Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chee Echiche Banyere Ihe ‘Ga-emesị Bụrụ Ọgwụgwụ Ya’

Chee Echiche Banyere Ihe ‘Ga-emesị Bụrụ Ọgwụgwụ Ya’

Chee Echiche Banyere Ihe ‘Ga-emesị Bụrụ Ọgwụgwụ Ya’

O NWERE ọtụtụ ihe anyị na-ekpebi ná ndụ. O doro anya na ọ kacha mma ka anyị gbalịa mata ihe ga-esi n’ihe ọ bụla anyị chọrọ ime pụta tupu anyị amalite ime ya. Ụfọdụ ndị akwaala ụta nke ukwuu n’ihi mkpebi ndị ha mere. Ma eleghị anya, o nweela mgbe ị sịrị, ‘A sịkwa na m ma na ọ bụ otú a ka ọ ga-adị, o nweghị ihe gaara eme ka m tinye aka na ya.’

Onye ime njem doro anya ga-achọ ịmata ebe ụzọ dị iche iche gara. O nwere ike ile map ma jụọ ndị maara ebe ahụ ajụjụ. O doro anya na ọ ga na-agụkwa saịn bọọdụ ndị ọ na-ahụ n’ụzọ. Olee otú anyị nwere ike isi mata ụzọ kacha mma anyị kwesịrị iso ná ndụ a anyị dị, bụ́ nke yiri ime njem? Chineke si n’ọnụ Mozis kwuo otu mgbe banyere ụmụ Izrel oge ochie, sị: “A sị nnọọ na ha maara ihe, ha gaara echebara ihe a echiche! Ha gaara eche echiche banyere ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha.”—Diuterọnọmi 32:29.

Ndụmọdụ Kacha Mma

Anyị ekwesịghị inwewe obi abụọ banyere ihe “ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ” nke ụzọ nke ndụ anyị nọ na ya. Ebe Chineke maara ihe niile, ọ bụ ya nọ n’ọnọdụ kacha mma ịgwa mmadụ niile ụzọ kacha mma ha kwesịrị iso. Ọ hụwo ọtụtụ ụzọ ụmụ mmadụ sooro, hụkwa ebe o dugara ha. Baịbụl sịrị: “Ụzọ mmadụ dị n’ihu Jehova, ọ na-echebara ụzọ ya niile echiche.”—Ilu 5:21.

Jehova na-elekọta ndị niile hụrụ ya n’anya. Site n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ọ na-agwa ha ụzọ kacha mma ha kwesịrị iso. Anyị na-agụ, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” Ya mere, tupu gị amalite ime ihe ọ bụla, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchọ ndụmọdụ Jehova, otú ahụ Eze Devid nke Izrel oge ochie mere. O kpere ekpere, sị: “Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ije ije na ya.”—Abụ Ọma 32:8; 143:8.

Obi ga-esi gị ike, ahụ́ ga-erukwa gị ala ma i soro ụzọ onye njem ị tụkwasịrị obi nke ụzọ doro anya gwara gị ka i soro. Ị gaghị echegbuwe onwe gị ma ụzọ ahụ ọ̀ ga-edugakwa gị n’ebe ị na-aga. Devid rịọrọ Jehova maka nduzi ya na ntụziaka ya, o sokwaara ha. Nke a mere ka obi ruo ya ala dị ka o kwuru nke ọma n’Abụ Ọma nke Iri Abụọ na Atọ, nke ọtụtụ ndị ma. Devid dere, sị: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m. Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara; ọ na-edu m n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara. Ọ na-eme ka mkpụrụ obi m nwetaghachi ume. Ọ na-edu m n’ụzọ ezi omume n’ihi aha ya. Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla.”—Abụ Ọma 23:1-4.

Gịnị Ga-abụ Ọdịnihu Ha?

