Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Okwukwe M Si Nyere M Aka Idi Ọdachi Ndị Dakwasịrị M

Otú Okwukwe M Si Nyere M Aka Idi Ọdachi Ndị Dakwasịrị M

Otú Okwukwe M Si Nyere M Aka Idi Ọdachi Ndị Dakwasịrị M

Dị ka Soledad Castillo si kọọ

Ọtụtụ ugboro ná ndụ m, owu ọmụma gaara emekpọ m ọnụ, ma, o mekpọghị m ọnụ. Mgbe m dị afọ iri atọ na anọ, di m m hụrụ n’anya nwụrụ. Afọ isii di m nwụrụ, papa m nwụrụ. Ọnwa asatọ papa m nwụrụ, m chọpuṭara na naanị otu nwa m mụrụ bu ọrịa a na-enweghị ike ịgwọ agwọ.

AHA m bụ Soledad, nke pụtara “Owu Ọmụma.” Ma, owu ọmụma emetụbeghị ka ndụ gwụ m ike, ọ bụ ezie na o nwere ike isi ike nkweta. Mgbe ọdachi dakwasịrị m, ama m na Jehova bụ́ Chineke nọ m nso wee ‘sekpụrụ m n’aka nri m ma nyere m aka ka m ghara ịtụ egwu.’ (Aịzaya 41:13) Chere ka m kọọrọ gị otú m si die ọdachi ndị dakwasịrị m na otú ha si mee ka m bịarukwuo Jehova nso.

Anyị Bi n’Udo n’Enweghị Ọtụtụ Nsogbu

A mụrụ m na Barcelona, Spain, na May 3, 1961. Abụ m naanị otu nwa papa m, bụ́ José, na mama m, bụ́ Soledad, mụrụ. Mgbe m dị afọ itoolu, mama m mụtara eziokwu dị n’Okwu Chineke. Ọ gbabuola mbọ ka a zaa ya ajụjụ ndị o nwere banyere okpukpe ya, ma, o nwetaghị afọ ojuju na chọọchị ya. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ anyị wee jiri Akwụkwọ Nsọ zaa ya ajụjụ niile o nwere. O kwetara ozugbo ka ha bịa kụziwere ya Baịbụl.

Ọ dịghị anya e mee mama m baptizim, o wee ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe afọ ole na ole gafere, papa m ghọkwuru Onyeàmà Jehova. Ọ dịghị anya Eliana, bụ́ onye kụziiri mama m Baịbụl, ahụ na m nwere mmasị nke ukwuu n’Okwu Chineke. Ọ bụ ezie na m ka dị obere, Eliana tụrụ aro ka a kụziwere m Baịbụl iche. N’ihi aka o nyeere m na agbamume mama m nyere, e mere m baptizim mgbe m dị afọ iri na atọ.

N’oge m ka na-eto eto, m na-ekpeku Jehova ekpere ọtụtụ mgbe, karịchaa, mgbe m chọrọ ime mkpebi. N’eziokwu, enwekarịghị m nsogbu mgbe m na-eto agbọghọ. N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke m nọ na ya, m nwere ọtụtụ ndị enyi, mụ na ndị mụrụ m dịkwa n’ezigbo mma. N’afọ 1982, Felipe, bụ́ Onyeàmà nke na-agbalị ka ya jiri ozi Jehova kpọrọ ihe, dị ka m na-agbalị, lụrụ m.

