Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụrụ na Adam Zuru Okè, Oleezi Otú O Si Mee Mmehie?

Ọ Bụrụ na Adam Zuru Okè, Oleezi Otú O Si Mee Mmehie?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Ọ Bụrụ na Adam Zuru Okè, Oleezi Otú O Si Mee Mmehie?

Ọ bụghị ihe ijuanya na Adam mere mmehie n’ihi na mgbe Chineke kere ya, o kere ya ka o nwere onwe ya ịhọrọ ihe ọ ga-eme. Onyinye a Chineke kenyere n’ime Adam emeghị ka Adam bụrụ onye na-ezughị okè. N’eziokwu, ọ bụ naanị Chineke zuru okè n’ụzọ niile. (Diuterọnọmi 32:3, 4; Abụ Ọma 18:30; Mak 10:18) Mmadụ izu okè ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ izu okè apụtaghị na ọ ga-enwe ike ime ihe niile. Dị ka ihe atụ, mma nwere ike izu okè maka iji ya egbu anụ, ma ị̀ ga-eji ya kuru ofe rachaa? Ya mere, e nwere ike ikwu na ihe zuru okè ma ọ bụrụ na ihe ahụ na-arụzu ọrụ e bu n’obi mee ya.

Gịnị mere Chineke ji kee Adam? Ọ bụ n’ihi na Chineke chọrọ isi n’Adam kee ụmụ mmadụ nwere ọgụgụ isi, ndị nweere onwe ha ịhọrọ ihe ha ga-eme. Ndị chọrọ ịhụ Chineke na ụzọ Chineke n’anya ga-egosi ịhụnanya ha site n’ịhọrọ irubere iwu ya isi. Ya mere, e keghị ụbụrụ mmadụ ka mmadụ na-erube isi, ma ọ̀ chọrọ ma ọ́ chọghị. Kama, e kere mmadụ ka o jiri obi ya na-erube isi, ma ọ bụrụ na ọ chọrọ irube isi. (Diuterọnọmi 10:12, 13; 30:19, 20) Ya mere, a sị na Adam enwereghị onwe ya ịhọrọ ma ọ̀ ga-enupụ isi ma ọ bụ na ọ gaghị enupụ isi, ọ pụtara na o nwere ihe kọrọ ya, ya bụ, na o zughị okè mgbe e kere ya ma nye ya ikike ịhọrọ ihe ọ ga-eme. Baịbụl kwuru na Adam ji aka ya họrọ ime ihe masịrị ya. Ọ họọrọ iso nwunye ya nupụ isi n’iwu Chineke nyere ha banyere “osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.”—Jenesis 2:17; 3:1-6.

Ma, mgbe Chineke kere Adam, ò kere ya ka echiche ya ghara izu okè, ka ọ ghara inwe ike ime mkpebi ziri ezi ma ọ bụ ghara imeri ọnwụnwa? Tupu Adam enupụ isi, Jehova bụ́ Chineke enyochaala ihe niile o kere n’ụwa, tinyere di na nwunye mbụ ahụ, wee hụ na ha “dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:31) Ya mere, mmehie Adam mere apụtaghị na o nwere ihe Onye kere ya na-ekezighị ekezi n’ahụ́ ya mgbe o kere ya. Kama nke ahụ, ọ bụ Adam ka Chineke tara ụta, ụta ahụ kwesịkwara ya. (Jenesis 3:17-19) Adam ekweghị ka ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe ihe ziri ezi dị mee ka irubere Chineke isi dịrị ya mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ.

Ọ dịkwa mkpa icheta na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o zuru okè dị ka Adam. A tụrụghị ime Jizọs otú e si atụrụ ime ụmụ Adam ndị ọzọ. Nne ya tụụrụ ime ya site n’ike mmụọ nsọ. N’ihi ya, o buteghị ihe ọ bụla ga-eme ka ọ ghara imeri ọnwụnwa. (Luk 1:30, 31; 2:21; 3:23, 38) Jizọs ji aka ya họrọ iguzosi ike n’ebe Nna ya nọ n’agbanyeghị ọnwụnwa siri ike ndị bịaara ya. Ebe ọ bụ na Adam ji aka ya họrọ inupụrụ iwu Jehova isi, ọ bụ ya ka ụta dịịrị.

Ma, gịnị mere Adam ji họrọ inupụrụ Chineke isi? Ò bu n’obi na ihe ga-akara ya mma ma ya nupụrụ Chineke isi? Mba, n’ihi na Pọl dere na ‘ọ bụghị Adam ka a ghọgburu.’ (1 Timoti 2:14) Kama nke ahụ, Adam họọrọ ime ihe ga-adị nwunye ya mma, bụ́ onye họọrọla iri mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila. Mmasị o nwere ime ihe ga-adị nwunye ya mma karịrị mmasị o nwere irubere Onye kere ya isi. O doro anya na mgbe ahụ nwunye Adam nyere Adam mkpụrụ osisi ahụ, ọ gaara echeretụ chee echiche ihe ga-eme mmekọrịta ya na Chineke ma ọ bụrụ na o nupụ isi. Ọ bụrụ na Adam ejighị obi ya dum hụ Chineke n’anya, ọ gaghị enwe ike imeri ọnwụnwa, tinyere ọnwụnwa si n’aka nwunye ya.

Adam emehiela tupu ya amụọ ụmụ. N’ihi ya, ụmụ niile ọ mụrụ ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ketara onyinye nke inwere onwe anyị ịhọrọ ihe anyị ga-eme. Ọ ga-adị mma ka anyị họrọ iji obi ekele na-echebara ịdị mma Jehova echiche ma mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike, ebe ọ bụ ya bụ onye anyị kwesịrị irubere isi na ife ofufe.—Abụ Ọma 63:6; Matiu 22:36, 37.