Esaf bụ́ ọbụ abụ, ma ọ bụkwanụ otu n’ime ụmụ ya, kwuru na ‘ọ fọrọ nke nta ka ya zọhie ụkwụ’ n’ije o jere n’okporo ụzọ nke ndụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ hụrụ otú ihe si na-agaziri ndị na-anaghị akwụwa aka ha ọtọ na ndị na-eme ihe ike, o wee malite inwere “udo ndị ajọ omume” anyaụfụ. O chere na ha ‘na-atụsara ahụ́ ruo mgbe a na-akaghị aka.’ Nke ka njọ bụ na ọbụ abụ ahụ malitere inwe obi abụọ ma yà mekwara ihe ziri ezi n’iso ụzọ ezi omume o so.—Abụ Ọma 73:2, 3, 6, 12, 13.

E mechaa, ọbụ abụ ahụ banyere n’ebe nsọ Jehova wee kpee ekpere ma chee echiche banyere ihe ga-emecha mee ndị ajọ omume. Ọ sịrị, “Anọ m na-achọ ịmata ihe ga-abụ ọdịnihu ha.” Ọ tụgharịrị uche banyere ọdịnihu nke ndị ahụ ọ na-enwere anyaụfụ. Gịnị ga-abụ ọdịnihu ha? Ọ ghọtara na “ọ bụ n’ala na-amị amị” ka ha nọ, nakwa na a ga-eme ka ha “tụọ ụjọ na mberede wee nwụọ!” Olee maka ụzọ ahụ nke ọbụ abụ ahụ nọ na ya? O kwuru banyere ya, sị: “N’ikpeazụ, ị [ya bụ, Jehova] ga-edu m ka m nweta ihe ùgwù.”—Abụ Ọma 73:17-19, 24.

Echiche ahụ ọbụ abụ ahụ chebaara ihe ga-abụ ụgwọ ọrụ nke ndị ji ọkụ ọkụ ma ọ bụ ụzọ rụrụ arụ na-aba ọgaranya mere ka ọ mara na ọ nọ n’ezi ụzọ. O kwubiri, sị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma.” Mmadụ na Jehova bụ́ Chineke ịdị ná mma mgbe niile na-eweta uru na-anaghị agwụ agwụ.—Abụ Ọma 73:28.

“Mara Ebe I Chere Ihu”

Ụdị ihe ahụ nwere ike iche anyị ihu taa. I nwere ike inweta ọrụ ngo magburu onwe ya, ma ọ bụ e bulie gị n’ọkwá ma ọ bụ mmadụ nwere ike ịgwa gị ka i soro n’achụmnta ego na-enye ezigbo ego. Ọ bụ ezie na ihe ọghọm nwere ike ịdapụta n’ihe ọ bụla mmadụ malitere ọhụrụ, ọ̀ bụ na i cheghị na ọ bara uru ka i buru ụzọ tụlee ihe nwere ike ‘imesị bụrụ ọgwụgwụ’ nke ihe ị chọrọ ime? Olee ihe ndị nwere ike isi na ya pụta? Ọ̀ ga-eme ka ị na-ahapụ ezinụlọ gị ghara ịnọ n’ụlọ, bụ́ nke nwere ike ịkpatara gị ma ọ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị nchekasị? Ọ̀ ga-eme ka gị na ndị ọjọọ na-akpa, dị ka ndị gị na ha na-achụ nta ego ma ọ bụ ndị na-anọ na họtel ma ọ bụ n’ebe ọzọ? Ọ bụrụ na i jiri nlezianya hụ ihe dị n’ihu, ị ga-enwe ike ime ezi mkpebi. Gee ntị na ndụmọdụ Sọlọmọn nyere, bụ́ nke sịrị: “Mara ebe i chere ihu.”—Ilu 4:26, nsụgharị Contemporary English Version.

