Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụbọchị Ọ Kwụsịrị Ịgba Karat

Ụbọchị Ọ Kwụsịrị Ịgba Karat

Akwụkwọ Ozi Si Ghana

Ụbọchị Ọ Kwụsịrị Ịgba Karat

Ọ DỊGHỊ otú m chere na ọ ga-adị. O yi uwe wụdara awụda na-acha ezigbo ọcha, keekwa ájị̀ ojii dị sentimita ise n’obosara n’úkwù ya na-ebughị ibu. O guzo ka onye chọrọ ịlụ ọgụ, gbasaa ụkwụ ya agbasaa ma zọgidesie ya ike n’ala, aka ya kwụkwa chịm. Ọ gbachiri ihu ya agbachi, ya ana-atụ ụjọ. O mechilatakwara anya legide ya otu ebe.

Na mberede, o tiri mkpu wee malie. Ihe m nụziri bụ ụda ụkwụ ọ gbara. Ya efegharịa aka. Ihe ọzọ m nụrụ bụ Zaam! O ji aka ya gbujie osisi ụzọ abụọ, ha adaa n’ala. Ọ maliri ọzọ, kpọgharịa n’elu, ụkwụ ya na aka ya agaa otu ebe ka ò nwere onye ọ chọrọ ịgba ya. Ọ̀ ga-abụ nwoke a bụ onye kwuru na ya chọrọ ịmụ Baịbụl?

M gakwuuru ya, matịa aka m ka mụ na ya kwee n’aka. “Ọ̀ kwa gị bụ Kojo? Anụrụ m na ị chọrọ ịmụ Baịbụl.” Ya ekwee m n’aka, chịa ọchị, mesapụ ihu ya. Anya ya ahụ na-atụ ụjọ kwụsịrị ịtụ ụjọ. Kama nke ahụ, anya ya gosiri mmasị o nwere n’ọbịbịa m bịara. Ọ zara m, sị: “Ee, achọsiri m ya ike. Olee mgbe anyị ga-amalite?”

Mụ na ya ji Baịbụl anyị na akwụkwọ e ji amụ Baịbụl gaa nọrọ ọdụ n’obere veranda dị n’ụlọ ya. Ebe a anyị nọ jụrụ oyi, dị jụụ. Ọ bụkwa naanị anyị nọ. Anyị dị atọ: Kojo, mụnwa na obere enwe ya. Obere enwe ahụ dị naanị sentimita iri atọ na ise n’ogologo, nwee ajị na-acha ọbara ọbara n’elu isi ya, nweekwa ajị ọcha n’agbà ya, bụ́ nke mere ka ọ na-atọ ọchị ma jọọ njọ n’anya. Ọ dị garagara, na-egwukarị egwuregwu, na-achọkwa ịmata ihe ọ bụla ọ hụrụ. N’ihi ya, ọ nọ na-agagharị otú masịrị ya, ma n’elu akwụkwọ anyị, na-anara anyị mkpịsị akwụkwọ anyị ji, na-amanye obere aka ya n’akpa uwe elu anyị, na-achọ ka anyị nye ya ihe. Kojo leghaara ihe ndị ahụ ọ na-eme anya ma na-ege ntị n’ihe anyị na-amụ, dị nnọọ ka nne na-eleghara mkpọtụ na mgbagharị ụmụaka ya na-agbagharị anya. Ọtụtụ ajụjụ ọ jụrụ m mere ka m mara na ọ na-eche echiche nke ọma, nakwa na ọ chọrọ nnọọ ịmụta ihe. Ọ ga-abụ na ịgba karat emeela ka ọ na-akpachapụ anya nke ọma, n’ihi na o nweghị ihe ọ na-ekweta, ọ gwụla ma e mere ka o doo ya anya ma gosi ya ebe ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ.

Ọmụmụ ihe anyị nọ na-aga nke ọma. Ma, ka oge na-aga, m chọpụtara na o nwere ihe ya na ya na-alụ, ya bụ, ihe na-echegbu ya nke ukwuu. Ọ gwara m, sị: “Naanị ihe na-amasị m nke ukwuu ná ndụ m bụ ịgba karat.” M chọpụtara na ịlụ ọgụ na-atọ ya ụtọ nke ukwuu, bụ́ nke mere o ji mụọ ịgba karat nke ọma, ya edoo ya anya. N’afọ iri abụọ na isii a ọ dị, ọ bụghị naanị na ịgba karat na-amasị ya nke ukwuu, kama, o doro ya anya nke na o nwetala ọkwá kachanụ n’ịgba karat, bụ́ nke naanị mmadụ ole na ole nwere ike inweta.

Amaghị m ihe Kojo ga-eme. M maara na ọ ghọtala na ịgba karat, ya bụ, iji ụkwụ na aka na-emerụ ndị ọzọ ahụ́, adabaghị n’àgwà ndị dị ka ọmịiko, ịdị nro, na ichebara ndị ọzọ echiche, bụ́ àgwà ndị e ji ama na ezi Ndị Kraịst hụrụ onwe ha n’anya. Ma, m maara na eziokwu dị na Baịbụl agbanweela obi ndị ikom obi ha siri ike. Ọ bụrụ na Kojo nwere ezigbo obi, Okwu Chineke ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ọ dị nro. M ga-enwe ndidi.

