Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Mgbe Ị Na-enwere Ndị Mmadụ Anyaụfụ? Ụmụnne Josef Nweere Ya Anyaụfụ

Ò Nwere Mgbe Ị Na-enwere Ndị Mmadụ Anyaụfụ? Ụmụnne Josef Nweere Ya Anyaụfụ

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ò Nwere Mgbe Ị Na-enwere Ndị Mmadụ Anyaụfụ? Ụmụnne Josef Nweere Ya Anyaụfụ

KA ANYỊ tụlee ihe inwere mmadụ anyaụfụ pụtara. Ò nwetụla mgbe ị na-enweghị mmasị n’ebe mmadụ nọ maka na ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ezigbo mmadụ, na ọ mara mma ma ọ bụ dị gara gara? *— Otú ahụ ka obi na-adị mmadụ ma ọ bụrụ na ọ na-enwere onye ọzọ anyaụfụ.

Anyaụfụ nwere ike ịbata n’ezinụlọ ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ na-emere otu nwa ha ihe karịa nke ọzọ. Baịbụl kọrọ banyere otu ezinụlọ nke anyaụfụ kpataara nnukwu nsogbu. Ka anyị tụlee nsogbu anyaụfụ ahụ kpatara na ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ merenụ.

Josef bụ nwa nwoke nke iri na otu Jekọb mụrụ. Ụmụ nwoke nna ji ha na ya nweere ya anyaụfụ. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ọ bụ n’ihi na nna ha, bụ́ Jekọb, hụrụ Josef n’anya karị. Dị ka ihe atụ, Jekọb kwaara Josef otu uwe nwegasịrị akara. Ihe kacha mee ka Jekọb hụ Josef n’anya bụ “n’ihi na ọ bụ nwa ọ mụrụ n’agadi,” bụrụkwa nwa mbụ nwunye ọ hụrụ n’anya, bụ́ Rechel, mụrụ.

Baịbụl kwuru na ‘mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịchaa, ha kpọrọ ya asị.’ Otu ụbọchị, Josef kọọrọ ndị ezinụlọ ha na ya rọrọ nrọ ebe ha niile kpọọrọ ya isiala, tinyere papa ya. Baịbụl kwuru na ‘ụmụnne Josef nweweere ya anyaụfụ.’ Papa ya bakwaara ya mba na ọ kọọrọ ha nro ahụ.—Jenesis 37:1-11.

Mgbe obere oge gafere, mgbe Josef dị afọ iri na asaa, ụmụnne ya nọ n’ebe dị anya na-azụ ewu na atụrụ ha. Jekọb wee zie Josef ka ọ gaa mara otú ụmụnne ya mere. Ị̀ ma ihe ọtụtụ n’ime ha chọrọ ime mgbe ha hụrụ ka ọ na-abịa?— Ha chọrọ igbu ya! Ma mmadụ abụọ n’ime ha, ya bụ, Ruben na Juda, achọghị ka ha gbuo ya.

Mgbe ụfọdụ ndị ahịa na-aga Ijipt nọ na-agafe, Juda sịrị: ‘Bịanụ ka anyị ree ya.’ Ha wee ree ya. Ha wee gbuo otu ewu, bịanye uwe Josef n’ọbara ya. E mechaa, ha gosiri nna ha uwe ahụ, o wee tie mkpu, sị: ‘Ọ ghaghị ịbụ na ajọ anụ ọhịa eriwo Josef!’—Jenesis 37:12-36.

Ka oge na-aga, Fero eze Ijipt hụrụ Josef n’anya. Ọ bụ n’ihi na Chineke nyeere Josef aka, ya akọọ ihe nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara. Ọ hụrụ ehi asaa ahụ́ siri ike na ehi asaa ọzọ na-arịa ọrịa ná nrọ nke mbụ ọ rọrọ. Ná nrọ nke abụọ, ọ hụrụ oko ọka asaa gbara agba na oko ọka asaa ọzọ fịkpọrọ afịkpọ. Josef kwuru na nrọ abụọ ahụ pụtara na a ga-enwe afọ asaa nri ga-aba ụba, nweekwa afọ asaa ọzọ ụnwụ ga-adị. Fero wee nye iwu ka e mee Josef onyeisi nke ndị ga-ekpokọta nri n’afọ ndị ahụ nri ga-aba ụba iji kwadebe maka ụnwụ.

Mgbe ụnwụ ahụ malitere, nri kọrọ ndị ezinụlọ Josef, bụ́ ndị bi n’ebe dị anya. Jekọb wee ziga ụmụnne Josef iri ndị tọrọ ya ka ha gaa Ijipt zụta nri. Ha bịakwutere Josef, ma, ha amataghị onye ọ bụ. Josef emeghị ka ụmụnne ya mara onye ọ bụ, o wee lee ha ule chọpụta na àgwà ọjọọ ha kpasoro ya na-ewute ha. Josef wee gwa ha onye ọ bụ. Ha nwere obi ụtọ, wee makụrịta ibe ha.—Jenesis, isi nke 40 ruo nke 45.

Olee ihe ị mụtara banyere anyaụfụ n’akụkọ a si na Baịbụl?— Anyaụfụ nwere ike ịkpata nnukwu nsogbu, ọbụna mee ka mmadụ merụọ nwanne ya ahụ́! Ka anyị gụọ Ọrụ 5:17, 18 na Ọrụ 7:54-59 wee hụ ihe anyaụfụ mere ka ndị mmadụ mee ndị na-eso ụzọ Jizọs.— Mgbe ị gụchara ha, ị̀ hụrụ ihe mere anyị na-aghaghị iji kpachara anya ka anyị ghara inwere ndị ọzọ anyaụfụ?—

Josef dịrị ndụ ruo otu narị afọ na iri. Ọ mụrụ ụmụ, ụmụ ya amụọ ụmụ, ụmụ ụmụ ya amụọkwa ụmụ. O doro anya na Josef kụziiri ha ugboro ugboro ka ha hụ onwe ha n’anya ma ghara inwere ibe ha anyaụfụ.—Jenesis 50:22, 23, 26.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ na ọ bụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa nwatakịrị ahụ ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

Ajụjụ:

○ Gịnị ka inwe anyaụfụ pụtara?

○ Olee ihe anyaụfụ mere ka ụmụnne Josef mee?

○ Gịnị mere Josef ji gbaghara ụmụnne ya?

○ Olee ihe anyị mụtara n’akụkọ a?