m maara bụ na ọ bụ naanị m ka a na-ejideghị. Ihe kpatakwaranụ ya bụ na m kwụwara aka ọtọ, e wee nye m ọrụ ahụ pụrụ iche. Ma ọ́ bụghị ya, a gaara ejidekwa m.

Ya mere n’afọ 1944, a gwara m ka m kwụsị ịrụ ọrụ agha ruo mgbe ọ bụla ọzọ a ga-agwa m malite. M lara ụlọ ịga hụ mama m. Ka m nọ na-eche ka e nye m ọrụ, m malitere ịmụ otú e si arụ ụlọ, bụ́ ọrụ mechara baara m uru. N’April 1945, ndị agha America weghaara obodo anyị, bụ́ nke dị nso na Magdeburg. Mgbe otu ọnwa gafere, agha ahụ biri. Ọ dịghị ihe mere anyị. O yikwara ka ihe ọ̀ ga-adị mma n’ọdịnihu.

Otu ụbọchị n’ọnwa June, onye na-akụ ékwé n’obodo anyị mara ọkwa, sị, “Ndị agha America lara n’abalị ụnyaahụ, ndị agha Russia ga-abịa n’elekere iri na otu nke ụtụtụ taa.” Obi lọrọ anyị mmiri mgbe anyị hụrụ na ndị Kọmụnist ga-amaliteghachi ịchị mpaghara ebe anyị bi. Ozugbo ahụ, mụ na nwa nwanne papa m malitere ime atụmatụ otú anyị ga-esi gbapụ. N’etiti ọkọchị, anyị gafere ná mpaghara ebe ndị America na-achị. Na November, anyị jisiri ike gaghachi ná mpaghara ebe ndị Russia na-achị, n’agbanyeghị na ọ dị ize ndụ, wee kpọrọ ezinụlọ anyị na nzuzo gafee ná mpaghara ebe ndị America na-achị.

“Gee Ntị nke Ọma ma Jiri Ihe Ị Ga-anụ Tụnyere Ihe Ị Mụtara”

Anyị malitere ibi n’ebe bụ́ West Germany n’oge ahụ. Ka oge na-aga, m malitere inwe mmasị na Baịbụl. N’ụbọchị Sunday, m na-aga n’ọhịa nọrọ gụọ Baịbụl. Ma, anaghị m aghọta ihe m na-agụ, ha na-adịkwa ka ihe mere n’oge gboo gboo. M nọkwa na-aga katikizim iji kwadebe maka baptizim a ga-eme m ka m bụrụ onye òtù okpukpe Menno. Ọ tụrụ m n’anya mgbe m gụtara n’akwụkwọ katikizim na e nwere “Chukwu Nna, Chukwu Mnwa, na Chukwu Mmụọ Nsọ,” nakwa ajụjụ sochiri ya nke bụ́, ‘Pesịn atọ a hà bụ Chukwu atọ?’ E dere azịza ya n’okpuru ajụjụ ahụ, sị: “Mba, ‘Pesịn’ atọ a abụghịkwa Chukwu atọ.” M jụrụ ụkọchukwu anyị otú nke a ga-esi kwe omume. Ọ zara m, sị, “Nwoke m, mmadụ ekwesịghị ichebiga echiche ókè banyere ihe ndị a; ara agbaala ụfọdụ ebe ha nọ na-echebiga echiche ókè banyere ihe ndị a.” Ozugbo ahụ, ekpebiri m na a gaghị emekwa m baptizim.

Mgbe ụbọchị ole na ole gafere, anụrụ m ka otu onye nọ na-agwa nwa nwanne papa m okwu. M chọrọ ịmata ihe ha na-ekwu, m wee tinye ọnụ wee jụọ onye ahụ ajụjụ ole na ole. Amaghị m n’oge ahụ na onye ahụ bụ Erich Nikolaizig, bụ́ onye nọbu n’ogige ịta ahụhụ dị na Wewelsburg. Ọ jụrụ m ma m̀ chọrọ ịmụ Baịbụl. Mgbe m zara ya na m chọrọ, ọ gwara m na ya ga-eji Baịbụl m kụziere m ihe niile ya ga-akụziri m.