Ịzụlite Nwa Anyị Ka Ọ Hụ Jehova n’Anya

Mgbe afọ ise gafere, m mụrụ nwa nwoke mara mma nke anyị gụrụ Saúl. Obi dị mụ na Felipe ụtọ na anyị mụrụ nwa. Olileanya anyị bụ na Saúl ga-eto wee ghọọ nwata ahụ́ siri ike nke na-echezi echiche echezi ma hụ Chineke n’anya. Mụ na Felipe na Saúl na-anọ ọtụtụ mgbe na-akọ banyere Jehova. Anyị na-erikọkwa nri ọnụ, na-agakọ ebe a na-atụrụ ndụ ọnụ, na-egwukọkwa egwu ọnụ. Ọ na-atọkwa Saúl ụtọ ka ya na Felipe soro na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma. Felipe kụziiri ya mgbe ọ dị obere ka ọ na-akụ aka n’ụzọ ma na-enye ndị mmadụ obere akwụkwọ e ji amụ Baịbụl mgbe ha na-ekwusa ozi ọma.

Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Saúl nọ na ọzụzụ anyị nyere ya ruru ya n’ahụ́. Mgbe ọ dị afọ isii, anyị na ya na-aga ekwusa ozi ọma ọtụtụ mgbe. Ige akụkọ Baịbụl na-amasị ya nke ukwuu, ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ anyị na-atọkwa ya ụtọ. N’oge na-adịghị anya o bidoro ịga ụlọ akwụkwọ, ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl mere ka ọ na-emere onwe ya obere mkpebi ụfọdụ.

Ma, mgbe Saúl ruru afọ asaa, ihe gbanwere nke ukwuu n’ezinụlọ anyị. Felipe malitere ịrịa ọrịa akpa ume. Ọrịa ahụ nyere ya nsogbu ruo ọnwa iri na otu. Ọ naghị ekwe ya ịga ọrụ, ọtụtụ mgbe ọ na-edina edina. Mgbe di m gbara afọ iri atọ na isii, ọ nwụrụ.

M ka na-ebe ákwá mgbe ọ bụla m chetara afọ ndị ahụ anyị nọ ná nsogbu. M nọ na-ele di m ka ọrịa ahụ nọ na-emesi ya ike n’enweghị ihe ọ bụla m ga-emeli. N’oge niile ahụ, agbalịrị m ịnọgide na-agba Felipe ume, ọ bụ ezie na n’ime onwe m aghọtala m na ihe ezinụlọ anyị lere anya ya ma mee atụmatụ ya akụọla afọ n’ala. M na-agụrụ ya akwụkwọ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Akwụkwọ ndị ahụ na-agbakwa anyị ume mgbe anyị na-enweghị ike ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Mgbe ọ nwụrụ, owu ọmụma zuru m ahụ́.

N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyeere m aka. M na-arịọ ya mgbe niile ka o nye m mmụọ ya. Ana m ekele ya maka afọ ole mụ na Felipe biri n’udo nakwa maka olileanya m nwere ịhụ Felipe ọzọ mgbe ọ ga-ebilite n’ọnwụ. Arịọrọ m Chineke ka o nyere m aka ka m na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla m chetara otú mụ na di m si bie nakwa ka o nye m amamihe m ga-eji zụlite nwa anyị, ka o wee ghọọ ezi Onye Kraịst. Ọ kasiri m obi n’agbanyeghị oké mwute m nọ na-enwe.

Papa m na mama m na ndị nọ n’ọgbakọ anyị nyeere m aka nke ukwuu. Ma, m rụrụ ọrụ dịịrị m n’ịkụziri Saúl Baịbụl na n’ịkụziri ya ka o fee Jehova. Onye m rụbuuru ọrụ gwara m ka ya nye m ọrụ dị mma m ga-anọ n’ọfịs na-arụ. Ma, m họọrọ ọrụ ịzachasị na ihichasị ihe, ka mụ na Saúl nwee ike na-anọkwu, ka anyị nweekwa ike na-anọ mgbe ọ lọtara akwụkwọ.

Otu ebe n’Akwụkwọ Nsọ gosiri m na ọ dị mkpa nke ukwuu ịzụ Saúl otú Chineke chọrọ. Ebe ahụ sịrị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.” (Ilu 22:6) Amaokwu a mere ka m mara na ọ bụrụ na m gbalịa ike m niile ime ka Saúl mata ụzọ Jehova, Jehova ga-agọzi mgbalị m. Ọ bụ ezie na ọ ga-eme ka m ghara ịkpata ego otú m kwesịrị, ma, o kwesịrị ka mụ na nwa m na-anọ, nke a dịkwa mkpa nke ukwuu karịa ego ọ bụla m nwere ike ịkpata.

