Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ihe E Kwuru n’Ọnụ Si Ghọọ Okwu Dị Nsọ E Dere Ede—Ide Ihe n’Oge Ndị Kraịst Oge Gboo

Otú Ihe E Kwuru n’Ọnụ Si Ghọọ Okwu Dị Nsọ E Dere Ede—Ide Ihe n’Oge Ndị Kraịst Oge Gboo

Otú Ihe E Kwuru n’Ọnụ Si Ghọọ Okwu Dị Nsọ E Dere Ede—Ide Ihe n’Oge Ndị Kraịst Oge Gboo

ỌTỤTỤ mmadụ bụ́ ndị kweere na Baịbụl n’ọgbọ dị iche iche na-ewepụta ọtụtụ awa na-agụ, na-amụ ma na-enyocha akwụkwọ ụfọdụ ndị mmadụ kacha mara e detụworo, ya bụ, Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ. Akwụkwọ ndị ahụ, na akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl, emetụtala ụwa anyị nke ukwuu, gosikwa ụmụ mmadụ ihe bụ́ omume ọma na ụkpụrụ ọma, kpaliekwa ha ide ihe odide na ime nkà dị iche iche. Nke ka nke bụ na o nyerela ọtụtụ nde mmadụ aka, tinyere gị onwe gị, ma eleghị anya, ịmata Chineke na Jizọs nke ọma.—Jọn 17:3.

E deghị Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn na akwụkwọ ndị ọzọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ozugbo Jizọs nwụrụ. Ọ ga-abụ na Matiu dere Oziọma ya n’ihe dị ka afọ asaa ma ọ bụ asatọ Jizọs nwụchara, ebe Jọn dere nke ya mgbe ihe dị ka afọ iri isii na ise gachara. Olee otú ha si nwee ike ideta ihe Jizọs kwuru na ihe ndị o mere? O doro anya na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke duziri ha. (Jọn 14:16, 26) Ma, olee otú e si dee ihe Jizọs kụziri kpọmkwem otú o si kụzie ha, nke na o mechara dịrị n’Akwụkwọ Nsọ?

Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs “Hà Bụ Ndị Iti Bọrịbọ”?

N’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, ụfọdụ ndị kwuru na ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge gboo edeghị ihe Jizọs kụziri na ihe ndị o mere ede, kama na ha ji ọnụ kọọrọ ya ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Mgbe Jizọs kwusaara ndị mmadụ ozi ọma, ọtụtụ iri afọ gafere tupu ndị dere Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn edee ihe ndị o kwuru. N’oge ahụ, ihe niile ndị mmadụ maara banyere Jizọs bụ ihe e ji ọnụ kọọrọ ha.” Ụfọdụ ndị na-eme nnyocha kwudịrị na ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge gboo “bụ ndị iti bọrịbọ.” * Ha kwukwara na n’oge ahụ e ji ọnụ na-akọ banyere ozi Jizọs jere n’ụwa na e tinyere akụkọ banyere ya nnu na ose. Ha sịrị na ọ bụ ya mere o ji bụrụ na ihe a na-akọ banyere Jizọs abụghị kpọmkwem ihe merenụ.

Akụkọ ọzọ ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwetara bụ na ndị Juu bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị ha na ya kpachiri anya, kụziri ihe otú ndị Rabaị si akụzi ihe, ya bụ, iburu ihe n’isi site n’ịkụzi ya ugboro ugboro, bụ́ nke mere ka ihe ha kụziri bụrụ eziokwu. Ọ̀ bụ naanị ọnụ efu ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ji kụzie banyere Jizọs? Ka ọ̀ ga-abụ na ide ihe odide nyere aka mee ka a ghara ichefu akụkọ banyere ozi Jizọs jere n’ụwa? Ọ ga-abụ na ihe e dere ede nyere aka na nke a, ọ bụ eziokwu na o dochaghị anyị anya.

Ndị Mmadụ Na-ede Ihe Kwa Ụbọchị

N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ụdị ndị dị iche iche maara otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. Alan Millard, bụ́ ọkachamara nke asụsụ Hibru na asụsụ ndị ọzọ ndị Juu na-asụ, kwuru banyere nke a, sị: “N’ebe niile, ma ndị ukwu ma ndị nta na-ede ihe n’asụsụ Grik, Arameik na Hibru.” Ọ sịkwara: “Ọ bụ n’etiti ha ka Jizọs dịrị ndụ.”

