Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Setịpụrụ Ihe Nlereanya Zuru Okè Anyị Ga-eso

Jizọs Setịpụrụ Ihe Nlereanya Zuru Okè Anyị Ga-eso

Jizọs Setịpụrụ Ihe Nlereanya Zuru Okè Anyị Ga-eso

Ị̀ CHỌRỌ ịbụ ezigbo mmadụ karịa otú ị bụ ugbu a? Ị̀ chọrọ inwe obi ụtọ karịa otú i nwere ugbu a? Pita onyeozi kwuru otú anyị nwere ike isi mee ya. Ọ sịrị: “Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) N’ezie, ebe Jizọs Kraịst biri ndụ pụrụ iche, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ya. Ọ bụrụ na anyị amụọ banyere Jizọs, bie ndụ otú o si bie, n’eziokwu, anyị ga-abụkwu ezigbo mmadụ. Anyị ga-enwekwa obi ụtọ karị. Ka anyị lerukwuo anya n’àgwà ụfọdụ onye ukwu a nwere ma chọpụta otú anyị nwere ike isi rite uru n’ihe nlereanya ya.

Jizọs emefeghị ihe ókè. Ọ bụ ezie na Jizọs ‘enweghị ebe ọ na-atọgbọ isi ya,’ o bighị ndụ ya ka onye ihe ọma na-anaghị adị mma, ọ gwaghịkwa anyị ka anyị bie ndụ otú ahụ. (Matiu 8:20) Ọ gara oriri dị iche iche. (Luk 5:29) Ọrụ ebube mbụ e dere ọ rụrụ, ya bụ, ime ka mmiri ghọọ mmanya dị ụtọ n’oriri agbamakwụkwọ, gosiri na ọ naghị asọ ndị mmadụ asọ, ọ naghịkwa achọ ịnọ naanị ya. (Jọn 2:1-11) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs mere ka ihe kacha ya mkpa ná ndụ doo ndị mmadụ anya. Ọ sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.”—Jọn 4:34.

Ì nyochaala ndụ gị nke ọma ka ị chọpụta ihe i nwere ike ime ka ịchụ ego ghara imebi mbọ ị na-agba ka gị na Chineke dịrị ná mma?

Ọ dịịrị ndị mmadụ mfe ịgakwuru Jizọs. Baịbụl gosiri na Jizọs na-emesapụ ihu nakwa na ya na ndị mmadụ na-adị ná mma. Ọ naghị ewe iwe ma ndị mmadụ buru nsogbu ha ma ọ bụ ajụjụ na-agbagwoju ha anya bịakwute ya. N’otu oge, mgbe ìgwè mmadụ gbara ya gburugburu, otu nwaanyị nke na-arịa ọrịa kemgbe afọ iri na abụọ metụrụ uwe ya aka nwee olileanya na ọ ga-agwọ ya. Jizọs abaghịrị ya mba maka ihe ahụ o mere, nke ọtụtụ ndị ga-ewere na ọ bụ ịwa anya, kama, o ji obiọma sị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.” (Mak 5:25-34) Ahụ́ rukwara ụmụaka ala mgbe ha gakwuuru ya, obi siri ha ike na ọ gaghị eleghara ha anya. (Mak 10:13-16) Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ, ha na-ekwurịta okwu dị ka ndị enyi. Ụjọ anaghị atụ ha ịgakwuru ya.—Mak 6:30-32.

Ọ̀ na-adịrị ndị ọzọ mfe ịbịakwute gị?

O nwere ọmịiko, o metakwaara ndị mmadụ ebere. Otu n’ime àgwà kacha mma Jizọs nwere bụ na ọ na-etinye onwe ya n’ọnọdụ ndị ọzọ iji mara otú obi dị ha ma nyere ha aka. Jọn onyeozi kọrọ na mgbe Jizọs hụrụ Meri ka ọ na-akwa ákwá n’ihi ọnwụ Lazarọs nwanne ya, ọ ‘sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu, anya mmiri wee gbaa ya.’ O sighịrị ndị hụrụ ihe ahụ merenụ ike ịghọta na Jizọs hụrụ ezinụlọ ahụ n’anya nke ukwuu nke na ihere emeghị ya igosi ya n’ihu ọha. Ọ bụ ọmịiko dị ukwuu o nwere mere o ji kpọlite enyi ya n’ọnwụ.—Jọn 11:33-44.

N’oge ọzọ, otu nwoke na-arịa ọrịa ekpenta, bụ́ ọrịa na-asọ oyi nke mere ka ya na ndị ọzọ ghara ibi, rịọrọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Ihe Jizọs mere na-emetụ nnọọ n’ahụ́: “O wee matịa aka ya bitụ ya, sị: ‘Achọrọ m. Dị ọcha.’” (Matiu 8:2, 3) Jizọs agwọghị ndị mmadụ naanị ka o mezuo ihe e buru n’amụma. Ọ chọrọ ihicha ha anya mmiri. Ihe kpaliri ya ime ihe niile o mere bụ otu n’ime ihe ndị o kwuru a kacha echetakarị, nke bụ́: “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.”—Luk 6:31.

