Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M Mụtara na Ndụ Dị Oké Ọnụ Ahịa

M Mụtara na Ndụ Dị Oké Ọnụ Ahịa

M Mụtara na Ndụ Dị Oké Ọnụ Ahịa

Ọ BỤ N’ỤTỤTỤ APRIL 16, 2007 KA IHE A MERE. Ka m makpu n’ọfịs dị n’okpukpu nke atọ nke ụlọ elu a na-akpọ Ụlọ Norris, nke dị na Mahadum Virginia, ihe ndị nọ na-eme mere ka m cheta ọzọ na ndụ anyị dị n’ụbọchị ọ bụla bụ ihe dị oké ọnụ ahịa nakwa na anyị kwesịrị inwe obi ekele maka ya.

Anọ m n’ọfịs m na-ejikere ịga were akwụkwọ ozi m n’okpukpu nke abụọ nke ụlọ ahụ. Otu prọfesọ wee bata gwa m ka m soro ya gaa n’ọfịs ya rụziere ya kọmputa. Ozugbo anyị banyere n’ọfịs ya, anyị nụrụ ka ụda égbè na-ada n’ike n’ike n’okpukpu nke abụọ nke ụlọ ahụ. Ebe anyị na-amaghị ihe na-emenụ, anyị banyere n’ọfịs ya ngwa ngwa kpọchie ụzọ wee nọrọ n’ime ya. Anyị chị obi anyị n’aka na-ele ihe ga-emenụ. M makpuuru n’otu akụkụ na-ekpeku Jehova bụ́ Chineke ekpere, na-arịọ ya ka o nyere m aka ịmara ihe m ga-eme n’ihe ọ bụla nwere ike ime.

Ka anyị nọ n’ebe ahụ, m chetara ihe mere m n’afọ iri na ise gara aga tupu ụbọchị ahụ. Anọ m na-edozi ụgbọala n’ụlọ ọrụ ebe a na-edozi ụgbọala. Onye mụ na ya na-arụ ọrụ bu efere mmanụ ụgbọala dị na ya. Ọkụ bara mmanụ ahụ. O wee jiri ụjọ wụọ m mmanụ ahụ ọkụ bara n’ihu! M wee kuru uzu ọkụ ahụ, ọkụ gbakwara m nke ukwuu, malite n’úkwù m gbagowe. E wee jiri ụgbọelu buga m n’ụlọ ọgwụ a na-agwọ ndị ọkụ gbara. E bugara m ná ngalaba a na-agwọ ndị ọkụ gbara nke ukwuu, bụ́ ebe m nọrọ ọnwa atọ na ọkara. A nọ n’ebe ahụ na-agwọ m ma ò nwere otú m ga-esi dịrị ndụ. Mgbe m nọrọ n’ụlọ ọgwụ ahụ ọnwa ise, m lọtara wee nwee obi ụtọ na m ka dị ndụ. Ihe ahụ mere m kụziiri m na m kwesịrị iwere ụbọchị ọ bụla m dị ndụ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ebe m bụ Onyeàmà Jehova, o mekwara ka m kpebisie ike na m ga-eji ndụ m na-efe onye nyere m ndụ, bụ́ Jehova Chineke.—Abụ Ọma 90:12; Aịzaya 43:10.

Ebe m na-enweghịzi ike ịrụzi ụgbọala n’ihi ọkụ ahụ gbara m, m mụrụ otú e si arụzi kọmputa, e wee wee m n’ọrụ na Mahadum Virginia. Ọ bụ ya mere m ji nọrọ n’ebe ahụ a na-akpọ Ụlọ Norris n’ụtụtụ ahụ.

Ka ụda égbè nọ na-ada, anyị amaghị na onye ahụ nke nọ n’okpuru na-agba égbè ahụ egbuola ọtụtụ mmadụ karịa otú onye ọ bụla ọzọ gbutụrụla n’America. Ọ kwụsịrị ịgba égbè ahụ mgbe o gburula mmadụ iri atọ na abụọ na-enweghị ihe ha mere, gbuokwa onwe ya. Mgbe nkeji iri abụọ ụda égbè ahụ malitere gachara, anyị nụrụ olu ndị uwe ojii na paseeji. Anyị wee kpọọ ha, ha abịa duru anyị duga n’ebe ọ na-enweghị ihe ga-eme anyị.

Ihe ize ndụ a merenụ kụziiri m na anyị ejighị ndụ anyị n’aka nakwa na anyị nwere ike ịnwụ mgbe ọ bụla. (Jems 4:14) Ọ dị mkpa nke ukwuu ka anyị tụkwasị Onye na-enye ndụ, bụ́ Jehova Chineke, obi ma were ụbọchị ọ bụla anyị dị ndụ dị ka onyinye dị oké ọnụ ahịa nke o nyere anyị.—Abụ Ọma 23:4; 91:2.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 30]

AP Photo/The Roanoke Times, Alan Kim