Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọ Ma M̀ Ga-ahụta Ihe Na-adịghị Mma Mere Ka M Mụta Eziokwu

Ịchọ Ma M̀ Ga-ahụta Ihe Na-adịghị Mma Mere Ka M Mụta Eziokwu

Ịchọ Ma M̀ Ga-ahụta Ihe Na-adịghị Mma Mere Ka M Mụta Eziokwu

Dị ka R. Stuart Marshall si kọọ

Otu ụkọchukwu nọ n’òtù a na-akpọ Jesuit kwuru, sị: “Anyị anaghị atụpụrụ Ndịàmà Jehova ọnụ. Ha na-amụ Baịbụl.” Ihe a ọ zara tụrụ m n’anya, ebe ọ bụ na naanị ihe m gwara ya bụ ka o gosi nwunye m ihe ndị na-adịghị mma n’ozizi Ndịàmà Jehova. Ekpebiri m na mụ na Ndịàmà ga-amụ Baịbụl ka m nwee ike iji aka m gosi nwunye m ihe na-adịghị mma n’ozizi ha.

Ọ BỤ mgbe ahụ m dị afọ iri anọ na atọ ka m gbalịrị iji ihe ndị m mụtara banyere okpukpe na nkà m nwere n’ịrụ ụka gosi na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi bụ ụgha. Ọ bụ ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik ka m gara, malite n’ụlọ akwụkwọ praịmarị ruo na mahadum. N’agbanyeghị na n’afọ 1969 m nwetara akara ugo mmụta n’ihe ọmụmụ akụnụba, mụọkwa ihe banyere nkà ihe ọmụma na nkà mmụta okpukpe. Ma, Baịbụl esoghị n’ihe niile m mụrụ n’ụlọ akwụkwọ Katọlik.

Mgbe m gachara mahadum, m lụrụ Patricia McGinn, onye Katọlik ibe m. Anyị abụọ gakwuru akwụkwọ wee nweta ntụrụ ugo nzere na Mahadum Stanford. N’afọ 1977, anyị mụrụ nwa anyị nwoke, bụ́ Stuart, ma, mechaa biri na Sacramento, California, U.S.A. Malite n’oge ahụ ruo afọ iri abụọ na atọ sochiri ya, m rụụrụ steeti California ọrụ n’ụlọ ọrụ a na-akpọ Legislative Analyst’s Office, bụ́ ụlọ ọrụ na-eleba anya n’ego steeti ahụ na-emefuru ụlọ akwụkwọ ndị dị na steeti ahụ. M rụsiri ọrụ ike, biekwa ndụ dị mma. Ka nwa anyị na-eto, ọ masịrị m imere ya ihe nna na-emere nwa ya. Nwunye m m hụrụ n’anya nyeere m aka nke ukwuu, m nyekwaara ya aka.

Ihe A Na-eji Cent Iri Abụọ na Ise Amata

Mgbe nwa anyị dị afọ abụọ, Patricia natara Ndịàmà Jehova Baịbụl, ya na ha wee malite ịmụ ya. Mgbe afọ atọ gafere, e mere ya baptizim. M chere na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi banyere oge ezumike na ịmịnye mmadụ ọbara ezichaghị ezi. Ma, o nwekwara ihe ndị ha na-akụzi m kwetara na ha bụ eziokwu. Ọ tụrụ m n’anya na m kwupụtara echiche m n’ihu ọha n’otu ụbọchị n’afọ 1987, mgbe a kpọrọ m ka m kwuo okwu ná nzukọ anyị na ndị omeiwu na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti anyị nwere. Ha kpọrọ m ka m kwuo banyere otu n’ime aro m tụụrụ ndị omeiwu steeti anyị.

