Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara’

O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara’

Ṅomie Okwukwe Ha

O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara’

MERI gbalịrị ka ya nọzie n’elu obere ịnyịnya ibu bu ya. Ọ nọọla ọtụtụ awa n’elu ịnyịnya ahụ. Josef nọ n’ihu jiri ụkwụ na-aga. Ọ bụ ya du Meri na-aga n’okporo ụzọ gara Betlehem, bụ́ obodo dị anya. Nwa Meri bu n’afọ megharịrị ahụ́ ọzọ.

Nwa Meri bu n’afọ akaala; Baịbụl kwuru hoo haa na ọ dị “ime ọmụmụ ugbu a.” (Luk 2:5) Ka di na nwunye ahụ nọ na-agafe ubi dị iche iche, ikekwe, ụfọdụ ndị na-akọ ihe ma ọ bụ na-agha mkpụrụ n’ubi ndị ahụ nọ na-ele ha anya, na-eche n’obi ha ihe mere nwaanyị ahụ́ dị otú ahụ ga-eji gawa njem. Gịnị mere Meri ji hapụ obodo ya bụ́ Nazaret wee gawa ebe ahụ dị anya?

Ihe niile a malitere n’ọnwa ole na ole bu ụzọ, bụ́ mgbe e nyere nwa agbọghọ ahụ bụ́ onye Juu ọrụ pụrụ iche a na-enyetụbeghị mmadụ ọ bụla kemgbe ụwa. A gwara ya na ọ ga-amụ nwa ga-aghọ Mesaya, bụ́ Ọkpara Chineke! (Luk 1:35) Mgbe ime ya ruwere ọmụmụ, ha hụrụ na ọ dị mkpa ka ha gaa njem a. Mgbe ha nọ na-aga njem a, ihe isi ike ndị lere okwukwe Meri ule bịaara ya. Ka anyị tụlee ihe ndị mere ka okwukwe ya sie ike.

Ịga Betlehem

Ọ bụghị naanị Josef na Meri nọ na-aga njem ahụ. N’oge na-adịbeghị anya, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka mmadụ niile gaa n’ala a mụrụ ha deba aha ha n’akwụkwọ. Gịnị ka Josef mere? Akụkọ ahụ sịrị: “Ya mere, Josef sikwa na Galili gawa, hapụ obodo Nazaret, banye Judia, n’obodo Devid, nke a na-akpọ Betlehem, n’ihi na o si n’ụlọ nakwa n’ezinụlọ Devid.”—Luk 2:1-4.

O nwere ihe mere iwu ahụ Siza nyere ji daba n’oge a. Otu amụma e buru n’ihe dị ka narị afọ asaa tupu ya enye iwu a kwuru na a ga-amụ Mesaya na Betlehem. Ọ dabara na e nwere obodo nta a na-akpọ Betlehem nke dị naanị kilomita iri na otu site na Nazaret. Ma, amụma ahụ kwuru kpọmkwem na ọ bụ na “Betlehem Efrata” ka a ga-amụ Mesaya ahụ. (Maịka 5:2) Dabere n’otú okporo ụzọ dị ugbu a n’ebe ahụ, obere obodo ahụ nke dị n’ebe ndịda dị otu narị kilomita na iri ise site na Nazaret, ụzọ ya bụkwa ugwu ugwu. Ọ bụ n’obere obodo ahụ bụ́ Betlehem ka a gwara Josef ka ọ gaa, n’ihi na ọ bụ ya bụ obodo Eze Devid na ezinụlọ ya, bụ́ ezinụlọ Josef na nwaanyị ọ lụrụ ọhụrụ.