Mgbe Saúl dị afọ iri na anọ, papa m nwụrụ. Ọnwụ ya nyere Saúl nsogbu, karịchaa, n’ihi na ọnwụ nna nna ya mere ka o cheta mwute niile o nwere mgbe papa nke ya nwụrụ. Papa m gosiri anyị otú anyị ga-esi hụ Jehova n’anya. Mgbe ọ nwụrụ, Saúl kpebiri na ebe ọ bụ naanị ya bụ nwoke anyị nwere n’ụlọ, na ya ga-ahụ na ya lekọtara mama ya na nne nne ya.

Ọgụ Anyị na Ọrịa Kansa Ọbara Lụrụ

Ọnwa asatọ papa m nwụrụ, dọkịta na-agwọ ezinụlọ anyị gwara m ka m kpọrọ Saúl gaa n’ụlọ ọgwụ dị nso n’ebe anyị bi, ebe ọ bụ na ike na-agwụkarị ya. Mgbe e lere ya ahụ́ ọtụtụ ugboro, ndị dọkịta gwara m na Saúl na-arịa ọrịa kansa ọbara. *

N’ime afọ abụọ na ọkara sochirinụ, Saúl nọ na-echu ụlọ ọgwụ ka mmiri, na-agbalị ka o die ọrịa kansa na otú ndị dọkịta si na-agwọ ya. Ọnwa isii mbụ a gwọrọ ya mere ka ọrịa ahụ kwụsịtụ ruo ọnwa iri na asatọ. Ma, ọ bịaghachiri, e wee malitekwa ịgwọ ya ọzọ bụ́ nke mere ka ike na-agwụ ya nke ukwuu. Ọrịa kansa ahụ kwụsịtụkwara naanị obere oge. Mgbe ọ bịaghachiri ọzọ, Saúl enweghịkwa ike idi ọgwụgwọ ọzọ. Saúl ewerewo onwe ya nyefee Chineke, kwuokwa ka e mee ya baptizim ka ọ bụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ma, ọ nwụrụ obere oge ọ gbachara afọ iri na asaa.

Ọtụtụ mgbe, ndị dọkịta na-ekwu ka a mịnye onye a na-agwọ ụdị ọrịa a ọbara n’ihi ụzọ siri ike e si agwọ ya. Ma, o doro anya na ịmịnye mmadụ ọbara enweghị ike ịgwọ ọrịa ahụ. N’oge mbụ ndị dọkịta chọpụtara na Saúl na-arịọ ọrịa kansa ọbara, ma Saúl ma mụ onwe m mere ka o doo ha anya na anyị agaghị achọ ka a mịnye ya ọbara, n’ihi na anyị chọrọ irube isi n’iwu Jehova, nke bụ́ ‘na-ezere ọbara.’ (Ọrụ 15:19, 20) Ọtụtụ mgbe m na-anọghị ya, Saúl mere ka o doo ndị dọkịta anya na ọ bụ ya ji aka ya kpebie ka a ghara ịmịnye ya ọbara. (Gụọ igbe dị na peeji nke 31.)

E mechaa, ndị dọkịta kwetara na Saúl na-eche echiche ka dimkpa, ọ bụ ezie na ọ ka bụ nwata, kwetakwa na ọ ghọtara nke ọma otú ọrịa ahụ ga-esi akpa ya aka ọjọọ. Ha kwetara ihe anyị kwuru wee na-agwọ ya n’amịnyeghị ya ọbara, ọ bụ ezie na ha nọkwa na-akwanye anyị ọkụ n’ahụ́ ka anyị gbanwee obi anyị. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu mgbe m nọ na-ege ntị oge Saúl nọ na-akọwara ndị dọkịta ihe mere o ji ọ chọghị ka a mịnye ya ọbara. O doro anya na ya na Jehova dị n’ezigbo mma.