N’otu ehihie anwụ na-achasi ike, mgbe ọ fọrọ obere ka anyị mụchaa ihe, anyị gụrụ otu amaokwu dị na Baịbụl nke metụrụ Kojo n’ahụ́ ka à ga-asị na o nwere onye gbara ya ụkwụ. Ọ gụrụ amaokwu ahụ nke sịrị: “Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) O ji olu dị ala kwughachi ihe ahụ ọ gụrụ, sị: “Onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya.” Ahụ́ kụnwụrụ ya. Ya elee mụ anya ná mkpụrụ anya wee jiri nwayọọ mụmụọ ọnụ ọchị. Ọ sịrị: “Ekpebiela m.”

Ugbu a, mụ na Kojo na-arụ ọrụ kacha amasị anyị. Anyị wepụtara onwe anyị na-akụziri ndị ọzọ chọrọ ige ntị n’ihe Baịbụl kwuru ihe. N’ụtụtụ taa, anyị na-aga ileta nwa okorobịa aha ya bụ Luke.

Mgbe anyị na-aga n’ụlọ ya, anyị si n’ụzọ kpara akpa ndị mmadụ juru, bụ́ ebe ahịa dị. N’okporo ụzọ ahụ, e nwere ọtụtụ ndị na-ere ahịa, ndị kpọsara ngwá ahịa ha n’elu tebụl. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kpọsara bụ: ose chara acha na ndị nke na-achaghị acha, nkata tomato, ọkwụrụ, nakwa redio, nche anwụ, ncha, wig, arịa ndị na-adị n’usekwu, akpụkpọ ụkwụ ọkịrịka na uwe ọkịrịka. Ụmụ agbọghọ na-eburu nnukwu efere nri na-esi ísì ọma n’isi na-agagharị na-ere. Ha na-eji nlezianya agafe n’ebe ahụ ndị mmadụ juru iji dọta ndị bịara ịzụ ahịa agụụ na-agụ ka ha zụrụ ofe na-atọ ụtọ na stuu, bụ́ ndị e ji azụ̀ a mịrị amị, nshịkọ na eju, sie. Nkịta, ewu, na ọkụkọ ndị na-ebesi ubé ike nọkwa na-agagharị. Redio, opì ụgbọala, na ndị mmadụ nọkwa na-eme ụzụ.

Anyị so ụzọ ahụ ruru unyí gafee ebe ahụ ụzụ dị ma rute n’otu ụlọ ochie nke e dere ihe a na-anaghị ahụkwa nke ọma. Ihe e dere na ya bụ: “Ụlọ Ntụrụndụ nke Ndị Na-aga Ebe Dị Anya.” Luke, bụ́ nwa okorobịa dịtụ gịrịgịrị nke dị afọ iri abụọ na ụma, guzo n’ọnụ ụzọ ya gwa anyị ka anyị bata n’ime ụlọ ya ka anwụ ghara ịcha anyị. Ihe juru n’ụlọ ya bụ akpa na igbe ndị e tinyejuru mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ, ahịhịa ndị e ji eriri kekọta, na ụgbụgbọ osisi. Ọ bụ nwanne mama Luke, bụ́ dibịa mgbọrọgwụ, nwe ihe a niile. Ọ bụ nna nna ya hà kụziiri ya ọgwụ dị iche iche ọ na-agwakọta, sụọ ha asụọ ma sie ha. Ha sịrị na ọ na-agwọ ọrịa niile. Luke nọ na-eche anyị eche. Ọ zakọọla ihe ndị ahụ ọnụ, doziekwa oche atọ. Anyị nọ ibe anyị nso, anyị wee malite ịmụ Baịbụl.

Ọ bụ Kojo na-akụziri Luke Baịbụl. M gbachiri nkịtị ma na-ege ntị ka ha nọ na-atụle ihe Baịbụl kwuru mere e ji nwee oké nhụjuanya n’ụwa. Mgbe Kojo chọrọ inyere Luke aka ka ọ sata otu amaokwu dị na Baịbụl, m hụrụ otú o si jiri aka ya siri ike jiri nwayọọ sapee ebe ahụ n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ahụ m chetara na n’oge na-adịbeghị anya, ọ na-eji aka ahụ alụ ọgụ. Ike nke Okwu Chineke na-agbanwe àgwà ndị na-adịghị mma riri mmadụ ahụ́, bụ́ ndị juru n’ụwa ọjọọ a, ma mee ka onye ahụ nwee àgwà ndị dị mma, dị ka ọmịiko na ịhụnanya. Onye mere mgbanwe a kpara ike dị ukwuu.

Mgbe anyị na-ala, anyị gakwuuru otu nwoke nọ ọdụ n’okpuru osisi mango ka anyị zie ya ozi ọma. O gere ntị nke ọma mgbe Kojo sapere Baịbụl na-agụrụ ya otu amaokwu. Mgbe nwoke ahụ matara na anyị bụ Ndịàmà Jehova, ọ maliri elu, tie mkpu, sị: “Enweghị m mmasị n’ebe unu nọ!” Iwe juru Kojo obi ozugbo. Ma, o medatara obi, jiri nwayọọ hapụ nwoke ahụ. Mụ na ya apụwa.

Mgbe anyị nọ na-aga n’ụzọ, Kojo bịakwutere m nso takwunyere m, sị: “Iwe juru m obi mgbe ahụ nwoke ahụ kwuru ihe ahụ. Ị̀ ma ihe m gaara eme ya?” M mụmụrụ ọnụ ọchị sị ya: “Ama m.” Ya amụmụọkwa ọnụ ọchị, anyị wee gawa.