Meri ọ̀ ga-ekweta iso Josef ebe ọ bụ na Josef ekpebiela na ha ga-aga? E kwuwerị, njem ahụ ga-esiri ya ike. Ọ ga-abụ na osisi amalitela ịgbụ akwụkwọ n’oge ahụ, ya mere, mmiri nwere ike izotụ ebe ọ bụ na oge ọkọchị akwụsịwala. E wezụga nke ahụ, Betlehem dị n’ugwu, n’ebe dị narị mita asaa na iri isii n’ịdị elu. Ịga n’ebe ahụ pụtara na mmadụ ga-arị ugwu ọtụtụ ụbọchị. Ma eleghị anya, ọ ga-ewetụ ha oge karị, n’ihi na ha ga na-ezu ike n’ụzọ n’ihi ọnọdụ Meri. Ọ bụrụ na nwa agbọghọ dị ime ọmụmụ, ọ ga-achọ ịnọ ụlọ ya nso, bụ́ ebe ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya nọ, ka ha wee nyere ya aka mgbe ime ga-amalite ime ya. O doro anya na obi siri ya ike tupu ya agaa njem a.

Otú o sina dị, Luk dere na Josef gara “ka e wee deba aha ya na Meri n’akwụkwọ.” O kwukwara na Josef ‘alụwo’ Meri. (Luk 2:4, 5) Ebe ọ bụ na Meri bụ nwunye ya, ọ ga-eso n’ihe mere Meri ji kpebie ịga. Ọ maara na di ya bụ onyeisi ya n’ihe metụtara ofufe, ọ nabatakwara ọrụ Chineke nyere ya ịbụ onye inyeaka site n’ịkwado mkpebi ndị di ya na-eme. * Ọ bụ nrubeisi mere ka o merie ihe a lere okwukwe ya ule.

Olee ihe ọzọ mere ka Meri rube isi? Ọ̀ ga-abụ na ọ maara na e buru amụma na ọ bụ na Betlehem ka a ga-amụ Mesaya ahụ? Baịbụl agwaghị anyị. Ma, anyị agaghị asị na ọ maghị, n’ihi na o doro anya na ọtụtụ ndị ndú okpukpe na ọbụna ndị ukwu na ndị nta maara na a ga-amụ ya n’ebe ahụ. (Matiu 2:1-7; Jọn 7:40-42) Meri maara Akwụkwọ Nsọ. (Luk 1:46-55) Ma ọ̀ bụ iji rubere di ya isi, ma ọ̀ bụ iji rubere ọchịchị isi ma ọ̀ bụkwanụ n’ihi amụma Jehova buru mere Meri ji kpebie ịga, ya bụrụgodị na ọ bụ ihe atọ a mere Meri ji gaa njem ahụ, o setịpụrụ ezi ihe nlereanya. Ọ na-amasị Jehova nke ukwuu ma ọ bụrụ na mmadụ dị umeala n’obi ma na-erube isi, ma onye ahụ ọ̀ bụ nwoke ma ọ̀ bụ nwaanyị. N’oge anyị a, mgbe ọ na-enweghị ihe e ji nrubeisi kpọrọ, Meri bụụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe niile ihe nlereanya magburu onwe ya ha kwesịrị iṅomi.

Ọmụmụ Kraịst

O doro anya na obi lọrọ Meri mgbe ọ nọ n’ebe dị anya hụ Betlehem. Ka Meri na Josef nọ na-arị ugwu na-aga, na-agafe osisi oliv dị iche iche, bụ́ ihe ubi fọdụrụ a na-ewebeghị, ikekwe, ha chetara ihe ndị merela n’obere obodo a. Ọ bụ obodo kacha nta n’ime obodo ndị dị na Juda, dị nnọọ ka Maịka onye amụma kwuru; n’agbanyeghị ya, ọ bụ na ya ka a mụrụ Boaz, Neomi, mechaakwa mụọ Devid, n’ihe karịrị otu puku afọ tupu mgbe ahụ.

Mgbe Meri na Josef rutere, ha hụrụ na ndị mmadụ jupụtara n’obodo ahụ. Ndị ọzọ eburula ha ụzọ bịa ka e deba aha ha n’akwụkwọ. N’ihi ya, e nweghị ụlọ ndị njem fọdụrụ ha ga-anọ. * O nweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ́ bụghị ịnọrọ n’ụlọ anụ ka chi bọọ. Anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ otú obi si koro Josef n’elu mgbe ọ hụrụ otú ahụ́ si na-egbu nwunye ya mgbu n’ụdị ọ na-egbutụbeghị ya mbụ, bụ́ nke nọ na-aka njọ. O nweghị nnọọ ebe ọzọ ime malitere ime ya ma ọ́ bụghị n’ụlọ anụ.