N’ọkọchị, bụ́ oge mbụ anyị matara na ọrịa ahụ na-arịa Saúl, e wepụtara akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso ná mgbakọ distrikti nke anyị gara na Barcelona. Akwụkwọ ahụ nke bara oké uru nyeere anyị aka nke ukwuu iguzosi ike n’agbanyeghị na anyị amaghị ihe echi ga-ewetara anyị. N’oge niile anyị nọrọ n’ụlọ ọgwụ, anyị na-agụkọ akwụkwọ ahụ ọnụ. N’oge niile ahụ ihe jọọrọ anyị njọ nakwa n’oge ndị ọzọ, anyị na-echeta ihe akwụkwọ ahụ kwuru ọtụtụ mgbe. Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe e kwuru n’Aịzaya 41:13, bụ́ nke e dere ná mbido akwụkwọ ahụ, baara anyị uru nke ukwuu. Amaokwu ahụ sịrị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”

Okwukwe Saúl Metụrụ Ndị Ọzọ n’Ahụ́

Nchekwube Saúl nwere nakwa otú o si gosi ntozu okè metụrụ ndị dọkịta na ndị nọọsụ na-arụ ọrụ n’Ụlọ Ọgwụ Vall d’Hebrón n’ahụ́. O mere ka ndị niile lekọtara ya n’ụlọ ọgwụ hụ ya n’anya. Kemgbe ahụ, onyeisi ngalaba na-agwọ ọrịa kansa ọbara n’ụlọ ọgwụ ahụ agwọọla ụmụ Ndịàmà ndị ọzọ na-arịa ọrịa kansa ọbara. Ọ kwanyekwaara ha ùgwù nke ukwuu. Ọ na-echeta otú Saúl si guzosie ike ná mkpebi ya imezu ihe o kweere, na-echetakwa obi ike o nwere mgbe ọnwụ chere ya ihu nakwa otú o si tinyere ụwa ya obiọma. Ndị nọọsụ gwara Saúl na n’ime ndị niile ha gwọrọla ọrịa n’ọnụ ụlọ ọgwụ ahụ, na ọ bụ ya kacha bụrụ ezigbo nwa. Ha sịrị na ọ naghị eme mkpesa nakwa na o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ịkpa ndị mmadụ ọchị, ọbụna n’oge ọ na-aga ịnwụ.

Otu ọkachamara nke otú ụmụ mmadụ si akpa àgwà gwara m na ọtụtụ ụmụaka ụdị ọrịa ọjọọ ahụ na-arịa, bụ́ ndị ọgbọ ya, na-enupụkarịrị ndị dọkịta na ndị mụrụ ha isi n’ihi ahụ́ mgbakasị na nkụda mmụọ. Ma, ọ chọpuṭara na Saúl emeghị otú ahụ. O juru ya anya ịhụ na Saúl dị nwayọọ ma nwee nchekwube. Nke a mere ka mụ na Saúl nwee ohere izi ya ozi ọma banyere ihe ndị anyị kweere.

M na-echetakwa otú Saúl si nyere otu Onyeàmà nọ n’ọgbakọ anyị aka n’amaghị ama. Obi dara ya mbà kemgbe afọ isii, ọgwụ agwọtaghịkwa ya. Ọ rahụrụ n’ụlọ ọgwụ iji lekọta Saúl ọtụtụ mgbe. Ọ gwara m na otú Saúl si were ọrịa kansa ọbara rịara ya metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. Ọ chọpụtara na n’agbanyeghị oké ike ọgwụgwụ na-agwụ Saúl, na Saúl na-agbalị ịgba onye ọ bụla bịara ileta ya ume. Onyeàmà ahụ sịrị, “Omume Saúl mere ka m nwee obi ike ịgbaso obi na-ada m mbà mgba.”

