Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọtụtụ Mmadụ Kweere na Ọ Dị

Ọtụtụ Mmadụ Kweere na Ọ Dị

Ọtụtụ Mmadụ Kweere na Ọ Dị

“M na-arọ nrọ ebe ọkụ na-ere m na hel! M na-arọkwa nrọ ebe a tụbara m n’ọkụ, m na-eti mkpu wee teta. N’ihi ya, agbalịsiri m ike ka m ghara ime mmehie.”—Arline.

ÌKWEERE na hel bụ ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ? Ọtụtụ ndị kweere. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2005, otu ọkà mmụta nke na-akụzi na Mahadum St. Andrews, nke dị na Scotland, chọpụtara na otu onye n’ime ndị ụkọchukwu atọ ọ bụla nọ na Scotland kweere na ahụhụ ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma ga-ata bụ “ịnọ na hel na-echegbu onwe ha ruo mgbe ebighị ebi.” Ma, otu onye n’ime ndị ụkọchukwu ise ọ bụla nọ n’ebe ahụ kweere na a ga-ata ndị nọ na hel ahụhụ.

N’ọtụtụ mba, ọtụtụ ndị kweere na hel dị. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2007, a gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ wee chọpụta na mmadụ asaa n’ime mmadụ iri ọ bụla kweere na hel dị. Ọbụna ná mba ọtụtụ ndị na-anaghị aga ụka, ndị mmadụ kwekwaara na hel dị. N’ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ na Canada n’afọ 2004, a chọpụtara na ihe dị ka mmadụ anọ n’ime mmadụ iri ọ bụla nọ n’ebe ahụ kweere na hel dị. Na Great Britain, a chọpụtara na ihe dị ka mmadụ atọ n’ime mmadụ iri ọ bụla kwenyesiri ike na hel dị.

Ihe Ndị Ụkọchukwu Na-akụzi

Ọtụtụ ndị ụkọchukwu akwụsịla ịkụzi na hel bụ ebe e ji ọkụ ata ndị mmadụ ahụhụ. Kama nke ahụ, ha na-akụzi ihe yiri ihe e dere na Catechism of the Catholic Church, nke e bipụtara n’afọ 1994. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ahụhụ kachanụ a na-ata ndị mmadụ na hel bụ ikewapụ ha n’ebe Chineke nọ ruo mgbe ebighị ebi.”

N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị ka kweere na hel bụ ebe ndị mmadụ ga-anọ ná nchegbu ma ọ bụ ebe ha ga-anọ na-ata ahụhụ. Ndị na-ezi ozizi a kwuru na o si na Baịbụl. R. Albert Mohler, onyeisi nke ụlọ akwụkwọ Southern Baptist Theological Seminary, kwuru, sị: “A naghị agbagha ya agbagha na ọ bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.”

Gịnị Mere Ihe I Kweere Ji Dị Mkpa?

Ọ bụrụ n’ezie na hel bụ ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ, i kwesịrị ịtụ ya ụjọ. Ma, ọ bụrụ na ozizi a abụghị eziokwu, ndị ụkọchukwu ndị na-akụzi ya na-emegharị ndị mmadụ anya, na-emekwa ka ha na-atụ ụjọ na-enweghị isi. Ha na-akparịkwa Chineke.

Olee ihe Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru banyere hel? N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-eji nsụgharị Baịbụl bụ́ Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik na Bible Nsọ nke Igbo Union Version nakwa nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ zaa ajụjụ atọ a: (1) Gịnị n’ezie na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ? (2) Gịnị ka Jizọs kụziri banyere hel? (3) Olee otú ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere hel ga-esi metụta gị?