Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Onye Nwere Ike Ịma Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

Ò Nwere Onye Nwere Ike Ịma Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

Ò Nwere Onye Nwere Ike Ịma Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

“Abụ m Chineke . . , Onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.” —Aịzaya 46:9, 10.

N’OGE a a na-ejighị ihe ọ bụla n’aka, ndị ọkachamara n’ihe banyere ọchịchị, akụnụba, na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-amụ ihe ndị mere n’oge gara aga na ihe ndị na-eme n’oge a iji kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ndị ọzọ, bụ́ ndị na-achọsi ike ka ha mata ihe ọdịnihu ga-ewetara ha, na-agakwuru ndị na-agụ kpakpando ma ọ bụkwanụ ndị mgbaasị ka ha gwa ha ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, ọtụtụ mgbe, o nweghị enyemaka ha na-enweta. Ọ̀ pụtara na mmadụ enweghị ike ịmata ihe ga-eme ụwa a, ezinụlọ anyị, na anyị onwe anyị n’otu n’otu n’ọdịnihu? E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ò nwere onye nwere ike ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu?

Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ Jehova, kọwara ikike o nwere ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu mgbe ọ gwara Aịzaya onye amụma ihe ahụ e dere ná mmalite isiokwu a. Chineke si n’ọnụ Aịzaya kwuo na ndị Babịlọn ga-ahapụ ụmụ Izrel oge ochie ka ha laa wee gaa wughachi Jeruselem na ụlọ nsọ dị na ya. Amụma ahụ ò kwuru kpọmkwem otú ihe ndị a ga-esi eme? N’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu e merie Babịlọn, Aịzaya kwuru kpọmkwem na ọ bụ Saịrọs ga-emeri ya. Aịzaya kwukwara kpọmkwem otú Saịrọs ga-esi emeri ya. Ọ ga-eme ka Osimiri Yufretis, bụ́ osimiri na-echebe Babịlọn, sọrọ gaa n’ebe ọzọ. O kwukwara na nnukwu ọnụ ụzọ nwere ibo abụọ nke dị ná mgbidi obodo ahụ ga-eghe oghe mgbe Saịrọs ga-abata, bụ́ nke ga-eme ka ọ dịrị ya mfe imeri obodo ahụ.—Aịzaya 44:24–45:7.

Chineke ma ihe ga-eme n’ọdịnihu, ma mmadụ amaghị. Eze Sọlọmọn, bụ́ onye amamihe, dere, sị, “Ejila echi anya isi, n’ihi na ị maghị ihe chi ga-abọta.” (Ilu 27:1) Ihe a o kwuru ka bụkwa eziokwu. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịma ihe ọdịnihu ya ga-abụ. Olee ihe mere Chineke ji dị iche? Ọ ma ihe niile o kere eke nke ọma, marakwa otú mmadụ si eche echiche na otú o si akpa àgwà. Mgbe ọ bụla Chineke chọrọ, o nwere ike ịma kpọmkwem ihe ndị mmadụ ma ọ bụ mba dị iche iche ga-eme n’ọdịnihu. N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, o nwere ikike ime ka ihe gaa otú ọ chọrọ. Mgbe ọ bụla o si n’ọnụ ndị amụma ya kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ “na-eme ka okwu ohu ya mezuo, . . . na-emezucha atụmatụ nke ndị ozi ya.” (Aịzaya 44:26) N’eziokwu, ọ bụ naanị Jehova bụ́ Chineke bụ onye nwere ike ime nke a.

Aịzaya dịrị ndụ n’ihe karịrị narị afọ asaa tupu a mụọ Jizọs bụ́ Mesaya. N’agbanyeghị nke ahụ, Aịzaya buru amụma banyere ọbịbịa Mesaya. Ma, kemgbe ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, ndị na-akatọ Baịbụl na-ekwu na aghụghọ dị n’ihe e dere n’akwụkwọ Aịzaya. Ha kwuru na amụma ndị Aịzaya buru banyere Mesaya abụghị amụma n’eziokwu, kama na onye dere ha dere ha mgbe ha mecharala eme. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? N’afọ 1947, a hụrụ akwụkwọ Aịzaya na ihe odide ochie ndị ọzọ n’otu ọgba dị nso n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ndị ọkà mmụta chọpụtara na e dere akwụkwọ a n’ihe karịrị otu narị afọ tupu a mụọ Mesaya ahụ e buru n’amụma, ma ọ bụ Kraịst. N’ezie, Baịbụl mere ka a mara ihe ga-eme n’ọdịnihu!

Aịzaya na ndị ọzọ so dee Baịbụl enweghị amamihe ga-eme ka ha nwee ike ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Kama nke ahụ, ha “kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ e buru n’amụma site n’ọnụ Aịzaya banyere ndụ Jizọs. E mechaa, anyị ga-atụle ihe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya buru n’amụma banyere oge anyị a nakwa banyere ọdịnihu.