Mahadum California chọrọ ka e nye ha ego ka ha na steeti ndị ọzọ maa aka ka ha mara ma gọọmenti America ọ̀ ga-enye ha ọrụ ga-ewe ijeri dọla isii. A chọrọ ịrụ otu ọkpọka ngwá ọrụ buru oké ibu nke ndị sayensị ga-eji na-eme nnyocha. M tụrụ aro ka a ghara inye ha ego ahụ ma kwuo na ka oge na-aga, steeti anyị agaghị na-enweta ezigbo ego na ya. Mahadum ahụ kpọtara ndị ikom abụọ, bụ́ ndị nwetarala onyinye Nobel n’ihe ọmụmụ physics ka ha bịa kwuo okwu n’ihu nzukọ ahụ. Onye nke ọ bụla n’ime ha kwuru otú ihe ahụ a ga-ewu ga-esi nyere ndị na-amụ banyere sayensị aka ịmụta ihe. Otu n’ime ha kwuru na o nwere ike ime ka a mata otú eluigwe na ala si malite. Onye nke ọzọ ekwuo na o nwere ike ime ka a ghọta otú ndụ si malite n’ụwa anyị a.

Onyeisi oche ndị omeiwu ahụ chere ihu n’ebe m nọ.

O wee jụọ m, sị: “Ì chere na ijeri dọla isii karịrị akarị ma ọ bụrụ na anyị akwụọ ya iji mata ihe ndị a?”

M zara ya, sị: “Ekwetara m na ịmata ihe ndị a dị mkpa. Ma, Ndịàmà Jehova na-abịa n’ụlọ m n’ụtụtụ Saturday ọ bụla, na-enye m magazin na-akọwa ihe ndị ahụ, bụ́ nke a na-enye cent iri abụọ na ise iji nweta ha. Echeghị m na ihe anyị ga-eji ijeri dọla isii mụta ma a rụọ ngwá ọrụ ahụ ga-akarị ihe anyị ga-eji cent iri abụọ na ise mụta na magazin ahụ.”

Onye ọ bụla nọ n’ime ụlọ ahụ dapụrụ n’ọchị, tinyere ndị ikom ahụ nwetara onyinye Nobel. N’agbanyeghị na ndị omeiwu ahụ nyere ikike ka e nye ha ego ahụ ka ha chụọ nta ọrụ ahụ, o nweghị onye gbaghara ihe m kwuru.

Ka oge na-aga, achọpụtara m na ọ dị mkpa ka m lebara ihe malitere ime n’ezinụlọ anyị anya. O wutere m na kemgbe afọ isii mụ na Patricia kwuwere banyere Baịbụl na Ndịàmà Jehova, ọ ka nwere mmasị iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma. Ihe ọ pụtara bụ na oge ọ ga na-arụ ọrụ na mahadum ahụ ga-ebelata. Aghọtaghị m otú onye nwere ọgụgụ isi ga-esi chọọ ime ụdị ihe ahụ na-enweghị isi, ihe niile m gwara ya na-adị ka mmiri a wụrụ n’okwute. O kweghị agbanwe obi ya.

M gbalịrị ka onye maara Baịbụl karịa mụ nyere m aka, ya bụ, onye m chere ọ ga-adịrị mfe igosi nwunye m ihe dị iche n’ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi na ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na onye ahụ egosi ya otu ihe na-adịghị mma n’ihe ha na-akụzi, ọ ga-eme ka o nyowezie ihe ndị ọzọ ha na-akụzi enyo. Nke a bụ naanị ihe ọ ga-abụ m mee mụ enweta nwunye m. Mụ na ụkọchukwu ahụ, bụ́ ụkọchukwu chọọchị mụ na Patricia na-agabu, kwurịtara okwu. Ihe e dere ná mmalite isiokwu a bụ otú okwu mụ na ya kwurịtara si bie. Mgbe ụkọchukwu ahụ jụrụ ịgwa nwunye m okwu, m matara na ọ bụ mụ ga-achọpụta ihe ndị ahụ na-adịghị mma ma gosi ha Patricia, n’agbanyeghị na ọ ga-ewetụ m oge.