Omume gị ọ̀ na-egosi na ị na-enwe ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ?

Jizọs ghọtara ọnọdụ ndị mmadụ ma chebara ha echiche. Ọ bụ ezie na Jizọs emeghị mmehie ọ bụla, ọ dịghị mgbe ọ tụrụ anya ka ndị ọzọ na-akpa àgwà ka ndị zuru okè. O meghị omume ka ọ̀ ka ndị ọzọ mma, o meghịkwa ka onye na-anaghị echebara ndị ọzọ echiche. Otu mgbe, ‘otu nwaanyị nke a maara n’obodo na ọ bụ onye mmehie’ ji anya mmiri ya saa ụkwụ Jizọs iji gosi okwukwe ya na obi ekele ya. Jizọs hapụrụ ya ka ọ saa ya ụkwụ. O juru onye ọ bịara na nke ya anya, bụ́ onye mara nwaanyị ahụ ikpe. Jizọs ghọtara na nwaanyị ahụ nwere ezi obi, n’ihi ya, ọ maghị ya ikpe maka mmehie ya. Kama nke ahụ, ọ sịrị ya: “Okwukwe gị azọpụtawo gị; lawa n’udo.” Ọ ga-abụ na otú Jizọs si jiri obiọma gwa nwaanyị ahụ okwu mere ka ọ kwụsị omume ọjọọ ọ na-eme.—Luk 7:37-50.

À maara gị dị ka onye na-ajakarị ndị mmadụ mma na onye na-anaghị amakarị ndị mmadụ ikpe?

Ọ kwanyeere ndị mmadụ ùgwù, o leghịkwa onye ọ bụla anya n’ihu. Jizọs hụrụ Jọn onye na-eso ụzọ ya n’anya nke ukwuu. Ihe kpatara ya ga-abụ na ha nwere otu ụdị àgwà, bụrụkwa ndị ikwu. * N’agbanyeghị nke ahụ, o leghị ya anya n’ihu ma ọ bụ melaara ya ihe. (Jọn 13:23) N’eziokwu, mgbe Jọn na Jems nwanne ya rịọrọ ka e nye ha ọnọdụ kacha mma n’Alaeze Chineke, Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m.”—Mak 10:35-40.

Jizọs kwanyeere ndị ọzọ ùgwù mgbe niile. Ọ kpọghị ndị ọzọ asị otú ndị mmadụ si eme n’oge ọ nọ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, a na-emeso ụmụ nwaanyị omume dị ka ndị dị ala karịa ụmụ nwoke. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù ruuru ha. Onye mbụ o ji ọnụ ya gwa na ya bụ Mesaya abụghị onye Juu, kama ọ bụ nwaanyị Sameria. Ndị Juu enweghị ihe ha ji ndị obodo nwaanyị ahụ kpọrọ, ma ya fọdụzie ikele ha ekele. (Jọn 4:7-26) Ọ bụkwa ụmụ nwaanyị ka Jizọs mere ka ha buru ụzọ hụ ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ.—Matiu 28:9, 10.

Otú i si emeso ndị agbụrụ ọzọ, ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị, ndị na-asụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ ndị mba ọzọ, ọ̀ na-egosi na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu?

Ọ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụrụ nne ya na ụmụnne ya. Ma eleghị anya, Josef, bụ́ onye Jizọs ji mere nna, nwụrụ mgbe Jizọs ka bụ nwa okorobịa. Ọ ga-abụ na Jizọs rụrụ ọrụ ịkwa nkà iji nyere nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwaanyị ọ tọrọ aka. (Mak 6:3) N’oge ọ na-aga ịnwụ, o nyefere nne ya n’aka Jọn onye na-eso ụzọ ya ka o lekọtawa ya.—Jọn 19:26, 27.

Ị̀ ga-eme ihe Jizọs mere, ya bụ, ịrụ ọrụ dịịrị gị n’ezinụlọ unu?

Jizọs bụ ezigbo enyi. Jizọs bụ enyi pụrụ iche. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Ọ jụghị ndị enyi ya mgbe ha mere mmehie, ọbụna meghachi ya ugboro ugboro. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị na-eso ụzọ ya mere omume otú ọ chọrọ ka ha mee. Kama, o gosiri na ya bụ ezigbo enyi ha site n’ilekwasị anya n’àgwà ọma ndị ha nwere, ọ bụghị iche na ha bu ihe ọjọọ n’obi. (Mak 9:33-35; Luk 22:24-27) Ọ naghị amanye ha ka ha kwere ihe o kwuru, kama, ọ na-enye ha ohere ka ha kwuo echiche ha.—Matiu 16:13-15.

Nke ka nke bụ na Jizọs hụrụ ndị enyi ya n’anya. (Jọn 13:1) Olee otú ọ hụruru ha n’anya? Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Ò nwere onye nwere ike inye ndị enyi ya ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ndụ ya?

