Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Mere Ha Ihe Ha Chọrọ Ka E Mee Daniel!

E Mere Ha Ihe Ha Chọrọ Ka E Mee Daniel!

Maka Ndị Na-eto Eto

E Mere Ha Ihe Ha Chọrọ Ka E Mee Daniel!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri anya nke uche gị kirie ebe ihe ahụ mere. Nụrụ olu ndị ahụ ị na-agụ banyere ha. Ka ihe ha na-eme ruo gị n’ahụ́. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ DANIEL 6:1-28.

Olee ụdị onye i chere Darayọs bụ? Kwuo otú i chere ọ dị. Olee ụdị olu i chere o ji kwuo okwu? (Gụghachi amaokwu nke 14, 16, 18-20.)

․․․․․

Olee otú olulu ahụ dị, oleekwa otú i chere ọdụm ndị ahụ dị?

․․․․․

Kwuo ihe i chere mere n’ime nkeji ole na ole a tụbachara Daniel n’olulu ahụ ma kaa olulu ahụ akara.

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Gịnị mere ndị isi nọ n’ọchịchị Darayọs ji nweere Daniel anyaụfụ? (Gụghachi amaokwu nke 3.)

․․․․․

Gịnị mere Daniel na-eji anọ n’ebe ndị mmadụ na-ahụ ya ekpe ekpere n’agbanyeghị na o nwere ike ịnọ n’ebe ha na-agaghị ahụ ya? (Gụghachi amaokwu nke 10 na nke 11.)

․․․․․

Gịnị mere iwu ahụ ha kwuru ka Darayọs tie banyere ekpere ji dị Darayọs mma? (Gụghachi amaokwu nke 7.)

․․․․․

TINYE IHE Ị MỤTARA N’ỌRỤ. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Inwe obi ike n’agbanyeghị mmegide.

․․․․․

Mkpa ekpere dị.

․․․․․

Otú Jehova si echebe ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi.

․․․․․

OLEE IHE KACHA METỤ GỊ N’AHỤ́ N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ N’IHI GỊNỊ?

․․․․․