M Malitere Ịchọ Ma M̀ Ga-ahụta Ihe Na-adịghị Mma

Mgbe mụ na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, ihe kacha masị m bụ amụma ndị dị na Baịbụl. M gụrụ n’amụma Aịzaya banyere otú Babịlọn ga-esi daa, bụ́ nke e dere n’ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị afọ abụọ tupu ya emezuo. Amụma ahụ kwuru na ọ bụ Saịrọs ga-emeri Babịlọn, kwuokwa otú ọ ga-esi mee ka Osimiri Yufretis sọga n’ebe ọzọ ka o wee merie Babịlọn. (Aịzaya 44:27–45:4) Ọtụtụ afọ gara aga, amụrụ m banyere otú Babịlọn si daa n’ụlọ akwụkwọ mgbe a na-akụziri anyị otú e si alụ agha. Amụtakwara m na Daniel onye amụma buru amụma banyere eze Gris bụ́ dike n’ihe karịrị narị afọ abụọ tupu amụma ahụ emezuo. Amụma ahụ kwuru na mgbe eze ahụ nwụrụ, a ga-ekewa alaeze ya siri ike ụzọ anọ bụ́ ndị na-agaghị esiru ike ka nke ya. (Daniel 8:21, 22) M chetara na a kụziiri anyị ihe a mere eme banyere Alexander Onye Ukwu mgbe anyị na-amụ ihe ndị mere n’oge ochie n’ụlọ akwụkwọ. M mere nnyocha n’akwụkwọ ndị ọzọ wee chọpụta n’onwe m na e dere akwụkwọ ndị ahụ dị na Baịbụl n’ezie tupu ihe e dere na ha emezuo.

Ka mụ na Ndịàmà na-amụ ihe, ọ nọ na-edokwu m anya na Baịbụl bụ Okwu Chineke, bụ́ ihe m na-amụtaghị n’afọ niile m mụrụ banyere nkà mmụta okpukpe ndị Katọlik. Olee ihe m ga-eji ihe ndị a m na-amụta eme? M kpebiri inyefe Jehova ndụ m na ịghọ otu n’ime Ndịàmà ya. (Aịzaya 43:10) E mere m baptizim n’afọ 1991, naanị afọ abụọ mụ na ụkọchukwu ahụ kwurịtachara okwu. E mere nwa anyị nwoke baptizim n’afọ sochiri ya.

Okpukpe ọhụrụ anyị mere ka anyị gbanwee ihe ndị anyị chọrọ ime n’ezinụlọ anyị. Otu n’ime ihe mbụ m mere mgbe e mechara m baptizim bụ ime ndokwa ka nwunye m kwụsị ọrụ nkụzi ọ na-arụ na mahadum n’ime afọ ise ọzọ, bụ́ mgbe ọ ga-eru afọ iri ise. Ọ chọrọ ịghọ onye na-ekwusa ozi ọma mgbe niile. Nke a pụtara na ọ ga-eji otu puku awa kwusaa ozi ọma n’otu afọ, ma ọ bụ ihe dị ka awa iri asatọ na atọ kwa ọnwa n’oge ahụ, iji na-akụziri ndị ọzọ eziokwu dị na Baịbụl. N’afọ 1994, o selatara aka n’ọrụ ya wee malite ikwusa ozi ọma mgbe niile. Ihe ndị mbụ m mere bụ imekwu nke ọma n’ije ozi ọma, inye aka n’ihe ọ bụla m nwere ike n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke m nọ na ya, na idekọ ego niile e mefuru n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova na-ewu gburugburu ebe anyị bi.

N’oge ụfọdụ, m nwetara ohere n’ụlọ ọrụ anyị wee gwa ndị mmadụ banyere Baịbụl. Onye ọhụrụ nke malitere ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ anyị bụ otu Onyeàmà nke okwukwe ya na-esikwaghị ike. Obi abụọ o nwere banyere Baịbụl mere ka okwukwe ya jụọ oyi. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu na m nyeere ya aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma. Ọ laghachiri na steeti a mụrụ ya wee malite ikwusa ozi ọma mgbe niile.

