Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Alụmdi na Nwunye?

Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Alụmdi na Nwunye?

Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Alụmdi na Nwunye?

ỌTỤTỤ ndị na-ekwu na “ọ bụrụ na nwoke ji nwaanyị ma ọ bụ nwaanyị nọ na di agbanwee okpukpe ya, na alụmdi na nwunye ha ga-etisa.” Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-agwa nwaanyị lụrụ di ma ọ bụ nwoke lụrụ nwunye nke chọrọ ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova na alụmdi na nwunye ha ga-aghasa. Ma, nke a ọ̀ na-eme mgbe niile?

O doro anya na mgbe di ma ọ bụ nwunye mmadụ malitere inwe mmasị n’okpukpe ọzọ ma ọ bụ malite ikwere ihe dị iche n’ihe okpukpe mbụ ya na-akụzi, o nwere ike iju nwunye ya ma ọ bụ di ya anya. O nwere ike iwute nwunye ya ma ọ bụ di ya, ma ọ bụkwanụ mee ka o chegbuwe onwe ya.

Ọ bụ ụmụ nwaanyị na-ebukarị ụzọ amata na ha kwesịrị ịgbanwe okpukpe ha. Ọ bụrụ na nwunye gị na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, olee otú nke a nwere ike isi metụta alụmdi na nwunye gị? Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị a lụ alụ nke ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, olee ihe i nwere ike ime ka nchegbu di gị na-enwe belata?

Otú Ndị Bụ́ Di Si Ele Ihe Anya

Mark, onye bi n’Australia, na nwunye ya ebiela afọ iri na abụọ mgbe nwunye ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Mark kwuru, sị: “Mụ na nwunye m bi n’udo, ọrụ anyị na-agakwa nke ọma. Anyị enweghị nsogbu ọ bụla. Ma n’oge ahụ, nwunye m kpebiri na ya na Ndịàmà Jehova ga-amụwa Baịbụl. M chere ozugbo na nke a ga-eme ka otú m si ebi ndụ gbanwee. Ná mbido, mmasị ahụ nwunye m malitere inwe na Baịbụl mere ka ahụ́ ghara iru m ala. Ma, mgbe ọ gwara m na ya ekpebiela ka e mee ya baptizim, ka ọ ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, obi jọrọ m njọ nke ukwuu.”

Mark malitere ichegbu onwe ya ma okpukpe ọhụrụ nwunye ya ọ̀ ga-eme ka alụmdi na nwunye ha tisaa. Ọ maghị ma ọ̀ bụ ya kwụsị nwunye ya ịmụ Baịbụl ma gbochie ya ka ya na Ndịàmà ghara imekọ ihe ọ bụla. Ma, kama iji iwe mee otú ahụ, Mark cheere ka oge gafetụ. Gịnị mere alụmdi na nwunye ha?

Mark kwuru, sị, “Obi dị m ụtọ ikwu na alụmdi na nwunye anyị dị mma ugbu a karịa otú ọ dị mbụ. Ọ na-aka mma kemgbe afọ iri na ise nwunye m mere baptizim wee ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.” Gịnị mere ka ihe na-agazi agazi n’alụmdi na nwunye ha? Mark sịrị: “Ana m echeta na isi ihe kpatara ya bụ na nwunye m tinyere ndụmọdụ ọma ndị dị na Baịbụl n’ọrụ. Ọ na-agbalị mgbe niile ịkwanyere m ùgwù.”

Ndụmọdụ Ụmụ Nwaanyị Ha na Di Ha Bi n’Udo Nyere

Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị a lụ alụ nke ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, olee ihe i nwere ike ime ma ọ bụ ikwu iji mee ka nchegbu ọ bụla di gị na-enwe belata? Tụlee ihe ụmụ nwaanyị ụfọdụ ndị bi n’ebe dị iche iche n’ụwa kwuru.

Sakiko, onye Japan, kwuru, sị: “M lụrụ di kemgbe afọ iri atọ na otu. Anyị mụrụ ụmụ atọ. M ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova kemgbe afọ iri abụọ na abụọ. Ọ naghị adịrị mụ na di m mfe mgbe niile ibi n’udo ebe ọ bụ na mụ na ya anaghị ekpe otu okpukpe. Ma, m na-agbalịsi ike itinye ndụmọdụ Baịbụl n’ọrụ nke sịrị ka anyị bụrụ ndị ‘na-anụ ihe ngwa ngwa, ndị na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, ndị na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) M na-agbalị iji obiọma na-emeso di m ihe, m na-emekwa ihe dị ya mma ma ọ bụrụ na ihe ahụ emegideghị ihe Baịbụl kwuru. Nke a emeela ka ihe na-agazi agazi n’alụmdi na nwunye anyị.”

Nadezhda, onye Russia, kwuru, sị: “M lụrụ di kemgbe afọ iri abụọ na asatọ, ghọọ Onyeàmà e mere baptizim kemgbe afọ iri na isii. Tupu mụ amalite ịmụ Baịbụl, echeghị m na ọ bụ di m kwesịrị ịbụ onyeisi ezinụlọ anyị. Ọ na-amasị m ime ọtụtụ mkpebi n’onwe m. Ma, m ji nwayọọ nwayọọ chọpụta na ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka udo na obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ anyị. (1 Ndị Kọrịnt 11:3) O ji nwayọọ nwayọọ dịkwuoro m mfe ido onwe m n’okpuru di m, di m ahụkwalanụ mgbanwe niile m mere.”

Marli, onye Brazil, kwuru, sị: “M mụrụ ụmụ abụọ. M lụrụ di kemgbe afọ iri abụọ na otu. M ghọrọ Onyeàmà e mere baptizim kemgbe afọ iri na isii. M mụtara na Jehova bụ́ Chineke chọrọ ka di na nwunye nọgide bụrụ otu, ọ bụghị ikewa ekewa. Ya mere, m na-agbalị ka m bụrụ ezigbo nwaanyị, na-agbalịkwa ikwu okwu na ime omume otú ga-eme ka obi dị Jehova na di m ụtọ.”

Larisa, onye Russia, kwuru, sị: “Mgbe m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ihe dị ka afọ iri na itoolu gara aga, m ghọtara na ihe kacha mkpa m kwesịrị ime bụ ịgbanwe ndụ m. Di m hụrụ otú Baịbụl si mee ka m bụrụ ezigbo nwaanyị ugbu a, meekwa ka m hụkwuo ya n’anya. Ná mbido, otú anyị ga-esi zụọ ụmụ anyị seere anyị okwu, ma, anyị edoziela ya. Di m na-ahapụ ụmụ anyị ka ha soro m na-aga ọmụmụ ihe n’ihi na ọ hụrụ na ihe a na-akụzi n’ebe ahụ bụ maka abamuru ha.”

Valquíria, onye Brazil, kwuru, sị: “M mụrụ otu nwa. M lụrụ di kemgbe afọ iri na itoolu. M ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’afọ iri na atọ gara aga. Ná mmalite, di m achọghị ka m na-aga na-ekwusa ozi ọma. Ma, m mụtara iji olu ọma na ịdị nwayọọ na-eme ka obi ruo ya ala, na-emekwa ka ọ ghọta na Baịbụl na-eme ka m na-akpakwu ezigbo àgwà. Di m ji nke nta nke nta ghọta na ọ dị mkpa ka m na-ekwusa ozi ọma. Ugbu a, ọ na-akwado m nke ọma n’ihe niile metụtara otú m si efe Chineke. Ọ bụrụ na m chọrọ ịga kụziere ndị mmadụ Baịbụl n’ime ime obodo, ọ na-eburu m n’ụgbọala ya gaa, nweekwa ndidi chere n’èzí ruo mgbe m mechara.”

Ọ Ga-abara Unu Uru

Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, atụla egwu na nke a ga-eme ka alụmdi na nwunye unu ghasaa. Baịbụl ga-abara alụmdi na nwunye gị uru dị ka ọ baara ọtụtụ di na nwunye ndị bi n’ebe niile n’ụwa uru.

Otu nwoke nke na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova kwuru eziokwu, sị: “O wutere m ná mmalite mgbe nwunye m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ma, m chere ugbu a na uru m na-erite karịrị mwute m nwere.” Nwoke ọzọ kwuru banyere nwunye ya, sị: “Okwukwe nwunye m, otú o si nọgidesie ike ná mkpebi ya, na otú o si guzosie ike n’ime ihe ziri ezi emeela ka m nwee mmasị dị ukwuu n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Anyị eritela uru nke ukwuu n’alụmdi na nwunye anyị n’ihi okpukpe ya. Anyị na-agbaghara ibe anyị, na-ewerekwa alụmdi na nwunye anyị dị ka ihe ga-adịru mgbe niile.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 13]

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Were Alụmdi na Nwunye?

Ndịàmà Jehova kweere na Baịbụl bụ Okwu si n’ike mmụọ nsọ nke Chineke. Ya mere, ha ejighị ihe o kwuru banyere alụmdi na nwunye egwuri egwu. Lee otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị na-esonụ:

Ndịàmà Jehova hà na-agba Ndịàmà ibe ha ume ka ha hapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha ma ọ bụrụ na ha abụghị Ndịàmà? Mba. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ma nwaanyị ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ ya; nwaanyị nke nwere di na-ekweghị ekwe, ma nwoke ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya.” (1 Ndị Kọrịnt 7:12, 13) Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu a.

Ndịàmà Jehova hà na-agba nwaanyị nọ na di bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova ume ka ọ ghara ime ihe di ya chọrọ ma ọ bụrụ na di ya abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova? Mba. Pita onyeozi dere, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.”—1 Pita 3:1, 2.

Ndịàmà Jehova hà na-akụzi na di bụ o kwuchaa o bie? Mba. Pọl onyeozi sịrị: “Achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrịnt 11:3) Nwaanyị bụ́ Onye Kraịst ga na-asọpụrụ di ya n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ. Ma, ikike di nwere nwere ebe ọ na-erughị. Ọ ga-aza Chineke na Kraịst ajụjụ. Ya mere, ọ bụrụ na di agwa nwunye ya ka o mee ihe ga-emebi iwu Chineke, nwaanyị bụ́ Onye Kraịst “aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

Ndịàmà Jehova hà na-akụzi na mmadụ enweghị ike ịgba nwunye ya ma ọ bụ di ya alụkwaghịm? Mba. Jizọs Kraịst sịrị: “Ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko [ya bụ, mmekọahụ rụrụ arụ], wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.” (Matiu 19:9) Ya mere, Ndịàmà Jehova kweere ihe Jizọs kwuru, nke bụ́ na mmadụ nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ịkwa iko. Ma, ha kwenyesiri ike na di na nwunye ekwesịghị ịgba alụkwaghịm n’ihi nsogbu na-erijughị afọ. Ha na-agba Ndịàmà Jehova ibe ha ume ka ha gbasoo ihe Jizọs kwuru, nke sịrị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́. . . . Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:5, 6.