Ọkachamara ahụ bụ́ Millard dekwara banyere echiche bụ na “ndị mmadụ bụcha ndị iti bọrịbọ mgbe” e dere Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn, sị: “Ikekwe, ọ bụghị otú ahụ ka ihe dị n’oge ahụ, [ebe ọ bụ na] ọtụtụ ndị na-ede ihe . . . Ya mere, e nwere ndị nọ n’oge ahụ bụ́ ndị ọ ga-abụ na ha dere ihe ndị ha nụrụ, ma hà dere ya maka onwe ha ma ọ bụ ka ha jiri ya kụziere ndị ọzọ ihe.”

Ihe àmà na-egosi na e nwere mbadamba ihe e ji ede ihe n’oge ahụ bụ́ ndị e ji ihe machie elu ha ka e wee nwee ike iji ha na-ede ihe. Otu n’ime ihe atụ na-akwado nke a dị n’isi nke mbụ nke Oziọma Luk. A jụrụ Zekaraya, bụ́ onye na-anaghịzi ekwu okwu, aha ọ chọrọ ka a gụọ nwa ya. Amaokwu nke iri isii na atọ sịrị: “O wee sị [o doro anya na o ji aka kwuo] ka e nye ya mbadamba ihe, o wee dee, sị: ‘Jọn bụ aha ya.’” Akwụkwọ dị iche iche na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na ọ ga-abụ na okwu bụ́ “mbadamba ihe” pụtara bọọdụ e ji osisi rụọ nke e ji ihe machie elu ya. Ọ ga-abụ na otu n’ime ndị bịara n’ebe ahụ ji bọọdụ bịa, bụ́ nke Zekaraya dere ihe na ya.

O nwere ihe atụ ọzọ na-egosi na bọọdụ e ji ede ihe na ide ihe na ha bụ ihe a ma ama n’oge ahụ. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọrọ na Pita gwara ìgwè mmadụ okwu n’akụkụ ụlọ nsọ, gbaakwa ha ume, sị: “Chegharịanụ, . . . ka e wee hichapụ mmehie unu.” (Ọrụ 3:11, 19) Okwu ahụ bụ́ ‘ka e hichapụ’ si n’okwu Grik nke pụtara “ihicha ihe na ichicha ihe.” Akwụkwọ bụ́ The New International Dictionary of New Testament Theology kwuru, sị: “Ikekwe, ihe okwu ahụ e dere n’ebe a nakwa n’ebe ọzọ, ma eleghị anya, na-egosi bụ ime ka mbadamba ihe e ji ede ihe nke e ji ihe machie elu ya kwọọ mụrụmụrụ maka iji ya dee ihe ọzọ.”

Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn gosikwara na ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs na ndị ọzọ gere Jizọs ntị na-ede ihe kwa ụbọchị mgbe ha na-arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha bụ Matiu na Zakịọs bụ́ ndị na-anakọta ụtụ isi (Matiu 9:9; Luk 19:2); nakwa onyeisi ụlọ nzukọ (Mak 5:22); onyeisi ndị agha (Matiu 8:5); Joana, nwunye onye na-elekọtara Herọd Antipas ụlọ (Luk 8:3); tinyere ndị Farisii, ndị Sadusii, na ndị Sanhedrin. (Matiu 21:23, 45; 22:23; 26:59) O doro anya na ọtụtụ n’ime ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ma otú e si ede ihe. O nwedịrị ike ịbụ na ha niile ma otú e si ede ihe.

Ndị Na-amụ Ihe, Ndị Nkụzi, na Ndị Na-ede Akwụkwọ

Ka ndị na-eso ụzọ Jizọs wee bụrụ Ndị Kraịst na-akụziri ndị mmadụ ihe, ha aghaghị ịmara ihe Jizọs kwuru na ihe o mere, ha aghaghịkwa ịghọta otú Iwu Mozis na amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru si mezuo n’ebe Kraịst nọ. (Ọrụ 18:5) Ọ dị mma ịmara na Luk dere banyere otu oge Jizọs na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya hụrụ mgbe ọ ka bilitesịrị n’ọnwụ. Gịnị ka Jizọs mere n’oge ahụ? “Ọ kọwaara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ dum banyere onwe ya, malite n’ihe Mozis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.” Obere oge Jizọs gwachara ha nke ahụ, ọ sịrị ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya: “‘Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ, na ihe niile e dere n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma na Abụ Ọma banyere m aghaghị imezu.’ Mgbe ahụ, o mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” (Luk 24:27, 44, 45) Mgbe e mechara, ndị na-eso ụzọ ya “chetara” ihe Jizọs kọwaara ha.—Jọn 12:16.