Onye ọ bụla bụ́ nwaanyị ga-emetara Meri ebere. Ihe dị ka puku afọ anọ tupu oge Meri dị ndụ, Jehova buru amụma na ụmụ nwaanyị ga-enwe ihe mgbu mgbe ha na-amụ nwa n’ihi mmehie anyị ketara eketa. (Jenesis 3:16) O doro anya na nke a agụpụghị Meri. Luk akọghị otú o si nwee ihe mgbu mgbe ọ mụrụ nwa, naanị ihe o kwuru bụ: “O wee mụọ nwa ya nwoke, bụ́ nwa mbụ ya.” (Luk 2:7) N’ezie, Meri mụrụ “nwa mbụ” ya, nwa nke mbụ ọ mụrụ tupu ya amụọ ụmụ ya ndị ọzọ. Ụmụ niile ọ mụrụ dị asaa, ma ọ dịkarịa ala. (Mak 6:3) Ma, nwa nke a pụrụ iche. Ọ bụghị naanị na ọ bụ nwa mbụ Meri mụrụ, ọ bụkwa onye Jehova “bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,” Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya!—Ndị Kọlọsi 1:15.

Luk kwuziri ihe ọzọ ọtụtụ ndị ma ugbu a, sị: “O wee jiri ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.” (Luk 2:7) A na-egosi ọmụmụ Jizọs n’ihe nkiri nakwa n’ihe osise dị iche iche n’ụwa dum n’ụzọ na-adịchaghị mma. Tụlegodị nke bụ́ eziokwu. Ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri bụ efere ma ọ bụ arịa anụmanụ na-etinye ọnụ na-eri nri e debeere ha. Ya mere, ọ bụ n’ụlọ anụ ka ezinụlọ ahụ hiri. Ụdị ebe a anaghị adị ọcha, ezigbo ikuku anaghịkwa abata na ya, ma n’oge ahụ ma n’oge a. O doro anya na o nweghị nne na nna ga-ahọrọ ka a mụọ nwa ha n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na ebe ọzọ dị. Ọtụtụ nne na nna na-achọ imere ụmụ ha ihe ga-adịrị ha mma. Meri na Josef chọrọ imere Ọkpara Chineke otú ahụ ọbụna karị!

Ma, ha ekweghị ka iwe wee ha maka na ha enwetaghị ebe ọzọ; ha mere ihe ha nwere ike ime. Dị ka ihe atụ, Meri lekọtara nwa ahụ site n’ịfụ ya ákwà nke ọma wee jiri nlezianya nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri ka o hie ụra ma hụ na ahụ́ kpooro ya ọkụ nakwa na o nweghị ihe mere ya. Meri ekweghị ka ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya na ya mee ka o chegbuwe onwe ya wee mee ka ọ ghara imere nwa ya ihe niile o nwere ike imere ya. Ya na Josef makwaara na inyere nwata a aka ka o wee fee Chineke bụ ihe kacha mkpa ha nwere ike imere ya. (Diuterọnọmi 6:6-8) N’oge anyị a, ndị nne na nna ndị maara ihe na-enwe ụdị echiche ahụ ha nwere mgbe ha na-azụ ụmụ ha n’ụwa a ndị mmadụ na-ejighị ofufe Chineke kpọrọ ihe.

A Bịara Gbaa Ha Ume

Ndị ọzụzụ atụrụ meere mkpọtụ bata n’ebe ahụ dị jụụ di na nwunye ahụ na nwa ha nọ. Ha nubatara n’ike ka ha hụ ezinụlọ ahụ, nke ka nke, nwa ha. Ọṅụ juru ndị ikom ahụ obi, ihu ha gosikwara na obi dị ha ụtọ. Ha mere ngwa ngwa si n’ugwu ebe ha nọ na-azụ atụrụ ha bịa. * Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ gwara di na nwunye ahụ, bụ́ ndị ọbịbịa ha bịara tụrụ n’anya, ihe dị ebube mere n’ihu ha. N’ugwu ebe ahụ ha nọ, otu mmụọ ozi pụtara n’ihu ha ná mberede n’etiti abalị. Ebube Jehova wee nwuo dị ka ìhè gburugburu ha, mmụọ ozi ahụ wee gwa ha na a mụọla Kraịst, ma ọ bụ Mesaya, na Betlehem, gwakwa ha na ha ga-ahụ nwa ahụ ka a fụrụ ya ákwà, nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Ihe ọzọ dị ịtụnanya mekwara—ọtụtụ ndị mmụọ ozi pụtara n’ihu ha na-abụku Jehova abụ otuto!