Mgbe Erich bịara na nke m ugboro ole na ole, ọ gwara m ka m bịa mgbakọ Ndịàmà Jehova ga-enwe, bụ́ nke m chere bụ nke mbụ a ga-enwe kemgbe agha ahụ biri. Obi toro m ụtọ nke ukwuu, edekwara m amaokwu Baịbụl niile ndị ọkà okwu gụrụ na ndị ha kpọrọ aha n’agụghị ha agụ. Ọ dịghị anya m chọpụtara na mmadụ ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi nwere ihe ndị ọ chọrọ onye ahụ n’aka. N’ihi ya, m kwụsịrị ịmụ Baịbụl. O sikwaara m ike ikweta na e nwere naanị otu ezi okpukpe. Mgbe Erich chọpụtara na mụ ekpebiela ịlaghachi na chọọchị m na-ekpebu, o nyere m ndụmọdụ a, sị, “Gee ntị nke ọma ma jiri ihe ị ga-anụ tụnyere ihe ị mụtara.”

Ọ bụ naanị ugboro abụọ ka m gara na nke ndị ụkọchukwu anyị, m wee chọpụta na ha amaghị ihe ha na-ekwu, nakwa na ọ bụghị eziokwu ka ha na-akụzi. M degaara ọtụtụ ndị ụkọchukwu akwụkwọ ozi ma jụọ ha ajụjụ ndị metụtara Baịbụl. Otu zara m, sị, “I rughị eru ịmụ Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na a mụbeghị gị ọzọ.”

Nwa agbọghọ m chọrọ ịlụ manyere m ime ihe m na-achọghị ime. Ọ nọ n’òtù ndị a mụrụ ọzọ n’okpukpe Menno. Ndị ezinụlọ ya, bụ́ ndị kpọrọ Ndịàmà Jehova asị, manyere ya ka ọ gwa m na ọ bụrụ na mụ akwụsịghị okpukpe ọhụrụ a, na mụ na ya ga-akwụsị ịkpa. N’oge a, eziokwu Baịbụl edoola m anya nke ọma nke na m maara otu ihe m kwesịrị ime, ya bụ, mụ na ya ịkwụsị ịkpa.

N’oge na-adịghị anya, Erich bịara na nke m. Ọ gwara m na e nwere ndị a ga-eme baptizim n’izu na-abịa abịa, ma jụọ m ma m̀ ga-achọ ka e mee m baptizim. O doola m anya na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi bụ eziokwu, m chọkwara ife Jehova bụ́ Chineke. N’ihi ya, m kwetara. E wee mee m baptizim n’efere ukwu e ji asa ahụ́ na May 1948.

N’oge na-adịghị anya e mere m baptizim, ezinụlọ anyị kpebiri ịkwaga Paraguay, South America. Mama m rịọkwara m arịrịọ ka m soro ha gaa. Ọ masịchaghị m ịga n’ihi na m ka chọrọ ịmụtakwu Baịbụl. Mgbe m gara n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Wiesbaden, m hụrụ August Peters. O chetaara m na ọ bụ ọrụ dịịrị m ilekọta ezinụlọ anyị. O nyekwara m ndụmọdụ a: “N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, akwụsịkwala ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ bụrụ na ị kwụsị, ị ga-adị ka ndị okpukpe ọzọ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst.” Ruokwa taa, m ghọtara uru ndụmọdụ ahụ bara na mkpa ọ dị ikwusa ozi ọma “site n’ụlọ ruo n’ụlọ,” ma ọ bụ site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ.—Ọrụ 20:20, 21.