O ruola afọ atọ kemgbe Saúl nwụrụ. O doro anya na m ka na-enwe mwute. Esighị m ike, ma, Chineke enyela m “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Ahụla m na mmadụ nwekwara ike irite uru ọbụna mgbe ihe isi ike kacha mwute bịaara ya. Ọnwụ di m na nke papa m na nke nwa m m diri enyerela m aka ka m ghara ịchọ ọdịmma onwe m naanị, meekwa ka m na-emeso ndị na-ata ahụhụ ihe n’obi ọma karị. Nke ka nke bụ na o meela ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma. M ga-edi ihe ọ bụla nwere ike ịbịara m n’ọdịnihu n’atụghị egwu n’ihi na Nna m nke eluigwe ka na-enyere m aka. Ọ ka sekpụ m n’aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Ọ bụ ajọ ọrịa kansa ọbara na-arịa Saúl, ụdị nke na-ebibi mkpụrụ ndụ na-acha ọcha ndị na-adị n’ọbara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Ò NWETỤLA MGBE I CHERE ECHICHE IHE KPATARA YA?

O nwere ike bụrụ na ị nụtụla na Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara. Ò nwetụla mgbe i chere echiche ihe kpatara ya?

Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-aghọtahie ihe mere Ndịàmà Jehova ji eme ihe a Akwụkwọ Nsọ kwadoro. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eche na Ndịàmà Jehova anaghị achọ ka a gwọọ ha ma ha rịawa ọrịa ma ọ bụkwanụ na ndụ adịghị ha mkpa. Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Ndịàmà Jehova na-achọ ka e jiri ụzọ kacha mma gwọọ ha na ndị ezinụlọ ha. Ma, ha na-achọ ka a gwọọ ha n’amịnyeghị ha ọbara. N’ihi gịnị?

Ọ bụ iwu dị mkpa Chineke nyere ụmụ mmadụ mere ha ji eme otú ahụ. Ozugbo Iju Mmiri oge Noa gachara, Chineke nyere Noa na ezinụlọ ya ikike ka ha na-eri anụ. Ma, Chineke nyere ha otu iwu: Ọ gwara ha ka ha ghara iri ọbara. (Jenesis 9:3, 4) Ọ bụ Noa mụrụ agbụrụ ụmụ mmadụ dị iche iche, n’ihi ya, ọ bụ mmadụ niile ka e nyere iwu ahụ. O nweghị mgbe e mechara kagbuo iwu ahụ. Mgbe ihe karịrị narị afọ asatọ gafere, Chineke nyeghachiri ụmụ Izrel iwu ahụ, wee kọwaara ha na ọbara dị nsọ, nakwa na ọ na-anọchi anya mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ. (Levitikọs 17:14) Mgbe ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise o nyere ụmụ Izrel iwu ahụ gafere, ndịozi Kraịst nyere Ndị Kraịst niile iwu ka ha “na-ezere . . . ọbara.”—Ọrụ 15:29.

Ndịàmà Jehova kweere na o nweghị otú mmadụ ga-esi kwuo na ya na-ezere ọbara ma ọ bụrụ na o kwe ka a mịnye ya ọbara n’ahụ́. Ya mere, ha na-achọ ka a gwọọ ha ọrịa n’amịnyeghị ha ọbara. Ihe a ha kweere bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro na-eme ka otú e si agwọ ha bụrụ ụzọ kacha mma. O doro anya na ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà Jehova jikwa achọ ka a gwọọ ha ọrịa n’amịnyeghị ha ọbara.

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na di m, bụ́ Felipe, na nwa anyị, bụ́ Saúl

[Foto dị na peeji nke 29]

Papa m, bụ́ José, na mama m, bụ́ Soledad

[Foto dị na peeji nke 30]

Foto Saúl, otu ọnwa tupu ya anwụọ