Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn Obi?

È Kwesịrị Ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn Obi?

È Kwesịrị Ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn Obi?

“E kwesịrị iwere oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn dị ka akụkọ ifo Ndị Kraịst oge gboo kọrọ.”—Burton L. Mack, ọkachamara nke na-akụzi ihe ọmụmụ Agba Ọhụrụ, bụ́ onye larala ezumike nká.

Ọ BỤGHỊ naanị ọkachamara a nwere ụdị echiche a. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta ekwuola na e kwesịghị ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn obi, ya bụ, ịtụkwasị ihe Baịbụl kwuru banyere ndụ Jizọs na ozi o jere obi. Gịnị mere ụfọdụ ndị ji chee na ihe dị n’akwụkwọ ndị ahụ bụ akụkọ ifo? Ihe ndị ha kwuru ò kwesịrị ime ka i nwewe obi abụọ ma ihe dị n’akwụkwọ ndị ahụ ọ̀ bụkwa eziokwu? Ka anyị tụlee ihe àmà ụfọdụ.

Ụfọdụ Na-arụ Ụka na E Kwesịghị Ịtụkwasị Akwụkwọ Ndị ahụ Obi

Malite n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga ruo n’ihe dị ka narị afọ anọ gara aga, ọtụtụ ndị kweere na e kwesịrị ịtụkwasị akwụkwọ ndị ahụ obi. Ma, malite n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na akwụkwọ ndị ahụ esighị n’ike mmụọ nsọ Chineke, kama, na ọ bụ ụmụ mmadụ chepụtara ha. Ha kwukwara na ndị dere akwụkwọ ndị ahụ amaghị mgbe ihe ndị ahụ ha dere banyere Jizọs mere, nakwa na ndị ikom ahụ enweghị ike ide ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi. E wezụgakwa nke ahụ, ha kwuru na oyiyi Oziọma Matiu, Mak, na Luk yiri ibe ha na-egosi na onye ọ bụla n’ime ha weere ihe ibe ya dere dee na nke ya. Ndị na-akatọ Baịbụl ekwetaghị na Jizọs rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ e dere n’akwụkwọ ndị ahụ, ha ekwetaghịkwa na o si n’ọnwụ bilie dị ka akwụkwọ ndị ahụ kwuru. Ụfọdụ n’ime ha na-ekwudị na o nweghị onye dịrị ndụ n’ụwa bụ́ Jizọs!

Ndị nkatọ ahụ kwukwara na ọ ga-abụrịrị Mak bu ụzọ dee Oziọma nke ya, n’ihi na o nweghị oké ihe dị iche n’ihe o dere na ihe Matiu na Luk dere. Ndị nkatọ ahụ kwukwara na Matiu na Luk si n’ihe Mak dere dee akwụkwọ nke ha ma weta ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ ndị ọkà mmụta kpọrọ Q (ya bụ, mkpụrụ akwụkwọ si n’okwu German bụ́ Quelle). Otu ọkà mmụta Baịbụl nke aha ya bụ A.F.J. Klijn, kwuru na echiche ahụ ọtụtụ ndị nkatọ ahụ nwere “na-egosi na naanị ihe ndị ahụ dere Oziọma Matiu, Mak, na Luk mere bụ iwere ihe ibe ha dere dee n’akwụkwọ nke ha.” Nke a na-eme ka o yie ka ndị dere akwụkwọ ndị ahụ hà weere ihe ndị ọzọ dere wee sị na ọ bụ nke ha, meekwa ka o yie ka hà bụ ndị na-akọ akụkọ ifo. Ihe a ndị nkatọ ahụ kwuru emeela ka ndị mmadụ ghara ikwere na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke.—2 Timoti 3:16.

Matiu, Mak, na Luk Hà Weere Ihe Ndị Ọzọ Dere Wee Sị na Ọ Bụ nke Ha?

Oyiyi ihe Matiu, Mak, na Luk dere yiri, ọ̀ na-egosi n’ezie na ha weere ihe ibe ha dere dee n’akwụkwọ nke ha? Mba. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na mmụọ nsọ ‘ga-echetara ha ihe niile ọ gwara ha.’ (Jọn 14:26) N’ihi ya, o kwesịghị ịtụ anyị n’anya na Matiu, Mak, na Luk chetara ihe ụfọdụ merenụ ibe ha chetara ma dee ha. N’eziokwu, ọ ga-abụ na ụfọdụ ndị so dee Baịbụl gụrụ ihe ndị ọzọ so dee Baịbụl dere, deekwa ihe ụfọdụ ha dere. Ma, ihe nke ahụ na-egosi bụ na ha ji nlezianya mee nnyocha, ọ naghị egosi na ha weere ihe ndị ọzọ dere wee sị na ọ bụ nke ha. (2 Pita 3:15) E wezụga nke ahụ, akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na a na-eji ọnụ nkịtị akọ ihe ndị mere eme n’oge ahụ, ọ ga-abụ ya mere o ji dịrị ha mfe iji otu ụzọ dee ihe ndị dị mkpa Jizọs kwuru.”