“Onye Amụma Ụgha” na Paraguay

Ntakịrị oge m hụchara August Peters, mụ na ndị ezinụlọ anyị banyere ụgbọ mmiri na-aga South America. Ebe anyị kwụsịrị wee biri bụ na Gran Chaco, nke dị na Paraguay, bụ́ ebe ndị okpukpe Menno bikwa. Mgbe izu abụọ anyị rutere gafere, m gara naanị m n’obodo nta ahụ dị nso n’ebe anyị bi ịga kwusaa ozi ọma, bụ́ nke siiri m ike ime. Akụkọ gbasara ngwa ngwa n’ebe ahụ na o nwere “onye amụma ụgha” so ná ndị bịara ọhụrụ.

Ọ bụ n’oge ahụ ka ọrụ ịrụ ụlọ m mụrụ baara m uru nke ukwuu. Ụlọ dị ezinụlọ niile bịara abịa n’ebe ahụ mkpa. A na-eji blọk ájá a zọrọ azọ na akịrịka arụ ya. M nwere ọrụ nke ukwuu ruo ọnwa isii, nke a nyekwara m ohere buru ibu ikwusara ndị m na-arụrụ ọrụ ozi ọma. Ha na-akwanyere m ùgwù. Ma, ha anaghị achọ iji anya ahụ m ozugbo m rụchara ụlọ ha.

N’ime oge ahụ, ụgbọ mmiri si Germany na-ebute ọtụtụ ndị okpukpe Menno gbara ọsọ ndụ. Otu onye n’ime ha bụ nwa agbọghọ aha ya bụ Katerina Schellenberg, bụ́ onye ya na Ndịàmà mụtụrụla ihe, ya achọpụta ozugbo na ihe ha na-akụzi bụ eziokwu. N’agbanyeghị na e mebeghị ya baptizim, o kwuru na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova mgbe ụgbọ mmiri bu ha na-abịa. N’ihi ya, e kweghị ka o soro ha bịa biri n’ebe ndị Germany bi. A hapụrụ naanị ya n’Asunción, bụ́ isi obodo Paraguay. Ọ malitere ịgbara otu ezinụlọ odibo. Ọ mụrụ asụsụ Spanish, chọta Ndịàmà, e wee mee ya baptizim. Mụ na nwa agbọghọ ahụ nke nwere obi ike lụrụ n’October 1950. Ọ na-akwado m ma na-enyere m aka nke ukwuu n’ihe niile bịaara anyị ná ndụ kemgbe ọtụtụ afọ.

N’oge na-adịghị anyị, m nwetara ego zuru iji zụta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya abụọ na-adọkpụ ya. M ji ya na-ekwusa ozi ọma. N’oge niile, m na-echeta ndụmọdụ ahụ Nwanna Peters nyere m. N’oge ahụ, nwanne m nwaanyị, bụ́ onye ghọrọla Onyeàmà, sonyeere anyị. Anyị niile na-ebilikarị n’elekere anọ nke ụtụtụ wee gaa ebe na-ewe anyị awa anọ, jiri awa abụọ ma ọ bụ atọ kwusaa ozi ọma ma laghachi.

Agụtara m n’akwụkwọ anyị na a na-ekwu okwu sitere na Baịbụl nke ọhaneze na-egere. N’ihi ya, m haziri otu ma kwuo ya. Agatụbeghị m ọmụmụ ihe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na Germany. N’ihi ya, m chepụtara otú e kwesịrị isi kwuo ya, m wee kwuo banyere Alaeze Chineke. Mmadụ asatọ bịara ọmụmụ ihe ahụ. Nke a wutere ndị ụkọchukwu chọọchị Menno. Ha dunyere ndị òtù ha ka ha gaa napụtachaa ndị mmadụ akwụkwọ niile e ji amụ Baịbụl anyị nyere ha, ha gwakwara ha ka ha ghara ikele anyị ekele ọzọ.

