Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụma Ndị E Buru Banyere Mesaya

Amụma Ndị E Buru Banyere Mesaya

Amụma Ndị E Buru Banyere Mesaya

NDỊ Juu nọ kemgbe na-atụ anya ọbịbịa Mesaya n’ihi ihe ndị ha maara Aịzaya na ndị amụma ndị ọzọ dere banyere ya. N’ezie, n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ “ndị Juu nọ na-atụ anya” na ọbịbịa Mesaya adịla nso. (Luk 3:15) Ọ dị mma ịmara na e nwere ihe dị iche iche dị ịrịba ama e kwuru banyere ndụ Mesaya n’ime amụma ndị e buru na Baịbụl. Mmadụ enweghị ike ibu ihe ndị ahụ n’amụma n’onwe ya ma ọ bụkwanụ mee ka ha mezuo n’isi Jizọs.

Ihe Ndị E Buru n’Amụma Banyere Ọmụmụ Mesaya. Aịzaya buru amụma na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ Mesaya, ma ọ bụ Kraịst. Mgbe Matiu onyeozi kwuchara banyere ọrụ ebube ndị Chineke rụrụ, bụ́ ndị mere ka a mụọ Jizọs, o dere, sị: “Ihe a niile mere ka ihe Jehova kwuru site n’ọnụ onye amụma ya wee mezuo, nke sịrị: ‘Lee! Nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke.’” (Matiu 1:22, 23; Aịzaya 7:14) Aịzaya bukwara amụma na Kraịst ga-esi n’ezinụlọ Devid. Ọ kpọrọ Jesi, bụ́ nna Devid, aha kpọmkwem. N’ezie, ọ bụ n’ezinụlọ Devid ka a mụrụ Jizọs. (Matiu 1:6, 16; Luk 3:23, 31, 32) N’ihi ya, tupu a mụọ Jizọs, mmụọ ozi Gebriel gwara nne Jizọs, bụ́ Meri, sị: “Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya.”Luk 1:32, 33; Aịzaya 11:1-5, 10; Ndị Rom 15:12.

Ihe Ndị E Buru n’Amụma Banyere Ndụ Mesaya. Mgbe Jizọs bụ dimkpa, ọ bịara n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret wee jiri olu dara ụda gụpụta ihe Aịzaya buru n’amụma, nke sịrị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma.” Jizọs kwuru na amụma ahụ mezuru n’isi ya wee sị: “Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.” (Luk 4:17-21; Aịzaya 61:1, 2) Aịzaya bukwara amụma na Jizọs ga-eji obiọma, ịdị nwayọọ, na ịdị umeala n’obi mesoo ndị ọ ga-agwọ ọrịa ihe. Matiu dere, sị: “Ọtụtụ ndị sokwaara ya, o wee gwọọ ha niile, ma o nyesiri ha iwu ike ka ha ghara ime ka a mata onye ọ bụ; ka ihe e kwuru site n’ọnụ Aịzaya onye amụma wee mezuo, bụ́ onye sịrị: . . . ‘Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghịkwa etisi mkpu ike . . . Ọ dịghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ọ ga-egwepịa.’”—Matiu 8:16, 17; 12:10-21; Aịzaya 42:1-4; 53:4, 5.

Ihe Ndị E Buru n’Amụma Banyere Ahụhụ Mesaya Ga-ata. Aịzaya buru amụma na ọtụtụ ndị Izrel agaghị anabata Mesaya ahụ, kama ịnabata ya, ọ ga-aghọrọ ha “nkume ịsụ ngọngọ.” (1 Pita 2:6-8; Aịzaya 8:14, 15) N’ezie, n’agbanyeghị na Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, ha “enweghị okwukwe n’ebe ọ nọ, nke mere na e mezuru ihe Aịzaya onye amụma kwuru, sị: ‘Jehova, ònye nwere okwukwe n’ihe anyị nụrụ?’” (Jọn 12:37, 38; Aịzaya 53:1) Otu n’ime ihe ndị mere na ọtụtụ ndị Juu enweghị okwukwe na Jizọs bụ na ha nwere echiche na-ezighị ezi nke bụ́ na Mesaya ga-anapụta mba ha n’aka ọchịchị ndị Rom ozugbo ọ bịara ma weghachi alaeze Devid n’ụwa. Ọtụtụ ndị Juu ekwetaghị na Jizọs bụ Mesaya maka na ọ tara ahụhụ wee nwụọ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Aịzaya buru amụma na Mesaya ga-ata ahụhụ tupu ya abụrụ Eze.

