Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ịmata Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Hel Ga-esi Metụta Gị?

Olee Otú Ịmata Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Hel Ga-esi Metụta Gị?

Olee Otú Ịmata Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Hel Ga-esi Metụta Gị?

NDỊ na-akụzi na hel bụ ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ na-ekwu ihe na-ezighị ezi banyere Jehova bụ́ Chineke na àgwà ya. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume. (2 Tesalọnaịka 1:6-9) Ma, iwe ezi omume Chineke na-ewe abụghị àgwà bụ́ isi o nwere.

Chineke abụghị onye obi ọjọọ ma ọ bụ onye na-anaghị agbaghara mmehie. Ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ na-atọ m ụtọ ma ọlị, bụ́ ọnwụ nke onye na-emebi iwu?” (Ezikiel 18:23, nsụgharị Bible Nso nke Igbo Union Version) Ọ bụrụ na ọnwụ onye ajọ omume anaghị atọ Chineke ụtọ, olee otú ọ ga-esi masị ya ịhụ ka ha na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi?

Àgwà bụ́ isi Chineke nwere bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) N’eziokwu, “Onyenweanyị na-egosi mmadụ niile obiọma ya, ebere nke Onyenweanyị na-erute ihe niile o kere.” (Abụ Ọma 145:9, nsụgharị Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Chineke chọkwara ka anyị jiri obi anyị niile hụ ya n’anya.—Matiu 22:35-38.

Olee Ihe Kwesịrị Ịkpali Gị Ime Uche Chineke—Ọ̀ Bụ Ụjọ Hel Ka Ọ̀ Bụ Ịhụnanya I Nwere n’Ebe Chineke Nọ?

Ịkụzi na a na-ata mkpụrụ obi ahụhụ na hel na-eme ka ọtụtụ ndị na-atụ Chineke ụjọ na-enweghị isi. Ma, onye mụtara ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke ma hụ Ya n’anya, na-atụ ya egwu kwesịrị ekwesị. Abụ Ọma 111:10 sịrị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ; ezi uche ka ndị niile na-eme ha nwere.” (nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Egwu a a na-atụ Chineke abụghị ụjọ na-enweghị isi, kama, ọ bụ egwu e kwesịrị ịtụ ya na nsọpụrụ e kwesịrị inye ya maka na ọ bụ ya kere ihe niile. Ezigbo egwu a na-eme ka anyị ghara ime ihe ga-ewute ya.

Tụlee otú eziokwu Kathleen mụtara banyere hel si metụta ndụ ya. Kathleen dị afọ iri atọ na abụọ. Ọ na-aṅụbu ọgwụ ike. Ọ na-agakarị oriri na nkwari, na-eme ihe ike, na-akwa iko, ndụ gbụkwara ya. O kwuru, sị: “M na-ele nwa m nwaanyị dị otu afọ anya, kwuo n’obi m, sị: ‘Legodị ihe m na-eme ya. M ga-aga ọkụ mmụọ n’ihi ihe ndị a m na-eme.’” Kathleen gbalịrị ka ọ kwụsị ịṅụ ọgwụ ike, ma o kweghị ya. O kwuru, sị: “M chọrọ ịbụ ezigbo mmadụ, ma ihe niile m na-eme ná ndụ enweghị nke na-enwe isi. O yiri m ka o nweghị uru ọ bara ịbụ ezigbo mmadụ.”

Ọ bụ mgbe ahụ ka Ndịàmà Jehova ziri Kathleen ozi ọma. Kathleen kwuru, sị: “Amụtara m na ọkụ mmụọ adịghị. Ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru doro anya. Ịmata na ọkụ agaghị ere m na hel mere ka ahụ́ ruo m ala nke ukwuu.” Ma, ọ mụtakwara na Chineke kwere ụmụ mmadụ nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke ihe ọjọọ na-agaghị adị. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Luk 23:43) O kwuru, sị: “Enweela m ezigbo olileanya nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs.”

Kathleen ọ̀ ga-enwe ike ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike ebe ọ bụ na ọ naghịzi atụ ụjọ ọkụ mmụọ? O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ọgwụ ike gụsiri m ike, m na-ekpe ekpere, rịọ Jehova bụ́ Chineke ka o nyere m aka. M na-echeta otú o si ele àgwà rụrụ arụ anya, achọghịkwa m ime ihe ga-ewute ya. Ọ zara m ekpere m.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Egwu Kathleen na-atụ ka ọ ghara imejọ Chineke mere ka ọ kwụsị ịṅụ ọgwụ ike.

N’eziokwu, ịmụta ịhụ Chineke n’anya na ịtụ ya egwu kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ịtụ ọkụ mmụọ ụjọ, nwere ike ịkpali anyị ime uche Chineke ka anyị wee nweta obi ụtọ na-adịru ebighị ebi. Otu ọbụ abụ dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova bụ, nke na-eje ije n’ụzọ Ya niile.”—Abụ Ọma 128:1, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

OLEE NDỊ KA A GA-AKPỌPỤTA NA HEL?

Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl sụgharịrị okwu Grik abụọ bụ́ Geʹen·na nakwa Haiʹdes otu ihe, ya bụ, “hel” ma ọ bụ “ọkụ mmụọ,” wee si otú a na-akpatara ndị mmadụ mgbagwoju anya. Na Baịbụl, okwu ahụ bụ́ Geʹen·na, pụtara ibibi mmadụ kpamkpam, nke na onye ahụ agaghị enwe olileanya mbilite n’ọnwụ. Ma, ndị nọ na Haiʹdes, ma ọ bụ Hedis, nwere olileanya mbilite n’ọnwụ.

Ya mere, mgbe Jizọs nwụrụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, Pita onyeozi mesiri ndị gere ya ntị obi ike na ‘a hapụghị Jizọs n’ime Hedis.’ (Ọrụ 2:27, 31, 32; Abụ Ọma 16:10, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Okwu a sụgharịrị “Hedis” n’amaokwu a bụ okwu Grik bụ́ Haiʹdes. Jizọs agaghị n’ọkụ mmụọ. Hedis, ma ọ bụ “hel,” bụ ili. Chineke kpọpụtara Jizọs na Hedis, e nwekwara ndị ọzọ ọ ga-akpọpụta na ya.

Baịbụl kwuru banyere mbilite n’ọnwụ, sị: “Ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha.” (Mkpughe 20:13, 14, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Ịkpọpụta ndị nọ na “hel” pụtara na Chineke ga-eme ka ndị niile ọ chọrọ ịkpọlite n’ọnwụ dị ndụ ọzọ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Anyị nwere olileanya magburu onwe ya nke ga-emezu n’ọdịnihu, ya bụ, ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ a ga-esi n’ili kpọlite! Jehova, bụ́ Chineke nke ịhụnanya ya na-adịru ebighị ebi, ga-eme nke a.