Ha kpọkwara m òkù n’isi ụlọ ọrụ obodo ahụ anyị bi. Onyeisi ebe ahụ na ndị ụkọchukwu abụọ si Canada wee jụọ m ajụjụ ruo ọtụtụ awa. N’ikpeazụ, otu n’ime ha, sịrị, “Nwoke m, i nwere ike ikwere n’ihe ọ bụla masịrị gị, ma ị ga-ekwe anyị nkwa na ị gaghị agwa onye ọ bụla ihe i kweere.” Ma, ekweghị m ha nkwa ahụ ha chọrọ ka m kwe ha. N’ihi ya, ha gwara m ka m kwapụ n’obodo ahụ n’ihi na ha achọghị “onye amụma ụgha” n’etiti “ụmụnna nwere okwukwe na Chineke.” Mgbe m jụrụ, ha kwuru na ha ga-agbara ezinụlọ anyị dum ụgbọ. M jụrụ na mụ agaghị ala.

N’ọkọchị afọ 1953, m gara mgbakọ Ndịàmà Jehova n’Asunción. Mụ na Nathan Knorr, bụ́ onye si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, kparịtara ụka. O wee tụọrọ m aro ka m kwaga n’isi obodo ahụ ma soro mmadụ ole na ole si mba ọzọ, bụ́ ndị e kenyere ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ, na-aga ozi ọma, karịchaa, ebe ọ bụ na e nwechaghị ndị na-anabata ozi ọma anyị na-ekwusa n’ebe ahụ ndị okpukpe Menno bi.

Ibute Alaeze Chineke Ụzọ

N’oge ahụ, e nwere naanị ihe dị ka Ndịàmà iri atọ na ise na Paraguay dum. M gwara nwunye m banyere ya. Ọ bụ ezie na o nwechaghị mmasị ịkwaga n’obodo mepere emepe, o kwetara ịgaghachi ebe ahụ. N’afọ 1954, naanị mụ na Katerina ji oge anyị nwetara ohere rụọ ụlọ brik anyị. Ọ dịghị mgbe anyị hapụrụ ịga ọmụmụ ihe, anyị na-agakarịkwa ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ná ngwụsị izu.

Otu n’ime ọrụ m rụrụ bụ iso onye nlekọta sekit, ya bụ, onyeozi na-ejegharị ejegharị, aga ebe ụfọdụ ndị na-asụ German bi na Paraguay, ịga na-asụgharị ihe ọ na-ekwu. Ebe ọ bụ na amachaghị m Spanish, ọ ga-abụ na ọrụ kacha taa akpụ e nyetụworo m bụ oge mbụ a gwara m ka m sụgharịa okwu e kwuru na Spanish n’asụsụ German.

Ahụ́ nyewere nwunye m nsogbu, anyị wee kwaga Canada n’afọ 1957. N’afọ 1963, anyị kwagara United States. N’ebe niile anyị birila, anyị na-agbalịsi ike ibute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị. (Matiu 6:33) M na-ekele Jehova bụ́ Chineke na o mere ka m mụta eziokwu dị n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, n’oge m bụ okorobịa. Ihe niile m mụtara na Baịbụl enyerela m aka n’ọtụtụ ụzọ ná ndụ!

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na mụ enyerela ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu magburu onwe ya dị na Baịbụl, bụ́ nke kasiworo m obi nke ukwuu. Ihe kacha enye m ọṅụ bụ na ụmụ m na ụmụ ụmụ m eritela uru n’ọzụzụ anyị nyere ha site na Baịbụl, malite n’oge a mụrụ ha ọhụrụ. Ha niile na-agbaso ndụmọdụ ahụ Nwanna Peters nyere m ogologo oge gara aga, sị, “N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, akwụsịkwala ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Ihe kacha enye m ọṅụ bụ na ụmụ m na ụmụ ụmụ m eritela uru n’ọzụzụ anyị nyere ha site na Baịbụl, malite n’oge a mụrụ ha ọhụrụ

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Mụ na Katerina, n’oge na-adịghị anya tupu anyị agbaa akwụkwọ n’afọ 1950

[Foto dị na peeji nke 21]

Anyị na nwa mbụ anyị, n’ụlọ anyị dị na Paraguay, n’afọ 1952

[Foto dị na peeji nke 23]

Anyị na ndị ezinụlọ anyị dum

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ọ bụ Keith Trammel sere foto a © 2000

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na Peeji nke 19]

Ọ bụ Keith Trammel sere foto a © 2000