N’afọ 1995, m gara nzukọ anyị na ndị omeiwu na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti anyị nwere, iji nụrụ banyere otu nnyocha gọọmenti America na-eme. Onyeisi oche ndị omeiwu ahụ jụrụ onye nnọchianya gọọmenti America banyere ọkpọka ngwá ọrụ ahụ a chọrọ ịrụ. Onye nnọchianya ahụ kwuru na ọ bụ steeti Texas ka e nyere ọrụ ahụ, ma, ha arụchaghị ọrụ ahụ n’ihi ụzọ ihe atọ. Nke mbụ bụ na ego a ga-eji rụọ ya si n’ijeri dọla isii ruo ijeri dọla itoolu tupu a malite ịrụ ya. Nke abụọ abụrụ na gọọmenti America ji ego mee ihe ọzọ, nke ka nke, agha Iraq a lụrụ n’afọ 1991. Nke atọ abụrụ na ha chọpụtara na ha nwere ike ịmata azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ n’aka Ndịàmà Jehova, n’ọnụ ego cent iri abụọ na ise. O yiri ka kemgbe ahụ m kwuru ihe ahụ, ọtụtụ ndị ekwuola ya, e kwuokwa ya ugbu a.

Mgbe mmadụ niile nọ na-achị ọchị, ụfọdụ n’ime ndị omeiwu ahụ lere m anya. M kwuru okwu iji mee ka ndị niile nọ ná nnọkọ a mara otú ihe dị ugbu a, sị, “I nwere ike ịmata ihe ndị ahụ ugbu a n’akwụghị ụgwọ, ma ọ bụrụhaala na ị gụọ akwụkwọ ahụ.”

Ezigbo Ndụ nke Na-enye Obi Ụtọ

Ozugbo nwunye m lara ezumike nká, anyị dokwara ihe m ga-eme n’afọ ise ga-esochi. M ji akọ jụọ ajụjụ n’ụlọ ọrụ ndị ọzọ banyere ịrụ ọrụ nwa oge, ebe ọ bụ na m chọziri itinyekwu oge n’ịkụziri ndị ọzọ eziokwu dị na Baịbụl. Ọ tụrụ m n’anya na ụlọ ọrụ anyị kwetara ka m rụwa ọrụ nwa oge. N’ihi ya, n’afọ 1998, m malitekwara ikwusa ozi ọma mgbe niile.

Otu ụtụtụ, ka mụ na nwunye m nọ na-akwado ịga kwusaa ozi ọma, e si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, United States, kpọọ m na fon. Onye ahụ kpọrọ m jụrụ m ma m̀ ga-enwe mmasị ịrụ ọrụ na Brooklyn, n’ihi na n’oge ahụ, a nọ na-achọ ndị ga-enye aka rụọ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. M ji obi m niile zaa ya ee. Ọ bụ otú ahụ ka mụ na nwunye m si rụọ ọrụ ọnwa iri na asatọ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. M mechara laa ezumike nká n’ọrụ m na-arụrụ steeti California tupu oge ezumike nká m eruo, ka m wee nwee ike ịrụcha ọrụ ahụ. Mgbe nke ahụ gachara, anyị so wuo Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova na Fairfield, California. Anyị rere ụlọ anyị dị na Sacramento ma kwaga n’obere ụlọ dị na Palo Alto. Ezumike nká m lara n’oge mere ka anyị nwetakwuo ngọzi. Kemgbe ahụ, anyị arụọla ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nigeria, South Africa, Canada, Britain, na Germany.

Ọ na-enye mụ na nwunye m ọṅụ inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl, otú ahụ o nyere Ndịàmà ahụ nyeere anyị aka ọṅụ. N’eziokwu, m chere na ihe Jehova kụziiri m baara m uru nke ukwuu karịa ihe a kụziiri m n’ụlọ akwụkwọ dị elu. N’ụzọ niile, ọ karịrị agụmakwụkwọ ọ bụla a na-agụ n’ụwa. Jehova azụọla Ndịàmà ya ka ha na-akụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl otú ọ ga-eru ha n’obi. Ọ bụ nke a mere m ji nọgide na-amụ ihe. Mụ na nwunye m nwere obi ekele maka ndụ anyị dị ugbu a na ohere anyị nwere iji ihe ndị anyị mụtara na-ejere Ọkaakaa eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke, ozi.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Mgbe mụ na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, ihe kacha masị m bụ amụma ndị dị na Baịbụl

[Foto dị na peeji nke 27]

Mụ na Patricia, n’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

[Foto dị na peeji nke 29]

Anyị na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl