Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Jizọs Kụziri Banyere Hel?

Gịnị Ka Jizọs Kụziri Banyere Hel?

Gịnị Ka Jizọs Kụziri Banyere Hel?

Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka ị na-eme mmehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma ka i buru otu anya baa n’alaeze Chineke karịa inwe anya abụọ e wee tụba gị na hel. Ikpuru dị na ya anaghị anwụ anwụ, ọkụ ya anaghịkwa anyụ anyụ.”—MAK 9:47, 48, nsụgharị Contemporary English Version.

N’oge ọzọ, Jizọs kwuru banyere oge ikpe, mgbe ọ ga-agwa ndị na-emebi iwu, sị: “Pụọnụ n’ihu m, ndị a na-abụ ọnụ, gaa n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.” O kwukwara na ha “ga-apụ jee baa n’ahụhụ mmehie ebighị ebi.”—MATIU 25:41, 46, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version.

Ọ BỤRỤ na mmadụ elerughị ihe a Jizọs kwuru anya, o nwere ike iyi ya ka ọ̀ na-akwado na e nwere ọkụ mmụọ. O doro anya na Jizọs anaghị emegide Okwu Chineke bụ́ nke kwuru hoo haa, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”—Ekliziastis 9:5, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version.

Oleezi ihe Jizọs na-ekwu mgbe ọ sịrị na a ga-atụba mmadụ “na hel”? ‘Ọkụ ebighị ebi’ ahụ Jizọs kwuru okwu ya ọ̀ bụ ọkụ nkịtị ka ò nwere ihe ọ na-anọchi anya ya? Olee ihe ndị na-emebi iwu ‘ịba n’ahụhụ mmehie ebighị ebi’ pụtara? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a n’otu n’otu.

Olee ihe Jizọs na-ekwu mgbe ọ sịrị na a ga-atụba mmadụ “na hel”? Okwu Grik a sụgharịrị “hel” na Mak 9:47 bụ Geʹen·na. Okwu a sitere n’okwu Hibru bụ́ Geh Hin·nomʹ, nke pụtara “Ndagwurugwu Hinọm.” Ndagwurugwu Hinọm dị ná mpụga Jeruselem oge ochie. N’oge ọchịchị ndị eze Izrel, a na-achụ ụmụaka n’àjà n’ebe ahụ, nke bụ́ ihe arụ n’anya Chineke. Chineke kwuru na ya ga-ebibi ndị ahụ na-efe ofufe ụgha. N’ihi ya, a ga-akpọ ndagwurugwu Hinọm “ndagwurugwu ogbugbu,” ebe a ga na-atụba “ozu ndị nke a” n’elighị ha eli. (Jeremaya 7:30-34, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) N’ihi ya, Jehova buru amụma na Ndagwurugwu Hinọm ga-aghọ ebe a ga na-atụba ozu nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụghị ebe a ga-ata ndị dị ndụ mere ihe ọjọọ ahụhụ.

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị bi na Jeruselem ji Ndagwurugwu Hinọm mere ebe a na-ekpofu ihe. Ha na-atụba ozu ndị omekome ụfọdụ n’ebe ahụ, na-emekwa ka ọkụ nke na-enwu na ya ghara ịnyụ anyụ, ka o wee repịa ihe ndị e kponyere na ya na ozu ndị a tụbara na ya.

Mgbe Jizọs kwuru banyere ikpuru ndị na-anaghị anwụ anwụ na ọkụ na-anaghị anyụ anyụ, ọ ga-abụ na ọ na-ekwu banyere ihe e dere n’Aịzaya 66:24. Aịzaya kwuru banyere “ozu niile nke ndị na-ejehie ejehie megide [Chineke],” sị: “ikpuru ha agaghị anwụ, ọkụ ha agaghị anyụkwa.” (nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Jizọs na ndị ọ gwara okwu maara na ihe ndị a e dere n’Aịzaya na-ekwu ihe ga-eme ozu ndị ahụ a na-ekwesịghị ili eli.

N’ihi ya, ndagwurugwu Hinọm ma ọ bụ Gehena nke Jizọs kwuru okwu ya pụtara mmadụ ịnwụ n’enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ. O mere ka okwu ya doo anya mgbe o kwuru na Chineke “nwere ike ibibi ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.” (Matiu 10:28, nsụgharị The New American Bible) Gehena pụtara ọnwụ ebighị ebi, ọ bụghị ahụhụ ebighị ebi.

‘Ọkụ ebighị ebi’ ahụ Jizọs kwuru okwu ya ọ̀ bụ ọkụ nkịtị ka ò nwere ihe ọ na-anọchi anya ya? Cheta na ọ bụ “ekwensu na ndị mmụọ ozi ya” ka e doziiri ‘ọkụ ebighị ebi ahụ’ Jizọs kwuru okwu ya na Matiu 25:41. Ì chere na ọkụ nwere ike ire ndị mmụọ? Ka ọ̀ ga-abụ na Jizọs ji “ọkụ” mee ihe atụ? N’ezie, “atụrụ” na “ewu” Jizọs kwuru okwu ha n’oge ahụ ọ na ekwu okwu abụghị atụrụ na ewu nkịtị; ha na-anọchi anya ụdị ụmụ mmadụ abụọ. (Matiu 25:32, 33) Ọkụ ebighị ebi ahụ Jizọs kwuru okwu ya bụ ọkụ ihe atụ nke ga-erechapụ ndị na-emebi iwu.

Olee otú ndị na-emebi iwu ga-esi “jee baa n’ahụhụ mmehie ebighị ebi”? Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ nsụgharị dere “ahụhụ” na Matiu 25:46, isi ihe okwu Grik ahụ bụ́ koʹla·sin pụtara bụ “igbutulata osisi na-eto eto,” ma ọ bụ ịkwa osisi, igbupụ alaka ndị na-abaghị uru. N’ihi ya, ndị yiri atụrụ ga-enweta ndụ ebighị ebi, ma ndị yiri ewu, bụ́ ndị jụrụ ichegharị, ga-ata “ahụhụ mmehie ebighị ebi,” ya bụ, a ga-ebibi ha ka ha ghara ịdị ndụ ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.

Olee Ihe I Chere?

Ọ dịghị mgbe Jizọs kụziri na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ. Kama, ọ kụziri ọtụtụ mgbe na ndị nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie. (Luk 14:13, 14; Jọn 5:25-29; 11:25) Olee ihe mere Jizọs ji kwuo na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ma ọ bụrụ na o kweere na mkpụrụ obi ha anwụghị anwụ?

Jizọs akụzighị na Chineke ga-eji obi ọjọọ na-ata ndị ajọ omume ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Kama nke ahụ, o kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Gịnị mere Jizọs ga-eji kwuo na ndị na-ekweghị na ya ga-anwụ? Ọ bụrụ n’ezie na ihe o bu n’obi bụ na ha ga-adị ndụ ebighị ebi, na-ata ahụhụ n’ọkụ mmụọ, ọ́ garaghị ekwu ya?

Ozizi ahụ bụ́ na hel bụ ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ esighị na Baịbụl. Kama, ọ bụ ozizi ndị na-ekpere arụsị nke a na-akụzi ka à ga-asị na ọ bụ ozizi Ndị Kraịst. (Gụọ  igbe nke isiokwu ya bụ “Akụkọ Dị Mkpirikpi Banyere Hel,” nke dị na peeji nke 6) Chineke anaghị ata ndị mmadụ ahụhụ ebighị ebi na hel. Olee otú ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere hel ga-esi metụta otú i si ele Chineke anya?

[Igbe dị na peeji nke 6]

 AKỤKỌ DỊ MKPIRIKPI BANYERE HEL

Ọ BỤ NDỊ NA-EKPERE ARỤSỊ MALITERE IKWERE NA YA: Ndị Ijipt oge ochie kweere n’ọkụ mmụọ. Akwụkwọ bụ́ The Book Ȧm-Ṭuat, nke e dere n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ atọ gara aga, kwuru banyere ndị “a ga-atụba n’olulu ọkụ, ha ejiri isi daba na ya; . . . ha agaghị esi na ya pụta, . . . ha agaghịkwa enwe ike ịgbapụ n’ọkụ na-ere ha.” Ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Grik nke aha ya bụ Plutarch (onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga) dere banyere ndị ọ sị na ha nọ n’ala mmụọ, sị: “[Ha] na-ebe ákwá ka ha na-ata oké ahụhụ, nke na-emenye ihere ma na-afụ oké ụfụ.”

Ọ BANYERE N’OKPUKPE NDỊ JUU: Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus (onye dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga) kwuru na ndị Essene, bụ́ òtù nọ n’okpukpe ndị Juu, kweere na “mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, nakwa na ọ na-adị ndụ ruo ebighị ebi.” O kwukwara, sị: “Nke a yiri echiche ndị Grik . . . Ha chere na a na-atụba mkpụrụ obi ndị ajọ omume n’ebe na-atụ ụjọ nke gbara ọchịchịrị, bụ́ ebe ha ga na-ata ahụhụ n’akwụsịghị akwụsị.”

