Ọrịa Ndị A Sị na E Ji Ọrụ Ebube Agwọ Taa Ọ̀ Bụ Ike Chineke Ka E Ji Agwọ Ha?
Ọrịa Ndị A Sị na E Ji Ọrụ Ebube Agwọ Taa Ọ̀ Bụ Ike Chineke Ka E Ji Agwọ Ha?
N’ALA ụfọdụ, a na-ahụkarị ndị na-aga ‘n’ala nsọ’ dị iche iche, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-asị na a gwọrọ ha ọrịa ndị a sị na ha enweghị ngwọta. N’ala ndị ọzọ, ndị dibịa na-asị na ha ji ike pụrụ iche ha nwere agwọ ndị mmadụ ọrịa. N’ebe ndị ọzọkwa, ndị ụka na-enwe mgbakọ dị iche iche, bụ́ ebe ndị ọrịa na-esi n’ígwè e ji akwagharị ha malie ma ọ bụ tụsa osisi ha ji aga ije wee sị na a gwọọla ha.
Ọtụtụ n’ime ndị na-agwọ ọrịa ndị ahụ nọ n’okpukpe dị iche iche. Ha na-ebo ibe ha ebubo na okpukpe ha bụ okpukpe ụgha, ma ọ bụkwanụ na ha na-ekpere arụsị. Ajụjụ anyị nwere ike ịjụ bụ, Chineke ọ̀ na-esi n’aka ọtụtụ okpukpe ndị a na-anaghị enwekarị otu olu arụ ọrụ ebube? Ajụjụ a dị mkpa n’ihi na Baịbụl sịrị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.” (1 Ndị Kọrịnt 14:33) Ya mere, ọrịa ndị ahụ a sị na e ji ọrụ ebube agwọ, ọ̀ bụ ike Chineke ka e ji agwọ ha n’ezie? Ụfọdụ na-asị na ọ bụ ike Jizọs nyere ha ka ha ji agwọ ọrịa. Ka anyị leba anya n’otú Jizọs si gwọọ ndị mmadụ ọrịa.
Otú Jizọs Si Gwọọ Ndị Mmadụ
Otú Jizọs si gwọọ ndị ọrịa dị nnọọ iche n’otú ndị sị na ha ji ọrụ ebube agwọ ọrịa taa si agwọ nke ha. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwọrọ ndị niile gakwuuru ya ka ọ gwọọ ha. Ọ gwọghị ụfọdụ n’ime ndị ọrịa ma gwa ndị nke ọzọ ka ha lawa n’agwọghị ha. Jizọs na-agwọ ndị mmadụ, ọrịa ha alaa kpamkpam. Ọtụtụ mgbe, ọrịa ha na-ala ozugbo ahụ. Baịbụl sịrị: “Ìgwè mmadụ ahụ dum nọkwa na-achọ ibitụ ya aka, n’ihi na ike si n’ahụ́ ya na-apụ wee na-agwọ ha niile.”—Luk 6:19.
Jizọs adịghị ka ndị sị na ha ji ọrụ ebube agwọ ọrịa taa, bụ́ ndị na-asị na ihe mere na ha agwọghị onye ọrịa bụ na o nweghị okwukwe. Jizọs gwọrọ ọbụna ụfọdụ ndị na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ. Dị ka ihe atụ, o nwere otu ụbọchị Jizọs gakwuuru otu onye ìsì gwọọ ya, ọ bụ ezie na onye ìsì ahụ arịọghị ya arịọ ka ọ gwọọ ya. E mechaa, Jizọs jụrụ ya, sị: “Ì nwere okwukwe n’ebe Nwa nke mmadụ nọ?” Nwoke ahụ zara ya, sị: “Nna anyị ukwu, ònyekwanụ ka ọ bụ ka m wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ?” Jizọs asị ya: “Onye a gị na ya na-ekwu okwu bụ ya.”—Jọn 9:1-7, 35-38.
I nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ na ọ bụghị okwukwe ndị Jizọs gwọrọ ọrịa mere o ji gwọọ ha, gịnị mere Jizọs ji agwakarị ndị ọ gwọrọ, sị: “Okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma”?’ (Luk 8:48; 17:19; 18:42) Jizọs na-ekwu nke ahụ iji gosi na ya na-agwọ ndị okwukwe ha kpaliri ha ịbịakwute ya, ma, ọ gwọghị ndị jụrụ ịbịakwute ya. Ọ bụghị okwukwe ndị a gwọrọ ọrịa gwọrọ ha; ọ bụ ike Chineke gwọrọ ha. Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: ‘Chineke ji mmụọ nsọ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ; n’ihi na Chineke nọnyeere ya.’—Ọrụ 10:38.
O yiri ka ọ̀ bụ ego ka ndị sị na ha ji ọrụ ebube agwọ ọrịa taa na-achụ. A ma ha ama dị ka ndị ma otú e si anapụta ndị mmadụ ego. E kwuru na otu onye sị na ya ji ọrụ ebube agwọ ọrịa nwetara nde dọla iri asatọ na itoolu n’otu afọ n’aka ndị na-ekiri ihe ọ na-eme na televishọn n’ụwa dum. Ndị ụka na-enwetakwa ego n’aka ndị na-aga ka a gwọọ ha ọrịa ‘n’ala nsọ’ dị iche iche. Ma, Jizọs anaghị ndị ọ gwọrọ ọrịa ego ọ bụla. O nwedịrị mgbe o nyere ha nri. (Matiu 15:30-38) Mgbe Jizọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa zie ndị mmadụ ozi ọma, ọ gwara ha, sị: “Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọlitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ndị ekpenta dị ọcha, chụpụnụ ndị mmụọ ọjọọ. Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Gịnị mere otú ndị sị na ha na-agwọ ọrịa taa si agwọ ya ji dị iche n’otú Jizọs si gwọọ ọrịa?
Olee Ebe Ike A Sị na E Ji Agwọ Ọrịa Si?
Kemgbe ọtụtụ afọ, ụfọdụ ndị ọkachamara n’ịgwọ ọrịa elebawo anya n’ọgwụgwọ ahụ a sị na ndị okpukpe ji ọrụ ebube agwọ ndị mmadụ. Gịnị ka ha chọpụtarala? Akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily Telegraph nke London, dere ihe otu dọkịta nke nọ n’England kwuru, bụ́ onye ji afọ iri abụọ nyochaa ụdị ọgwụgwọ ahụ a sị na e ji ọrụ ebube agwọ. Dọkịta ahụ kwuru, sị: “Ọgwụgwọ ahụ a sị na ndị ji ọrụ ebube agwọ ọrịa na-agwọ ndị mmadụ adabatụdịghị n’otú e si agwọ ọrịa.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị kwenyesiri ike na ikike ndị senti ma ọ bụ ‘ala nsọ’ ha gara gwọrọ ha, ma ọ bụkwanụ na ndị okpukpe sị na ha na-agwọ ọrịa gwọrọ ha. Ọ̀ ga-abụ na a ghọrọ ha aghụghọ?
Mgbe Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, o kwuru na ndị okpukpe ihu abụọ ga-asị ya: ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị arụghị ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?’ Ma, ọ ga-asị ha: “Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.” (Matiu 7:22, 23) Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị banyere ebe ike ndị ahụ ji arụ ọrụ si, sị: “Ọnụnọ nke onye ahụ na-emebi iwu bụ dị ka ọrụ Setan si dị, nke ọ na-arụ site n’ịrụ ọrụ niile dị ike na ime ihe ịrịba ama ụgha na ịrụ ọrụ ebube ụgha, sitekwa n’iji ụdị ajọ omume niile na-eduhie ndị na-ala n’iyi.”—2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10.
Ihe ọzọ bụ na ọrịa ọ bụla a si na e si n’aka ndị senti ma ọ bụ e ji arụsị ma ọ bụ ihe oyiyi gwọọ esighị n’aka Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke nyere iwu doro anya, sị: “Gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ,” sịkwa, “Kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.” (1 Ndị Kọrịnt 10:14; 1 Jọn 5:21) Ọrịa ndị ahụ a sị na e ji ọrụ ebube agwọ bụ otu n’ime aghụghọ Ekwensu ji eme ka ndị mmadụ ghara ife Chineke. Baịbụl sịrị: “Setan n’onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.”—2 Ndị Kọrịnt 11:14.
Ihe Mere Jizọs na Ndịozi Ya Ji Gwọọ Ndị Mmadụ Ọrịa
Ezigbo ọrụ ebube Jizọs na ndịozi ya rụrụ mgbe ha gwọrọ ndị mmadụ ọrịa, bụ́ ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, mere ka a mara nke ọma na Jizọs na ndịozi ya na-ejere Chineke ozi. (Jọn 3:2; Ndị Hibru 2:3, 4) Ọrịa ndị Jizọs ji ọrụ ebube gwọọ kwadokwara ozi ọma ọ nọ na-ezi. Baịbụl sịrị: “O wee gazuo Galili dum, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ, na-agwọkwa ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere.” (Matiu 4:23) Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ, ma ọrịa ọ gwọrọ ndị mmadụ, ma nri o nyere ìgwè mmadụ, ma oké ifufe ọ kwụsịrị ma mkpọlite ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ, na-egosi ihe ndị ọ ga-emere ndị na-erube isi, bụ́ ndị ga-aba n’Alaeze ya. N’ezie, nke a bụ ozi ọma!
Ọrụ ebube ahụ Jizọs na ndịozi ya rụrụ, ma ọ bụ onyinye mmụọ nsọ ha nwere kwụsịrị mgbe ha nwụrụ. Mgbe ndị ha nyere ikike ịrụ ọrụ ebube nwụrụ, ikike ahụ kwụsịkwara. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onyinye ibu amụma, a ga-ewepụ ha; ọ bụrụ na e nwere ịsụ asụsụ dị iche iche [ya bụ, asụsụ e ji ọrụ ebube asụ], ha ga-akwụsị; ọ bụrụ na e nwere ihe ọmụma [ya bụ, nke Chineke kpughere], a ga-ewepụ ya.” (1 Ndị Kọrịnt 13:8) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? ‘E wepụrụ’ ọrụ ebube ndị ahụ, tinyere ịgwọ ọrịa, n’ihi na ha adịkwaghị mkpa, ebe ọ bụ na ha arụzuola ihe mere e ji malite ịrụ ha, ya bụ, ime ka a mara na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa nakwa na ọ bụ Chineke nwe ọgbakọ Ndị Kraịst.
N’agbanyeghị nke ahụ, ọrịa ndị Jizọs ji ọrụ ebube gwọọ ndị mmadụ nwere ihe dị mkpa ha na-akụziri anyị taa. Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’ihe Jizọs kụziri banyere Alaeze Chineke ma nwee okwukwe na ya, anyị ga-atụ anya ịhụ mgbe amụma e si n’ike mmụọ nsọ buo ga-emezu, ma n’ahụ́ anyị ma ná mmekọrịta anyị na Chineke. Amụma ahụ sịrị: “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24; 35:5, 6; Mkpughe 21:4.