Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Onye Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe Bụ n’Ezie?

Olee Ụdị Onye Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe Bụ n’Ezie?

Olee Ụdị Onye Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe Bụ n’Ezie?

ỌTỤTỤ ndị bu ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị, n’isi, bụ́ ekpere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere. (Matiu 6:9-13) Mgbe ọ bụla ha na-ekpe ekpere ahụ, ha na-akpọ Chineke “Nna Anyị.” Ma, mmadụ ole ga-asị na ha maara ya nke ọma?

Olee maka gị onwe gị? Ị̀ ma Chineke nke ọma? Gị na ya ọ̀ dị n’ezigbo mma? Ị̀ na-agwa ya okwu, na-akọrọ ya ihe ndị na-eme gị obi ụtọ na ihe ndị na-ewute gị? Gịnị n’ezie ka ịmara ya pụtara?

“Jehova Bụ Aha Ya”

Naanị ihe nwata nke na-amụ ije nwere ike ịma banyere nna ya bụ na ọ bụ ya bụ Papa. Ma, mgbe ọ na-etolite, ọ ga-amata aha nna ya, ụdị nna ọ bụ, jirikwa ya na-eme ọnụ, ma eleghị anya. Oleekwanụ banyere Onye nyere anyị ndụ, bụ́ onye bi n’eluigwe? Ị̀ ma aha ya na ihe aha ya pụtara?

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-asị “Ka e doo aha gị nsọ” mgbe ha na-ekpe Ekpere Onyenwe Anyị, ikekwe, ha amaghị ihe ha ga-aza ma a jụọ ha, “Gịnị bụ aha ahụ?” Kpakpando ndị juru n’eluigwe na nnukwu ugwu na ihe dị iche iche mara mma dị ndụ dị n’ala oké osimiri na-egosi na Chineke dị adị. Ma, ha anaghị ekwu ihe bụ́ aha Chineke. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmara aha ya, anyị kwesịrị ịga na Baịbụl. Baịbụl kwuru kpọmkwem, sị: “Jehova bụ aha ya.”—Ọpụpụ 15:3.

Chineke chọrọ ka anyị jiri aha ya bụ́ Jehova mara ya. N’ihi gịnị? N’ihi na aha ya na-egosi ụdị onye ọ bụ. Aha ya pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” ma a sụgharịa ya otú e si dee ya n’asụsụ Hibru. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ọ na-aghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ iji mezuo nzube ya. Legodị ya anya otú a: Nna na-aghọ onye na-akpa afọ ezinụlọ ya, onye ndụmọdụ, onye ikpe, onye ogbugbo, onye na-enye nchebe, na onye nkụzi iji lekọta ezinụlọ ya nke ọma dabere ná mkpa na ọnọdụ ezinụlọ ya. N’otú aka ahụ, aha ahụ bụ́ Jehova na-emesi anyị obi ike na mee elu mee ala, Chineke ga-emezu nzube ya, bụ́ nke ga-ewetara ndị niile na-efe ya ngọzi.

Ka anyị tụlee ọrụ dị iche iche Chineke anyị, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, na-arụ iji mezuo ihe aha ya pụtara. Ọ ga-eme ka ị ghọta ụdị onye Jehova bụ, meekwa ka ị mụta ihe ị na-aghaghị ime iji bịaruo ya nso.

“Chineke nke Ịhụnanya na nke Udo”

Pọl onyeozi kpọrọ Onye kere anyị “Chineke nke ịhụnanya na nke udo.” (2 Ndị Kọrịnt 13:11) N’ihi gịnị? Jizọs Kraịst bu ụzọ kwuo, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọ bụ n’ihi otú Chineke si hụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu mere o ji nye Ọkpara ọ hụrụ n’anya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ga-eme ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe n’ebe ọ nọ nwee ndụ ebighị ebi, mgbe ahụhụ na ihe mgbu ndị mmehie na-akpata na-agaghị adịkwa. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka anyị hụ Chineke n’anya, bịaruokwa ya nso?

Chineke na-egosi mmadụ niile ịhụnanya ya, na-egosikwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ ịhụnanya ya n’otu n’otu. Mozis gwara ụmụ Izrel oge ochie, bụ́ ndị nupụrụ isi ugboro ugboro, sị: “Ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emeso otú a, unu ndị nzuzu na-amaghị ihe? Ọ́ bụghị ya bụ Nna gị nke mụrụ gị, Onye kere gị wee mee ka ị kwụsie ike?” (Diuterọnọmi 32:6) Ị̀ ghọtara ihe okwu a ọ gwara ha pụtara? Dị ka Nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya, ihe banyere ndị Jehova metụrụ Jehova n’obi, n’agbanyeghị mmehie ha. O gbokwaara ha mkpa ha niile, ma mkpa anụ ahụ́ ha ma nke ime mmụọ ha, meekwa ka obi ruo ha ala.

