Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“I Ruo n’Osimiri Coco, Banye n’Aka Nri”

“I Ruo n’Osimiri Coco, Banye n’Aka Nri”

Akwụkwọ Ozi Si Nicaragua

“I Ruo n’Osimiri Coco, Banye n’Aka Nri”

“Ị GA-EJI ụgbọala nwere ike ịgba n’okporo ụzọ ọjọọ na ihe i nwere ike iji dọpụta ụgbọala n’apịtị. Ị ga-ewere ihe gbatakwuo mmanụ ụgbọala. Marakwa na apịtị dị n’ebe ahụ nwere ike irikpu ụkwụ ụgbọala gị. I ruo n’osimiri Coco, banye n’aka nri.”

Ikwu eziokwu, ihe a onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, dị ka m na-ekwusa, gwara m kụdara m obi. N’agbanyeghị nke ahụ, n’otu ụtụtụ Tuesday, m biliri gawa mgbakọ Ndị Kraịst na Wamblán, bụ́ obere obodo dị n’ebe ugwu Nicaragua.

N’isi ụtụtụ, m buuru ụgbọala ochie m bụ́ nke siri ike gawa n’okporo ụzọ awara awara dị larịị nke e si aga mba dị iche iche. Mgbe m garuru Jinotega, m sooro okporo ụzọ a na-eteghị korota, nke ndị bi n’ebe ahụ na-akpọ feo, ma ọ bụ ụzọ ọjọọ. Tupu mụ agbafechaa obodo ahụ, m hụrụ ụlọ ahịa abụọ. Aha otu bụ Ọrụ Ebube Chineke, nke ọzọ abụrụ Mbilite n’Ọnwụ.

Okporo ụzọ ahụ gbagọrọ agbagọ, nwee ugwu, nweekwa mkpọda. M na-agba obere obere ma m gbafewe ndagwurugwu. Agbafere m ọdọ mmiri toro ogologo nke dị n’otu ndagwurugwu nke urukpuru kpuchiri ugwu dị n’akụkụ ya abụọ. N’ebe ahụ, ahụrụ m osisi dị iche iche ndị okooko osisi mara mma kwụrụ n’ahụ́ ha.

Ọ fọrọ obere ka mụ na otu bọs nke na-agba n’etiti ụzọ suo n’otu ebe ụzọ ahụ gbagọrọ agbagọ. Ọ nọ na-akwụ anwụrụ, ụkwụ ya nọkwa na-abọli obere okwute ka ọ na-agbafe. Na Nicaragua, a na-ahụ n’enyo ihu bọs nakwa n’enyo azụ ha ebe ndị na-akwọ ụgbọala bụ́ ndị na-agba ọnwụ ọnwụ dere utu aha ha ndị dị ka Azụ Eru Ala, Akpị, Eke, ma ọ bụ Dinta.

M ruru na Ndagwurugwu Pantasma n’ehihie. N’ebe ahụ, m gbafere otu ụlọ e ji osisi rụọ, bụ́ nke a zara mbara èzí ya aza. Ebe ahụ yichara ihe e sere n’otu akwụkwọ. N’akwụkwọ ahụ, e sere otu agadi nwoke nke nọ ọdụ n’oche, nkịta anọrọ n’okpuru osisi na-ehi ụra, e kegidekwara oké ehi abụọ n’ụgbọala ha na-adọkpụ bụ́ nke e ji osisi rụọ ụkwụ ya abụọ. N’otu obere obodo, ahụrụ m ìgwè ụmụaka ka ha si n’otu ụlọ akwụkwọ na-apụta. Ha juru n’okporo ụzọ, uwe akwụkwọ ha yi na-acha anụnụ anụnu, ha yiri ebili mmiri na-asọ n’ụsọ oké osimiri.

Anwụ malitere ịchasi ike mgbe m rutewere Wiwilí, ọ bụ n’ebe ahụ ka m nọ hụ osimiri Coco. Nnukwu osimiri ahụ dị mkpa nke ukwuu n’obodo ahụ, ọ na-asọsikwa ike mgbe niile. Echetara m ihe ahụ a gwara m, m wee gaa aka nri wee banye n’okporo ụzọ ahụ dị ize ndụ nke dị kilomita iri atọ na asaa, bụ́ nke gara Wamblán.

M gbafere ihe dị ka iyi asatọ ma ọ bụ itoolu ka m nọ na-agafe oké nkume, okokoro na ugwu dị iche iche. Ka m nọ na-agbalị izere ịgbaba n’olulu ndị apịtị dịbu, ụkwụ ụgbọala m bọliri nnukwu uzuzu. N’eziokwu, “m ṅụjuru uzuzu afọ.” N’ikpeazụ, m ruru ebe ụzọ ahụ jedebere, ihe m hụziri bụ ndagwurugwu nke osisi juru. Ọ bụ ebe ahụ bụ Wamblán, bụ́ ebe m na-aga.