Ị̀ ga-agbara ndị enyi gị ọsọ mgbe ha kpasuru gị iwe ma ọ bụ mee ihe wutere gị, ka ùnu ga-anọgide na-abụ enyi?

O nwere obi ike, bụrụkwa dimkpa. Ụfọdụ ndị na-ese ihe osise na-ese Jizọs dị ka onye na-adịghị ike na onye na-anaghị ekwuli okwu. Ma, Jizọs adịtụdịghị otú ahụ. Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn gosiri na ọ bụ dimkpa obi siri ike. Jizọs chụpụrụ ndị na-azụ ahịa n’ụlọ nsọ ugboro abụọ, tụpụsịakwa ngwá ahịa ha n’èzí. (Mak 11:15-17; Jọn 2:14-17) Mgbe ìgwè mmadụ bịara ijide “Jizọs onye Nazaret,” o ji obi ike pụta, kwuo hoo haa, sị: “Ọ bụ m. Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa.” O mere nke a ka a ghara ime ndị na-eso ụzọ ya ihe ọ bụla. (Jọn 18:4-9) Ka a sịkwa ihe mere na mgbe Pọntiọs Paịlet hụrụ ụdị obi ike Jizọs nwere mgbe e ji ya eji na-emeso ya omume ọjọọ, ọ sịrị: “Lee nwoke ahụ!”—Jọn 19:4, 5.

Mgbe ị matara ihe i kwesịrị ime, ị̀ na-eji obi ike eme ya n’eleghị anya n’azụ?

Àgwà ndị a na àgwà ndị ọzọ magburu onwe ha mere ka Jizọs bụrụ onye anyị kwesịrị iso ihe nlereanya ya zuru okè. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka omume ya gbanwee omume anyị, anyị ga-abụkwu ezigbo mmadụ, nweekwa obi ụtọ karị. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji gbaa Ndị Kraịst ume ka ha sochie nzọụkwụ Jizọs anya. Ị̀ na-agbalị isochi nzọụkwụ Jizọs anya?

Ọ Bụghị Naanị Ihe Nlereanya Ka Ọ Bụụrụ Anyị

Ma, ọ bụghị naanị ihe nlereanya ka Jizọs bụụrụ anyị. Ọ sịrị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ọ bụghị naanị na Jizọs mere ka anyị mara eziokwu banyere Chineke, si otú ahụ meghee ụzọ ụmụ mmadụ si abịaru Chineke nso, o mekwara ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwee ohere inweta ndụ.—Jọn 3:16.

Jizọs kwuru na nke a so n’ihe mere o ji bịa n’ụwa, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà, si otú ahụ tọọrọ ụmụ mmadụ ntọala ịdị ndụ ebighị ebi. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji rite uru n’àjà ahụ? Jizọs kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

N’ezie, ịmata banyere Jizọs, iṅomi otú o si bie ndụ na inwe okwukwe n’àjà o ji ndụ ya chụọ bụcha ihe ndị dị mkpa ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. Anyị na-agwa gị ka i wepụta oge mụọ akwụkwọ ga-eme ka ị mata ihe ndị ahụ dị mkpa, ya bụ, Baịbụl. Anyị na-agwakwa gị ka ị gbalịa mee ihe o kwuru, dị ka Jizọs mere. *

Ihe nlereanya ọma Jizọs setịpụụrụ anyị mgbe ọ dịrị ndụ n’ụwa na-akụziri anyị ụdị mmadụ anyị kwesịrị ịbụ. Àjà o ji ndụ ya chụọ nwere ike ime ka anyị nwere onwe anyị n’aka mmehie na ụgwọ ọrụ ọ na-akwụ, ya bụ, ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) Ọnọdụ anyị gaara adị mwute nke ukwuu ma a sị na Jizọs Kraịst agbataraghị anyị ọsọ enyemaka. Ya enwela mgbe ị ga-ekwe ka iji ọrụ n’aka na nchegbu nke ndụ mee ka ị ghara ịtụle ihe nlereanya nke nwoke kacha ukwuu dịworo ndụ, ya bụ, Jizọs Kraịst, na isochi ihe nlereanya ya anya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ọ ga-abụ otu nne mụrụ Salomi, nne Jọn, na Meri, nne Jizọs. Tụlee Matiu 27:55, 56 na Mak 15:40 na Jọn 19:25.

^ par. 26 Ị chọọ ịhụ ebe a kọrọ akụkọ zuru ezu banyere ndụ Jizọs dịrị mgbe ọ nọ n’ụwa, gụọ akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

▪ Jizọs kwanyeere ndị mmadụ ùgwù, o leghịkwa onye ọ bụla anya n’ihu

▪ Ọ bụ ezigbo enyi ruo oge ọnwụ ya

▪ O nwere obi ike

Ị̀ na-agbalị isochi nzọụkwụ Jizọs anya?

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Jizọs emefeghị ihe ókè

Ọ dịịrị ndị mmadụ mfe ịgakwuru ya

O nwere ọmịiko