Ka a sịkwa ihe mere ndị ikom ahụ ji jiri ọsọ bịa Betlehem! Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ ha ụtọ nke ukwuu ịhụ nwa ọhụrụ ahụ ka o dina n’ebe ahụ, dị nnọọ ka mmụọ ozi ahụ kwuru. Ha gwakwara ndị ọzọ ozi ọma ahụ. “Ha mere ka a mara ihe a gwara ha . . . Ihe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọọrọ ha jukwara ndị niile nụrụ ya anya.” (Luk 2:17, 18) Ihe àmà na-egosi na ndị ndú okpukpe nke oge ahụ na-eleda ndị ọzụzụ atụrụ anya. Ma, o doro anya na ihe ndị ikom a kwesịrị ntụkwasị obi ma dị umeala n’obi masịrị Jehova. Ma, olee otú ọbịbịa ha bịara dị Meri n’ahụ́?

Ọ bụ ezie na o doro anya na ike gwụchara Meri n’ihi nsogbu dị n’ịmụ nwa, o gere ntị n’ihe niile ha kwuru. O nwekwara ihe ọzọ o mere: “Meri buuru okwu a niile n’obi ya, na-eche ihe ihe ndị a pụtara.” (Luk 2:19) N’eziokwu, nwaanyị a na-echeru echiche ala. Ọ maara na ozi ahụ mmụọ ozi ziri dị oké mkpa. Chineke ya, bụ́ Jehova, chọrọ ka ọ mara ma ghọta onye nwa ya bụ na otú nwa ya si dị mkpa. Ọ bụghị naanị na o gere ntị. Kamakwa, o tinyere okwu ahụ n’obi ya ka o wee na-echeta ya ọbụna mgbe ọtụtụ ọnwa nakwa ọtụtụ afọ gachara. Nke a na-egosi ihe mere Meri ji nwee okwukwe pụrụ iche ná ndụ ya dum.

Ị̀ ga-eṅomi Meri? Jehova mere ka eziokwu bara uru jupụta n’Okwu ya. Ma, eziokwu ahụ agaghị abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ ṅaa ntị na ya. Otú anyị si aṅa ntị na ya bụ ịgụchi Baịbụl anya, ọ bụghị ịgụ ya ka à ga-asị na ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ nkịtị, kama dị ka Okwu nke si n’ike mmụọ nsọ Chineke. (2 Timoti 3:16) Mgbe anyị gụrụ Okwu Chineke, anyị kwesịkwara itinye eziokwu dị na ya n’obi anyị, na-echekwa ihe ọ pụtara, dị ka Meri mere. Ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche n’ihe anyị na-agụ na Baịbụl, na-eche echiche banyere otú anyị nwere ike isi na-etinye ndụmọdụ Jehova n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu, ọ ga-eme ka okwukwe anyị na-eto eto.

Ihe Ndị Ọzọ Ọ Ga-etinye n’Obi Ya

Mgbe nwa ahụ ruru abalị asatọ, Meri na Josef biri ya úgwù dị ka Iwu Mozis kwuru, ha gụkwara ya Jizọs dị ka a gwara ha. (Luk 1:31) Mgbe nwa ahụ ruru abalị iri anọ, ha si Betlehem kuru ya gaa n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, bụ́ ebe na-adịchaghị anya, wee nye onyinye e ji eme ka mmadụ dị ọcha bụ́ nke Iwu kwuru ka ndị dara ogbenye na-enye, ya bụ, nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ. Ọ bụrụ na o nwere otú ihere si mewe ha maka na ha enyeghị ebule na otu kpalakwukwu ndị nne na nna ndị ọzọ na-enye, ha leghaara ihere ahụ anya. Otú o sina dị, a gbara ha ume nke ukwuu mgbe ha nọ n’ebe ahụ.—Luk 2:21-24.

Otu agadi nwoke aha ya bụ Simiọn gakwuuru ha wee kwuo ọtụtụ ihe ọzọ Meri ga-etinye n’obi ya. E kwere ya nkwa na tupu ya anwụọ na ọ ga-ahụ Mesaya ahụ anya, mmụọ nsọ Jehova gwakwara ya na obere nwa ahụ bụ́ Jizọs bụ Onye Nzọpụta ahụ e buru n’amụma. Simiọn gwakwara Meri na n’otu ụbọchị ọ ga-enwe ihe mgbu. O kwuru na ọ ga-adị Meri ka à manyere ya ogologo mma agha n’ahụ́. (Luk 2:25-35) Ọ ga-abụ na ihe ahụ Simiọn kwuru, bụ́ nke na-awụ akpata oyi n’ahụ́, nyeere Meri aka idi nsogbu ndị mechara bịara ya mgbe ihe karịrị afọ iri atọ gafere. Mgbe Simiọn hụchara obere nwa ahụ bụ́ Jizọs, onye amụma bụ́ Ana hụrụ ya wee malite ịkọrọ ndị niile ọ na-agụ agụụ ka a napụta Jeruselem banyere nwa ahụ.—Luk 2:36-38.

Ọ bụ mkpebi dị mma ka Josef na Meri mere mgbe ha kpọtara nwa ọhụrụ ha n’ụlọ nsọ Jehova nke dị na Jeruselem. Ha si otú a mee ka nwa ahụ malite ịga n’ụlọ nsọ Jehova, bụ́ ebe ọ ga na-agachi anya ruo mgbe ọ ga-anwụ. N’ụlọ nsọ ahụ, ha nyere onyinye otú ike ha hà wee nweta ntụziaka na agbamume. O doro anya na mgbe Meri si n’ụlọ nsọ ahụ laa, okwukwe ya sikwuru ike, obi ya ejupụtakwa n’eziokwu ndị ọ ga-echebara echiche ma kọọrọ ndị ọzọ.

Ọ bụ ihe magburu onwe ya ịhụ ka ndị nne na nna taa na-eṅomi ihe nlereanya ahụ. Ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-akpọ ụmụ ha mgbe niile aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ndị nne na nna ahụ na-eme ihe niile ha nwere ike ime, na-agba ndị kwere ekwe ibe ha ume. Mgbe ha gachara ọmụmụ ihe, ha na-esikwu ike n’okwukwe, obi na-atọkwa ha ụtọ karị, obi ha na-ejupụtakwa n’ihe ọma ha ga-akọrọ ndị ọzọ. Anyị na-akpọ gị òkù ka i soro ha na-aga ọmụmụ ihe ha. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-ahụ na okwukwe gị ga na-esikwu ike dị ka nke Meri.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Lee ọdịiche dị n’amaokwu ndị ahụ na ihe e kwuru banyere njem mbụ ọ gara. Amaokwu ahụ sịrị: “Meri biliri . . . ma” gaa leta Elizabet. (Luk 1:39) Ebe ọ na-alụbeghị di n’oge ahụ, naanị nkwa ka Josef kwere na ọ ga-alụ ya, ọ gawara njem ahụ n’agwaghị Josef. Mgbe ha lụrụ, ọ bụ Josef kpebiri na ha ga-aga njem ahụ, ọ bụghị Meri.

^ par. 14 N’oge ahụ, obodo dị iche iche na-enwegasị ọnụ ụlọ ebe ndị njem na ndị na-agafe agafe na-anọbọ chi.

^ par. 19 Obibi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ bi n’ọhịa na-azụ atụrụ ha kwekọrọ n’ihe ngụkọ oge Baịbụl na-egosi, ya bụ, na a mụghị Kraịst n’ọnwa December, bụ́ mgbe a na-edebe atụrụ nso n’ụlọ, kama ọ ga-abụ ná mbido ọnwa October.

[Foto dị na peeji nke 25]

A gọziri Simiọn site n’ime ka ọ hụ Onye Nzọpụta ahụ e buru n’amụma