Ọ BANYERE N’OKPUKPE NDỊ SỊ NA HA BỤ NDỊ KRAỊST: N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, akwụkwọ adịgboroja a na-akpọ Apocalypse of Peter kwuru banyere ndị na-emebi iwu, sị: “E doweere ha ọkụ na-anaghị anyụ anyụ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ezrael, bụ́ mmụọ ozi nke ọnụma, na-akpọrọ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọkụ na-ere n’otu mpaghara ahụ́ ha na-atụba ha n’ebe gbara ọchịchịrị, bụ́ hel ụmụ mmadụ; otu mmụọ nke ọnụma ana-ata ha ahụhụ.” N’otu oge ahụkwa, Theophilus bụ́ onye Antioch nke na-ede akwụkwọ kwuru ihe Sibyl, bụ́ onye amụma nwaanyị bụ́ onye Grik, buru n’amụma banyere ahụhụ a ga-ata ndị ajọ omume, sị: “Ọkụ ga-ere unu, unu ga-anọ n’ime ọkụ na-ere kwa ụbọchị.” Okwu a so n’okwu Theophilus sịrị na ọ bụ “eziokwu uru dị na ya, nke kwesịrị ekwesị ma baara mmadụ niile uru.”

A GBAKWASỊRỊ ỤKWỤ N’OZIZI ỌKỤ MMỤỌ NA-ARỤ ARỤRỤALA N’OGE GBOO: A sịrị na Mary nke Mbụ, bụ́ eze nwaanyị chịrị England (malite n’afọ 1553 ruo 1558), bụ́ onye kpọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị ndị Protestant atọ ọkụ n’elu osisi, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na a ga-emecha ree mkpụrụ obi nke ndị jụrụ okwukwe ọkụ ruo ebighị ebi na hel, ọ dị mma ka m bọọ ụdị ọbọ ahụ Chineke ga-abọ site n’ịkpọ ha ọkụ n’ụwa.”

IHE A NA-AKỤZI N’OGE A: N’ime afọ ole na ole gara aga, okpukpe ụfọdụ agbanweela ihe ha na-akụzi banyere hel. Dị ka ihe atụ, Òtù Na-ahụ Maka Ihe Chọọchị England Na-akụzi kwuru n’afọ 1995, sị: “Hel abụghị ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ ruo ebighị ebi, kama ọ bụ ebe ikpeazụ a kwadebeere ndị na-emegide Chineke nke ga-eme ka ha ghara ịdị ndụ ọzọ, bụ́ nke a na-agaghị agbanwe agbanwe.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

GỊNỊ KA “ỌDỌ ỌKỤ” AHỤ BỤ?

Mkpughe 20:10 kwuru na a ga-atụba Ekwensu n’ime “ọdọ ọkụ,” ‘mekpaakwa ya ahụ́ ehihie na abalị ruo mgbe niile ebighị ebi.’ (nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Ọ bụrụ na a ga-ata Ekwensu ahụhụ ruo mgbe niile ebighị ebi, ihe ọ pụtara bụ na Chineke ga-edebe ya ndụ, ma Baịbụl kwuru na Jizọs ‘ga-ebibi ya.’ (Ndị Hibru 2:14, nsụgharị King James Version) Ọdọ ọkụ ahụ e ji mee ihe atụ bụ “ọnwụ nke abụọ.” (Mkpughe 21:8) Nke a abụghị ọnwụ mbụ e kwuru okwu ya na Baịbụl, ya bụ, ọnwụ mmehie Adam kpatara, bụ́ ọnwụ e nwere ike isi na ya kpọlite mmadụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:21, 22) Ebe ọ bụ na Baịbụl ekwughị na ndị nọ n’ime “ọdọ ọkụ” ahụ ga-apụta, ihe ọ pụtara bụ na “ọnwụ nke abụọ” ahụ bụ ụdị ọnwụ ọzọ, ya bụ, ọnwụ ebighị ebi.

Gịnị ka ịta ndị nọ n’ime “ọdọ ọkụ” ahụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi pụtara? Mgbe ụfọdụ, “ịta ahụhụ” nwere ike ịpụta “ijichi” mmadụ. Otu mgbe, Jizọs zutere ndị mmụọ ọjọọ, ha wee tie mkpu, sị: “Ị̀ bịara ebe a imekpa anyị ahụ́ [ya bụ, ijichi anyị n’abis] mgbe oge anyị aka-erughị?” (Matiu 8:29; Luk 8:30, 31; nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) N’ihi ya, ndị niile nọ n’ime “ọdọ ọkụ” ahụ ga-ata “ahụhụ,” ya bụ, a ga-ejichi ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ha ga-anwụ “ọnwụ nke abụọ.”