Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú “Ụgbọ Mmiri Tashish” Si Malite Ịgba na Otú O Si Kwụsị Ịgba

Otú “Ụgbọ Mmiri Tashish” Si Malite Ịgba na Otú O Si Kwụsị Ịgba

Otú “Ụgbọ Mmiri Tashish” Si Malite Ịgba na Otú O Si Kwụsị Ịgba

“Ụgbọ mmiri nke Tashish na-eburu gị ngwa ahịa . . . n’elu ogbu mmiri.” —EZIKIEL 27:25, 26, NSỤGHARỊ BAỊBỤL NSỌ NHAZI KATỌLIK

UGBỌ mmiri Tashish so mee ka Eze Sọlọmọn baa ọgaranya. Ọ bụ ndị rụrụ ụgbọ ndị ahụ nyere aka chepụta mkpụrụ akwụkwọ Grik na nke ndị Rom. Ọ bụkwa ha wuru obodo ha kpọrọ Byblos, bụ́ ebe e si nweta aha akwụkwọ ndị mmadụ kacha mara e bipụtarala.

Olee ndị rụrụ ụgbọ mmiri Tashish ma na-akwọ ha? Olee otú e si malite ịkpọ ha ụgbọ mmiri Tashish? Oleekwa otú ihe ndị mere eme bụ́ ndị metụtara ndị nwe ụgbọ ndị ahụ na ụgbọ ha si gosi na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu?

Ndị Nwe Oké Osimiri Mediterenian

Ọ bụ ndị Finishia rụrụ ụgbọ mmiri ndị ahụ a na-akpọ ụgbọ mmiri Tashish. N’ihe dị ka otu puku afọ tupu Kraịst abịa n’ụwa, ndị Finishia abụrụlarị aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri. Ala ha bụ ala dị warara dị n’ikpere oké osimiri, nke dị n’ebe bụ́ Lebanon n’oge a. Mba ndị ọzọ bikwa n’ala ahụ, ma n’ebe ugwu ya, ma n’ebe ọwụwa anyanwụ ya, ma n’ebe ndịda ya. Oké Osimiri Mediterenian dị n’ebe ọdịda anyanwụ ya. Ka ndị Finishia wee nwee akụnụba, ha na mba ndị bi n’ikpere Oké Osimiri Mediterenian malitere ịzụkọrịta ahịa.

Ndị Finishia bụ́ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ji nwayọọ nwayọọ rụọ ọtụtụ ezigbo ụgbọ mmiri ha ji ebu ngwá ahịa. Ka ha na-enwekwu uru, na-enwekwu nkà n’ịrụ ụgbọ mmiri, ha rụrụ ụgbọ mmiri ndị ka ndị nke mbụ ibu, bụ́ ndị na-agaru ebe ndị dị anya karị. Mgbe ụgbọ ahịa ndị Finishia ruru Saịprọs, Sardinia, na Balearic Islands, ha sooro ikpere mmiri nke Ebe Ugwu Africa wee gawa n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo mgbe ha ruru Spen. (Lee map dị n’isiokwu a.)

Ndị Finishia bụ́ ndị na-arụ ụgbọ mmiri rụrụ ụgbọ mmiri ndị dị mita iri atọ n’ogologo. Ọ ga-abụ na ihe mere e ji kpọọ ụgbọ mmiri ndị ahụ “ụgbọ mmiri Tashish” bụ n’ihi na ha na-esi na Finishia gbaa puku kilomita anọ wee ruo n’ebe ndịda Spen, bụ́ ebe ọ ga-abụ na ya ka Tashish dị. *

Ọ ga-abụ na ndị Finishia ebughị n’obi ịchị ụwa, naanị ihe ha chọrọ bụ ịkpa ego. Ha mere nke a site n’imepe ebe dị iche iche a na-azụ ahịa. Ma, ahịa ha na-azụ mere ka ha ghọọ ndị nwe Oké Osimiri Mediterenian.

Ha Gafere Oké Osimiri Mediterenian

Ọchịchọ Ndị Finishia chọrọ inwetakwu uru mere ka ha malite ịbanye n’Oké Osimiri Atlantic. Ụgbọ mmiri ha nọgidere na-agaru ebe ndịda ikpere mmiri dị na Spen ruo mgbe ha ruru n’ebe a na-akpọ Tartessus. N’ihe dị ka afọ 1100 tupu a mụọ Kraịst, ha wuru otu obodo ha kpọrọ Gadir. Ọdụ ụgbọ mmiri a nke a na-akpọzi Cádiz, nke dị na Spen, bụ otu n’ime nnukwu obodo ndị mbụ e nwere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe.

Ndị Finishia na-azụ ma na-ere nnu, mmanya, azụ̀ ọkpọọ, osisi sida, osisi paịn, ihe dị iche iche e ji ígwè rụọ, ákwà a kpara akpa, ezigbo ákwà linin, na ákwà e ji uhie ndị Taya a ma ama sijie. Olee ihe ndị ha na-azụta na Spen?

Ebe Ndịda Spen bụ ebe a kacha enweta ọlaọcha na ọla ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa ná mpaghara Oké Osimiri Mediterenian. Ezikiel onye amụma kwuru banyere Taya, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri kacha ọdụ ụgbọ mmiri niile ndị Finishia nwere, sị: “I rere ọtụtụ ngwá ahịa gị na Spen wee zụrụ ọlaọcha, ígwè, ọla tin, na opu.”—Ezikiel 27:12, nsụgharị Today’s English Version.