Luk sịrị na ya na ọtụtụ ndị ji anya ha hụ ihe merenụ kwurịtara okwu, sịkwa na ya si “ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.” (Luk 1:1-4) Ihe a o kwuru ò yiri gị ka o weere ihe onye ọzọ dere wee sị na ọ bụ nke ya, ka ò yiri gị onye na-akọ akụkọ ifo? Mbanụ! Mgbe otu onye na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie, nke aha ya bụ William Ramsay, nyochara Oziọma Luk nke ọma, ọ sịrị: “Luk bụ aka ochie n’ịkọ akụkọ ihe mere eme: ọ bụghị naanị na e kwesịrị ịtụkwasị ihe ndị o dere obi, kamakwa, ọ ma otú e kwesịrị isi dee akụkọ ihe ndị mere eme . . . E kwesịrị ịgụnye ya ma a gụwa ndị bụ́ ọkaibe n’ịkọ akụkọ ihe mere eme.”

Ihe ndị oge gboo, bụ́ ndị dere banyere Ndị Kraịst, dere, tinyere ihe ọkà mmụta okpukpe bụ́ Origen, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga, dere, na-egosi na Matiu onyeozi bụ onye mbụ dere Oziọma. Origen dere, sị: “Ọ bụ Matiu dere Oziọma mbụ, bụ́ onye bụbu onye ọnaụtụ, ma mechaa ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, onye deere ya Ndị Juu chegharịrị echegharị, mechaa dee ya n’asụsụ Hibru.” O doro anya na Matiu, bụ́ onyeozi Jizọs nke ji anya ya hụ ihe merenụ, agaghị aga were ihe Mak dere dee wee sị na ọ bụ nke ya, ebe ọ bụ na Mak ejighị anya ya hụ mgbe ihe ndị ahụ mere. Oleezi nke bụ́ eziokwu n’ihe ahụ e kwuru, ya bụ, na Matiu na Luk si n’ihe Mak dere dee akwụkwọ nke ha? Oleekwa ihe bụ́ eziokwu banyere akwụkwọ a sị na ọ bụ Q?

Ọ̀ Bụ Mak Bu Ụzọ Dee Oziọma Ya?

Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru na “e nweghị ihe e ji n’aka kwadoro” echiche ahụ bụ́ na Mak bu ụzọ dee Oziọma ya, Matiu na Luk ewerezie ihe o dere dee na nke ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị ọkà mmụta chere na Mak bu ụzọ dee Oziọma ya tupu Matiu na Luk edee nke ha, n’ihi na, dị ka ha kwuru, o nweghị oké ihe dị iche n’ihe Mak dere na ihe ndị nke ọzọ dere. Dị ka ihe atụ, otu ọkà mmụta Baịbụl nke aha ya bụ Johannes Kuhn, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, kwuru na ọ ga-abụrịrị na e bu ụzọ dee Oziọma Mak. Kuhn kwuru na ọ bụrụ na ọ bụghị otú ahụ, na “ọ ga-abụ na Mak weere ihe Matiu dere, werekwa ihe Luk dere, jikọta ha ọnụ, ha aghọọ Oziọma nke ya.”

Ebe ọ bụ Oziọma Mak kacha ntakịrị, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ dịghị ihe pụrụ oké iche dị na ya dị ka e nwere ná ndị nke ọzọ. Ma, nke a anaghị egosi na e bu ụzọ dee ya. E wezụga nke ahụ, ọ bụghị eziokwu na e nweghị ihe dị iche n’ihe Mak dere na ihe Matiu na Luk dere. N’ezie, e nwere ihe karịrị otu narị amaokwu na iri asatọ n’akụkọ Mak kọrọ banyere ozi Jizọs jere, nweekwa ihe ndị ọzọ na-adọrọ mmasị, bụ́ ndị na-adịghị n’Oziọma Matiu na Luk. Ha niile na-egosi na Oziọma Mak dị iche n’ezie.—Gụọ  igbe dị na peeji nke 13.

Olee Maka Akwụkwọ ahụ A Sị na A Na-akpọ Q?

Olee maka akwụkwọ ahụ a sị na a na-akpọ Q, nke ụfọdụ ndị sị na ọ bụ na ya ka Matiu na Luk si nweta ihe ha dere? Otu prọfesọ nke na-akụzi banyere okpukpe, bụ́ James M. Robinson, kwuru, sị: “N’ezie, Q bụ akwụkwọ Ndị Kraịst kacha mkpa anyị nwere.” Ọ bụ ihe ijuanya na o kwuru nke a, ebe ọ bụ na e nweghị akwụkwọ bụ́ Q taa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị onye nwere ike inye ihe àmà na-egosi na o nwere mgbe ọ dịrị! Otú akwụkwọ ahụ si funyụọ anya bụ ihe ọzọ dị ịtụnanya karị n’ihi na ndị ọkà mmụta kwuru na ọ ga-abụrịrị na o ruru ọtụtụ mmadụ aka. Ihe ọzọ bụ na ọ dịghị ndị oge gboo, bụ́ ndị dere banyere Ndị Kraịst, dere ihe dị n’akwụkwọ ahụ bụ́ Q.

Chebara nke a echiche. E kwuru na akwụkwọ ahụ bụ́ Q dịrị adị nakwa na ọ kwadoro na e bu ụzọ dee Oziọma Mak. Nke a ọ́ bụghị otu akụkọ ifo ime ka mmadụ kwere akụkọ ifo ọzọ? Ụdị echiche a kwesịrị ime ka anyị buru ilu a n’obi, nke sịrị: ‘Naanị onye enweghị uche na-ekwenye ihe niile; ma onye nwere uche na-atụle mara nke bụ nke.’—Ilu 14:15, nsụgharị Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

E Kwesịrị Ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn Obi

Ndị ọkà mmụta ndị na-akatọ Baịbụl emeela ka ọtụtụ ndị ghara ịmụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere banyere ndụ Jizọs na ozi o jere n’ihi ihe na-edoghị ha anya ha na-ekwu. Ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuru na-egosi na Ndị Kraịst oge gboo ewereghị ihe ndị mere ná ndụ Jizọs, n’ozi ya, ọnwụ ya, na mbilite n’ọnwụ ya dị ka akụkọ ifo. Ọtụtụ narị mmadụ bụ́ ndị ji anya ha hụ ihe merenụ kwuru na ihe ndị ahụ bụ eziokwu. Ndị Kraịst oge gboo a, bụ́ ndị dị njikere iso Jizọs n’agbanyeghị mkpagbu ma ọ bụ ọnwụ nwere ike ịbịara ha n’ihi iso ya, ghọtara nke ọma na ọ dịghị uru ọ baara mmadụ ịbụ Onye Kraịst ma ọ bụrụ na ozi Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya bụ akụkọ ifo.—1 Ndị Kọrịnt 15:3-8, 17, 19; 2 Timoti 2:2.

Otu ọkà mmụta okpukpe, bụ́ George W. Buchanan, kwuru banyere echiche ahụ na-ese okwu nke bụ́ na e bu ụzọ dee Oziọma Mak nakwa banyere akwụkwọ ahụ a sị na ọ bụ Q, sị: “Itinye uche n’ihe ndị ahụ e chepụtara echepụta na-eme ka ndị na-amụ Baịbụl ghara ịmụ Baịbụl.” Nke ahụ kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Timoti, ka ọ ghara “ịṅa ntị n’akụkọ ụgha nakwa n’usoro ọmụmụ, bụ́ ndị na-emesị bụrụ ihe efu, ndị na-ebutekwa ajụjụ ndị a na-emere nnyocha kama ịdị na-ekesa ihe ọ bụla si n’aka Chineke n’ihe banyere okwukwe.”—1 Timoti 1:4.

E kwesịrị ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn obi. Ihe ndị e dere na ha bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi nke ndị mmadụ ji anya ha hụ mgbe ha mere. E mere nnyocha nke ọma tupu e dee ha. Ha mere ka anyị mara ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị banyere ndụ Jizọs Kraịst. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịṅa ntị n’ihe Pọl kwuru dị ka Timoti mere n’oge ochie. Pọl sịrị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.” Anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwere na “Akwụkwọ Nsọ dum,” tinyere Matiu, Mak, Luk, na Jọn, “si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”—2 Timoti 3:14-17.

[Igbe dị na peeji nke 13]

 A Sị na E Deghị Oziọma Mak, Anyị Agaraghị Ama na . . .

Jizọs lere anya gburugburu n’iwe, o wee wute ya nke ukwuu na ha bụ ndị ihe na-adịghị emetụ n’obi (Mak 3:5)

a gụrụ Jọn na Jems Boanajis (Mak 3:17)

nwaanyị ahụ nke na-arịa ọrịa oruru ọbara mefuru ihe niile o nwere (Mak 5:26)

Herodias buuru Jọn onye na-eme Baptizim iwe n’obi nakwa na Herọd na-atụ Jọn egwu ma na-echebe ya (Mak 6:19, 20)

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa zurutụ ike (Mak 6:31)

ndị Farisii na-akwọ aka ha ruo n’ikpere aka (Mak 7:2-4)

Jizọs kuuru ụmụaka (Mak 10:16)

Jizọs nwere ịhụnanya n’ebe nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị nọ (Mak 10:21)

Pita, Jems, Jọn, na Andru jụrụ Jizọs ajụjụ mgbe naanị ha na ya nọ (Mak 13:3)

otu nwa okorobịa hapụrụ uwe linin ya (Mak 14:51, 52)

E nwere otu n’ime ihe atụ ndị Jizọs mere na ọrụ ebube abụọ ọ rụrụ ndị na-adịghị n’ebe ọzọ ma e wezụga n’akwụkwọ Mak.—Mak 4:26-29; 7:32-37; 8:22-26.

E nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ ji anya ha hụ dị n’Oziọma Mak, bụ́ ndị na-adịghị n’Oziọma ndị ọzọ. Anyị ga-enwekwu ekele maka akwụkwọ Mak ma ọ bụrụ na anyị ewepụta ohere tụgharịa uche nke ọma n’uru ihe niile pụrụ iche a kọrọ na ya bara.