Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amamihe Jizọs Tụrụ Ndị Gere Ya Ntị n’Anya

Amamihe Jizọs Tụrụ Ndị Gere Ya Ntị n’Anya

Maka Ndị Na-eto Eto

Amamihe Jizọs Tụrụ Ndị Gere Ya Ntị n’Anya

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri anya nke uche gị kirie ebe ihe ahụ mere. Nụrụ olu ndị ahụ ị na-agụ banyere ha. Ka ihe ha na-eme ruo gị n’ahụ́. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ LUK 2:41-47.

Gịnị ka i chere Jizọs na ndị nkụzi ahụ nọ na-ekwu dị ka e kwuru n’amaokwu nke iri anọ na isii?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Gịnị ka i chere mere Jizọs na ndị ndú okpukpe ahụ ji nwee ike ikwurịta okwu n’agbanyeghị na ọ ka bụ nwata? Ọ̀ bụ naanị maka na o zuru okè, ka ò nwere ihe ọzọ mere ya?

․․․․․

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ LUK 2:48-52.

Olee ụdị olu Jizọs ji jụọ nne na nna ya, sị: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m?”

․․․․․

Olee ihe mere anyị ga-eji jide n’aka na Jizọs ejighị olu ike ma ọ bụ olu mkparị gwa nne na nna ya okwu?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Gịnị mere obi Josef na Meri chị n’aka mgbe ha na-achọgharị Jizọs na-ejighị bụrụ ihe ọjọọ?

․․․․․

Ọ bụ ezie na Jizọs zuru okè, gịnị mere o ji nọgide na-erubere nne na nna ya isi?

․․․․․

Ì chere na ihere mere Jizọs maka na a nọ n’ihu ndị nwere mmasị n’ebe ọ nọ baara ya mba?

․․․․․

TINYE IHE Ị MỤTARA N’ỌRỤ. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Nrubeisi.

Uru ọ bara mmadụ ịmara ihe dị na Baịbụl mgbe ọ ka bụ nwata.

․․․․․

OLEE IHE KACHA METỤ GỊ N’AHỤ́

N’AKỤKỌ A A KỌRỌ NA BAỊBỤL? Ọ̀ BỤ N’IHI GỊNỊ?

․․․․․