N’akwụkwọ Aịzaya, e buru amụma na Mesaya sịrị: “M cheere ndị na-eti ihe azụ m . . . Ewepụghị m ihu m iji zere mkparị na ịgbụ m ọnụ mmiri.” Matiu kwuru ihe mere mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe, sị: “Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri n’ihu ma suo ya ọkpọ. Ndị ọzọ mara ya ụra n’ihu.” (Aịzaya 50:6; Matiu 26:67) Aịzaya dere, sị: “O kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́; ma o mepeghị ọnụ ya.” Ọ bụ ya mere na mgbe Paịlet jụrụ Jizọs ajụjụ banyere ebubo ndị Juu na-ebo ya, Jizọs azaghị “ya ihe ọ bụla, ee e, ọbụna otu mkpụrụ okwu, nke mere na o juru gọvanọ ahụ anya nke ukwuu.”—Aịzaya 53:7; Matiu 27:12-14; Ọrụ 8:28, 32-35.

Ihe Ndị E Buru n’Amụma Banyere Ọnwụ Mesaya. Aịzaya bukwara amụma banyere ọnwụ Jizọs na ihe ndị ga-eme mgbe ọ nwụchara. Ọ sịrị: “Mgbe ọ nwụrụ, ili ya ga-adị n’etiti ndị ajọ omume nakwa n’etiti ndị ọgaranya.” (Aịzaya 53:9) Olee otú amụma a nke yiri ka ọ na-emegide onwe ya ga-esi mezuo? N’oge ọnwụ Jizọs, a kpọgidere ya n’osisi n’etiti mmadụ abụọ na-apụnara mmadụ ihe. (Matiu 27:38) E mechaa, Josef onye Arimatia, bụ́ nwoke bara ọgaranya, liri Jizọs n’ili ya o gwuru ọhụrụ. (Matiu 27:57-60) N’ikpeazụ, ọnwụ Jizọs mezuru otu n’ime ihe ndị kacha mkpa Aịzaya buru n’amụma. Aịzaya kwuru banyere Mesaya, sị: ‘Onye ezi omume ahụ, bụ́ ohu m, ga-eme ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume; ọ ga-eburukwa njehie ha.’ N’ezie, ọnwụ Jizọs gbapụtara ụmụ mmadụ ná mmehie ka ndị niile nwere okwukwe wee nwere onwe ha.—Aịzaya 53:8, 11; Ndị Rom 4:25.

Amụma Niile ahụ Ga-emezurịrị

Ndịozi Jizọs na Jizọs n’onwe ya kwuru ihe dị n’amụma Aịzaya karịa ka ha kwuru ihe ndị dị n’akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl mgbe ha na-eme ka a mara onye Mesaya bụ. Ma, ọ bụghị naanị akwụkwọ Aịzaya kwuru ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọtụtụ amụma ndị ọzọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ndị kwuru banyere Jizọs, Alaeze ya, na ihe ọma ndị Alaeze ahụ ga-eweta n’ọdịnihu, ga-emezu. * (Ọrụ 28:23; Mkpughe 19:10) Olee ihe mere anyị ji jiri n’aka na amụma ndị ahụ ga-emezu? Jizọs gwara ndị Juu nọ na-ege ya ntị, sị: “Unu echela na m bịara ibibi Iwu ahụ ma ọ bụ ihe ndị amụma kụziri [ya bụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru]. M bịara, ọ bụghị ibibi ya, kama imezu ya; n’ihi na n’ezie, ana m asị unu na ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịgabiga karịa otu mkpụrụ akwụkwọ kasị nta ma ọ bụ otu akụkụ mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu ahụ ịgabiga ma ọlị, ihe niile e dere n’ime ya agharakwa imezu.”—Matiu 5:17, 18.

Jizọs kwukwara na ihe ndị mere mgbe ọ nọ ndụ n’ụwa mezuru amụma Baịbụl, kwuokwa na ha ga-emezu amụma n’ọdịnihu. (Daniel 9:27; Matiu 15:7-9; 24:15) Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bukwara amụma banyere ihe ndị ọzọ ga-eme mgbe ha nwụrụla, tinyere ọtụtụ ihe ndị anyị na-ahụ na-eme taa. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe ndị ahụ nakwa amụma ndị ọzọ dị na Baịbụl, bụ́ ndị ga-emezu n’ọdịnihu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere amụma ndị mezuru n’isi Jizọs, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 200. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 4]

‘Nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke . . . ga-amụ nwa nwoke’

[Foto dị na peeji nke 5]

“Ewepụghị m ihu m iji zere mkparị”