Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna

“Unu ndị bụ́ nna, unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”—Ndị Kọlọsi 3:21.

OLEE otú nna ga-esi ghara ịkpasu ụmụ ya iwe? Ọ dị oké mkpa ka nna mata uru ọrụ ya bara. Otu akwụkwọ nke na-ekwu banyere uche ezughị okè kwuru, sị: “Ọrụ nna na-arụ iji mee ka ụmụ ya nwee ọgụgụ isi ma na-echezi echiche echezi abụghị obere ọrụ.”

Olee ihe bụ́ ọrụ nna? N’ọtụtụ ezinụlọ, ọrụ bụ́ isi a na-ewere na ọ bụ ọrụ nna bụ inye nwa ya ọ bụla mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọtụtụ ndị nne na-agwakarị nwa ha mgbe o mere ihe na-adịghị mma, sị: ‘Chere ka papa gị lọta!’ N’eziokwu, e kwesịrị inye ụmụaka ọzụzụ na ahụhụ kwesịrị ekwesị, ka ha wee nwee ezigbo àgwà mgbe ha toro. Ma, e wezụga inye ahụhụ, e nwere ihe ndị ọzọ na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo nna.

Ọ dị mwute ikwu na ọ bụghị ndị nna niile nwere ndị setịpụụrụ ha ezi ihe nlereanya mgbe ha bụ ụmụaka. E nweghị nna n’ezinụlọ a zụlitere ụfọdụ ndị ikom. Ndị ọzọ bụ́ ndị nna ha ji aka ike zụọ na-ejikarị aka ike azụ ụmụ nke ha. Olee otú nna e si otú a zụọ mgbe ọ bụ nwata ga-esi ghara ime otú nna ya mere, wee zụọ ụmụ ya nke ọma?

E nwere otu ebe a ga-enweta ndụmọdụ dị mma nke e kwesịrị ịtụkwasị obi, nke ga-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo nna. E nwere ndụmọdụ kacha mma banyere ezinụlọ n’ime Baịbụl. Ndụmọdụ dị na ya abụghị akụkọ ifo; nduzi ọ na-enye adịghị mgbe ọ ga-eduba anyị ná nsogbu. Ndụmọdụ dị na Baịbụl na-egosi na Onye chepụtara ya, bụ́ Jehova Chineke, nwere amamihe. Ọ bụkwa ya malitere ezinụlọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ọ bụrụ na ị bụ nna, ọ ga-adị mma ka ị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ịzụ ụmụ. *

Ịbụ ezigbo nna dị mkpa n’ihi na ọ na-eme ka ụmụaka na-eto nke ọma ma na-echezi echiche echezi, na-emekwa ka ha na Chineke dị ná mma. O nwere ike ịdịrị nwata nna ya hụrụ n’anya, bụ́ onye ya na nna ya dị n’ezigbo mma, mfe ịmụta otú ya na Chineke ga-esi dị n’ezigbo mma. E kwuwerị, Baịbụl kwuru na Jehova, bụ́ Onye kere anyị, bụ Nna anyị. (Aịzaya 64:8) Ugbu a, ka anyị tụlee ihe isii nna kwesịrị imere ụmụ ya. Ná nke ọ bụla n’ime ha, anyị ga-atụle otú ịgbaso ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere nna aka ime ihe ndị ahụ o kwesịrị imere ụmụ ya.

Nna Kwesịrị Ịhụ Ụmụ Ya n’Anya

Jehova setịpụụrụ ndị nna ihe nlereanya zuru okè. Baịbụl kwuru banyere otú Chineke si ele Jizọs, bụ́ Ọkpara ya, anya, sị: “Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya.” (Jọn 3:35; Ndị Kọlọsi 1:15) Jehova kwuru n’ihe karịrị otu ugboro na ya hụrụ Ọkpara ya n’anya, nweekwa mmasị n’ebe ọ nọ. Mgbe e mere Jizọs baptizim, Jehova si n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.” (Luk 3:22) O doro Jizọs anya na Nna ya hụrụ ya n’anya. Olee ihe nna bụ́ mmadụ ga-amụta n’aka Chineke?