Ndị Finishia chọpụtara na ihe ndị ahụ a na-egwute n’ala hiri nne n’akụkụ osimiri Guadalquivir, bụ́ ebe na-adịghị anya na Cádiz. A ka na-egwute ihe ndị ahụ n’ebe ahụ, bụ́ ebe a na-akpọ Río Tinto ugbu a. A na-egwute ezigbo ihe e ji arụ ígwè n’ebe ahụ kemgbe ihe dị ka puku afọ atọ.

Ọ bụ naanị ndị Finishia na-azụ ọlaọcha ndị Spen n’ihi ụgbọ mmiri ha ndị na-agachi Spen anya. Nke ahụ mere ka ọlaọcha jupụta na Finishia, jupụtakwa n’Izrel bụ́ mba dị ya nso. Eze Izrel bụ́ Sọlọmọn na eze Finishia bụ́ Haịram zụkọrịtara ahịa. N’ihi ya, o nweghị ihe ọlaọcha “bụ ma ọlị” mgbe Sọlọmọn na-achị.—1 Ndị Eze 10:21. *

Ọ bụ ezie na ịzụ ahịa doro ndị Finishia anya, mgbe ụfọdụ ha na-arụsa ndị mmadụ arụrụala. E kwuru na mgbe ụfọdụ, ha na-agwa ndị mmadụ ka ha bata n’ụgbọ mmiri ha lee ngwá ahịa ha bu. Mgbe ha batara, ha na-atọrọ ha were ha mere ndị ohu. Ka oge na-aga, ha malitere ịrụsa ndị ahịa ha, bụ́ ụmụ Izrel, arụrụala. Ha rere ha ka ha gbawa ohu. Ọ bụ ya mere ndị amụma bụ́ ndị Hibru ji buo amụma na a ga-ebibi obodo ndị Finishia, bụ́ Taya. Alexander Onye Ukwu mechara mezuo amụma ndị ahụ n’afọ 332 tupu a mụọ Kraịst. (Joel 3:6; Emọs 1:9, 10) Mbibi a o bibiri Finishia mere ka Finishia ghara ịdịkwa.

Ihe Ndị Mmadụ Mụtara n’Aka Ndị Finishia

Ndị Finishia ndị na-azụ ahịa na-ede ihe ha na ndị ọzọ kwekọrịtara n’akwụkwọ, dị ka ndị niile ma nke a na-akọ n’azụmahịa na-eme. Mkpụrụ akwụkwọ ha yiri nnọọ nke ndị Hibru oge ochie. Mba ndị ọzọ chọpụtara na mkpụrụ akwụkwọ ndị Finishia dị mma. Ndị Grik gbanwetụrụ ihe na ya wee jiri ya mere mkpụrụ akwụkwọ nke ha. Ọ bụkwa na ya ka ndị Rom si nweta mkpụrụ akwụkwọ nke ha, bụ́ mkpụrụ akwụkwọ ọtụtụ asụsụ na-ede taa.

E wezụga nke ahụ, Byblos, bụ́ otu n’ime obodo dị mkpa na Finishia, bụ ebe a na-enweta papaịrọs, bụ́ ihe e ji mere akwụkwọ n’oge ochie. Ojiji e ji papaịrọs ede ihe n’oge ahụ mere ka e mechaa mepụta akwụkwọ e ji ede ihe. N’ezie, ọ bụ n’okwu bụ́ Byblos ka e si nweta okwu Igbo e ji mara akwụkwọ a kacha ekesa n’ụwa dum, ya bụ, Baịbụl. N’ezie, akụkọ banyere ndị Finishia na ụgbọ mmiri ha na-emesi anyị obi ike na Baịbụl anaghị agha ụgha.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ka oge na-aga, okwu ahụ bụ́ “ụgbọ mmiri Tashish” ghọrọ aha e ji mara otu ụdị ụgbọ mmiri, ya bụ, ụgbọ mmiri na-eru ebe ndị dị anya.

^ par. 15 “Ọtụtụ ụgbọ mmiri Tashish” nke Sọlọmọn na ndị nke Haịram na-agakọ njem ọnụ. Ọ ga-abụ na ha na-amalite njem n’Iziọn-giba zụrụ ahịa banye n’Oké Osimiri Uhie nakwa n’ebe ndị ọzọ.—1 Ndị Eze 10:22.

[Map dị na peeji nke 27]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ỤZỌ DỊ ICHE ICHE NDỊ FINISHIA SI AGA AHỊA

SPEN

TARTESSUS

Osimiri Guadalquivir

Gadir

Corsica

Balearic Islands

Sardinia

Sisili

Krit

Saịprọs

Byblos

Taya

OKÉ OSIMIRI MEDITERANIAN

Iziọn-giba

Oké Osimiri Uhie

AFRICA

[Foto dị na peeji nke 27]

Mkpụrụ ego nke e sere ụgbọ mmiri ndị Finishia n’ihe dị ka narị afọ atọ tupu a mụọ Kraịst

[Foto dị na peeji nke 27]

Ebe ndị Finishia biri, bụ́ Cádiz, Spen—mgbe e bibichara ya

[Foto E Si Nweta Foto dị na peeji nke 26]

Museo Naval, Madrid

[Ebe E Sigasị Nweta Foto ndị dị na peeji nke 27]

Mkpụrụ ego: Museo Arqueológico Municipal. Puerto de Sta. María, Cádiz; ebe ndị Finishia biri: Yacimiento Arqueológico de Doña Blanca, Pto. de Sta. María, Cádiz, España