Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Hụrụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya

Onye Hụrụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya

Bịaruo Chineke Nso

Onye Hụrụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya

Ndị Hibru 10:26-31

ÒNWETỤLA mgbe mmadụ rụsara gị arụrụala ma ọ bụ mee ka ị taa ahụhụ ị na-ekwesịghị ịta, ma eleghị anya, ya adị gị ka onye ahụ enweghị mwute ọ bụla ma ọ bụkwanụ na o nweghị ahụhụ ọ tara maka ihe o mere gị? Idi ụdị ikpe na-ezighị ezi a adịghị mfe, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye o si n’aka bụ onye i chere hụrụ gị n’anya. I nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnị mere Chineke ji ekwe ka ụdị ihe a na-eme?’ * Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova bụ́ Chineke kpọrọ ụdị ikpe na-ezighị ezi ọ bụla asị. Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na-emesi anyị obi ike na Chineke ga-akwụ ndị obi tara mmiri na-eme mmehie ụgwọ ọrụ ihe ha na-eme. Ka anyị tụlee ihe Pọl onyeozi kwuru, nke o dere ná Ndị Hibru 10:26-31.

Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie.” (Amaokwu nke 26) Ụta dị ukwuu dịịrị ndị leziri anya na-eme mmehie. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Nke mbụ bụ na mmehie ha abụghị nke adịghị ike na-akpata mgbe ụfọdụ, ya bụ, ụdị nke anyị niile na-eme n’ihi ezughị okè. Ha na-eme ya ugboro ugboro. Nke abụọ bụ na ha na-amụ ụma eme mmehie. Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik kwuru na ha ‘kpachaara anya na-eme njọ.’ Ime ihe ọjọọ eriela ha ahụ́. Nke atọ bụ na mmehie ha abụghị maka na ha amaghị na ihe ha na-eme bụ ihe ọjọọ. Ha enwetala “ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ,” marakwa uche Chineke na ụzọ ya.

Olee otú Chineke si ele ndị mmehie obi tara mmiri anya bụ́ ndị na-achọghị ichegharị echegharị? Pọl sịrị: “Ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie.” Àjà Kraịst chụrụ, bụ́ onyinye Chineke nyere ụmụ mmadụ, na-ekpuchi mmehie anyị na-eme n’ihi ezughị okè. (1 Jọn 2:1, 2) Ma, ndị na-eme mmehie na-achọghị ichegharị na-egosi na ha ejighị onyinye ọma a kpọrọ ihe. N’anya Chineke, ha ‘zọkwasịrị Ọkpara Chineke ụkwụ, werekwa ọbara ya dị ka ihe na-abaghị uru.’ (Amaokwu nke 29) Omume ha na-egosi na ha na-elelị Jizọs anya, werekwa ọbara ya “dị ka ihe na-adịghị oké ọnụ,” ka à ga-asị na ya na ọbara mmadụ na-ezughị okè bụ otu. (Nsụgharị Today’s English Version) Ndị ahụ na-enweghị obi ekele agaghị erite uru n’àjà Kraịst.

Olee ihe ga-eme ndị ajọ omume? Chineke nke ikpe ziri ezi kwere nkwa, sị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ.” (Amaokwu nke 30) Ndị niile kpọchiri ntị na-eme mmehie iji megbuo ndị ọzọ kwesịrị ịkpachara anya. O nweghị onye leziri anya na-emebi iwu ezi omume Chineke nyere nke na-agaghị anata ụgwọ ọrụ ya. Ọtụtụ mgbe, ha na-eji isi ha eburu ihe ha metara ugbu a. (Ndị Galeshia 6:7) Ọ bụrụgodị na ha ejighị isi ha buru ya ugbu a, ha ga-eguzo n’ihu Chineke n’oge na-adịghị anya, mgbe ọ ga-ekpochapụ ikpe na-ezighị ezi niile n’ụwa. (Ilu 2:21, 22) Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ.”—Amaokwu nke 31.

Ịmara na Jehova bụ́ Chineke anaghị eleghara mmehie mmadụ leziri anya na-eme anya na-akasi anyị obi, na-emesikwa anyị obi ike, karịchaa, ndị e mesoro omume obi ọjọọ. Ọ bụrụ na e mesoo anyị omume ọjọọ, anyị ga-ahapụrụ ya Chineke kpamkpam, bụ́ onye kpọrọ ụdị ikpe na-ezighị ezi ọ bụla asị, ma nwee obi ike na ọ ga-abọrọ anyị ọbọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a tụlere ihe mere Chineke ji kwe ka nhụjuanya dịrị, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 106 ruo nke 114, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.