Nsogbu ndị juru n’ụwa na-emetụta anyị niile. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anọ ná mwute, ma ọ bụkwanụ anyị adaa mbà n’obi. Ọ na-amasị anyị ma e nwee onye ga-abịa mee ka anyị ghọta ọnọdụ anyị na nsogbu anyị nke ọma. Olee onye nwere ike inyere anyị aka? Jehova ji Okwu ya, bụ́ Baịbụl, gosi na ya bụ Onye Ndụmọdụ anyị na Onye Na-elekọta anyị nke hụrụ anyị n’anya. Akwụkwọ ahụ dị nsọ na-egosi ihe mere anyị ji ata ahụhụ dị ukwuu, na otú anyị nwere ike isi die ya. Otú ahụ nna nke hụrụ nwa ya n’anya si enyere nwa ya dara ada wee merụọ ahụ́ aka ka Jehova si ewetu onwe ya ala, dị ka e nwere ike ikwu ya, wee nyere anyị aka, n’ihi ịhụnanya dị ukwuu o nwere n’ebe anyị nọ. N’eziokwu, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ nke na ọ gaghị enyere ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ aka.—Aịzaya 59:1.

Ụzọ ọzọ Chineke si egosi na ya hụrụ anyị n’anya bụ na ọ bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Pọl onyeozi sịrị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ bụrụ na i jiri obi gị dum kpekuo Chineke ekpere ma soro ntụziaka o nyere n’Okwu ya, ị ga-enwekwa “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.”

“Chineke nke Nwere Ihe Ọmụma”

Baịbụl kwuru na Jehova bụ́ Chineke “nwere ihe ọmụma zuru okè.” Ebe ọ bụ “Chineke nke nwere ihe ọmụma,” ọ na-aghọta ụmụ mmadụ, marakwa mkpa ha karịa onye ọ bụla ọzọ. (Job 36:4; 1 Samuel 2:3) O si n’ọnụ ohu ya bụ́ Mozis kwuo na “ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta ga-eme ka mmadụ dị ndụ.” (Diuterọnọmi 8:3; Matiu 4:4) Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụghị ihe onwunwe ga-eme ka anyị nwee ezi afọ ojuju ná ndụ.

Onye Okike anyị na-eji Okwu ya, bụ́ Baịbụl, eduzi anyị, na-enyekwa anyị ndụmọdụ. Mgbe anyị na-amụ Baịbụl ma na-etinye ndụmọdụ Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị na-erite uru ‘n’okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta.’ Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị Onye Kraịst, bụ́ Zuzanna, kwuru banyere ezinụlọ ya, sị: “Ịgụkọ Baịbụl ọnụ, ịgakọ ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ọnụ, na izi ndị ọzọ ozi ọma dị na Baịbụl, mere ka mụ na di m dịkwuo ná mma. Ọ bụ ntụziaka Chineke na-enye anyị mere ka ọ bụrụ otu ihe ka anyị na-achụ ná ndụ, meekwa ka anyị hụ onwe anyị n’anya karị.”

Ị̀ ga-achọ ka ndụmọdụ Chineke na ntụziaka ọ na-enye baara gị uru? Ị ga-enweta ngọzi dị ukwuu n’aka ya site n’ịmụchi Baịbụl anya na itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ.—Ndị Hibru 12:9.

“Chineke nke Nzọpụta”

Esemokwu juru ebe niile n’ụwa taa. Ọ dịghị onye ma ihe ga-eme echi. Ọ bụrụ na a na-alụ agha n’obodo unu, ọ ga na-agụsi gị agụụ ike ka e nwee udo. N’ebe ndị ọzọ n’ụwa, ụjọ mpụ na ihe ike a na-eme na-atụ ndị mmadụ. Ụjọ na-atụkwa ụmụ mmadụ n’ihi ọnọdụ akụnụba nakwa n’ihi ndị ji ngwá agha na-eyi ọha mmadụ egwu. Ònye ga-anapụta anyị ná nsogbu a niile? Nnapụta na nchebe dị ụmụ mmadụ mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

Baịbụl kwuru, sị: “Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.” (Ilu 18:10) Ịmara aha Chineke na inwe obi ike n’aha ahụ nwere ike ime ka anyị na-eche echiche banyere ihe dị iche iche Chineke merela iji napụta ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ na ihe ndị ọ ka ga-eme iji napụta ha. Jehova bụ́ Chineke egosiwo nke ọma na o nwere ikike ịnapụta ndị ya. Dị ka ihe atụ, ọ napụtara Izrel site n’ibibi ndị agha Fero na ụgbọ agha ha. Jehova gosiri na ya bụ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-echeta ndị nọ n’ahụhụ ma nwee mmasị ime ihe iji napụta ha.—Ọpụpụ 15:1-4.

