Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere ndị Juu ji biri ná mba dị iche iche mgbe Jizọs nọ n’ụwa?

Mgbe Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị na ha enweghị ike ịga ebe ya na-aga, ndị Juu jụrụ ibe ha, sị: “Olee ebe nwoke a bu n’uche ịga . . . ? Ò bu n’uche ịgakwuru ndị Juu gbasasịrị n’etiti ndị Grik?” (Jọn 7:32-36) N’oge na-adịghị anya o kwuru nke ahụ, Ndị Kraịst gara kwusaara ndị Juu bi ná mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian ozi ọma.—Ọrụ 2:5-11; 9:2; 13:5, 13, 14; 14:1; 16:1-3; 17:1; 18:12, 19; 28:16, 17.

Ọ bụ mmeri ndị mba ọzọ meriri ndị Juu wee dọrọ ha n’agha mere ha ji gaa biri ná mba dị iche iche. Ndị mbụ dọọrọ ha n’agha n’afọ 740 tupu a mụọ Kraịst bụ ndị Asiria. Ka oge na-aga, ndị Babịlọn dọkwaara ha n’agha n’afọ 607 tupu a mụọ Kraịst. Ọ bụ naanị ụfọdụ n’ime ndị ahụ a dọọrọ n’agha laghachiri n’Izrel. (Aịzaya 10:21, 22) Ndị nke ọzọ esighị ná mba dị iche iche ha nọ lọta.

Ya mere, n’ihe dị ka narị afọ anọ tupu a mụọ Kraịst, ndị Juu bi n’ógbè otu narị na iri abụọ na asaa ndị dị n’Alaeze Ukwu Peshia. (Esta 1:1; 3:8) Mbọ ndị Juu gbara ka ndị mba ọzọ malite ikpe okpukpe ha mere ka ọtụtụ ndị mata banyere Jehova ka oge na-aga, matakwa banyere Iwu o nyere ndị Juu. (Matiu 23:15) Ndị Juu, bụ́ ndị si n’ọtụtụ mba, bịara Ememme Pentikọst nke e mere na Jeruselem n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, bụ́ ebe ha nọ nụ ozi ọma banyere Jizọs. Ya mere, obibi ndị Juu biri ná mba dị iche iche n’Alaeze Ukwu Rom so n’ihe mere ka ndị bi ná mba dị iche iche ghọọ Ndị Kraịst.

Olee otú ọlaedo Eze Sọlọmọn nwere haruru?

Akwụkwọ Nsọ kwuru na Haịram, bụ́ eze Taya, zigaara Sọlọmọn tọn ọlaedo anọ, eze nwaanyị Shiba ebunyekwa ya ọlaedo haruru ka nke ahụ Haịram zigaara ya. Ọtụtụ ụgbọ mmiri Sọlọmọn nwere sikwa n’Ofa butere ya ihe karịrị tọn ọlaedo iri na ise. Baịbụl kwuru na “ọlaedo a na-ebutere Sọlọmọn n’otu afọ dị narị talent ọlaedo isii na iri isii na isii n’ịdị arọ,” ma ọ bụ ihe karịrị tọn iri abụọ na ise. (1 Ndị Eze 9:14, 28; 10:10, 14) Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Olee otú ọlaedo ndị eze na-enwe n’oge ochie na-aha?

Otu ihe e dere n’oge ochie, bụ́ nke ndị ọkà mmụta kwetara na ọ bụ eziokwu, kwuru na eze Ijipt, bụ́ Fero Thutmose nke Atọ, (onye dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga) wetara ihe dị ka tọn ọlaedo iri na atọ na ọkara debe n’ụlọ chi bụ́ Amun-Ra nke dị na Karnak. N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga, eze Asiria, bụ́ Tiglat-pilesa nke Atọ, natara Taya ụtụ karịrị tọn ọlaedo anọ. Sargon nke Abụọ nyekwara chi Babịlọn ọlaedo hà otú ahụ n’onyinye. E kwuru na eze Masedonia, bụ́ Philip nke Abụọ (359-336 tupu a mụọ Kraịst), nwetara ihe karịrị iri tọn ọlaedo abụọ na asatọ kwa afọ n’ebe a na-egwu ọlaedo na Pangaeum, nke dị na Thrace.

E kwuru na mgbe nwa Philip, bụ́ Alexander Onye Ukwu, (336-323 tupu a mụọ Kraịst) weghaara Susa bụ́ obodo dị na Peshia, o nwetara ihe dị ka otu puku tọn ọlaedo na otu narị tọn na iri asatọ n’obodo ahụ, nwetakwa ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku tọn ọlaedo asaa n’ala Peshia dum. Ya mere, ọ bụrụ na e jiri otú ọlaedo ndị a kọrọ akụkọ ha n’ebe a hà tụnyere otú ọlaedo Sọlọmọn nwere hà, anyị ga-ahụ na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu.