Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Ọ Bụ Naanị Ha Ka A Ga-azọpụta?

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Ọ Bụ Naanị Ha Ka A Ga-azọpụta?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Ọ Bụ Naanị Ha Ka A Ga-azọpụta?

Ndịàmà Jehova kweere na ọ bụ okpukpe ha bụ ezi okpukpe. Ọ bụrụ na ọ bụghị otú ahụ, ha ga-agbanwe ihe ndị ha kweere. Ndịàmà Jehova nwere olileanya na a ga-azọpụta ha, dị ka ọtụtụ ndị okpukpe ndị ọzọ nwere. Ma, ha kwekwaara na ọ bụghị ha ka ọ dị n’aka ikpebi onye a ga-azọpụta. Ọ bụ Chineke bụ Onyeikpe. Ọ bụ ya na-ekpebi onye a ga-azọpụta.—Aịzaya 33:22.

Okwu Chineke na-egosi na ọ bụghị naanị na ndị a ga-azọpụta ga-achọ ka a zọpụta ha, kamakwa, ha ga-erubere Onye Nzọpụta isi. Dị ka ihe atụ: Ka anyị were ya na mmadụ furu ụzọ n’ọhịa. Ọ nọ na-agagharị na-achọ ụzọ. Ọ̀ ga-anwụ n’ọhịa ahụ ka ọ̀ ga-adị ndụ? Ihe ga-ekpebi ya bụ ihe ọ ga-eme ma o nwee onye bịara inyere ya aka. Mpako nwere ike mee ka ọ jụ enyemaka nke onye bịara ịzọpụta ya. Ma, o nwekwara ike iji obi umeala nabata enyemaka ya wee dị ndụ.

N’otu aka ahụ, a ga-azọpụta ndị na-erubere Onye na-anapụta ndị mmadụ, bụ́ Jehova Chineke, isi. Nzọpụta bụ onyinye si n’aka Chineke. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka a ga-azọpụta. Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.”—Matiu 7:21.

Ndịàmà Jehova kweere na Chineke ga-azọpụta naanị ndị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs ma na-agbasochi ihe Jizọs kụziri anya. (Ọrụ 4:10-12) Tụlee ihe atọ dị mkpa Okwu Chineke kwuru, bụ́ ndị anyị ga-eme ka e wee zọpụta anyị.

(1) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ nke bụ́ inye ndụ ya ka e wee zọpụta ndị ọzọ na-egosi na ịhụnanya dị mkpa. Ndị hụrụ ndị ọzọ n’anya nwere àgwà dị mkpa ga-eme ka a zọpụta ha.

(2) Jizọs gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị.” (Jọn 17:26) Jizọs maara na aha Chineke, bụ́ Jehova, dị Nna ya mkpa. Ọ bụ ya mere o ji kpee ekpere ‘ka e doo aha Nna ya nsọ.’ (Matiu 6:9) Ido aha Chineke nsọ gụnyere ịmara aha ahụ na ime ihe na-egosi na ọ dị mkpa, dịkwa nsọ. Ndị chọrọ ka a zọpụta ha kwesịrị ịna-akpọ aha ahụ, dị ka Jizọs mere. Ha kwesịkwara ịkụziri ndị ọzọ banyere aha Chineke nakwa àgwà dị iche iche Chineke nwere. (Matiu 28:19, 20) N’ezie, ọ bụ naanị ndị na-akpọku aha Chineke ka a ga-azọpụta.—Ndị Rom 10:13.

(3) Jizọs gwara Pọntịọs Paịlet, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole taa nwere okwukwe n’Alaeze Chineke, ma ọ bụ ọchịchị Chineke, nke Jizọs bụ Eze ya. Kama inwe okwukwe n’Alaeze ahụ, ọtụtụ ndị tụkwasịrị obi n’òtù dị iche iche ndị mmadụ hiwere. Ma, ndị a ga-azọpụta na-eji obi ha dum akwado Alaeze Chineke ma na-akụziri ndị ọzọ otú ọ ga-esi zọpụta ndị nwere okwukwe.—Matiu 4:17.

Mgbe a gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ụfọdụ n’ime ihe ha kwesiri ime ka e wee zọpụta ha, ha sịrị: “Ònyezi ka a pụrụ ịzọpụta?” Jizọs zara ha, sị: “Ihe na-ekweghị omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Luk 18:18-30) Ndịàmà Jehova na-agbasi mbọ ike ka ha mee ihe ndị ha kwesịrị ime ka e wee zọpụta ha. Ha na-agbalịsikwa ike inyere ndị ọzọ aka ka e wee zọpụta ha.