Na-agwa ụmụ gị na ị hụrụ ha n’anya. Kelvin, bụ́ nna nwere ụmụ ise, kwuru, sị: “M na-agbalị mgbe niile ime ka ụmụ m mara na m hụrụ ha n’anya, ọ bụghị naanị n’ọnụ, kamakwa site n’igosi nke ọ bụla n’ime ha na m nwere mmasị n’ebe ọ nọ. M na-awapụ ụmụ m ihe a wanyere ha n’úkwù ma wanye ha nke ọhụrụ, na-asakwa ha ahụ́.” Ụmụ gị kwesịkwara ịma na ihe ha masịrị gị. N’ihi ya, adịla na-akatọ ha ma ọ bụ na-agwakasị ha okwu ahụ́ mgbe ọ bụla ha mejọrọ ihe. Kama nke ahụ, na-aja ha mma mgbe mgbe. Donizete, bụ́ onye nwere ụmụ agbọghọ abụọ, sịrị, “Nna kwesịrị ịgbalị ka ọ na-ahụ ebe ụmụ ya mere nke ọma ka o wee na-aja ha mma.” Ụmụ gị ịmara na i nwere mmasị n’ebe ha nọ ga-eme ka ha mara na ha na-eme nke ọma. Nke a ga-emekwa ka ha nwee ike ịbịarukwu Chineke nso.

E Kwesịrị Isetịpụrụ Ụmụaka Ezigbo Ihe Nlereanya

Jọn 5:19 sịrị na Jizọs mere “naanị ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme.” Ị̀ hụrụ na amaokwu a kwuru na Jizọs hụrụ ihe Nna ya “na-eme” wee mee ya. Ụmụaka na-emekarị otu ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nna na-akwanyere nwunye ya ùgwù, nwa ya nwoke ga na-akwanyekwara ụmụ nwaanyị ùgwù mgbe o toro. Ọ bụghị naanị omume ụmụ ya ndị nwoke ka ihe nlereanya nna na-esetịpụ na-emetụta, kama, ọ ga-emetụtakwa otú ụmụ ya ndị nwaanyị ga-esi na-ele ndị ikom anya.

Ọ̀ na-esiri ụmụ gị ike ịrịọ mgbaghara? Ezigbo ihe nlereanya dịkwa ụmụaka mkpa ná nke a. Kelvin chetara mgbe ụmụ ya abụọ kụwara kamera ya dị oké ọnụ. Iwe were ya nke ukwuu nke na o ji aka suwaa tebụl. Mgbe e mechara, Kelvin nwere mwute n’ihi iwe ọkụ ahụ o were, ya arịọ ndị ezinụlọ ya, tinyere nwunye ya, arịrịọ. Ọ chọpụtara na ụmụ ya mụtara ihe dị mma n’arịrịọ ahụ ọ rịọrọ; ọ na-adịrị ha mfe ịrịọ mgbaghara.

Obi Ụtọ Kwesịrị Ịdị n’Ezinụlọ Ụmụaka Nọ

Jehova bụ ‘Chineke obi ụtọ.’ (1 Timoti 1:11) Ọ bụ ya mere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs ji nwee ọṅụ dị ukwuu mgbe ya na Nna ya nọ. Ilu 8:30 mere ka anyị ghọta otú Jizọs na Nna ya si na-emekọ ihe. Ọ sịrị: “M nọ n’akụkụ ya [ya bụ, Nna ya] dị ka onye ọkà ọrụ, . . . mụ onwe m na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.” Nke a na-egosi na Nna ahụ na Ọkpara ya dị n’ezigbo mma.

Obi ụtọ kwesịrị ịdị n’ezinụlọ ụmụ gị nọ. Iwepụta oge ka gị na ụmụ gị na-egwuri egwu ga-eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ unu. Ndị nne na nna na ụmụ ha igwuri egwu na-eme ka ha na ha dị ná mma. Felix, onye nwere nwa nwoke na-erubeghị afọ iri abụọ, kwetara na nke a bụ eziokwu, sị: “Otu ihe dị mkpa mere mụ na nwa m ji dịrị ná mma bụ na m na-ewepụta oge mụ na ya ji atụrụ ndụ. Anyị na-egwuri egwu, anyị na-aga leta ndị enyi anyị, na-agakwa ebe dị iche iche mara mma. Nke a emeela ka ezinụlọ anyị dịrị n’otu.”

E Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke

Ọ bụ Nna Jizọs kụziiri ya ihe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Ihe m nụrụ n’ọnụ ya [ya bụ, Nna ya] ka m na-ekwu n’ụwa.” (Jọn 8:26) N’anya Chineke, ọ bụ ọrụ dịịrị nna ịkụziri ụmụ ya omume ọma na otú ha na Chineke ga-esi dị ná mma. Otu n’ime ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ dị ka nna bụ ịkụnye àgwà ọma n’ime obi ụmụ gị. Ọ bụ mgbe ha dị obere ka i kwesịrị ịmalite ịkụziri ha ya. (2 Timoti 3:14, 15) Felix malitere ịgụrụ nwa ya akụkọ ndị dị na Baịbụl mgbe ọ dị obere. Felix gụụrụ ya akụkọ ndị dị ụtọ, tinyere ndị nke dị n’akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. * Ka nwa ya nọ na-etolite, Felix ji akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl, bụ́ ndị kwesịrị afọ ndụ ya, na-akụziri ya ihe.

Donizete kwuru, sị: “Ime ka ọmụmụ ihe ezinụlọ dị ụtọ adịghị mfe. Ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na-egosi na ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, ebe ọ bụ na ọ naghị esiri ụmụaka ike ịmata mgbe nne na nna ha na-anaghị eme ihe ha kwuru.” Carlos, bụ́ onye nwere ụmụ atọ, kwuru, sị: “Ezinụlọ anyị na-ezukọ kwa izu iji tụlee mkpa ndị anyị nwere n’ezinụlọ. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị nwere ohere ikwu ihe anyị ga-atụle.” Kelvin na-agbalị ịgwa nwa ya banyere Chineke n’agbanyeghị ebe ọ bụla ha nọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ha na-eme. Nke a na-echetara anyị ihe Mozis kwuru. Ọ sịrị: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị, kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.”—Diuterọnọmi 6:6, 7.

E Kwesịrị Ịdọ Ụmụaka Aka ná Ntị

E kwesịrị ịdọ ụmụaka aka ná ntị ka ha wee too bụrụ ndị ma ihe, na-arụsikwa ọrụ ike. O yiri ka ndị nne na nna ụfọdụ hà na-eche na ịdọ ụmụ ha aka ná ntị pụtara imesi ha ike, iji iwe na-abara ha mba ma ọ bụ ịgwakasị ha okwu ahụ́. Ma, Baịbụl ekwughị na ndị nne na nna ịdọ ụmụ ha aka ná ntị pụtara imesi ha ike. Kama nke ahụ, ndị nne na nna kwesịrị iji ịhụnanya na-adọ ụmụ ha aka ná ntị, dị ka Jehova na-eme. (Ndị Hibru 12:4-11) Baịbụl sịrị: “Ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka e nye ụmụaka ahụhụ. Ma, nwata kwesịrị ịmara ihe mere e ji na-enye ya ahụhụ. Ịdọ aka ná ntị ndị nne na nna dọrọ nwa ha ekwesịghị ime ka o chee na ha jụrụ ya ajụ. Baịbụl akwadoghị ka ndị mụrụ ụmụ na-eti ụmụ ha ihe gafee ókè, bụ́ nke nwere ike imerụ ha ahụ́. (Ilu 16:32) Kelvin sịrị, “Mgbe ọ dị mkpa ka m nye ụmụ m ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ha mere, m na-agbalị mgbe niile ime ka ha mara na ihe mere m ji eme otú ahụ bụ maka na m hụrụ ha n’anya.”

E Kwesịrị Ichebe Ụmụaka

E kwesịrị ichebe ụmụaka ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ, gharakwa iso ndị ọjọọ na-akpakọrịta. Ọ dị mwute ikwu na e nwere “ndị ajọ mmadụ” nọ n’ụwa bụ́ ndị kpebiri imebi ụmụaka na-enweghị ihe ha ma. (2 Timoti 3:1-5, 13) Olee otú ị ga-esi chebe ụmụ gị? Baịbụl nyere ndụmọdụ a amamihe dị na ya, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.” (Ilu 22:3) I kwesịrị ịkpachara anya iji chebe ụmụ gị ka ha ghara ịdaba ná nsogbu. Mara ihe ndị nwere ike ịkpata nsogbu, meekwa ihe niile i kwesịrị ime iji chebe ụmụ gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-ahapụ ụmụ gị ka ha na-aga n’Ịntanet, hụ na ha ma ebe ha kwesịrị ịga na ebe ha na-ekwesịghị ịga. Ọ ga-akacha mma ma ị dọwa kọmputa n’ebe onye ọ bụla ga na-ahụ ya, ka i wee nwee ike ịmara ebe ndị ha na-aga.

Nna kwesịrị ịzụ ụmụ ya na ịkwadebe ha ka ha mara ihe ha kwesịrị ime mgbe ndị na-achọ imebi ụmụaka chọrọ imebi ha. Ụmụ gị hà ma ihe ha kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ achọọ imebi ha mgbe ị na-anọghị? * Ụmụ gị kwesịrị ịma ihe ha kwesịrị iji akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ha ji bụrụ nwaanyị eme nakwa ihe ha na-ekwesịghị iji ha mee. Kelvin kwuru, sị: “Ahapụrụghị m ndị ọzọ, ọbụna ndị nkụzi, ka ha kụziere ụmụ m ihe ndị a. Ama m na ọ bụ ọrụ dịịrị m ịkụziri ụmụ m banyere mmekọahụ nakwa banyere ndị na-emebi ụmụaka.” Ụmụ ya niile etoola n’enweghị ihe mere ha. Ndị nke nwaanyị alụọla di, ndị nke nwoke alụọkwa nwunye. Ha na di ha na nwunye ha bikwa n’udo.

Chọọ Enyemaka Chineke

Onyinye kacha mma nna nwere ike inye ụmụ ya bụ inyere ha aka mee ka ha na Chineke dị n’ezigbo mma. Nna isetịpụrụ ụmụ ya ezi ihe nlereanya dị mkpa nke ukwuu. Donizete kwuru, sị: “Ndị nna kwesịrị igosi na ha ji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe. E kwesịrị ịhụ nke a karịchaa mgbe nsogbu ma ọ bụ ihe isi ike bịaara ha. N’oge ahụ, nna kwesịrị igosi na ya tụkwasịrị Jehova obi. Ekpere ezinụlọ na-ekpekọ ọnụ na otú ha si ekele Chineke ọtụtụ ugboro maka ihe ọma niile ọ na-emere ha, ga-akụziri ụmụaka uru mmadụ na Chineke ịbụ enyi bara.”

Olee otú ị ga-esi bụrụ ezigbo nna? Chọọ ndụmọdụ nke onye kacha mara otú e kwesịrị isi zụọ ụmụaka, ya bụ, Jehova bụ́ Chineke. Ọ bụrụ na i jiri ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke zụọ ụmụ gị, ị ga-ahụ na ihe e kwuru n’Ilu 22:6 bụ eziokwu, bụ́ nke sịrị: “Ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 N’agbanyeghị na ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ a tụlere n’isiokwu a lekwasịrị anya n’ọrụ ndị bụ́ nna, ọtụtụ n’ime ihe a tụlere na ya gbasakwara ndị nne.

^ par. 18 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ par. 25 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ị ga-esi chebe ụmụ gị ka a ghara imebi ha, gụọ Teta! nke October–December 2007, peeji nke 3 ruo nke 11. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 19]

Nna kwesịrị isetịpụrụ ụmụ ya ezi ihe nlereanya

[Foto dị na peeji nke 20]

Nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ya banyere Chineke

[Foto dị na peeji nke 21]

E kwesịrị iji ịhụnanya na-adọ ụmụaka aka ná ntị