Akụkọ ndị a na-egosi na ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nyochasiri Akwụkwọ Nsọ ike ma mụsie ya ike iji ghọtachaa ihe ihe ha hụrụ ma nụ banyere Onyenwe ha, bụ́ Jizọs Kraịst, pụtara. (Luk 1:1-4; Ọrụ 17:11) Harry Y. Gamble, bụ́ ọkachamara nke na-akụzi banyere okpukpe na Mahadum Virginia, dere, sị: “O doro anya na site ná mmalite, e nwere Ndị Kraịst, ikekwe ha dị ọtụtụ, bụ́ ndị wepụtara oge ha na-amụchi Akwụkwọ Nsọ Hibru anya ma na-akọwa ya, ha si na ya na-ewepụta amaokwu [ya bụ, ihe àmà] dị iche iche ndị na-akwado ihe ndị ha kweere, ha na-emekwa ka onye ọ bụla jiri amaokwu ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma.”

Ihe a niile na-egosi na kama ịdabere naanị n’akụkọ e ji ọnụ kọọ, ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge gboo mụchiri ihe anya, gụsie akwụkwọ ike, deekwa ihe odide. Ha bụ ndị na-amụ ihe, ndị nkụzi, na ndị na-ede akwụkwọ. Nke ka nke bụ na ha ji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe, ọ bụ ya mere mmụọ nsọ ji duzie ha. Jizọs mesiri ha obi ike na “mmụọ nke eziokwu ahụ” ‘ga-echetara ha ihe niile ọ gwara ha.’ (Jọn 14:17, 26) Mmụọ nsọ nyeere ha aka icheta ihe Jizọs mere na ihe ndị o kwuru na ide ha ede, tinyere ogologo okwu o kwuru, dị ka Ozizi Elu Ugwu ahụ. (Matiu, isi nke 5 ruo nke 7) Mmụọ nsọ duzikwara ndị dere Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn ide otú obi dị Jizọs mgbe ụfọdụ na ihe o kwuru mgbe ọ na-ekpe ekpere.—Matiu 4:2; 9:36; Jọn 17:1-26.

Ya mere, ọ bụ ezie na o doro anya na ndị dere Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn si n’akụkọ e ji ọnụ kọọrọ ha nakwa ihe e dere ede nweta ihe ha dere, ihe ha dere si n’aka onye kacha elu, bụ́ onye a pụrụ ịtụkwasị obi, bụ́ Jehova Chineke. N’ihi ya, obi siri anyị ike nke ukwuu na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke” nakwa na o nwere ike ịkụziri anyị ihe na iduzi anyị ime ihe dị Chineke mma.—2 Timoti 3:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ede ihe kwa ụbọchị mgbe ha na-arụ ọrụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Mmụọ nsọ Chineke nyeere ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge gboo aka icheta ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

 Ndịozi Jizọs Hà Bụ Ndị Iti Bọrịbọ?

Mgbe ndị na-achị obodo na ndị okenye Jeruselem “hụrụ otú Pita na Jọn si nwee nkwuwa okwu, ghọtakwa na ha bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị, o juru ha anya.” (Ọrụ 4:13) Ndịozi Jizọs hà bụ ndị iti bọrịbọ? Akwụkwọ bụ́ The New Interpreter’s Bible kwuru banyere echiche ahụ, sị: “O yiri ka e kwesịghị ịghọta okwu ndị ahụ elu elu, dị ka à ga-asị na Pita [na Jọn] bụ ndị na-agatụdịghị akwụkwọ, ndị na-amaghị otú e si ede ma ọ bụ otú e si agụ. Naanị ihe okwu ha na-egosi bụ na ndịozi ahụ abụghị ndị ukwu otú ahụ ndị ahụ na-ekpe ha ikpe bụ ndị ukwu.”

[Foto dị na peeji nke 13]

“O wee sị ka e nye ya mbadamba ihe, o wee dee, sị: ‘Jọn bụ aha ya’”

[Foto dị na peeji nke 13]

Mbadamba ihe e ji ede ihe nke e ji ihe machie elu ya, na mkpịsị e ji ede ihe, bụ́ ndị dịwara kemgbe ihe dị ka puku afọ abụọ ma ọ bụ otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga

[Ebe E Si Nweta Foto]

© British Museum/Art Resource, NY