Ihe ọzọ ga-ekpebi ma ọdịnihu anyị ọ̀ ga-adị mma ruo mgbe ebighị ebi bụ inwe okwukwe na Jehova bụ́ Chineke bụ Onye Nzọpụta anyị. Eze Devid nke Izrel oge ochie, bụ́ onye ọtụtụ ihe isi ike bịaara, gosiri na ya nwere ụdị okwukwe ahụ. Ọ bụ ya mere o ji dee banyere Jehova, sị: “Ị bụ Chineke nke nzọpụta m.” (Abụ Ọma 25:5) Pita onyeozi ji obi ike kwuo, sị: “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.”—2 Pita 2:9.

Chineke kwere onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi maka enyemaka nkwa, sị: “M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.” (Abụ Ọma 91:14) Ndị ohu Chineke taa ahụla na nkwa ahụ bụ eziokwu. Henryk, onye Poland, ejirila ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo afọ iri asaa, n’agbanyeghị ihe isi ike na mkpagbu. Mgbe Henryk dị afọ iri na isii, a tụrụ nna ya mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ dị n’Auschwitz. A kpọgara Henryk na nwanne ya nwoke n’ebe ndị Nazi na-akpọchi ndị ntorobịa. E mechaa, a nọ na-akpọgharị ya, e si n’otu ogige ịta ahụhụ akpọga ya n’ọzọ. Henryk chetara ihe mere n’oge ahụ. Ọ sịrị: “O nweghị mgbe Jehova hapụrụ m n’oge niile m nọ n’ọnọdụ ọjọọ. O nyeere m aka mgbe niile ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọtụtụ ugboro ọ fọrọ ntakịrị ka m nwụọ.” N’ezie, Jehova na-enye ndị ohu ya okwukwe na ike ha ga-eji die nsogbu ha.

N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-azọpụta ndị niile nwere okwukwe n’ebe ọ nọ, bụ́ ndị tụkwasịrị ya obi. Ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ Jehova, e nweghịkwa onye nzọpụta ọzọ ma e wezụga m.” (Aịzaya 43:11) ‘N’agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,’ ọ ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa ma napụta ndị ziri ezi. (Mkpughe 16:14, 16; Ilu 2:21, 22) Jehova mesiri anyị obi ike, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11.

Ịghọ “Ụmụ Chineke”

N’oge Malakaị onye amụma, ụmụ Izrel sịrị na Jehova bụ Nna ha. Ma, o ruo n’ịkwanyere ya ùgwù na ịsọpụrụ ya, ihe ha ji achụrụ ya àjà bụ achịcha rụrụ arụ na anụmanụ dara ngwọrọ na ndị nke kpuru ìsì. Ọ bụ ya mere Jehova ji jụọ ha, sị: “Ọ bụrụ na m bụ nna, olee nsọpụrụ a na-enye m?”—Malakaị 1:6.

Emela ụdị ihe ahụ ụmụ Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere. Kama nke ahụ, anyị na-agba gị ume ka ị mụọ banyere Jehova bụ́ Chineke ma bịaruo ya nso. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems gbara anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

Jehova ịbụ Nna anyị chọrọ ihe ụfọdụ n’aka anyị. Ma, ọ bụrụ na ị na-agbalị ịsọpụrụ Chineke site n’idebe iwu ya n’ihe niile ị na-eme ná ndụ, ọ gaghị echefu mgbalị gị. Kama ichefu ya, ọ ga-enyere gị aka ije ije n’ụzọ kwụ ọtọ nke na-eduga n’ụwa ọhụrụ ahụ o kwere ná nkwa, bụ́ ebe ‘ọnwụ na-agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.’ (Mkpughe 21:4) N’oge ahụ, a ga-eme ka ndị niile na-erube isi ‘nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’—Ndị Rom 8:21.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Chineke chọrọ ka anyị jiri aha ya bụ́ Jehova mara ya, bụ́ nke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” ma a sụgharịa ya otú e si dee ya n’asụsụ Hibru

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“O nweghị mgbe Jehova hapụrụ m n’oge niile m nọ n’ọnọdụ ọjọọ.”—HENRYK

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

“Ịgụkọ Baịbụl ọnụ, ịgakọ ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ọnụ, na izi ndị ọzọ ozi ọma dị na Baịbụl, mere ka mụ na di m dịkwuo ná mma.”—ZUZANNA