Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Kpọrọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Kirie Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị

Anyị Kpọrọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Kirie Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị

Anyị Kpọrọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Kirie Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị

“OLEE ihe a na-eme n’ebe ahụ?” Ọtụtụ ndị na-agbafe alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Mogale City (Krugersdorp), nke dị nso na Johannesburg, South Africa, na-ajụ ajụjụ a. Ya mere, Ndịàmà Jehova kpebiri ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa kirie alaka ụlọ ọrụ ha ahụ n’October 12 na October 13, 2007. E nwere ihe abụọ mere ha ji kpọọ ndị mmadụ òkù. Nke mbụ bụ iji mee ka ndị mmadụ kwụsị akụkọ na-abụghị eziokwu ha na-akọ. Nke abụọ abụrụ iji gosi ọhaneze ihe a na-eme n’alaka ụlọ ọrụ ahụ iji na-akwado ọrụ Jizọs Kraịst nyere iwu ka a rụọ.—Matiu 28:19, 20.

Ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ dere ihe gbara okpotokpo n’ebe e si abata na ya iji nabata ọhaneze, ha nyekwara ndị bi nso n’ebe ahụ akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche. Ha kpọkwara ndị ha na-azụ ahịa na ndị ezinụlọ ha. Gịnịzi mere? Ihe karịrị narị ndị ọbịa ise bụ́ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova bịara kirie alaka ụlọ ọrụ ahụ.

Ihe masịrị ọtụtụ ndị bụ ígwè e ji ebi akwụkwọ bụ́ MAN Roland Lithoman nke na-ebi ihe ruru puku magazin iri itoolu n’otu awa. Ebe ọzọ masịkwara ndị ọbịa ahụ bụ ebe a na-ekechi ihe karịrị tọn akwụkwọ iri na anọ kwa ụbọchị, bụ́ ndị a na-ebugara ndị chọrọ ha, tinyekwara ebe a na-ekwe akwụkwọ. Ndịàmà ndị na-arụ ọrụ ná ngalaba dị iche iche debere foto dị iche iche mara mma, tinyere nke gosiri otú ibi akwụkwọ si malite, site n’oge Gutenberg ruo n’oge a e ji ígwè ọgbara ọhụrụ ebi akwụkwọ. Foto ọzọ gosiri otú alaka ụlọ ọrụ ahụ si edebe ebe niile ọcha. Dị ka ihe atụ, e nwere ihe ha rụrụ nke na-ewepụ ikuku ọjọọ na ísì ọjọọ na-apụta n’ígwè ahụ e ji ebi akwụkwọ, tinyere nke na-ewepụ uzuzu na-esi n’ebe a na-ebi akwụkwọ apụta.

Ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ dị n’ebe ahụ bipụtara otu isiokwu n’akwụkwọ akụkọ ha nke kọrọ na narị mmadụ asaa ndị wepụtara onwe ha wee na-arụ ọrụ n’ebe ahụ “bụ ndị ozi a họpụtara ahọpụta, ndị weere onwe ha nyefee Jehova.” Ọ kọkwara otú ebe ahụ a na-ebi akwụkwọ “si dị ọcha na-enweghị atụ na otú ihe niile si apụta n’oge.” Otu nwoke nke na-enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ n’oge gara aga bịakwara kirie alaka ụlọ ọrụ ahụ. E mechaa, o dere akwụkwọ ozi nke sịrị: “Jidenụ ka unu ji. O siri ike ịhụ ebe mara mma ka ụlọ ọrụ unu.”

Ọtụtụ n’ime ndị ọbịa ahụ gosiri obi ekele ha nwere maka ịbịa kirie alaka ụlọ ọrụ ahụ, o jukwara ha anya na alaka ụlọ ọrụ ahụ nwere akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Baịbụl n’asụsụ otu narị na iri ise na otu nakwa na alaka ụlọ ọrụ ahụ na-ebipụta akwụkwọ a na-eziga ná mba iri na asatọ ndị dị ma ná ndịda Africa ma n’etiti Africa. Ndị mmadụ nwekwara ohere ịga kirie alaka ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova nwere n’ụwa dum, n’oge a na-arụ ọrụ n’ụbọchị. Ọ ga-adị mma ka ị kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị ná mba unu wee chọpụta oge e ji ekiri ya.

[Foto dị na peeji nke 14]

Akwụkwọ ịkpọ òkù

[Foto dị na peeji nke 14]

Mgbe ndị bịara ikiri alaka ụlọ ọrụ ahụ na-abata

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Mogale City, South Africa

[Foto dị na peeji nke 15]

Ígwè e ji ebi akwụkwọ bụ́ MAN Roland Lithoman

[Foto dị na peeji nke 15]

Ebe a na-ekwe akwụkwọ

[Foto dị na peeji nke 15]

Ebe a na-ekechi akwụkwọ