Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Banyere Jizọs

Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Banyere Jizọs

Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Banyere Jizọs

“O doro anya na Jizọs onye Nazaret . . . bụ onye kachanụ dịtụrụla ndụ n’ụwa.” —H. G. Wells, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye Bekee.

“Kraịst . . . pụrụ iche ná ndị niile bụ́ dike dịtụrụla ndụ n’ụwa.” —Philip Schaff, ọkà mmụta okpukpe na ọkọ akụkọ ihe mere eme a mụrụ na Switzerland.

ÒNYE kwesịrị ka a kpọọ ya nwoke kacha ukwuu dịtụrụla ndụ? Olee ihe a ga-eji amata ma mmadụ ọ̀ bụ onye ukwu? Ọ̀ bụ otú onye ahụ si akpa ike n’agha? Ọ̀ bụ ike ọkpụkpụ aka ya? Ọ̀ bụ otú ụbụrụ ya si aghọ nkọ? Ọ̀ bụ otú ihe o kwuru na ihe o mere si emetụta ndị mmadụ, ka ọ̀ bụ ihe nlereanya o setịpụrụ?

Legodị ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, ndị ọkà mmụta sayensị, ndị na-ede akwụkwọ, ndị ọchịchị, na ndị ọzọ, ma ndị dịrị ndụ n’oge gara aga ma ndị ka dị ndụ ugbu a, kwuru banyere Jizọs Kraịst, onye Nazaret:

“Ọ bụrụ na mmadụ achọọ igosi na ọ bụghị Jizọs onye Nazaret bụ onye kacha ukwuu dịtụrụla ndụ kemgbe ụwa, ọ bụghị naanị kemgbe puku afọ abụọ gara aga, onye ahụ ga-ebu ụzọ chọọ okpookpo ụgha ọ ga-agha iji megharịa ndị mmadụ anya.”—Reynolds Price, onye America bụ́ ọkà mmụta Baịbụl nke na-ede akwụkwọ.

“Ọ bụ nwoke aka ya dị ọcha, onye ji onwe ya chụọ àjà maka ọdịmma ndị ọzọ, ọbụna nke ndị iro ya wee gbapụta ụwa. Ihe a o mere magburu onwe ya.”—Mohandas K. Gandhi, onye ọchịchị na onye ndú okpukpe ndị India.

“Mgbe m bụ nwata, e ji ma Baịbụl ma Talmud [ya bụ, akwụkwọ okpukpe ndị Juu] kụziere m ihe. Abụ m onye Juu, ma, ihe banyere onye Nazaret ahụ na-amasị m nke ukwuu.”—Albert Einstein, ọkà mmụta sayensị a mụrụ na Germany.

“N’echiche m, Jizọs Kraịst pụrụ iche ná ndị niile dịtụrụla ndụ n’ụwa. Ọ bụ Ọkpara Chineke pụrụ iche, bụrụkwa Nwa nke Mmadụ pụrụ iche. Ihe niile O kwuru na ihe niile O mere baara anyị uru taa. Ma ná ndị dị ndụ ma ná ndị nwụrụla anwụ, o nweghị nwoke ọzọ a ga-asị mere ka ya.”—Sholem Asch, onye na-ede akwụkwọ nke a mụrụ na Poland. Ọ bụ magazin bụ́ Christian Herald dere ihe a o kwuru, deekwa ya otú a anyị dere ya n’ebe a.

“Malite mgbe m bụ nwata ruo mgbe m gbara afọ iri atọ na ise, m kwenyesiri ike na ihe niile ụmụ mmadụ na-eme abaghị uru. Ọ dịghị ihe m kweere na ya. Ọ bụ afọ ise gara aga ka m malitere inwe okwukwe. M kwetara n’ozizi banyere Jizọs Kraịst, ndụ m niile agbanwee ná mberede.”—Count Leo Tolstoy, onye Russia bụ́ ọkà ihe ọmụma nke na-ede akwụkwọ ọgụgụ.

“N’ime ndị niile dịrịla ndụ n’ụwa, ọ bụ ndụ [Jizọs] kacha metụta ndị mmadụ, ọ ka na-emetụtakwa ndị mmadụ karị.”—Kenneth Scott Latourette, onye America bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke na-ede akwụkwọ.

“Ànyị kwesịrị iwere na akụkọ ndụ Jizọs bụ akụkọ ifo? Enyi m, n’eziokwu, o yighị akụkọ ifo. Kama nke ahụ, e nwere ọtụtụ ihe akaebe na-akwado na Jizọs Kraịst dịrị ndụ. Ihe akaebe e nwere na Socrates dịrị ndụ aharughị ka nke Jizọs Kraịst, ọ bụ ezie na mmadụ niile kweere na Socrates dịrị ndụ.”—Jean-Jacques Rousseau, ọkà ihe ọmụma bụ́ onye France.

O doro anya na ọ bụrụ na e nwere onye anyị kwesịrị iṅomi ná ndụ, ọ bụ Jizọs Kraịst. Pọl, bụ́ nwoke gụrụ akwụkwọ, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, onye Jizọs họọrọ ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ ya na onye ga-ekwusa banyere ya ná mba dị iche iche, gbara anyị ume “ka anyị na-elegide anya” n’ebe Jizọs nọ. (Ndị Hibru 12:2; Ọrụ 9:3) Olee ihe Jizọs kụziiri anyị banyere otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ? Olee otú ndụ ya nwere ike isi baara gị uru?