Ọ ga-adị mma ka anyị niile chebara ndụmọdụ ahụ echiche, nke ka nke, ndị na-eto eto. Otu nwa okorobịa gbazitere otu ihe nkiri vidio bụ́ nke na-egosi ihe ndị na-akpali mmekọahụ. O mechara kọọ na mgbe ya lechara vidio ahụ, na agụụ mmekọahụ gụsiri ya ike nke na ya gara na nke otu nwaanyị akwụna, bụ́ onye ọ ma bi ya nso. O mechara nwee mwute, akọnuche ya malitekwara ịma ya ikpe, ụjọ tụkwara ya na ọ ga-abụ na ya ebutela ọrịa. Ihe mere ya bụ kpọmkwem ihe Baịbụl kwuru, sị: “Na mberede, o sooro ya na-aga, dị ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya.” Ọ garaghị abanye ná nsogbu ahụ ma a sị na o bu ụzọ chee echiche banyere “ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ” ya.—Ilu 7:22, 23.

Tụkwasị Ntụziaka Chineke Obi

Ọtụtụ ndị ga-ekweta na ọ dịghị mma ileghara ihe e dere na saịn bọọdụ anya mgbe mmadụ na-aga n’ụzọ. Ma, ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị na-eme ihe yiri nke ahụ ná ndụ ha mgbe ntụziaka e nyere ha na-adịghị ha mma. Lee ihe ụfọdụ ụmụ Izrel mere n’oge Jeremaya. N’oge ahụ, mba ahụ amaghị ihe ha ga-eme eme. Jehova bụ́ Chineke wee gwa ha, sị: “Jụọnụ ajụjụ okporo ụzọ ndị dịwara kemgbe oge ochie, bụ́ ebe ezi ụzọ dị ugbu a; jeekwanụ ije na ya.” Ma, ha gbara isi akwara wee sị na ha “agaghị eje ije” n’ụzọ ahụ. (Jeremaya 6:16) Gịnị ‘mesịrị bụrụ ọgwụgwụ’ isi ha nupụrụ? N’afọ 607 T.O.A., ndị Babịlọn gara bibie obodo ha bụ́ Jeruselem ma dọrọ ndị bi na ya n’agha laa Babịlọn.

Ileghara ntụziaka Chineke nyere anya, bụ́ ndị yiri ihe e dere na saịn bọọdụ, agaghị abara anyị uru. Akwụkwọ Nsọ gbara anyị ume, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”—Ilu 3:5, 6.

Ụfọdụ ịdọ aka ná ntị Chineke nyere yiri saịn bọọdụ e dere, ‘Abanyela n’Ebe A.’ Dị ka ihe atụ, Baịbụl sịrị: “Abanyela n’ụzọ ndị ajọ omume, abanyekwala n’ụzọ ndị ọjọọ.” (Ilu 4:14) Otu n’ime ụzọ dị njọ ịbanye bụ nke e kwuru okwu ya n’Ilu 5:3, 4, bụ́ nke sịrị: “Egbugbere ọnụ nke nwaanyị na-akwa iko na-atasị atasị dị ka ụgbụgbọ mmanụ aṅụ, okpo ọnụ ya na-akwọkwa mụrụmụrụ karịa mmanụ. Ma ihe na-esi n’ebe ọ nọ apụta na-elu ilu dị ka ahịhịa ilu; ọ dị nkọ dị ka mma agha ihu abụọ.” Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ha na onye akwụna ma ọ bụ onye ọzọ ịkwa iko ga-enye ha obi ụtọ. Ma, ileghara iwu Chineke anya, bụ́ nke kwesịrị ịchịkwa omume anyị, na-eduga naanị n’ọdachi.

Tupu gị etinye aka n’ihe ọ bụla ị na-achọ ime, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ebe ihe a ga-eduga m?’ Naanị ịkwụsịtụ chee echiche ihe “ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ” ihe ị na-achọ ime ezuola ime ka ị ghara itinye aka n’ihe ga-ebutere gị ọdachi. Ọrịa o biri n’ájá ọcha na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute ná mmekọahụ, ite ime, ntisasị alụmdi na nwunye na obi amamikpe bụ mkpụrụ ndị leghaara ịdọ aka ná ntị Chineke anya na-aghọrọ. Pọl onyeozi kwuru nke ọma ebe ụzọ ọjọọ nke ndị na-eme omume rụrụ arụ ga-eduga ha. Ọ sịrị na ha “agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

“Lekwa Ụzọ”

Mgbe ụfọdụ ọ na-esiri anyị ike ịmata ihe ga-esi n’ihe anyị chọrọ ime pụta. Ya mere, anyị kwesịrị ikele Chineke maka otú o si hụ anyị n’anya wee na-enye anyị ntụziaka doro anya. Jehova sịrị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.” (Aịzaya 30:21) Olee ebe ụzọ a Jehova na-egosi anyị ga-eduga anyị? Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị warara, ịga na ya adịghịkwa mfe, Jizọs sịrị na ọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:14.

Wepụta oge chee echiche banyere ụzọ ị nọ na ya ugbu a. Ọ̀ bụ ezi ụzọ? Olee ebe ọ ga-eduga gị? Rịọ Jehova n’ekpere ka o duzie gị. Na-atụle ‘map’ bụ́ Baịbụl. O nwere ike ịdị gị mkpa ka ị gakwuru onye ọzọ nọ n’ụzọ nke ndụ kemgbe, bụ́ onye na-agbalị iso nduzi nke Chineke. Ọ bụrụ na i mee nke a wee chọpụta na o nwere ebe i kwesịrị ime mgbanwe, mee otú ahụ ngwa ngwa.

Obi na-esi onye na-eme njem ike ma ọ bụrụ na ọ hụ saịn bọọdụ nke na-egosi ya na ọ gahieghị ụzọ. Ọ bụrụ na i nyochaa ndụ gị wee chọpụta na ị na-eje ije n’ụzọ ezi omume, nọgide na ya, adala mbà. Ụgwọ ọrụ kacha mma ị ga-enweta n’ije ije n’ụzọ a ga-eru gị aka n’oge na-adịghị anya.—2 Pita 3:13.

Ụzọ ọ bụla nwere ebe ọ gara. Mgbe ị ga-enweta ụgwọ ọrụ nke ihe ị họọrọ ime ná ndụ, olee otú ahụ́ ga-adị gị? O nweghị uru ọ ga-abara gị iburu aka n’isi na-eti, ‘Ewoo, a sịkwa na m ma, agaraghị m eme ihe a!’ Ya mere, tupu gị amalite ime ihe ọ bụla ọzọ ị chọrọ ime ná ndụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe “ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ” nke ihe a m na-achọ ime?’

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Gịnị ‘Ga-emesị Bụrụ Ọgwụgwụ Ya’?

A na-anwakarị ndị na-eto eto ọnwụnwa ime ihe ọtụtụ ndị na-eme. Legodị ihe atụ ndị a.

Mmadụ nyere gị sịga wee sị gị ṅụtụgodị ya ma ị sị na ị bụ dimkpa.

Onye nkụzi nke bu ọdịmma gị n’obi gwara gị ka ị gụkwuo akwụkwọ na mahadum.

A kpọrọ gị ka ị bịa oriri na nkwari nke a ga-enwe mmanya na-aba n’anya ma ọ bụkwanụ ọgwụ ọjọọ na ya.

Mmadụ sịrị gị, “Tinyenụ foto gị na akụkọ ndụ gị n’Ịntanet.”

Enyi gị gwara gị ka gị na ya lee fim nke na-egosi ime ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ.

Ọ bụrụ na mmadụ agwa gị otu n’ime ihe ndị a, olee ihe ị ga-eme? Ị̀ ga-ekweta ozugbo, ka ị̀ ga-ebu ụzọ chee echiche nke ọma banyere ihe nwere ike ‘imesị bụrụ ọgwụgwụ’ ya? Ị ga-egosi na ị ma ihe ma ọ bụrụ na ị jụọ onwe gị, sị: “Mmadụ ọ̀ pụrụ ịgụnye ọkụ n’obi ya, uwe ya aghara ire ọkụ? Ka mmadụ ọ̀ pụrụ ije ije n’elu icheku ọkụ, ọkụ aghara ịhụ ya n’ụkwụ?”—Ilu 6:27, 28.