Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova Hà Kweere n’Ihe E Dere n’Agba Ochie?

Ndịàmà Jehova Hà Kweere n’Ihe E Dere n’Agba Ochie?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Ndịàmà Jehova Hà Kweere n’Ihe E Dere n’Agba Ochie?

Ndịàmà Jehova kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke, kwerekwa na Agba Ochie na Agba Ọhụrụ dịcha oké mkpa. Ma, ọ na-amasị ha ịkpọ ha aha kwesịrị ekwesị, ya bụ, “Akwụkwọ Nsọ Hibru” na “Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.” Ọ bụ n’ihi na asụsụ bụ́ isi e ji dee Agba Ochie na Agba Ọhụrụ mgbe a na-ede ha bụ Hibru na Grik.

Ma, ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst anaghị anabatacha ihe e dere n’Agba Ochie. Ha na-ekwu na ihe ndị e dere na ya na-egosi na Chineke bụ Chineke iwe, onye agha na igbu ọchụ na-adị mma. Ha na-ekwukwa na àgwà ndị ahụ adabaghị n’ịhụnanya na-enweghị atụ na àgwà ọma Agba Ọhụrụ kwuru na o nwere. Ma ọ bụkwanụ ha ekwuo na ebe ọ bụ na ihe e dere n’Agba Ochie bụ nnọọ banyere okpukpe ndị Juu na ọ dịghị Ndị Kraịst mkpa. Ma, ebe ọ bụ na Chineke nyere iwu na Diuterọnọmi 12:32, ka a ghara ịtụkwasị ihe ma ọ bụ wepụ ihe n’okwu ya, ihe ndị ahụ ha kwuru ò kwesịrị ime ka a jụ Agba Ochie, bụ́ ebe e dere ihe karịrị ọkara nke ihe niile dị na Baịbụl?

N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, mgbe Pọl onyeozi gara leta ụmụ amaala Tesalọnaịka, nke dị na Gris, ‘ya na ha nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ, ya ana-akọwa ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ, ka o sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’ (Ọrụ 17:1-3) Ụfọdụ ndị ọ gwara okwu ghọrọ Ndị Kraịst. Pọl mechara jaa ha mma, sị: “Mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nabatara ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.” (1 Tesalọnaịka 2:13) N’oge ahụ, ọ ga-abụ na n’ime akwụkwọ iri abụọ na asaa dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, naanị Oziọma Matiu ka e derela. N’ihi ya, o doro anya na ‘Akwụkwọ Nsọ’ Pọl gụrụ iji gosi “ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ” bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru.

N’eziokwu, ndị so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dere kpọmkwem ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ugboro narị atọ na iri abụọ, deekwa ihe ndị ọzọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ọtụtụ narị ugboro, n’edeghị ha kpọmkwem otú e si dee ha. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? “N’ihi na ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Nke a na-egosi nke ọma na ndị nabatara akwụkwọ niile dị na Baịbụl na-erite uru dị ukwuu.

Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụ́ nke dabeere n’ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ Okwu Chineke nke Chineke si na ya jiri nwayọọ nwayọọ kpughee nzube ya. Ihe ndị e dere na ya emeghị ka Akwụkwọ Nsọ Hibru ghara ịbakwa uru. Herbert H. Farmer, bụ́ ọkà mmụta na-akụzi banyere okpukpe na Mahadum Cambridge, kwuru na Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn “agaghị edo anya ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ mata akụkọ banyere ndị ha na Chineke gbara ndụ n’oge ochie, bụ́ nke e dere n’Agba Ochie.”

Okwu Chineke abụghị akwụkwọ a ga-edegharị edegharị. N’agbanyeghị nke ahụ, “ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) Site n’ịgbakwụnye Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na Baịbụl, Chineke ji nwayọọ nwayọọ kpughee otú nzube ya ga-esi mezuo, n’emeghị ka Akwụkwọ Nsọ Hibru yie akwụkwọ na-abachaghịkwa uru. Ha niile bụcha ‘okwu Jehova nke na-adịru mgbe ebighị ebi.’—1 Pita 1:24, 25.