O yiri ka mmadụ niile ò tetara mgbe o ji ọkara gafee elekere anọ n’echi ya. Oké ọkpa ndị nọ na-akwa kpọtere m n’ụra n’isi ụtụtụ, m wee bilie gagharịa n’okporo ámá obodo ahụ. Ísì achịcha a na-eme n’ebe ahụ si n’ugwu dị n’ebe ahụ na-ekubata.

E nwere ọtụtụ ebe onye na-ese ihe n’ebe ahụ sere paradaịs n’ahụ́ ájá. Ndị mmadụ sere ihe n’ụlọ ahịa ha ndị dị n’okporo ámá iji gwa ndị mmadụ ụdị mmanya ọtọ bịrịbịrị ha na-ere. Akwụkwọ ndị a mapawara n’ebe dị iche iche na-echetara ndị mmadụ ihe dị iche iche ọchịchị atọ chịrịla ala ha kwere ha ná nkwa. Ụlọ mposi ha na-adị n’èzí. Ha na-awụ ala ya simenti ma jiri gbamgbam kụchie ahụ́ ya na elu ya.

M kelere ndị mmadụ Adiós bụ́ ekele ndị Nicaragua. Ha mụmụrụ ọnụ ọchị, wee kelee m nke ọma. Anyị nọ na-ekwusi okwu ike n’ihi mkpọtụ ụkwụ ịnyịnya na ịnyịnya ibu na-eme ka ha na-agafe.

Ná mgbede Friday, ọtụtụ ezinụlọ bịara maka mgbakọ abalị abụọ ahụ. Ụfọdụ ji ụkwụ, ịnyịnya, na ụgbọala bịa. Ụfọdụ ụmụntakịrị nwoke na nwaanyị yi akpụkpọ ụkwụ rọba, jiri ụkwụ gaa awa isii. Ha gafere mmiri dị iche iche n’agbanyeghị na etu dị na ha nakwa na e liri ogbunigwe n’akụkụ mmiri ndị ahụ. Ụfọdụ ndị si n’ebe ndị dị anya bu obere nri bịa, ya bụ, osikapa e ji abụba ezì sie. Gịnị mere ha niile ji bịa?

Ha bịara iji mee ka olileanya ha, nke bụ́ na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu, sikwuo ike. Ha bịara ịnụrụ okwu si na Baịbụl. Ha bịara ime ka obi tọọ Chineke ụtọ.

Na Saturday, ihe karịrị narị mmadụ atọ zukọtara n’ụlọ a kụrụ gbam gbam. Ha nọdụrụ ọdụ n’oche osisi nakwa n’oche rọba. Ndị nne nyekwara ụmụ ha nri. Ezì nọ na-eme mkpọtụ, oké ọkpa na-akwakwa n’ebe a na-azụ ha bụ́ nke na-adịghị anya n’ebe anyị nọ.

Anwụ malitere ịchasi ike, okpomọkụ wee karịa. N’agbanyeghị nke ahụ, mmadụ niile gere ntị nke ọma n’ihe a na-ekwu. Ha na-asape Baịbụl ha mgbe ndị ọkà okwu na-agụ Baịbụl, ha bụkwara abụ ndị dabeere na Baịbụl, geekwa ntị nke ọma mgbe a na-ekpe ekpere.

Mgbe mgbakọ nke ụbọchị ahụ gachara, mụ na ndị ọzọ nọrọ, mụ na ụmụaka gwukwara egwu. Mụ na ndị na-eto eto gụkwara ihe ha dere. M gosiri ha kpakpando na ụyọkọ kpakpando ndị dị na kọmputa m. Ụmụaka ahụ mụmụrụ ọnụ ọchị, ndị mụrụ ha nwekwara obi ụtọ.

Ọ dịghị anya, mgbakọ ahụ gwụrụ, onye ọ bụla alawa. Alawara m n’ụtụtụ echi ya. Agaghị m echefu ihe ọma niile a m hụrụ na njem a, obi dịkwa m ụtọ na m metara ndị enyi ọhụrụ m hụrụ n’anya. Ekpebiri m iṅomi ha na ịmụta inwe afọ ojuju na inwe olileanya n’ebe Chineke nọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ọtụtụ ezinụlọ ji ụkwụ gaa ọtụtụ kilomita iji bịa mgbakọ ahụ e nwere na Wamblán