Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị E Buru n’Amụma na Ha Ga-eme n’Oge Na-adịghị Anya

Ihe Ndị E Buru n’Amụma na Ha Ga-eme n’Oge Na-adịghị Anya

Ihe Ndị E Buru n’Amụma na Ha Ga-eme n’Oge Na-adịghị Anya

PITA onyeozi dere banyere ọdịnihu mmadụ na ọdịnihu ụwa, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya [ya bụ, Chineke] si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Aịzaya onye amụma bụ onye mbụ e si n’ọnụ ya kwe nkwa “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Aịzaya 65:17; 66:22) Okwukwu Pita kwughachiri amụma a na-egosi na amụma a emezuchabeghị n’oge Pita dị ndụ.

Mgbe afọ iri atọ na abụọ gachara, Mkpughe e kpugheere Jọn onyeozi gosiri na Alaeze Chineke ga-eweta ngọzi dị iche iche ‘n’ụwa ọhụrụ.’ (Mkpughe 21:1-4) Ihe Jizọs na Pọl onyeozi kwuru banyere otú ụwa ga-adị n’oge na-adịghị anya tupu Alaeze Chineke abịa na-emezu ugbu a. Ya mere, anyị na-atụ anya na Alaeze ahụ ga-eweta ụwa ọhụrụ n’oge na-adịghị anya. Olee otú ụwa ọhụrụ ahụ ga-adị? Akwụkwọ Aịzaya gwara anyị otú ọ ga-adị.

Ngọzi Ndị A Ga-enwe n’Ụwa Ọhụrụ

Udo Ga-adị n’Ụwa Dum, Mmadụ Niile Ga Na-efekwa Chineke Ofufe. “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”—Aịzaya 2:2-4.

Udo Ga-adị n’Etiti Ụmụ Mmadụ na Ụmụ Anụmanụ. “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọ, agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa, nwa ehi na nwa ọdụm tojuru etoju na anụ mara abụba ga-anọkọkwa; nwatakịrị ga na-edukwa ha. Nne ehi na anụ ọhịa bea ga-atakọ nri; ụmụ ha ga-amakpukọkwa. Ọbụna ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka oké ehi. . . . Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum; n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”—Aịzaya 11:6-9.

Nri Mmadụ Niile Ga-eri Ga-eju Ebe Niile. “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emere ndị niile oké oriri nke ihe mara abụba, oké oriri nke ezigbo mmanya doro edo, nke ihe mara abụba nke ụmị jupụtara na ya, nke ezigbo mmanya doro edo, nke a zara aza.”—Aịzaya 25:6.

Ọnwụ Agaghị Adị Ọzọ. “[Chineke] ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile. Ọ ga-ewepụkwa n’ụwa dum nkọcha a na-akọcha ndị ya, n’ihi na Jehova ekwuwo ya.”—Aịzaya 25:8.

A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ. “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ. Ozu m niile ga-ebili. Tetanụ tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá! . . . ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.”—Aịzaya 26:19.

Mesaya Ga-ekpe Ikpe Ziri Ezi. “Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị. Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume, ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa.”—Aịzaya 11:3, 4.

A Ga-agwọ Ndị Ìsì na Ndị Ntị Chiri. “A ga-emeghe anya ndị ìsì, a ga-emeghekwa ntị nke ndị ntị chiri.”—Aịzaya 35:5.

Ala Na-anaghị Eme Nri Ga-amalite Ime Nri. “Ala ịkpa na ógbè mmiri na-adịghị ga-enwe aṅụrị, mbara ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, waakwa okooko dị ka okooko safrọn. Ọ ghaghị ịwa okooko, ọ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.”—Aịzaya 35:1, 2.

Ụwa Ọhụrụ. “M na-eke eluigwe ọhụrụ [ya bụ, ọchịchị ọhụrụ nke si n’eluigwe na-achị] na ụwa ọhụrụ [ya bụ, ụmụ mmadụ ọhụrụ bụ́ ndị ezi omume]. A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma nweenụ obi ụtọ, ṅụrịakwanụ ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe m na-eke. . . . Ha [ya bụ, ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa] ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya. N’ihi na dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ; ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghịkwa amụ ụmụ mụta nsogbu; n’ihi na ha na ụmụ ha bụ ụmụ Jehova gọziri agọzi. Ọ ga-erukwa na tupu ha akpọkuo m, m ga-aza ha; mgbe ha ka kpụ okwu n’ọnụ, mụ onwe m ga-anụ ya.” “‘Dị ka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke m na-eke ga-adịgide n’ihu m,’ ka Jehova kwuru, ‘otú a ka ụmụ unu na aha unu ga-adịgide.’”—Aịzaya 65:17-25; 66:22.

E Buru Amụma na Ọdịnihu Ga-amagbu Onwe Ya

Akwụkwọ Aịzaya abụghị naanị akwụkwọ dị na Baịbụl nke buru amụma na a ga-enwe ngọzi dị iche iche n’ọdịnihu. N’ime Baịbụl, e nwere ọtụtụ amụma ndị kwuru ihe ndị magburu onwe ha Chineke ga-eme site n’Alaeze ya nke dị n’aka Kraịst. * Ọ̀ ga-amasị gị ibi na paradaịs ahụ? I nwere ike ibi na ya! Jiri aka gị chọpụta ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie banyere ihe ọma Chineke zubere maka ọdịnihu. Ị ga-amụtakwa otú i nwere ike isi rite uru na ya. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ime nke a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na ihe ndị ọ ga-eweta, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke 76 ruo peeji nke 85. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 8]

Ụmụ mmadụ na ibe ha ga-adị n’udo, ha na ụmụ anụmanụ ga-adịkwa n’udo

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ

[Foto dị na peeji nke 10]

Ụwa dum ga-abụ paradaịs